Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ike Emegbu Mmadụ—Ihe Ụfọdụ Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe

Iji Ike Emegbu Mmadụ—Ihe Ụfọdụ Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe

 Iji Ike Emegbu Mmadụ—Ihe Ụfọdụ Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe

GỊNỊ na-eme ka nwatakịrị malite iji ike ya emegbu ndị ọzọ? Ọ bụrụ na e megbutụla gị, i nwere ike ịsị, “Achọghị m ịma! Ọ dịghị ihe a ga-ekwu ga-eme ka ụdị àgwà ahụ zie ezi.” Ikekwe, ihe i kwuru bụ eziokwu. Ma e nwere nnukwu ọdịiche dị n’etiti ikwu ihe kpatara e ji mee ihe na ile ihe e mere anya dị ka ihe ziri ezi. Ihe ndị kpatara nwatakịrị ji eji ike ya emegbu ndị ọzọ adịghị eme ka àgwà ọjọọ ahụ zie ezi, kama ha pụrụ inyere anyị aka ịghọta àgwà ọjọọ ahụ. Nghọta dị otú ahụ pụkwara ịbara anyị ezigbo uru. N’ụzọ dị aṅaa?

Otu ilu oge ochie na-ekwu, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 19:11) Iwe iwe n’ihi àgwà onye ahụ ji ike ya emegbu anyị pụrụ ime ka anyị ghara ile ihe anya otú o kwesịrị, na-eme ka obi kowe anyị n’elu, ọbụnakwa mee ka anyị kpọọ ya asị. Ma ịghọta ihe mere o ji akpa ụdị àgwà ahụ pụrụ inye aka mee ka iwe anyị dajụọ. Nke ahụ n’onwe ya pụrụ ime ka anyị ghọtakwuo ihe nke ọma ka anyị na-achọ ihe ngwọta maka ya. Ya mere, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ na-akpata àgwà ọjọọ a.

Gịnị Na-akpata Àgwà nke Iji Ike Emegbu Mmadụ?

N’ọtụtụ ọnọdụ, ma ọ́ bụghị na ndị mụrụ onye ahụ na-eji ike ya emegbu mmadụ esetịpụghịrị ya ezi ihe nlereanya mgbe ọ na-etolite, ya abụrụ na ha leghaara ya anya kpam kpam. Ọtụtụ ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ si n’ezinụlọ ndị nne na nna bụ ndị na-adịghị egosi mmetụta ma ọ bụ ndị na-achọghị ịma ma ọ bụkwanụ bụrụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ndị kụziiri ụmụ ha iji iwe na ime ihe ike na-edozi nsogbu. Ụmụaka a zụlitere n’ezinụlọ dị otú ahụ nwere ike ha agaghị ewere okwu ha na-agwakasị ndị ọzọ ahụ́ na ihe ike ha na-eme dị ka iji ike emegbu mmadụ; ha pụrụ ọbụna iche na àgwà ha dị mma ma bụrụ nke a na-anabata.

Otu nwa agbọghọ dị afọ 16 bụ́ onye nna nkuchi ya na-emegbu n’ụlọ, bụrụkwa onye ụmụ akwụkwọ ibe ya na-emegbu n’ụlọ akwụkwọ na-ekwu na ya ghọrọ onye na-emegbu ndị ọzọ mgbe ọ nọ na klas nke mbụ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ na-ekweta, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, ihe kpatara ya bụ iwe juru m obi; ana m amaja nnọọ onye ọ bụla m hụrụ. Iwe iwe abụghị obere ihe. Ozugbo iwe were gị, ị ga-achọ ịkpasu ndị ọzọ iwe.” Ọ bụ ezie na e jighị ime ihe ike ike otú ahụ mara ụmụ nwanyị na-emegbu ndị ọzọ, e ji iwe nke na-akpata ya mara ha. *

N’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ, e nwere ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụmụaka si ebe dịgasị iche iche, bụ́ ndị a zụlitere n’ụzọ ndị dịgasị nnọọ iche. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ụmụaka na-eme ihe ike ike n’ihi na a kụziworo ha n’ebe obibi ha na ịkakwasị ndị ọzọ anya na ịgwakasị ha okwu ahụ́ bụ ụzọ ndị kasị mma ha pụrụ isi na-enweta ihe ha chọrọ.

