Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ike Emegbu Mmadụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Iji Ike Emegbu Mmadụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

 Iji Ike Emegbu Mmadụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

“Ị bịa ụlọ akwụkwọ echi, anyị ga-egbu gị.”—Otu nwanyị na-akpọghị aha ya ji okwu ahụ yie nwata akwụkwọ Canada aha ya bụ Kristen egwu na fon. *

“Abụghị m onye ihe na-emetụtakarị n’ahụ́, ma o ruru n’ókè nke na achọghịzi m ịga ụlọ akwụkwọ. Afọ na-arụ m, m richaa nri ụtụtụ kwa ụbọchị, m gbọwa agbọ.”—Hiromi, bụ́ nwata akwụkwọ dị afọ iri na ụma na Japan, na-echeta ije ya na ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ.

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe gị na onye na-eji ike ya emegbu mmadụ mekọrọ ihe? Ha na ihe ka ọtụtụ n’ime anyị emekọwo ihe n’otu oge ma ọ bụ n’oge ọzọ. Ọ pụrụ ịbụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọrụ, ma ọ bụ ọbụna kpọmkwem n’ebe obibi—ebe iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi otú ahụ na-akawanye njọ n’ụbọchị ndị a. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ e dere na Britain na-eme atụmatụ na pasent 53 nke ndị toworo eto bụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha ma ọ bụkwanụ ndị enyi ha nwoke ma ọ bụ ndị enyi ha nwanyị, na-agwakasị okwu ahụ́. Ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ na ndị ha na-emegbu pụrụ ịbụ ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwanyị, ha pụkwara ịnọ n’ọkwá ọ bụla n’akụkụ ọ bụla nke ụwa.

Gịnị kpọmkwem bụ iji ike emegbu mmadụ? Ya na mmaja ma ọ bụ imenye egwu abụchaghị otu ihe. Ọ na-agụnyekarị ụmụ obere ihe e mere mmadụ ruo ogologo oge kama ịbụ ihe e mere ya otu ugboro ma ọ bụ ugboro ole na ole. Ọkà n’ịmụ akparamàgwà mmadụ, bụ́ Dan Olweus, bụ́ onye mbụ malitere iji nlezianya amụ banyere iji ike emegbu mmadụ, na-egosi ihe ndị e jikarị amata àgwà a, dị ka mmadụ ịma ụma na-eme ihe ike ike na mmadụ ime ka o doo anya na ike ya karịrị nke onye ọ na-emegbu.

Ikekwe, ọ dịghị ụzọ zuru ezu a pụrụ isi kọwaa iji ike emegbu mmadụ, ma a kpọwo ya “mmadụ ịkpachapụ nnọọ anya na-achọ imerụ onye ọzọ ahụ́ na ime ka ọ nọrọ ná nchegbu.” Ihe na-akpata nchegbu ahụ abụghị nanị ihe ahụ na-emenụ kpọmkwem kamakwa ọ bụ ụjọ a na-atụ banyere ihe pụrụ ime. Ụzọ e si eme ya pụrụ ịgụnye ịma njakịrị, oké nkatọ, mkparị, asịrị, na ịchọ ka mmadụ mee ihe ndị ọ na-agaghị emeli.—Lee igbe dị na peeji nke 4.

Ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ lekwasịrị Kristen, bụ́ onye ahụ dị afọ iri na ụma a kpọtụrụ aha ná mmalite, anya n’ihe ka ukwuu n’oge ọ na-aga akwụkwọ. N’oge ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ elementrị, ha na-anyapawa chịngọm ná ntutu isi ya, na-ama ya njakịrị maka ọdịdị ahụ́ ya, ma na-eyi egwu ịkụ ya ihe. N’oge ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ihe bịadịrị ka njọ—ruo n’ókè nke na a kpọrọ ya na fon ma yie ya egwu igbu ya. Ugbu a ọ dị afọ 18, ọ na-akwa arịrị, sị: “Ụlọ akwụkwọ bụ ebe mmadụ kwesịrị ịnọ na-amụ ihe, ọ bụghị ebe a ga na-eyi ya egwu ọnwụ ma na-amajagharị ya.”

Otu ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike uche na-ekwu, sị: “Ọ bụ ihe dị mwute a na-ahụkarị ná mmekọrịta ụmụ mmadụ. Ọ na-atọ ụfọdụ ndị ụtọ iweda ndị ọzọ ala.” Mgbe àgwà dị otú ahụ bịara ka njọ, ọ pụrụ ime ka mmadụ jiri iwe megwara,  ọbụnadị ọ pụrụ ịkpata ọdachi. Dị ka ihe atụ, a magidere otu onye e were n’ọrụ ịkwọ ụgbọala, bụ́ onye nwere nsogbu ikwu okwu, njakịrị ma jiri ike megbugide ya ruo n’ókè nke na o mesịrị gbuo mmadụ anọ n’ime ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ, ma gbagbuzie onwe ya.

