Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbanwe Ejiji Na-agbanwe

Mgbanwe Ejiji Na-agbanwe

 Mgbanwe Ejiji Na-agbanwe

MA ÀNYỊ ma ma ọ bụ na anyị amaghị, ejiji na-ewunụ na-emetụta, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ, mkpebi ndị anyị na-eme kwa ụbọchị banyere ihe ndị anyị ga-eyi. Mee elu mee ala, mmetụta dị ike nke ejiji na-ewunụ na-enwe na-ekpebi n’ụzọ dị ukwuu ụdị uwe ga-adị n’ahịa.

Ọbụna ụdị uwe ndị anyị na-ejighịzi akpọrọ ihe ugbu a nwere oge ha na-ewu ewu. Dị ka ihe atụ, uwe ụmụ nwoke na-eyi akpọ taị nakwa taị n’onwe ya, ghọrọ ejiji na-ewu nnọọ ewu kemgbe ihe karịrị otu narị afọ gara aga. Uwe oyi ụmụ nwanyị ghọkwara ihe wuru ewu laa azụ n’afọ ndị 1920.

Ọchịchọ abụọ bụ́ isi na-eme ka ọrụ imepụta ejiji na-aga aga—ọchịchọ maka ihe ọhụrụ na ọchịchọ nke iso biri. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-enwe mmasị iyi uwe ọhụrụ. Ọ bụ ya mere mgbe ụfọdụ, anyị na-azụ uwe ndị ọhụrụ, ọ bụghị n’ihi na nke anyị nwere enwe akaala, kama ọ bụ nanị n’ihi na anyị chọrọ ime mgbanwe. E wezụga nke ahụ, anyị adịghị achọ iyi uwe na-ekwesịghị ekwesị, n’ihi ya, anyị na-azụrụ uwe ndị yiri n’ókè ụfọdụ ụdị nke ndị anyị na ha na-akpakọrịta na-eyi. Eri ọtụtụ narị afọ, ndị na-emepụta ejiji emejụwo ọchịchọ maka ihe ọhụrụ nakwa ọchịchọ nke iso biri—mgbe ụfọdụkwa, ha ejiwo ha mee ihe maka uru nke onwe ha.

Akụkọ Dị Mkpirikpi Banyere Otú E Si Emepụta Ya

Iji mepụta otu ụdị ejiji, ọ dị ụzọ ihe ise bụ́ isi ndị na-emepụta ejiji na-elekwasị anya: àgwà, otú ákwà ga-adị ma a kwachaa ya, otú a ga-esi pịa ákwà ma a kwawa ya, ọdịdị ya, na otú akara ya ga-esi kwekọọ n’akụkụ ya nile ma a kwachaa ya. Nhọrọ ndị na-emepụta ejiji na ndị na-akwa ákwà nwere n’ụzọ ihe ise a amụbaala n’afọ ndị gafeworonụ. Dị ka ihe atụ, n’Ijipt oge ochie, a họọrọ ákwà linin ndị na-ahụ ụzọ, bụ́ ndị e mepụtara ná mba ahụ, dị ka ndị kasị mma, o kwesịkwara ekwesị maka ebe na-ekpo ọkụ. Ma ebe ọ bụ na ọ naghị adị mfe isiji ákwà linin esiji, ọ na-enwekarị nanị otu àgwà—a na-eme ka ọ chaa ọcha. Ma, ndị Ijipt na-emepụta ejiji na-asụ̀ ákwà ha àsụ̀ iji mee ka ọ dị mma n’anya ma a kwachaa ya. E si otú ahụ mepụta otu n’ime ụdị ejiji ndị kasị nọtee aka n’ụwa.

Ka ọ na-erule na narị afọ mbụ O.A., a bịara nwee ákwà ndị ọhụrụ na àgwà ndị ọhụrụ. Ndị Rom bụ́ ndị aka ji akụ̀ si na China ma ọ bụ n’India na-atụbata ákwà silk, n’agbanyeghị na ihe a na-emefu iji bubata ya mere ka ákwà silk e kwere ekwe daa ọnụ ka ọlaedo. Ákwà ọzọ wuru ewu bụ nke e ji ajị anụ e sijiri esiji nke si Taịa mee, nke otu kilogram ya pụrụ ịda denarius 2,000—ụgwọ ọrụ afọ isii nke onye na-akpata afọ ya. Ihe ọhụrụ ndị e ji esiji ákwà na ákwà ndị ọhụrụ e nwere mere ka ndị inyom Rom bụ́ ndị aka ji akụ̀ nwee ike ịdị na-eyi stola—uwe elu dị ogologo ma dị owoghoro—nke ihe e ji mee ha bụ ogho na-acha anụnụ anụnụ e nwetara n’India ma ọ bụ ikekwe ákwà silk na-acha odo odo e nwetara na China.

Ọ bụ ezie na ụdị ejiji ndị ọhụrụ na-apụta site n’oge ruo n’oge, n’ọgbọ ndị gara aga, uwe dara oké ọnụ pụrụ iwu ewu n’afọ ndụ nile. Mgbanwe ndị a na-enwe na-abịa nwayọọ nwayọọ, ọ na-abụkarịkwa nanị ndị a ma ama ka ọ na-agbasa. Otú ọ dị, mgbe a  bịara nwee mgbanwe n’usoro mmepụta ihe, ejiji malitere ịgbasa ndị nkịtị karị.

