Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpịsị Osisi nke Na-eme Ka Ezé Dị Ọcha

Mkpịsị Osisi nke Na-eme Ka Ezé Dị Ọcha

 Mkpịsị Osisi nke Na-eme Ka Ezé Dị Ọcha

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA ZAMBIA

AFRICA—kọntinent nke ndị bi na ya nwere ezé mara mma ma brọsh ịsa ezé ndị a na-emepụta ma na-ere na ya dị ole na ole! Ò si aṅaa dị otú ahụ? N’ebe ọtụtụ nọ, ihe na-eme ka ezé ha na-egbuke egbuke ma ọ bụrụ na ha achịa ọchị bụdị mkpịsị osisi nkịtị—atụ!

Ọ dị mgbe ndị Babilọn na-ata atụ, e mesịakwa, ndị Ijipt, Gris, na Rom tawara atụ. E jikwa obere osisi a e ji emere “brọsh ịsa ezé” mee ihe n’ebe nile n’Arebia n’oge Okpukpe Alakụba na-abatabeghị na ya. N’ihe dị ka afọ 300 gara aga, ndị Europe kwụsịrị inwe mmasị n’ịta atụ, n’agbanyeghị nke ahụ, a ka na-ata ya nnọọ n’akụkụ dị iche iche nke Africa, Eshia, nakwa n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.

Osisi a na-esikarị na ya enweta atụ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ saltbush. N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, a na-esi n’osisi oroma nkịrịsị nakwa n’osisi oroma nkịtị enweta atụ, ebe a na-eji osisi dogon yaro emere atụ n’ala India, bụ́ ebe fọrọ obere ka o ruo otu kọntinent. N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, ọ fọrọ nke nta ka osisi na akụ́kụ́ ndị e si na ha enweta atụ ruo 300. Olee otú atụ na-esi eme ka ezé dị ọcha?

Ka a na-atari osisi ahụ, isi ya na-abịa yie “brọsh” dị jagajaga. A nọgide na-ata ya, ọ na-ewepụ irighiri ihe ndị kpafanyere n’ezé ma mee ka ọbara na-agazu n’agbụ̀. Ịta atụ na-emekwa ka asọ mmiri na-agbapụtakwu, bụ́ nke na-arụ ọrụ dị ka ihe nsacha ọnụ e bu pụta ụwa, nke na-asapụ nje bacteria ma na-eme ka ọnụ ghara ịdịrị ha mma maka ịnọ na ya mụbaa. *

Ma atụ na-arụ ọrụ dị ka brọsh, ọ na-arụkwa ọrụ ndị ọzọ. Alaka na mkpọrọgwụ osisi ụfọdụ nwere mmiri ọgwụ ndị na-eme ka ezé ghara ire ngwa ngwa. E gosiwo na ihe ndị e nwetara n’osisi atụ ụfọdụ nwere ihe ndị na-egbu nje bacteria na nje fungus. Alaka osisi atụ ahụ a kpọtụrụ aha na mbụ, pụrụ ọbụna inye aka gbochie ọnyá afọ. Na Namibia, atụ ndị e nwetara n’osisi a na-akpọ muthala na-eme ka nje ndị na-akpata ezé ure, ọrịa agbụ̀, na ọnyá akpịrị ghara ịmụba. Ihe a sitere n’okike nke e ji eme ka ezé dị ọcha pụrụ ime ka ezé ghara ịkpọpu akpọpu ma meekwa ka úkwù ezé na agbụ̀ sikwuo ike. Ụlọ ọrụ ụfọdụ na-emepụtazi ihe e ji asa ezé bụ́ ndị nwere ihe ụfọdụ e nwetara n’ụdị osisi ndị dị otú ahụ.

N’ezie, ụfọdụ ndị na-ahọrọ iji brọsh ịsa ezé asa ezé ha. Ma ị̀ họọrọ iji nke ahụ ma ọ bụ ịta atụ dị ka ndị oge ochie mere, otu ihe doro anya: Idebe ezé ọcha bụ akụkụ dị mkpa nke mmadụ ilekọta ahụ́ ike ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 N’eziokwu, nri dịkwa mkpa. Ndị bi n’ime ime obodo ndị dị n’Africa na-erikarị nri ndị a na-ewepụghị ihe ọ bụla na ha nakwa akwụkwọ nri karịa ndị ibe ha bi n’ebe ndị mepere emepe. Ha adịghịkwa erikarị nri ndị shuga dị na ha, nri ndị e wepụrụ ihe na ha, na mmanya ọtọ bịrịbịrị—ihe ndị a ma na-akpata ezé ure.

[Foto dị na peeji nke 29]

Dogon yaro bụ otu n’ime osisi ndị e si enweta atụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

William M. Ciesla, Forest Health Management International, www.forestryimages.org