Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ịgbalị Ịchọ Izu Okè?

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ịgbalị Ịchọ Izu Okè?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ịgbalị Ịchọ Izu Okè?

“Àgwà nke ịchọkarị izu okè fọrọ nke nta ka ọ na-achịkwa ndụ m nile.”—Carly.

ỊCHỌKARỊ IZU OKÈ—nkwenye bụ́ na mmadụ aghaghị ịbụ onye zuru okè n’ihe nile ọ na-eme—na-emetụta otú ọtụtụ ndị ntorobịa si eche echiche.

Akwụkwọ bụ́ Perfectionism—What’s Bad About Being Too Good? (Ịchọkarị Izu Okè—Olee Ihe Ọjọọ Dị n’Ịdịbiga Mma Ókè?) na-ekwu, sị: “E nwere nnukwu ọdịiche dị n’etiti ọchịchọ kwesịrị ekwesị nke imezi ihe emezi na ịchọ n’ụzọ gabigara ókè imeta ihe nile otú na-agaghị ekwe omume. Ọ pụrụ ịdịsi ndị na-agbalị imezi ihe emezi mkpa ike ịhụ na ihe nile dị nnọọ n’usoro na a hazikwara ha ahazi, ha na-atụkwa anya oké ihe n’aka onwe ha, ma ha na-anabatakwa ihie ụzọ ha ma na-enwe ụzọ ndị dị mma isi mee ihe banyere ha. . . . N’aka nke ọzọ, ndị na-achọkarị izu okè na-echegbu onwe ha mgbe nile banyere imehie ihe. Ha na-enwe ụkpụrụ ndị dị oké elu.”

Ọ̀ bụ otú ahụ ka ị dị? Ọ bụrụ na ụkpụrụ gị dị elu gabiga ókè, ị pụrụ ịghọ, n’ụzọ dị mfe, onye ọ na-esiri ike ime ihe ọ bụla. Ị pụrụ ịchọpụta na ị na-ezere ime ihe ọhụrụ ọ bụla. Ma ọ bụ, ị pụrụ iji n’ihi ụjọ ịkụ afọ n’ala na-eyigharị ime ihe ndị dị mkpa. Ị pụrụ ọbụna ịchọ ịjụ onye ọ bụla nke na-emerughị ihe otú ị chọrọ ya, ị pụrụ ịghọ onye na-enwekwaghị ndị enyi.

Ọ bụrụ na ihe e kwuru n’elu bụ eziokwu n’ụzọ ọ bụla banyere gị, tụlee ihe Bible kwuru n’Eklisiastis 7:16: “Abụbigala onye ezi omume ókè; emekwala onwe gị onye mabigara ihe ókè; n’ihi gịnị ka ị ga-emebi onwe gị?” Ee, onye na-achọkarị izu okè pụrụ ‘imebi’ onwe ya! N’eziokwu, ọbụna e jikọtawo ịchọkarị izu okè na nsogbu iri ihe bụ́ ndị na-eyi ndụ egwu dị ka nsogbu achọghị iri ihe na iribiga nri ókè. *

Ya mere, ị pụrụ ịjụ sị, ‘Olee otú m pụrụ isi kwụsị ịgbalị ịchọ izu okè?’ N’ezie, mmadụ ịgbanwe echiche ya banyere nke a pụrụ ịbụ ihe siri ike. Ma site n’enyemaka Chineke, a pụrụ ime ya. Ya mere, ka anyị hụ otú Chineke si ele ịchọkarị izu okè anya.

Izu Okè—Ọ̀ Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ A Pụrụ Iru Eru?

Nke mbụ, ọ̀ ga-ekwe gị omume izu okè n’ụzọ nile? Ọ gaghị ekwe omume dị ka Bible si kwuo, bụ́ nke na-asị: “Ọ dịghị onye ezi  omume dịnụ, ọbụnadị otu . . . Mmadụ nile agahiewo, ha nile aghọwo ndị na-abaghị uru.” (Ndị Rom 3:10-12) Okwu ndị a na-akpali iche echiche, ọ́ bụghị ya? Ha na-egosi na onye ọ bụla nke na-agbalị izu okè n’ụzọ nile ga-akụ afọ n’ala.

Cheedị echiche banyere Pọl onyeozi, bụ́ onye o doro anya na ọ bụ ihe nlereanya pụtara ìhè nke onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọbụna Pọl apụghị ijere Chineke ozi n’emehieghị ihe. O kwupụtara, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ihe ọjọọ na-anọ n’ebe m nọ. N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.” (Ndị Rom 7:21-23) Ọ bụ nanị site n’enyemaka Chineke ka Pọl pụrụ ikwesị ntụkwasị obi dị ka Onye Kraịst.