N’ime narị afọ nke 19, a bịara nwee ụlọ ọrụ ndị ọrụ ha bụ imepụta ákwà maka ndị ọgaranya nakwa ndị ogbenye. Ụlọ ọrụ ndị na-eji ígwè ọrụ emepụta ákwà ogho na ndị e ji ajị anụ mee mụbara, ọnụ ahịa ákwà dalatakwara. N’ihi inwe ígwè ndị e ji akwa ákwà, a pụrụ imepụta uwe n’ọnụ ego dị ala karị, ihe ọhụrụ ndị e ji esiji ákwà, bụ́ ndị mmadụ mere, mekwara ka e nwekwuo àgwà dị iche iche a pụrụ ịhọrọ.

Mgbanwe ndị e nwere n’etiti ọha mmadụ nakwa na nkà na ụzụ keere ọbụna òkè ka ukwuu n’ime ka ọha mmadụ nwee ihe ndị ha ga na-eyi. N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe nakwa n’Ebe Ugwu America, ndị mmadụ nwere ego ka ukwuu ha ga na-emefu. N’afọ ndị 1850, a bịara nwee magazin ndị na-akọ banyere ndị inyom, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, a malitere ikowe uwe ndị a kwarala akwa hà otú kwesịrị ekwesi ná nnukwu ụlọ ahịa dị iche iche. Na narị afọ nke 19 kwa, Charles Frederick Worth mere ka e nwee ebe ngosi ejiji, na-eji ndị mmadụ egosi ụdị ejiji dị iche iche iji kpalie mmasị nke ndị ga-achọ ịzụ ha.

Na narị afọ nke 20, eri ndị ọhụrụ mmadụ mere, dị ka rayon, nylon, na polyester, mere ka ndị na-emepụta ákwà nwee ike imepụta ụdị ákwà dịgasị iche iche. Ụkpụrụ ejiji ndị e ji kọmputa see mere ka ọ dị mfe imepụta ụdị ejiji ndị ọhụrụ, n’ihi ijikọ ụwa ọnụ, ejiji ndị ọhụrụ pụkwara ịpụta na Tokyo, New York, Paris, na São Paulo n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’otu oge. Ka ọ dịgodị, ndị na-atụpụta ụkpụrụ ejiji na ndị na-emepụta ejiji achọpụtawo ụzọ ndị ọhụrụ ha ga-esi na-akwalite ngwá ahịa ha.

Taa, kama ịbụ ndị aka ji akụ̀, ọ bụzi ndị na-eto eto ka ejiji kasị echu ụra. Ọtụtụ nde n’ime ha na-azụ uwe ọhụrụ kwa ọnwa, ụlọ ọrụ na-emepụta uwe na-emepụtakwa uwe ruru ọtụtụ narị ijeri dollar kwa afọ. * Ma è nwere ọnyà ndị dị na ya?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 N’otu afọ na-adịbeghị anya, e mere atụmatụ na ọnụ ahịa uwe ndị e mepụtara n’otu afọ ahụ dị ijeri dollar 335.

 [Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Ndị Na-eme Ka Ejiji Na-ewu Ewu

Ruo ọtụtụ narị afọ, ọ bụ ndị eze na ndị a ma ama na-esetịpụ ụkpụrụ a ga-agbaso n’ihe banyere ejiji. Na narị afọ nke 17, Eze Louis nke Iri na Atọ nke France kpebiri ikpu wig iji kpuchie isi nkwọcha ya. N’oge na-adịghị anya, ndị a ma ama na Europe nọ na-akpụchasị ntutu ha ma malite ikpu wig—ụdị ejiji wugidere gafee otu narị afọ.

Na narị afọ nke 19, magazin ndị na-ekwu banyere ndị inyom kpọsara ụdị ejiji ọhụrụ e nwere, ọbụna sepụtakwa ụkpụrụ uwe ndị na-adịghị oké ọnụ iji mee ka ndị inyom nwee ike ịkwara onwe ha uwe. Na narị afọ nke 20, ka ihe nkiri sịnịma na telivishọn bịara bụrụ nke na-ewu ewu, ndị a ma ama na-eme ihe nkiri ghọrọ ndị a na-asọpụrụ ná mba nile, ha guzobekwara ụkpụrụ dị iche iche nke iji ejiji. Ndị oti egwú a ma ama malitekwara iji ejiji ndị gbapụrụ nnọọ iche, bụ́ ndị ọtụtụ ndị ntorobịa na-egbughị oge n’iṅomi. Taa, ihe agbanwebeghị hie nne ka ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-eji ngosi ejiji, magazin ndị na-egbuke egbuke, bọọdụ mkpọsa, windo ụlọ ahịa, na mkpọsa ngwá ahịa telivishọn eme ihe n’ụzọ dị irè iji mee ka ndị mmadụ chọọ ịzụ uwe ndị ọhụrụ.

[Foto]

Eze Louis nke Iri na Atọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ The Historian’s History of the World

[Foto dị na peeji nke 4]

Ákwà linin Ijipt a so n’otu n’ime ejiji ndị kasị wutee aka

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto e sere site n’ikike nke British Museum

[Foto dị na peeji nke 4]

Na Rom oge ochie, ndị inyom yiri uwe “stola”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ Historia del Traje, 1917

[Foto dị na peeji nke 4, 5]

Ejiji bụ́ “kimono” adịwo adị kemgbe ihe dị ka afọ 650 O.A.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ akụkọ bụ́ La Ilustración Artística, Mpịakọta nke Iri, 1891

[Foto dị na peeji nke 5]

N’ọgbọ ndị gara aga, uwe ndị dara oké ọnụ pụrụ iwu ewu n’afọ ndụ nile

[Ebe E Si Nweta Foto]

EclectiCollections

[Foto dị na peeji nke 5]

Mgbanwe e nwere ná mmepụta ihe mere ka o kwe ndị nkịtị mee iji ejiji kpọrọ ihe

[Ebe E Si Nweta Foto]

EclectiCollections