Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnwere Onwe Pụọ ná Nsogbu nke Iji Ike Emegbu Mmadụ

Nnwere Onwe Pụọ ná Nsogbu nke Iji Ike Emegbu Mmadụ

 Nnwere Onwe Pụọ ná Nsogbu nke Iji Ike Emegbu Mmadụ

‘Iji ike emegbu mmadụ bụ àgwà a na-amụta amụta, a pụkwara ịkwụsị àgwà ọ bụla a mụtara amụta.’—Dr. C. Sally Murphy.

ENYEMAKA dị ma onye na-eji ike ya emegbu mmadụ ma onye ọ na-emegbu mkpa. Ọ dị onye na-emegbu mmadụ mkpa ịmụta imeso ya ihe n’ejighị ike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ dịkwa onye a na-emegbu mkpa ịma ụzọ ụfọdụ dị irè isi na-anagide nsogbu ahụ.

Mgbe mgbe, onye na-eji ike ya emegbu mmadụ adịghị ama ụzọ ọ ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe, ọ dịghịkwa aghọta mmetụta nke ndị ọ na-amaja. Ọ dị mkpa ileru anya n’ihe ọ na-eme ma kụziere ya ikwurịta okwu nke ọma. Akwụkwọ bụ́ Take Action Against Bullying na-ekwu, sị: “Ọ gwụla ma ndị na-emegbu mmadụ hà mụtara ma na-agbaso akparamàgwà ndị ọhụrụ, ha ga-anọgide na-emegbu mmadụ ná ndụ ha nile. Ha na-eji ike ha emegbu di ma ọ bụ nwunye ha, ụmụ ha, na ikekwe ndị ha ka n’ọkwá n’ebe ha na-arụ ọrụ.”

Nyere Ha Aka Ịghara Ịbụ Ndị Na-eji Ike Emegbu Mmadụ

Ịzụ ụmụaka ka ha na-enwe mmetụta ọmịiko mgbe ha ka dị obere pụrụ inye aka mee ka ha ghara ịghọ ndị ji ike ha emegbu mmadụ. Ndị ọkà nkụzi nọ ná mba ụfọdụ na-enye ụdị ọzụzụ ọgbara ọhụrụ a na-akpọ ọzụzụ maka inwe mmetụta ọmịiko. Nzube e ji enye ọzụzụ ahụ bụ ịkụziri ụmụ akwụkwọ ndị dị afọ ise ịghọta mmetụta nke ndị ọzọ na iji obiọma na-emeso ha ihe. Ọ bụ ezie na ihe ndekọ e nwere banyere uru na-adịte  aka ọ ga-enwe ebubeghị ibu, ihe ndị si na ya pụta ná mmalite na-enye echiche na ndị nwetarala ọzụzụ ahụ adịchaghị eme ihe ike ike otú ndị na-enwetaghị ya si eme.

Dị ka onye bụ́ nne ma ọ bụ nna, i kwesịghị ịhapụchara ndị nkụzi ọzụzụ dị otú ahụ. Ọ bụrụ na ị chọghị ka nwa gị ghọọ onye ji ike ya emegbu ndị ọzọ, ọ dị gị mkpa iji okwu ọnụ na omume na-akụziri ya otú ọ ga-esi na-asọpụrụ ma na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Gịnị pụrụ inyere gị aka? Ikekwe, i nwere otu ihe magburu onwe ya bụ́ nke a na-ejichaghị akpọrọ ihe bụ́ ebe e si enweta ụdị ọzụzụ a—Okwu Chineke, bụ́ Bible. Olee otú ọ pụrụ isi nye aka?

Otu ihe bụ na ọ na-akụziri anyị n’ụzọ doro anya otú Chineke si ele iji ike emegbu ndị ọzọ anya. Ọ kpọrọ ya asị! Bible na-ekwu banyere Chineke, sị: “Onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) Ọzọkwa, Chineke na-ahụ ihe na-emenụ. N’ime Bible, e dekọrọ na o chegharịrị uche ya, ma ọ bụ nwee mwute, n’ihi ụmụ Izrel mgbe ha nọ na-ata ahụhụ “n’ihi ịsụ ude ha n’ihu ndị na-emegbu ha na-akpagbukwa ha.” (Ndị Ikpe 2:18) Ọtụtụ ugboro, Chineke nyere ndị ji ike ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma megbuo ndị na-adịghị ike na ndị na-apụghị ịzọ onwe ha, ntaramahụhụ.—Ọpụpụ 22:22-24.

N’ime Bible, e nwekwara ihe pụrụ ịbụ ozizi a kasị mara amara e zitụrụla banyere ụzọ e si egosipụta mmetụta ọmịiko. Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ịkụziri ụmụaka ịnakwere Ụkpụrụ Ọma ahụ—inwe mmasị na ya na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya—adịghị mfe; ọ na-achọ isetịpụ ezi ihe nlereanya, nnọgidesi ike, na ịrụsi ọrụ ike, karịsịa ebe ọ bụ na ụmụaka bu àgwà nke iche nanị banyere onwe ha pụta ụwa. Ma mgbalị nile dị otú ahụ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ụmụ gị amụta inwe obiọma na mmetụta ọmịiko, ọ gatụghị amasị ha iji ike ha megbuo ndị ọzọ.