N’ụzọ dị mwute, ọ na-eyikarị ka usoro dị otú ahụ ọ̀ na-agaziri ha. Shelley Hymel, bụ́ onye ya na onyeisi nke ngalaba mmụta na Mahadum British Columbia, Canada, na-arụkọ ọrụ, anọwo na-amụ akparamàgwà ụmụaka ruo iri afọ abụọ. Ọ na-ekwu, sị: “Anyị nwere ụmụaka ndị na-achọpụta ụzọ ha ga-esi na-enweta ihe ndị ha chọrọ, ọ bụkwa ihe dị mwute  na ha na-enweta ya site n’iji ike ha emegbu mmadụ. Ha na-enweta ihe ha chọrọ—ikike, ọkwá, na ùgwù.”

Ihe ọzọ so eme ka iji ike emegbu mmadụ na-amụbawanye bụ nleghara anya. Ọtụtụ ndị a na-emegbu na-eche na ọ dịghị onye ha pụrụ ịkọsara—ọ dịkwa mwute na ọtụtụ mgbe, otú ahụ ka ọ na-adị n’ezie. Debra Pepler, bụ́ onyeisi nke Ngalaba LaMarsh nke Na-eme Nnyocha Banyere Ime Ihe Ike na Idozi Nsogbu na Mahadum York nke Toronto, nyochara ụmụ akwụkwọ ebe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ ma chọpụta na ndị nkụzi na-achọpụta ma na-akwụsị nanị ihe dị ka pasent 4 nke mmegbu ndị e ji ike megbuo ndị ọzọ.

N’agbanyeghị nke ahụ, Dr. Pepler kweere na ọ dị oké mkpa ime ihe banyere ya. Ọ na-ekwu, sị: “Ụmụaka agaghị edozili nsogbu ahụ n’ihi na ọ bụ ihe e ji ike eme, mgbe ọ bụla mmadụ megburu ibe ya, ike onye ahụ na-emegbu mmadụ na-akarị nke onye ọ na-emegbu.”

Ya mere, n’ihi gịnị ka ọtụtụ mmadụ na-ejighị akọ banyere mmegbu a na-emegbu ha? Ọ bụ n’ihi na ndị a na-emegbu kwenyesiri ike na ọ bụrụ na ha ekwupụta ya, ihe ga-aka njọ. N’ihi ya, ruo n’ókè ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-eto eto na-anọgide na-enwe nchekasị na obi erughị ala n’oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ. Olee mmetụta ibi ndụ otú ahụ na-enwe?

Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe n’Anụ Ahụ́ Nakwa n’Uche

Akụkọ si n’aka Òtù Ndị Ọkachamara n’Inyocha Akparamàgwà n’Ụlọ Akwụkwọ ná Mba United States na-ekwu na kwa ụbọchị, ihe karịrị ụmụaka 160,000 na-agha akwụkwọ n’ihi na ha na-atụ ụjọ na a ga-eji ike megbuo ha. Ndị a na-emegbu pụrụ ịkwụsị ikwu banyere ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ banyere kpọmkwem otu ihe ọmụmụ ma ọ bụ ihe omume a na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. Ha pụrụ ịnwa ịga akwụkwọ n’azụ oge kwa ụbọchị ma ọ bụ ghara iso na-amụ ihe ma ọ bụ ọbụna na-achọ ihe ha ga-ejide aka iji ghara ịga akwụkwọ.

Olee otú a pụrụ isi mata ụmụaka e ji ike emegbu? Ha pụrụ inwe ihu mgbarụ, ịbụ ndị ahụ́ na-erughị ala, ndị obi kooro n’elu, ma ọ bụ na-eme ka ndị ike gwụrụ ma na-anọrọ onwe ha. Ha pụrụ ịdị na-eji iwe emeso ndị nọ n’ụlọ ma ọ bụ ndị ọgbọ ha na ndị enyi ha ihe. Ndị na-adịghị emegbu mmadụ bụ́ ndị na-ahụ ebe e ji ike emegbu mmadụ pụkwara inweta mmetụta ọjọọ ndị na-esi na ya apụta. Ọnọdụ ahụ na-eme ka ha na-atụ ụjọ nke ukwuu, bụ́ nke na-eme ka ha ghara inwe ike ịmụta ihe.

Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ Pediatrics in Review na-ekwu, sị: “Ihe kasị njọ nke iji ike emegbu mmadụ na-akpatara ndị a na-emegbu nakwa ọha mmadụ bụ ime ihe ike, gụnyere igbu onwe onye na igbu ọchụ. Mmetụta nke ịbụ ndị na-adịghị ike bụ́ nke ụmụaka a na-emegbu na-enwe pụrụ ịdị nnọọ ukwuu nke na ụfọdụ na-eme omume ndị pụrụ ịkpatara ha nsogbu ma ọ bụ megwara n’ụzọ pụrụ ịkpata ọnwụ.”

Ọkà mmụta sayensị nke na-eme nnyocha, bụrụkwa prọfesọ nke nkà mmụta sayensị metụtara ahụ́ ike ọha na eze na Mahadum Toronto, bụ́ Dr. Ed Adlaf, kwupụtara nchegbu ọ na-enwe na “ndị aka ha dị n’iji ike ha emegbu mmadụ yikarịrị nnọọ ka hà ga-enwe nsogbu nke mmetụta uche ugbu a nakwa n’ọdịnihu.” N’ime afọ agụmakwụkwọ nke 2001, e nyochara ihe karịrị ụmụ akwụkwọ 225,000 n’Ontario ma chọpụta na otu ụzọ n’ụzọ anọ ruo otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha enwewo ahụmahụ banyere ụdị ụfọdụ nke iji ike emegbu mmadụ, ma ọ́ bụghị dị ka ndị e megburu ọ bụrụ dị ka ndị megburunụ. N’otu ìgwè ahụ, 1 mmadụ n’ime mmadụ 10 ọ bụla echesiwo echiche ike banyere igbu onwe ha.

Mmadụ ịbụ onye a na-emegbu mgbe nile pụrụ ime ka ọ ghara ịtụkwasịcha onwe ya obi, na-akpatara ya ajọ nsogbu ahụ́ ike, nakwa ọbụna mee ka ọ ghara ịmụta akwụkwọ. Ndị a na-emegbu pụrụ inwe isi ọwụwa, bụrụ ndị na-adịghị ehi ụra nke ọma, na-enwe nchekasị, ma daa mbà n’obi. Ụfọdụ na-enwe nsogbu uche nke na-abịa mgbe e nwesịrị ọdachi. Ọ bụ ezie na ndị ọzọ pụrụ imetere mmadụ ebere mgbe a kụrụ ya ihe, e nwere ike ha agaghị emere ya otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na a kpataara ya obi erughị ala. Mbibi ọ na-akpata adịghị apụtacha ìhè. N’ihi ya, kama imetere onye ahụ a na-emegbu ebere, e nwere ike ndị enyi na ndị ezinụlọ ya agaghịzi na-enwe mmasị ịnụ mkpesa ọ na-eme.

Mmegbu na-enwekwa mmetụta ọjọọ n’ahụ́ ndị na-eji ike ha emegbu mmadụ. Ọ bụrụ na ha akwụsịghị ya mgbe ha bụ ụmụaka, ikekwe ha ga-etolite ma bụrụ ndị na-emegbu mmadụ n’ebe ọrụ. N’ezie, nnyocha ụfọdụ e mere na-egosi na ndị ji ike ha megbuo mmadụ mgbe ha bụ ụmụaka zụlitere ụdị àgwà ndị dịgidere ruo oge ha merela okenye. O yikarịkwara ka hà ga-abụ ndị ga-eme mpụ karịa ndị na-adịghị eji ike ha emegbu mmadụ.

 Mmetụta Ọ Na-enwe n’Ezinụlọ

Iji ike emegbu mmadụ n’ebe ọrụ na-emetụta ịdị n’otu na udo nke ezinụlọ. Ọ pụrụ ịkpali onye a na-emegbu inwe ọchịchọ na-ekweghị nghọta nke imerụ ndị ọ hụrụ n’anya ya na ha bi n’ụlọ, ahụ́. Ọzọkwa, ọ pụrụ ime ka di ma ọ bụ nwunye lụsoo onye ahụ ji ike ya emegbu mmadụ ọgụ ka ọ na-agbachitere onye ahụ a na-emegbu, n’ụzọ na-enweghị isi. N’aka nke ọzọ, onye òtù ọlụlụ pụrụ ịta di ma ọ bụ nwunye ya a na-emegbu ụta na ọ bụ ya ka nsogbu ahụ si n’aka. Mgbe nsogbu dị otú ahụ nke iji ike emegbu mmadụ dịgidere ruo ogologo oge, a hụwo ka ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-akwadobu ndị òtù ọlụlụ ha ghọziri ndị na-apụghị idi nsogbu ahụ. Ka ọtụtụ afọ na-agafe, o yikarịrị ka ezinụlọ ahụ ọ̀ ga-etisa.

