Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ile Ejiji Anya n’Ụzọ Ziri Ezi

Ile Ejiji Anya n’Ụzọ Ziri Ezi

 Ile Ejiji Anya n’Ụzọ Ziri Ezi

BIBLE na-ekwu na “ihe nile ọ bụla ka [Chineke] meworo ka ọ maa mma na mgbe ya.” (Eklisiastis 3:1) Anyị na-ahụ ihe ndị mara mma n’ebe nile n’ụwa anyị nọ n’ime ya. Anyị na-ahụkwa ya n’ụmụ mmadụ.

Onye na-emepụta ejiji na-achọ ime ka anyị makwuo mma site n’uwe ndị anyị na-eyi. Ma, dị ka e gosiri n’isiokwu bu ụzọ, ndị na-emepụta ejiji agbanwewokwa echiche ndị mmadụ nwere banyere ihe mara mma. Onye prọfesọ n’ịmụ akparamàgwà mmadụ, bụ́ Ruth Striegel-Moore na-ekwu, sị: “Ọ marawo anyị nnọọ ahụ́ ịhụ ụmụ nwanyị dị nnọọ gịrịgịrị, anyị echewaziela na ọ bụ ya bụ ịma mma.”

N’ụzọ doro anya, ọ ga-abụ nzuzu ikwe ka echiche ụwa nwere ugbu a banyere ihe mara mma manye anyị iso ha na-eme otú ha si eme. N’akwụkwọ ya bụ́ Always in Style, Doris Pooser na-arụtụ aka na “ọ dịghị nwanyị mkpa taa ịgbanwe ma ọ bụ imegharị ọdịdị ahụ́ ya mgbe ọ bụla e nwere echiche  ọhụrụ banyere ọdịdị ahụ́ ‘bụ́ ịgba.’” N’ezie, gịnị mere anyị ga-eji kwe ka usoro mgbasa ozi manye anyị ịgbaso echiche nke ha? “Lee nnọọ ka ọ ga-esi kara anyị mfe inwe afọ ojuju banyere ọdịdị anyị, kama ịgbalịsiwa ike ịgbanwe ọdịdị ahụ́ anyị,” ka Pooser na-ekwu.

Mma Na-anaghị Emebi Emebi

Inwe obi ike n’ebe gị onwe gị nọ na inwe afọ ojuju ná ndụ dabeere nnọọ n’ihe karịrị ịdị mma n’ile anya. “Ezi obi ụtọ na-esite n’obi,” ka Judy Sargent, bụ́ onye nweburu nsogbu nke erighị ihe nke ọma n’ihi ịtụ ụjọ ibu ibu, na-ekwu. “A pụghị inweta ya site n’ọdịdị ahụ́ mmadụ.” Bible kwuru okwu n’ụzọ sakwuru mbara banyere nke ahụ. “Ka ịchọ mma ụnụ,” ka Pita onyeozi dere, “bụrụ mma nke omume ọma nke si n’ebe nzuzo nke obi unu pụta. Meenụ ka ọ bụrụ mma nke ọla oke ọnụahịa, nke na-anaghị emebi emebi, nke bụ mmụọ dị nwayọọ na nke udo. Nke dị oké ọnụ n’anya Chineke.”—1 Pita 3:4, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

Mma na-anaghị emebi emebi nke Pita na-ezo aka na ya karịrị mma elu ahụ́ n’ihi na ọ bụ nke na-adịgide adịgide, bụrụkwa nke dị oké ọnụ n’anya Chineke. Ọtụtụ narị afọ gara aga, otu eze maara ihe kwuru, sị: “Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu: ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto.”—Ilu 31:30.

Ọ bụ ezie na mma anụ ahụ́ pụrụ ịdọta mmasị taa karị, ọtụtụ ndị ka na-akwanyere onye na-egosipụta àgwà Ndị Kraịst ùgwù. Pọl onyeozi  gbara Ndị Kraịst ume, sị: “Yikwasịnụ onwe unu ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ, . . . mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:10, 12.

A ma ejiji na-ewu ewu dị ka ihe na-eme ọ pụta taa ọ laa echi. Oké ihe ụdị ejiji na-ewunụ pụrụ nnọọ ime bụ ịchọ anyị mma ruo nanị nwa oge. Ma mmetụta ọma ọ bụla anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ ga-eji ọsọ mie ala ma ọ bụrụ na àgwà anyị adịghị mma otú anyị dị n’ile anya. Cheta na “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”—gụnyere àgwà ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, ịdị mma, na njide onwe onye—adịghị ala ala ma ọlị.—Ndị Galeshia 5:22, 23; 1 Timoti 2:9, 10.

Otú ọ dị, n’eziokwu, o kwesịrị ekwesị ilebara ejiji anyị anya nke ọma. Aline, bụ́ onye si France, na-ekweta na ime ihe kwesịrị ekwesị n’akụkụ a bụụrụ ya ihe ịma aka. “Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma,” ka ọ na-ekwu, “enwere m nnọọ mmasị n’ejiji. Ọ na-abụ ọchịchọ m ịgbaso uwe ọ bụla wupụtara ọhụrụ n’ihi na ọ na-eme ka m nwee obi ike n’ebe mụ onwe m nọ. Ọ bụrụkwa na m pụrụ ịzụ uwe ndị e dere aha onye a ma ama na-emepụta ejiji, ebe ahụ ka ọ kachadịrịị mma.

“Ma mgbe m tolitere,” ka Aline gara n’ihu ikwu, “abịara m mụta iji ego m kpatara egbo mkpa m, amalitekwara m iji ihe ka ukwuu n’oge m nwere na-eje ozi Ndị Kraịst. Aghọtara m na ọ bụrụ na m chọrọ ịdị na-ekowe akpa m ebe aka m ga-eru, apụghịzi m ịnọgide na-achụso ejiji ọ bụla pụtara ọhụrụ. Amalitere m ịzụ uwe mgbe ha dị ọnụ ala ma ọ bụ ịzụ ha n’aka ndị mgbuka. Achọpụtara m na m ka nwere ike iji ejiji dị mma—ma, ọ bụ n’ọnụ ego dị nnọọ ala. Ihe ga-eme ka o kwe omume bụ ịmụta ịzụ uwe ndị ga-adị gị mma n’ahụ́, ndị a pụrụ iyi eyi, ndị kwekọrọ ná ndị i nwere enwe, ma bụrụ ndị na-agaghị ala ngwa ngwa. Kama ikwe ka ejiji ndị na-ewu ewu na-ekpebi ihe ndị m ga-azụ, ana m agbalịzi ịchọpụta ụdị ejiji ndị ga-adị m mma n’ahụ́. Agaghị m asị na adịghịzi m eji ejiji akpọrọ ihe. Ma uru m bara dị ka mmadụ dabeere n’ihe karịrị nnọọ otú m dị n’ile anya.”

N’etiti ọha mmadụ ebe a na-ejikarị ọdịdị elu ahụ́ akpọrọ ihe karịa omume, Ndị Kraịst ga-eme nke ọma iburu n’uche ihe a dị mkpa nke Bible na-echetara anyị: “Ihe ọ bụla dị n’ụwa—ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ—adịghị esite ná Nna ahụ, kama ọ na-esite n’ụwa. Ọzọkwa, ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:16, 17.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ịma mma bụ́ ezigbo ya na-esite n’omume

[Foto dị na peeji nke 10]

Họrọ uwe ndị ga-adị mma oyiyi, ndị ga-ekwekọkwa ná ndị i nwere enwe