Enyemaka Maka Ndị E Ji Ike Emegbu

Ndị e ji ike emegbu, karịsịa ndị na-eto eto, na-eche ihe ịma aka tara akpụ ihu—ihe ịma aka nke iche echiche nke ọma mgbe ha nọ ná nrụgide. Mgbe mmadụ na-emegbu gị, ma eleghị anya ihe ọ na-achọ bụ ime ka obi koro gị n’elu. Ọ na-atụ anya na ị ga-ewebiga iwe ókè ma ọ bụ gosi na ụjọ ji gị. Ọ bụrụ na i wee iwe ọkụ ma ọ bụ malite ibe ákwá ma gosipụta na o wutere gị ma ọ bụ na ụjọ na-atụ gị, onye ahụ na-emegbu gị na-enweta ihe ọ chọrọ. N’ihi ya, ọ pụrụ ịnwa ịkpali gị ime otu ihe ahụ ugboro ugboro.

Gịnị ka ị pụrụ ime? Tụlee aro ndị na-esonụ. Ọ bụ ndị na-eto eto ka e bu n’obi n’ụzọ bụ́ isi tụọ aro ndị a, ma ụkpụrụ ndị dị na ha pụkwara ịbara ndị toruworo ogo mmadụ bụ́ ndị e ji ike emegbu, uru.

 Ewela iwe. Enwela ọnụma. Bible na-adụ ọdụ n’ụzọ amamihe dị na ya, sị: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma.” (Abụ Ọma 37:8) Mgbe ị na-achịkwalighị iwe gị, ị na-eme ka onye na-emegbu gị na-achịkwa gị, o yikwara ka ị̀ ga-eme ihe ị ga-emesị kwaa ụta maka ya.—Ilu 25:28.

Gbalịa ka ị ghara ichewe banyere imegwara. Mgbe mgbe, mmegwara na-arụpụta ihe dị iche n’ihe e bu n’uche mee ya. Otú o sina dị, imegwara ihe adịghị eme ka obi jụrụ mmadụ n’ezie. Otu nwa agbọghọ bụ́ onye ndị ntorobịa ise kụrụ ihe mgbe ọ dị afọ 16, na-echeta, sị: “Ekpebiri m n’obi m, sị, ‘Aga m emegwara ha.’ N’ihi ya, ndị enyi m nyeere m aka, m wee megwara mmadụ abụọ n’ime ndị ahụ kụrụ m ihe.” Gịnị si na ya pụta? “Ọ bịara dị m ka abaghịzi m n’ihe,” ka ọ na-ekwu. Omume ya bịakwara ka njọ ka e mesịrị. Cheta okwu Bible amamihe dị na ya bụ́: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:17.

Mgbe o yiri ka ihe o biriwela ọkụ, pụọ ngwa ngwa. Bible na-ekwu, sị: “Tupu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ya.” (Ilu 17:14) Isi ihe a na-ekwu bụ gbalịa izere ndị na-eji ike ha emegbu ndị ọzọ. Ilu 22:3 na-ekwu, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nhá.”

Ọ bụrụ na mmadụ anọgide na-emegbu gị, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i jiri ọnụ gị gwa ya obi gị. Họrọ oge obi ruru gị ala, legide onye ahụ na-emegbu gị anya ná mkpụrụ anya, ma jiri olu dịtụ ala gwa ya okwu n’atụghị egwu. Gwa ya na ihe ọ na-eme gị adịghị amasị gị —na ọ dịghị atọ gị ọchị nakwa na ọ na-ewe gị iwe. Akparịla ya ma ọ bụ maa ya aka.—Ilu 15:1.

Kọọrọ okenye maara nke a na-akọ ma na-eche echiche ọma banyere gị mmegbu ahụ e ji ike emegbu gị. Kpọọ okwu aha mgbe ị na-akọrọ ya nsogbu ahụ, ma rịọ ya ka o nyere gị aka n’idozi ya. Mee otu ihe ahụ mgbe ị na-ekpeku Chineke ekpere, ị pụkwara isi na ya nweta enyemaka na nkasi obi dị ukwuu.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:17.

Cheta na ị bara uru dị ka mmadụ. Onye ahụ na-emegbu gị pụrụ ịchọ ka i chee na ọ dịghị uru ị bara, na e kwesịrị ka e mekpọọ gị ọnụ. Ma ọ bụghị ya bụ onyeikpe gị. Chineke bụ onyeikpe gị, ọ na-elekwasịkwa anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị na-emezi emezi. Ọ bụ onye ahụ na-emegbu gị bụ onye na-adịchaghịzi uru ọ bara n’ihi omume dị otú ahụ ọ na-eme.