Iji Ike Emegbu Mmadụ Bụ Ihe Zuru Ụwa Ọnụ

Gburugburu ụwa, a na-ahụ mmegbu n’etiti ụmụaka toruworo ịga akwụkwọ. Nnyocha e mere bụ́ nke e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ Pediatrics in Review na-egosi na na Norway, pasent 14 nke ụmụaka bụ ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ ma ọ bụ ndị e ji ike emegbu. Na Japan, pasent 15 nke ụmụ akwụkwọ praịmarị na-ekwu na a na-eji ike emegbu ha, ebe a na-ahụkarị omume ahụ n’etiti pasent 17 nke ụmụ akwụkwọ nọ n’Australia nakwa na Spen. Na Britain, otu ọkachamara na-eme atụmatụ na ụmụaka dị nde 1.3 na-emegbu ndị ọzọ.

Prọfesọ Amos Rolider nke Emek Yizre’el College nyochara ụmụ akwụkwọ dị 2,972 bụ́ ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ 21. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Jerusalem Post si kwuo, prọfesọ ahụ chọpụtara na “pasent 65 mere mkpesa na ụmụ akwụkwọ ibe ha etiwo ha aka, gbaa ha ụkwụ, nuo ha aka ma ọ bụ kpasuo ha iwe.”

Usoro ọhụrụ nke na-eji nwayọọ ebibi ihe bụ iji telifon na kọmputa ezigara mmadụ ozi iyi egwu e dere ede. Ndị ntorobịa na-emeghekwa ebe ndị ha na-edebe ihe ọmụma ndị jupụtara n’ihe ndị na-akpali ịkpọ asị n’Intanet megide onye ha na-emegbu, gụnyere ihe ọmụma ndị dịịrị nanị onye ahụ. Dị ka Dr. Wendy Craig nke Queen’s University dị na Canada si kwuo, ụdị mmegbu a “na-emetụta nwatakịrị e si otú ahụ emegbu n’ụzọ jọgburu onwe ya.”

Ebe Ọrụ

Iji ike emegbu mmadụ n’ebe ọrụ bụ otu n’ime ihe ndị kasị akpata mkpesa ndị a na-eme banyere ime ihe ike n’ebe ọrụ. N’ezie, mba ụfọdụ na-akọ na o jupụtara ebe nile karịa ịkpa ókè agbụrụ na iyi egwu mmekọahụ. Kwa afọ, a na-emegbu ihe dị ka 1 mmadụ n’ime mmadụ 5 ọ bụla na-arụ ọrụ na United States.

Na Britain, otu akụkọ Mahadum Sayensị na Nkà na Ụzụ nke Manchester dere n’afọ 2000 kwuru na n’ime mmadụ 5,300 e were n’ọrụ n’ụlọ ọrụ 70, pasent 47 kọrọ na ha ahụwo ebe e ji ike megbuo mmadụ n’ime afọ ise gara aga. Nnyocha Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe mere na 1996 nke dabeere n’ajụjụ ọnụ a gbara mmadụ 15,800 si mba 15 so n’òtù ahụ, gosiri na pasent 8—ihe dị ka nde ndị ọrụ 12—abụwo ndị a majara ma ọ bụ jiri ike megbuo.

Ma ọ̀ bụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọrụ, ụdị mmegbu nile yiri ka è nwere otu àgwà e ji amata ha—iji ike emerụ onye ọzọ ahụ́ ma ọ bụ na-eweda ya ala. Otú ọ dị, gịnị mere ụfọdụ ndị ji eji ike ha emegbu mmadụ? Olee mmetụta ndị ọ na-enwe? Gịnịkwa ka a pụrụ ime banyere ya?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Igbe dị na peeji nke 12]

Ụdị Dị Iche Iche nke Ndị Ji Ike Ha Emegbu Mmadụ

Ndị Na-eji Ike Ọkpụkpụ Aka Emegbu Mmadụ: Ndị a kasị adị mfe mmata. Ha na-egosipụta iwe ha site n’ịkụ onye ha họọrọ imegbu ihe, inu ya aka, ma ọ bụ ịgba ya ụkwụ—ma ọ bụkwanụ site n’ibibi ihe onwunwe ya.

Ndị Na-eji Okwu Ọnụ: Ha na-eji okwu ọnụ akpasu onye ha họọrọ imegbu iwe ma na-eweda ya ala, ma ọ́ bụghị site n’ịkọ ya ọnụ na ịkparị ya, ya abụrụ site n’ịma ya njakịrị n’ụzọ dị njọ n’esepụghị aka.

Ndị Na-emebi Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya: Ha na-akọsa ihe ndị na-adịghị mma ha nụpeere banyere onye ha họọrọ imegbu. Ndị e ji ụdị mmegbu a mara bụ ụmụ nwanyị.

Ndị Na-eme Ya n’Ihi na E Mere Ha Ya: Ndị a bụ ndị e megburu ma ha aghọzie ndị na-emegbu ndị ọzọ. N’ezie, ha ịbụ ndị e megburu adịghị eme ka a ghara ịta ha ụta maka àgwà ha; nanị ihe ọ na-eme bụ ime ka a mata ihe mere ha ji na-akpa ụdị àgwà ahụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

Ebe e si nweta ya: Akwụkwọ bụ́ Take Action Against Bullying (Mee Ihe Banyere Nsogbu nke Iji Ike Emegbu Mmadụ), nke Gesele Lajoie, Alyson McLellan, na Cindi Seddon, dere