Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Na-akpata Nsogbu ahụ A Na-enwe n’Ọrụ Ugbo Nakwa n’Ịkpa Anụ?

Gịnị Na-akpata Nsogbu ahụ A Na-enwe n’Ọrụ Ugbo Nakwa n’Ịkpa Anụ?

 Gịnị Na-akpata Nsogbu ahụ A Na-enwe n’Ọrụ Ugbo Nakwa n’Ịkpa Anụ?

“A zụrụ ndị na-arụ ọrụ n’Ụlọ Ọrụ A Na-akpọtụrụ Maka Nchegbu Ọrụ Ugbo Na-akpata, inyere gị aka maka nchegbu ị na-enwe n’ọrụ ugbo. Anyị bụ ndị ọrụ ugbo na ndị rụburu ọrụ ugbo—dị nnọọ ka gị onwe gị—anyị na-aghọtakwa ihe ịma aka ezinụlọ ndị bi n’ime obodo na-eche ihu. Anyị pụrụ igosi gị ndị pụrụ inyere gị aka. . . . A gaghị eme ka ndị mmadụ mara banyere ihe ndị anyị na gị kwuru na fon.”—E nwetara ya n’ebe gọọmenti Canada na-edebe ihe ọmụma n’Intanet.

ỌTỤTỤ ndị ọkachamara n’ọrụ ahụ́ ike amataziela nchegbu dị ka ihe ize ndụ nye ọrụ ugbo na ịkpa anụ. Iji nyere ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ aka ịnagide ọnọdụ ha, e nwere ndị ọkà mmụta n’ịchọpụta na ịgwọ nsogbu akparamàgwà, ndị bụ́ aka ochie n’ịhụ maka nchegbu ọrụ ugbo na-akpata, na-arụ ọrụ ndị dị ka inye ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ nkwado na iwepụta nọmba fon ndị ha pụrụ ịkpọ iji nweta enyemaka.

Nwunye otu onye ọrụ ugbo aha ya bụ Jane na-aga otu nzukọ a na-enye ndụmọdụ na ya n’abalị Thursday. “Abịara m n’ihi na di m gburu onwe ya,” ka Jane na-akọwa. “Ọchịchọ ya abụwo mgbe nile ịnọgide na-akọ ihe n’ala ezinụlọ anyị, echekwara m na ebe ọ na-emelighị ya, ọ chọghị ime ihe ọ bụla ọzọ.”

Ọtụtụ ndị achọpụtawo na ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ bụ́ ndị na-achọ inwere onwe ha pụọ ná nchegbu,  na-arịwanye elu n’ụzọ a na-ahụtụbeghị ụdị ya. Gịnị kpọmkwem na-akpata nsogbu ahụ ọtụtụ ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ na-enwe?

Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha na Ọrịa

Ebe ahụ gọọmenti na-edebe ihe ọmụma n’Intanet, bụ́ nke e kwuru banyere ya ná mmalite na-ekwu, sị: “Otú ọrụ ugbo si dị kpọmkwem pụtara na ị pụghị ịchịkwa ihe ka ukwuu n’ime ihe ndị na-eme ná ndụ gị—ihu igwe, ego ole ihe na-ada n’ahịa, ego ole a na-akwụ n’ọmụrụ nwa, na ígwè ọrụ imebi emebi. Ọbụna ịhọrọ otu n’ime ihe abụọ ndị dị ka ihe ị ga-akọ n’ugbo ma ọ bụ ire ala [ma ọ bụkwanụ] inye ya onye i ji ụgwọ pụrụ ịkpata nchegbu, ebe ọ bụ na ihe ga-esi na ya pụta pụrụ ịdị mma ma ọ bụ dị njọ.” Mgbe a tụkwasịziri ya egwu a na-atụ maka oké ọkọchị, ọrịa, ma ọ bụ maka akọpụtaghị ihe, nchegbu ahụ nwere ike ịkarị akarị.

Dị ka ihe atụ, oké ọkọchị pụrụ ịbụ mma ihu abụọ. Howard Paulsen bụ́ onye ọrụ ugbo nke na-akpakwa anụ kọwara na oké ọkọchị nke 2001, bụ́ nke kasị njọ n’akụkọ ihe mere eme nke Canada, kpara ihe ọ kọrọ n’ugbo na anụ ụlọ ya aka ọjọọ. Ebe ọ bụ na ọ dịghị ahịhịa anụ ụlọ ya ga-ata ma ọ bụ ihe o nwetara n’ubi ya, ọ ghaghị ịzụ ihe anụ ụlọ ga-eri azụ. “Emefuwo m rịị $10,000 n’ịzụ nri anụ, ugbu a, ana m enye ha nri ha kwesịrị iri n’oge oyi,” ka o kwuru. “Ị malite ime nke ahụ, uru agaghịdị adị n’ịkpa anụ.” N’ebe ndị ọzọ, idei mmiri akpawo ọtụtụ ugbo aka ọjọọ—na-ebibi ihe nile a kọrọ na ha.