Ọ dabara nke ọma na Chineke adịghị achọ ma ọ bụ na-atụ anya izu okè n’ihe nile n’aka anyị. “N’ihi na ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị, ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:14) Ọ bụ nanị n’ime ụwa ọhụrụ Chineke ka ụmụ mmadụ ga-ezu okè n’ikpeazụ.

Gbanwee Ihe Ndị Ị Na-atụ Anya Ha

Ka ọ dịgodị, ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya iche na ị pụrụ izu okè n’ụzọ nile. N’ezie, i kwesịrị ịtụ anya ịdị na-emehie ihe site n’oge ruo n’oge. (Ndị Rom 3:23) N’ezie, mgbe ụfọdụ anyị anadịghị ama mgbe anyị mehiere ihe! Abụ Ọma 19:12 na-ekwu sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịhụ njehie ya.” (Today’s English Version) Otu onye ntorobịa aha ya bụ Matthew si otú a kwuo ya: “I zughị okè—ọ dịghị onye zuru okè n’Ụwa. Ọ bụrụ na ị na-atụ anya izu okè n’aka onwe gị, ọ dịghị ihe ga-eme ka i nwee obi ụtọ. . . . Ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya, ọ gaghị ekwe omume.”

N’iburu nke a n’uche, ọ́ gaghị adị mma ịgbanwe ihe ndị ị na-atụ anya ha? Dị ka ihe atụ, ị̀ na-akpatara onwe gị ike ọgwụgwụ site n’ịgbalị ịbụ onye kasị emeta otu ihe? Bible na-egosi na ụdị mgbalị ahụ nke na-agwụ ike pụrụ n’ezie ịbụ “ihe efu na ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 4:4) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ mmadụ ole na ole na-enwe ike aghọ ndị kasị emeta ihe. Ọ bụrụgodị na mmadụ abụrụ onye kasị emeta ihe, ọ naghị adị anya e nwee onye ọzọ ka ya mma.

Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka ọ dị mkpa iche; kama ka ọ na-eche echiche iji nwee uche zuru okè.” (Ndị Rom 12:3) Jiri ezi uche na-eme ihe! Gbanwee ihe ndị ị na-atụ anya ha ka ha kwekọọ n’ihe ndị ị pụrụ ime na ihe ndị ị na-apụghị ime. Chọọ imezi ihe emezi, ma achọla izu okè. Setịpụ ihe mgbaru ọsọ a kapịrị ọnụ nke a pụrụ iru eru.

Dị ka ihe atụ, Pọl gbara Timoti ume ka ọ bụrụ  “onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” (2 Timoti 2:15) Ee, Pọl gbara ya ume imezi ihe emezi, ma ọ bụghị izu okè. N’otu aka ahụ, setịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha. Ọ bụrụkwa na i jighị n’aka ihe bụ “ihe ezi uche dị na ya,” gị na ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye ọzọ toruworo ogo mmadụ nke ị tụkwasịrị obi kwurịta ya.

Ụfọdụ ndị na-atụ aro ọbụna ka ị mara ụma gbalịa ime ihe ụfọdụ ndị ị na-amachaghị eme, dị ka ịmalite ime otu egwuregwu ọhụrụ ma ọ bụ ịkpọ otu ngwá egwú. N’ezie, ka ị na-amụ otu ihe ọhụrụ, ị ga-emehierịrị ihe ọtụtụ mgbe. Ma nke ahụ adịchaghị njọ. Ikekwe ọ ga-enyere gị aka ịhụ na imehie ihe bụ nnọọ ihe ya na ịmụta ihe na-agakọ.

Ihe ọ bụla ị chọrọ ime—ma ọ bụ ide ihe banyere otu isiokwu e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ ịmụta otú e si akpọ ngwá egwú piano—tụlee ndụmọdụ ọzọ Pọl onyeozi nyere: “Unu adịla umengwụ n’ihe unu na-eme.” (Ndị Rom 12:11) Ee, adịla na-eyigharị ihe nanị n’ihi na ị na-atụ ụjọ ịkụ afọ n’ala.

Otu onye ntorobịa mere ka ọ bụrụ ihe maara ya ahụ́ bụ́ ịdị na-eyigharị ide ihe e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ ka o dee site n’inye ihe ngọpụ bụ́ na ya “na-akpakọ onwe ya ọnụ.” Ọ bụ ezie na mmadụ ịkpakọ onwe ya ọnụ dị mma, kpachara anya ka ọ ghara ịbụ ihe mgbakwasị ụkwụ iji na-eyigharị ihe ị ga-eme. Nwatakịrị nwanyị a bịara ghọta na “mgbe mmadụ na-aghaghị ime mkpebi n’agbata inyefe ihe odide e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ ka o dee, bụ́ nke ọ na-edetachaghị otú ọ chọrọ na enyefeghị ya enyefe, na ọ ka mma inwe nke o nyefere.”