N’ọnọdụ ụfọdụ, iji ike emegbu mmadụ na-akpata ọnọdụ nke enweghịzi ọrụ na ihe e ji akwado ndụ, nkewa na ịgba alụkwaghịm, ma ọ bụ ọbụna igbu onwe onye. Site n’ọkara ruo ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ndị Australia e ji ike emegbu n’ebe ọrụ kọrọ na ọ na-enwe mmetụta ọjọọ n’ezi mmekọrịta ndị ha nwere, dị ka nke ha na ndị enyi ha nwoke ma ọ bụ ndị enyi ha nwanyị, di ma ọ bụ nwunye ha, ma ọ bụkwanụ ndị òtù ezinụlọ ha.

Iji Ike Emegbu Mmadụ Na-efu Ihe Dị Ukwuu

Iji ike emegbu mmadụ n’ebe ọrụ na-efukwa ndị were mmadụ n’ọrụ ihe dị ukwuu. Onye na-emegbu mmadụ n’ebe ọrụ pụrụ ịbụ ọga ya nke nwere ọnụ ọjọọ ma ọ bụ onye ọrụ ibe ya nke na-akpa nkata ọjọọ, ọ pụkwara ịbụ nwanyị ma ọ bụ nwoke. Ndị dị otú ahụ na-enyochakarị ndị ọzọ, na-ahụchata ihe nile ha na-eme, ma na-eweda ha ala site n’ịgwa ha okwu ọjọọ na ịkatọ ha mgbe nile, ha na-eweda ndị ha na-emegbu ala n’ihu ndị ọzọ. Ndị na-eji ike ha emegbu ndị ọzọ adịghị amatakebe na ha enweghị olu ọma, ha adịghịkwa arịọ mgbaghara maka àgwà ha. Ha na-emegbukarị ndị ọrụ ma nke a na-akọ, ndị na-eguzosi ike n’ihe, na ndị ndị ọrụ ibe ha nwere nnọọ mmasị n’ebe ha nọ.

Ndị ọrụ e ji ike emegbu adịchaghị arụ ọrụ nke ọma otú ha kwesịrị ịrụ ma ọ bụrụ na a dịghị emegbu ha. Nke a na-emetụtakwa ihe ndị ọrụ ibe ya na-arụpụta bụ́ ndị na-ahụ ebe e ji ike emegbu ya. Iji ike emegbu ndị ọrụ pụrụ ime ka ha ghara iguzosicha ike n’ihe nye onye were ha n’ọrụ ma ghara ịdị uchu n’ọrụ ha. Otu akụkọ mere atụmatụ na iji ike emegbu mmadụ na-efu ụlọ ọrụ mmepụta ihe dị na United Kingdom ihe dị ka nde dollar atọ kwa afọ. A na-ekwukwa na ọ bụ akparamàgwà dị otú ahụ na-akpata ihe karịrị pasent 30 nke ọrịa ndị metụtara nchekasị.

N’ụzọ doro anya, iji ike emegbu mmadụ na-emetụta ọha mmadụ n’ụwa nile. Ajụjụ bụ, Ọ̀ dị ihe ọ bụla a pụrụ ime iji belata nsogbu ahụ ma mee ka ọ kwụsị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ụzọ ụmụ nwanyị na-esikarị emegbu ndị ọzọ bụ izere ịtụpụrụ onye ahụ ọnụ na ịkọsa ihe ha nụpeere banyere ya. Otú ọ dị, o yiri ka ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu hà na-emekwu ihe ike.

[Foto dị na peeji nke 15]

Iji ike emegbu mmadụ n’ebe ọrụ bụ nnọọ ihe a na-ahụkarị

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị a na-ejikarị ike emegbu pụrụ ịghọ ndị na-enwe nkụda mmụọ na ndị owu na-ama