Na Britain, ntiwapụ nke ọrịa na-emetụta ụkwụ na ọnụ n’afọ 2001 bụ nanị nke kasị ọhụrụ n’ime ọtụtụ nsogbu ndị Britain na-akpa anụ nwerela, gụnyere ọrịa ehi ara na ahụ́ ọkụ ezì. Ọrịa ndị a—na egwu ha na-akpali n’ahụ́ ọha na eze—abụghị nanị nsogbu akụ̀ na ụba ka ha na-akpata. Ụlọ ọrụ akụkọ ụwa bụ́ Agence France-Presse kọrọ, sị: “A hụla ebe ụmụ amaala nwere obi, ọ bụghị ndị anya mmiri na-agba ngwa ngwa, na-ebe ákwá ka ha na-ekiri ebe ndị ọrụ gọọmenti bụ́ ọkà n’ịgwọ ụmụ anụmanụ na-achịkọta ìgwè anụ were ha oge dị ukwuu ịzụlite, ma na-esu ha ọkụ.” Mgbe ntiwapụ nke ọrịa na-emetụta ụkwụ na ọnụ gasịrị, ndị uwe ojii malitere ịnara ndị na-akpa anụ bụ́ ndị yiri ka hà ga-egbu onwe ha, égbè ha. Ụlọ ọrụ na-enye ndụmọdụ zara ọtụtụ fon ndị sitere n’aka ọtụtụ ndị na-akpa anụ, bụ́ ndị obi kooro n’elu.

Ọnọdụ Akụ̀ na Ụba A Na-ejighị n’Aka

E nwewokwa mgbanwe dị ukwuu n’ọnọdụ akụ̀ na ụba. “N’agbata afọ 1940 na etiti afọ ndị 1980,” ka azụ akwụkwọ bụ́ Broken Heartland na-ekwu, “ihe a na-emefu iji kọpụta ihe n’Ebe Bụ́ Idé n’America mụbara okpukpu atọ, ego e ji azụ ígwè ọrụ mụbara okpukpu anọ, ihe a na-akwụ n’ọmụrụ nwa mụbara okpukpu iri, uru ahịa dalatara ruo pasent 10, ọ̀tụ̀tụ̀ ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ ji dalata bụ ụzọ abụọ n’ụzọ atọ, ndị mmadụ sikwa n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe nile ndị ọrụ ugbo bi kwapụ, achụmnta ego na ọnọdụ akụ̀ na ụba esighịzikwa ike na ha.”

N’ihi gịnị ka ihe a na-emefu na-eji akawanye uru a na-erite? N’ụwa taa nke yiri otu ógbè, azụmahịa mba na mba na-emetụta ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ. N’ihi ya, ndị ọrụ ugbo na-ahụ onwe ha dị ka ndị ha na ndị na-emepụta nri ọtụtụ kilomita site n’ebe ha nọ na-asọrịta mpi. N’ezie, azụmahịa mba na mba emewokwa ka e nwee ahịa ndị ọhụrụ a na-ere ihe ndị a kọtara n’ubi, ma azụmahịa a zuru ụwa ọnụ pụkwara nnọọ ịbụ ihe a na-ejitụghị n’aka. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1998, ego kọrọ ọtụtụ ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa ezì na Canada mgbe ndị ahịa ha nọ n’Eshia nwere ndakpọ akụ̀ na ụba.

Mbelata nke Ndị Nọ n’Ime Obodo

Prọfesọ Mike Jacobsen nke Mahadum Iowa, bụ́ ọkachamara n’ihe ndị metụtara ime obodo, chọpụtara na nsogbu ndị ọrụ ugbo bụkwa nsogbu nke ndị bi n’ime obodo. Ọ na-ekwu, sị: “Ebe ndị a bụ ebe dị mma ịnọ zụlite ụmụaka, ebe dị ọcha, ebe ị ga-achọ ịlụ nwanyị ma zụlite ụmụ gị. Ụlọ akwụkwọ ndị dị na ha dị nnọọ mma n’anya. Ha adịghị ize ndụ. Otú ahụ ka a na-eche na ọ dị, ọ́ bụghị ya? Ọnọdụ akụ̀ na ụba nke obodo ndị a dabeere nke ukwuu n’ọtụtụ  obere ugbo ndị ezinụlọ dị iche iche nwere n’ógbè ndị gbara ha gburugburu.” N’ihi ya, a na-ahụkwa nsogbu ndị ọrụ ugbo a site n’ụlọ ọgwụ, ụlọ akwụkwọ, ụlọ nri, ụlọ ahịa, na ụlọ chọọchị ndị mechiri emechi n’ime obodo. Otu n’ime ihe ndị kasị eme ka ndụ ndị ọrụ ugbo na-akpali mmasị, bụ́ mbikọta ọnụ nke ndị mmadụ, ebelatawala.