Jụ Echiche Ndị Na-akpata Nkụda Mmụọ

N’eziokwu, o nwere ike ịdị na-enye gị nsogbu n’obi mgbe ị rụrụ ọrụ na-adịchaghị mma. Echiche na-ezighị ezi, nke ịma onwe onye ikpe ka pụrụ ịdị na-agbata gị n’uche. Gịnị ka ị pụrụ ime? Nke bụ́ eziokwu bụ na ịnọgide na-atụgharị uche n’echiche ndị na-ezighị ezi pụrụ ịkpata nkụda mmụọ. Ya mere, gbalịsie ike iwepụ echiche ndị na-ekwesịghị ekwesị banyere onwe gị n’uche gị. Jiri mmehie ihe gị mere ihe ọchị. E kwuwerị, e nwere “mgbe ịchị ọchị.” (Eklisiastis 3:4) Chetakwa na Jehova adịghị akwado okwu mkparị—ọbụna mgbe anyị gwara ya onwe anyị.—Ndị Efesọs 4:31.

Kama ịdị na-akatọ onwe gị mgbe nile, tinye ihe e kwuru n’Ilu 11:17 n’ọrụ: “Onye na-emeso mkpụrụ obi ya ezi ihe ka onye ebere bụ: ma onye na-emekpa anụ ahụ́ nke aka ya ahụ́ ka onye na-enweghị obi ebere bụ.” Ya mere, chebara ajụjụ a echiche, Isetịpụrụ onwe gị ụkpụrụ ndị dị elu gabiga ókè, ò mewo ka ọ dịrị gị mfe inwe ndị enyi? Ma eleghị anya o mebeghị. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na ị jụwo ụfọdụ ndị n’ihi na ha adịghị eme ihe n’ụzọ zuru okè. Ya mere, gịnị ka ị pụrụ ime?

Tinye iwu ahụ Bible nyere n’ọrụ: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Ee, site n’iji ezi uche eme ihe karị n’ihe ị na-atụ anya ya n’aka ndị ọzọ, ị ga-eme ka o kwe omume karị inweta ọṅụ nke inwe ndị enyi!

Ma, ị pụrụ iche, sị, ‘Gịnị mere ndị ọzọ ga-eji na-ezere m n’ihi àgwà m nke ịchọkarị izu okè?’ Tụlee mmetụta ọ na-enwe n’ahụ́ ndị ọzọ mgbe ị na-ekwupụta oké ihe ndị ị na-atụ anya ha n’aka onwe gị. Akwụkwọ bụ́ When Perfect Isn’t Good Enough na-akọwa, sị: ‘Ime oké mkpesa mgbe ọ bụla i nwetara akara na-erughị akara ị tụrụ anya ya n’ule pụrụ ịbụ mkparị nye ndị enyi gị, bụ́ ndị na-aghaghị ịgbalịsi ike inweta akara i nwetara.’ Ya mere, gbalịsie ike ibelata ịdị na-ekwu okwu na-akụda mmụọ na ịdị na-eche nanị maka onwe gị. Ndị mmadụ ga na-enwe mmasị karị ka gị na ha na-anọ.

Carly na-eto eto chịkọtara okwu ahụ ọnụ mgbe ọ sịrị: “N’ụzọ bụ́ isi, ana m asị àgwà nke ịchọkarị izu okè m ka o nye m ohere.” Olee ụzọ ị pụrụ isi mee nke a? Tụgharịa uche n’otú Chineke si ele ihe anya. Ọ bụrụ na ọ ka na-esiri gị ike ịchịkwa otú i si eche echiche n’akụkụ a, soro ndị mụrụ gị ma ọ bụ Onye Kraịst tozuru okè nke nọ n’ọgbakọ unu kwurịta ya. Kpegara Chineke ekpere ma rịọ ya ka o nyere gị aka ịgbanwe echiche gị. Ekpere pụrụ ịbụ ngwá ọgụ dị ike iji lụsoo àgwà ịchọkarị izu okè ọgụ.—Abụ Ọma 55:22; Ndị Filipaị 4:6, 7.

Na-echeta mgbe nile na Jehova adịghị achọ izu okè; nanị ihe ọ na-atụ anya ya n’aka anyị bụ ka anyị kwesị ntụkwasị obi nye ya. (1 Ndị Kọrint 4:2) Ọ bụrụ na ị na-agbalịsi ike ikwesị ntụkwasị obi, ị pụrụ inwe obi ụtọ n’ezie banyere ụdị onye ị bụ—ọ bụ ezie na ị dịghị emeta ihe nile n’ụzọ zuru okè.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

[Foto dị na peeji nke 21]

Ụjọ ịkụ afọ n’ala pụrụ ime gị ka ị ghara ịdị na-eme ihe ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 22]

Ịgbalị ịmụta ihe ndị ọhụrụ pụrụ inyere gị aka ime ihe banyere ihie ụzọ gị