Ndị Nne na Nna—Chebenụ Ụmụ Unu

Ndị nne na nna n’onwe ha pụkwara ịmalite n’oge ịkwadebe ụmụ ha iji amamihe na-anagide ndị ji ike ha emegbu mmadụ. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ iso ụmụ ha mee ihe ngosi iji gosi otú nwatakịrị pụrụ isi gosipụta obi ike.

Ọbụna otú mmadụ si kwụrụ—iguzo kwem—pụrụ igosi ụfọdụ ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ na obi kara ya, bụ́ nke pụrụ ime ka ha gbanwee obi ha. Ilegide mmadụ anya ná mkpụrụ anya, ịwụsa aka awụsa, na iji olu dịtụ ala kwuo okwu n’atụghị egwu pụkwara inye aka. A na-agba ndị nne na nna ume ịkụziri ụmụ ha isi ebe ahụ pụọ, izere ndị ji ike emegbu ha, na ịrịọ okenye a tụkwasịrị obi, dị ka onye nkụzi, ka o nyere ha aka.

A na-amalite ịhụ na a kwụsịrị àgwà nke iji ike emegbu ndị ọzọ site n’inye ezinụlọ ọzụzụ. Ndị nne na nna bụ́ ndị na-ewepụta oge iji soro ụmụ ha nọkọọ, jiri ndidi na mmetụta ọmịiko na-ege ntị mgbe ha na-akọ nchegbu ha, na-eme ka ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị dị mkpa, ndị a na-akwado, na ndị a hụrụ n’anya. Ọtụtụ ndị ọkachamara banyere ịzụ ụmụ na nsogbu nke ndị na-eto eto na-agba ndị mụrụ ụmụ ume ka ha nyere ụmụ ha aka ịdị na-enwe echiche ziri ezi banyere onwe ha. Echiche dị otú ahụ kwesịrị ekwesị na-eme ka ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ ghara ịdị na-ele ha anya dị ka anụ oriri.

Ma nanị ikwu okwu ezughị. Ọ dị onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ mkpa ịmụta ịsọpụrụ ndị ọzọ na ịkwanyere ha ùgwù nakwa ịzụlite mmetụta ọmịiko. Ya mere, anabatala àgwà ọ bụla na-egosi iji ike emegbu mmadụ n’ime ezinụlọ gị. Mee ka ụlọ gị bụrụ ebe dị nchebe, nke nsọpụrụ na ịhụnanya jupụtara na ya.

Njedebe nke Iji Ike Emegbu Ndị Ọzọ

“Mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Otú ahụ ka Bible si chịkọta akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. N’ezie, ihe a kpọrọ mmadụ anọgidewo bụrụ ndị e ji ike emegbu ruo ọtụtụ puku afọ. Otu onye so dee Bible kwuru, sị: “Mụ onwe m wee laghachi hụ mmegbu nile a na-emegbu n’okpuru anyanwụ: ma, lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.”—Eklisiastis 4:1.

Otú ọ dị, Chineke na-ahụ n’ezie mmegbu nile a na-emegbu ndị mmadụ n’ụwa, ọ na-emetekwara ndị a na-emegbu ebere. Ma ọ̀ dị ihe ọ bụla ọ ga-eme banyere ya? Ee, ọ dị! Rịba ama nkwa ya nke dị na Maịka 4:4: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi [vaịn] ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”

Chegodị echiche ihe ụwa ga-adị ka ya mgbe a ga-emezu nkwa ahụ. Ọ dịghị onye ga-eme ka ndị ọzọ maa jijiji n’ụjọ—a gaghị enwe ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ! Nke ahụ ọ́ dịghị amasị gị? Ma Chineke emewo ihe karịrị ikwe nkwa maka ọdịnihu dị otú ahụ. Ugbu a kpọmkwem, ọrụ nkụzi Bible nke bara uru nke ukwuu na-aga n’ihu n’ụwa nile. Ihe ndị dị mma si na ya apụta. A na-akụziri ndị na-ekere òkè na ya ịgbanwe àgwà ime ihe ike ike ha, ime ka ha na ibe ha nọgide na-adị n’udo, na ịsọpụrụ ndị ọzọ ma na-akwanyere ha ùgwù. (Ndị Efesọs 4:22-24) N’isi nso, mmetụta izi ihe a bụ́ ịgba na-enwe n’ahụ́ ndị mmadụ ga-ezu ụwa nile, mmegbu agaghịzikwa adị. Nkwa Chineke ndị e dekọrọ na Bible ga-emezu. Onye ọ bụla nke ga-adị ndụ n’oge ahụ ga-ebi n’ụwa nke ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ na-agaghị anọ!

[Foto dị na peeji nke 16]

Isi n’ebe onye na-eji ike ya emegbu mmadụ nọ pụọ abụghị ihe ihere

[Foto dị na peeji nke 17]

N’ezinụlọ ihe na-agazi agazi na ya, a na-akụziri ụmụaka ịnagide ụdị nile nke iji ike emegbu mmadụ

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Kụziere ụmụ gị iji ọnụ ha na-ekwu obi ha n’atụghị egwu ma na-eji akọ ekwu ya