N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na, dị ka magazin bụ́ Newsweek si kwuo, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 16 nke ndị America bi n’ime obodo, dara ogbenye ọnụ ntụ. N’akụkọ ya bụ́ “Nsogbu Ime Obodo n’Australia,” Geoffrey Lawrence na-ede na n’Australia, “ọnụ ọgụgụ ndị na-enweghị ọrụ, ndị na-enweghị ezigbo ọrụ na ndị dara ogbenye, bara ụba n’ime obodo karịa n’obodo ukwu.” Ọnọdụ akụ̀ na ụba a na-ejighị n’aka amanyewo ọtụtụ ezinụlọ—karịsịa ndị nke na-akatachabeghị ahụ́—ịkwaga n’obodo ukwu. Sheila, bụ́ onye so ezinụlọ ya na-arụ ọrụ n’otu ugbo, na-ajụ, sị: “Ogologo oge hà aṅaa ka ọnọdụ a ga-adịru tupu anyị agharazie inwe ndị ga-adị njikere ịkọ ugbo n’ala a?”

N’ihi nkwaga ndị na-eto eto na-akwaga n’obodo ukwu n’ike n’ike, ndị bi n’ọtụtụ ime obodo abụrụwo, n’ụzọ doro anya, ndị kataworo ahụ́. Ọ bụghị nanị na ógbè ndị a enweghịzi ike nke ndị ntorobịa kamakwa ndị agadi nọ na ha enweghị ndị na-elekọta ha—mgbe mgbe, n’oge a kasị chọọ nlekọta dị otú a. N’ụzọ kwere nghọta, mgbanwe ndị a na-ewere ọnọdụ ngwa ngwa na-agbagwoju ọtụtụ ndị kataworo ahụ́ bụ́ ndị bi n’ebe ndị a anya ma na-amapụ ha obi.

N’ihi ya, nsogbu a na-enwe n’ọrụ ugbo nakwa n’ịkpa anụ bụ nke na-ebibi ihe ma zuo ebe nile. Ọ na-emetụta anyị nile. Otú o sina dị, dị ka isiokwu anyị na-esonụ ga-egosi, e nwere ihe mere a ga-eji kwere na nsogbu a na-enwe n’ọrụ ugbo nakwa n’ịkpa anụ ga-akwụsị.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

N’ụwa taa nke yiri otu ógbè, azụmahịa mba na mba na-emetụta ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

“Ogologo oge hà aṅaa ka ọnọdụ a ga-adịru tupu anyị agharazie inwe ndị ga-adị njikere ịkọ ugbo n’ala a?”

 [Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

ỊKỌ NRI NA ỊKPA ANỤ N’EJIGHỊ FATỊLAỊZA NA ỌGWỤ EME IHE

Ọtụtụ mmadụ na-enwezi mmasị ná nri ndị a kọpụtara n’ejighị fatịlaịza na ọgwụ mee ihe. Na Canada, obere ụlọ ahịa ndị na-ere ihe oriri ndị a kọpụtara n’ụzọ dị otú a ji ihe dị ka pasent 15 na-amụba kwa afọ.

Ndị na-arụ ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ n’ejighị fatịlaịza na ọgwụ eme ihe na-ekwu na nke a dị iche ná nri ndị a kọpụtara ná nnukwu ugbo nke ndị na-achụ nta ego. “Ebe ọ bụ na e nwere nnukwu ubi, a na-akọkarị nanị otu ụdị akụ́kụ́ n’ụzọ buru ibu, bụ́ nke a na-eji ígwè ọrụ na ọgwụ ndị na-egbu ụmụ ahụhụ na fatịlaịza, bụ́ ndị ụmụ mmadụ mepụtara, eme ka o mee nke ọma,” ka Katharine Vansittart na-ede n’akwụkwọ bụ́ Canadian Geographic. “E wezụga na ọgwụ ndị dị otú ahụ nwere ike fọdụ n’ime ihe oriri e ji ha kọpụta, akụ́kụ́ adịchaghịkwa enye ihe n’ahụ́ mgbe e were ha n’achaghị acha, bụ́ otú ọ na-aghaghị ịdị ma ọ bụrụ na a ghaghị ibu ha gaa ebe dị anya iji ruo n’ahịa. Iji jide n’aka na ihe ndị e nwetara n’ubi ruru ebe a ga-anọ ree ha n’emebighị emebi, a pụrụ iji gas, wax, ma ọ bụ ụzarị ọkụ mee ka ha ghara imebi.”

Olee ndị na-azụ nri ndị a na-ejighị fatịlaịza na ọgwụ kọpụta? Akụkọ ahụ si Alberta na-ekwu na ndị na-azụ ha “na-agụnye ndị dị afọ iri na ụma bụ́ ndị na-adịghị eji ahụ́ ike ha egwuri egwu, ndị nne bụ́ ndị na-eche banyere ụmụ ha, na ndị agadi a mụrụ ozugbo Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị. . . . Ọ bụghịzi nanị ụmụ okoro na agbọgbọ ndị ahụ nọ na-agbapụ iche n’afọ ndị 1960.”

Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile kwenyere na nri ndị a na-ejighị fatịlaịza na ọgwụ kọpụta ka mma. Akwụkwọ bụ́ Canadian Geographic na-ekwu, sị: “Oké ọnụ a na-ere nri ndị a na-ejighị fatịlaịza na ọgwụ kọpụta n’ebe nile emewo ka ndị na-enwe obi abụọ kwuwe na ọ dịghị uru ha bara, n’achọghị inweta ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ sitere n’aka ndị ọkà mmụta sayensị, bụ́ ndị na-egosi uru ha bara. Ndị ọzọ na-enwe nchegbu banyere ụzọ abụọ e si akọpụta nri bụ́ ndị aka ndị ogbenye na-adịghị eru.” Ndị na-akwalite nri ndị a na-ejighị fatịlaịza na ọgwụ kọpụta na-ekwu na mgbanwe ndị a na-enwe n’ihe oriri, n’orire ha, nakwa n’ibuga ha n’ebe a chọrọ ha, pụrụ ime ka aka onye ọ bụla, n’agbanyeghị ọnọdụ akụ̀ na ụba ya, ruo ná nri ndị a na-ejighị fatịlaịza na ọgwụ kọpụta. N’ihi echiche dịgasị iche iche na ihe ndekọ nkà mmụta sayensị ndị e nwere, arụmụka a na-enwe banyere nri ndị a na-ejighị fatịlaịza na ọgwụ kọpụta eyighị ka ọ̀ ga-akwụsị n’isi nso.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

ỌGWỤ AHỤHỤ—IHE NA-AKPATARA NDỊ ỌRỤ UGBO ỌNỌDỤ AMAGHỊ NKE A GA-EME

N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ụmụ ahụhụ na ọrịa akụ́kụ́ egbuwo ihe ruru pasent 75 nke akụ́kụ́ a gaara enweta. Ngwọta doro anya e nwere bụ nnọọ ịkọpụtakwu nri. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Globe and Mail na-akọ, sị: “Ndị ọrụ ugbo bụ́ ndị Canada agbalịwo ịnọ n’isi n’asọmpi ahụ site n’ịtụpụta usoro ndị ha ga-eji na-eme ihe bụ́ ndị ga-eme ka ha na-akọpụtakwu nri, na-eme ka ha nwekwuo ihe ndị ha ga-ere.” N’agbanyeghị nke ahụ, Terence McRae nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka gburugburu ebe obibi Canada na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọtụtụ n’ime mgbanwe ndị a amụbawo ihe ize ndụ ọrụ ugbo pụrụ ịkpata na gburugburu ebe obibi.”

Gịnị banyere iji ọgwụ ahụhụ eme ihe? Nke a na-etinyekwa ndị ọrụ ugbo na ndị na-akpa anụ n’ọnọdụ amaghị nke a ga-eme, ebe ọ bụ na a ka na-agbagha ịdị irè nke ọgwụ ahụhụ ma na-ekwu otú ha si dị ize ndụ nye ahụ́ ike. Otu akụkọ sitere n’aka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa kwetara na a matachabeghị ókè nsí na ihe ize ndụ ndị dị n’ihe ka ọtụtụ n’ọgwụ ahụhụ ndị e ji eme ihe, haruru. Ihe ize ndụ ndị a pụrụ inwe pụrụ ịka njọ ka ọgwụ ahụhụ ndị ahụ na-esi n’otu ụdị nri baa n’ọzọ. Ụmụ anụmanụ na-ata ahịhịa a gbara ọgwụ ahụhụ. Ụmụ mmadụ, n’aka nke ha, na-ata anụ ụmụ anụmanụ ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto]

USDA Photo nke Doug Wilson sere