Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-eji Akụ̀ na Ụba Agọzi Anyị?

Chineke Ọ̀ Na-eji Akụ̀ na Ụba Agọzi Anyị?

 Echiche nke Bible

Chineke Ọ̀ Na-eji Akụ̀ na Ụba Agọzi Anyị?

“Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—ILU 10:22.

AKỤKỤ Bible ahụ e hotara n’elu, ọ̀ na-apụta na Chineke na-eji ihe onwunwe agọzi ndị ohu ya? Ọtụtụ mmadụ kweere otú ahụ. Tụlee ihe otu onye ụkọchukwu Pentikọstal si Australia, onye bụ́kwa onye na-ede akwụkwọ, na-ekwu: “N’akwụkwọ [m], aga m agwa unu ihe mere o ji dị unu mkpa inwekwu ego, aga m agwakwa unu otú unu pụrụ isi nwekwuo ego . . . Ọ bụrụ na unu ga-agbanwe ụzọ unu si eche echiche ma nwee echiche kwesịrị ekwesị banyere ego, ekwere m na unu ga-enweta ngọzi na ihe ịga nke ọma sitere n’aka Chineke, unu agaghịkwa enwe nsogbu ego ọzọ ma ọlị.”

Otú ọ dị, okwu dị otú ahụ na-enye echiche na ndị ogbenye enweghị ihu ọma Chineke. Ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe ọ̀ bụ n’ezie ihe na-egosi na mmadụ nwere ngọzi Chineke?

E Nwere Nzube E ji Gọzie Ha

N’ime Bible, e dekọrọ banyere ebe Chineke ji akụ̀ na ụba gọzie ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. Dị ka ihe atụ, mgbe Jekọb hapụrụ ụlọ ya, ọ bụ nanị mkpanaka ya ka o ji, ma ka afọ 20 gasịrị, ọ chị ìgwè atụrụ, ehi, na ịnyịnya ibu ruru ọmụma ụlọikwuu abụọ lọta. Dị ka Bible si kwuo, akụ̀ na ụba Jekọb bụ onyinye si n’aka Chineke. (Jenesis 32:10) Ihe atụ ọzọ: Ihe nile Job nwere funahụrụ ya, n’agbanyeghị nke ahụ, Jehova mesịrị jiri “atụrụ dị puku iri na anọ nakwa kamel dị puku isii nakwa otu puku ehi e jikọrọ abụọ abụọ nakwa otu puku nne ịnyịnya ibu,” gọzie Job. (Job 42:12, NW) Jehova nyere Eze Solomọn akụ̀ na ụba dị nnọọ ukwuu nke na ọ ka na-ede udé ruo n’oge a.—1 Ndị Eze 3:13.

 N’aka nke ọzọ, Bible nwere ọtụtụ ihe ndekọ banyere ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị dara ogbenye, ndị rubeere ya isi ma fee ya ofufe. N’eziokwu, Chineke ejighị ịda ogbenye na-ata ụfọdụ ndị ahụhụ ma jiri ihe ịga nke ọma na-agọzi ndị ọzọ. Gịnịzi bụ nzube Chineke ji were akụ̀ na ụba gọzie ndị ohu ya n’ọnọdụ ụfọdụ?

Azịza ya dịgasị iche iche n’ọnọdụ nke ọ bụla. Ngọzi e ji ihe onwunwe gọzie Jekọb tọrọ ntọala maka iguzobe otu mba, iji kwadebe maka ọbịbịa nke Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. (Jenesis 22:17, 18) Ihe ịga nke ọma Job nwere mere ka a ghara inwe obi abụọ ọ bụla banyere onye wetaara Job ọdachi, si otú ahụ na-edo aha Jehova nsọ. (Jems 5:11) Solomọn jikwa ihe dị ukwuu n’ime akụ̀ na ụba ahụ Chineke nyere ya wuo ụlọ nsọ dị ebube. (1 Ndị Eze 7:47-51) N’ụzọ na-akpali mmasị, Jehova jikwa Solomọn mee ihe ide, site n’ahụmahụ nke ya, banyere uru na-anaghị adịte aka nke akụ̀ na ụba.—Eklisiastis 2:3-11; 5:10; 7:12.

Otú Chineke Si Agọzi Anyị

Jizọs kụziiri ụmụazụ ya inwe echiche ziri ezi banyere ego mgbe ọ gwara ha ka ha ‘kwụsị ichegbu onwe ha’ banyere ihe onwunwe. O so ha tụgharịa uche na e yikwasịghị ọbụna Solomọn uwe, n’ebube ya nile, dị ka e si yikwasị okooko lili nke ọhịa. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Chineke na-eyikwasị ihe ọkụkụ nke ubi uwe, . . . ọ́ gaghị eyikwasị unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta?” Jizọs mesiri Ndị Kraịst obi ike na ọ bụrụ na ụmụazụ ya ga-ebu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịziri ha ihe oriri, uwe, nakwa ebe obibi. (Matiu 6:25, 28-33) Olee otú e si emezu nkwa ahụ?

Ọ bụrụ na a gbasoo ndụmọdụ Bible, ọ na-arụpụta ngọzi ime mmụọ karịsịa. (Ilu 10:22) Otú ọ dị, ọ na-eweta abamuru ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke na-enye Ndị Kraịst ntụziaka, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike.” (Ndị Efesọs 4:28) Ọ na-ekwukwa na “ogbenye ka onye ji ọrụ aka umengwụ arụ ọrụ ga-abụ: ma aka ndị dị nkọ na-eme ọgaranya.” (Ilu 10:4) A na-enwekarị mmasị iwe Ndị Kraịst na-akwụwa aka ha ọtọ ma na-arụsi ọrụ ike, bụ́ ndị na-agbaso ndụmọdụ a, n’ọrụ. Nke a pụrụ ịbụ ngọzi.

Bible na-ezikwa Ndị Kraịst izere iji ịgba chaa chaa emere ihe mkpori ndụ, izere àgwà na-emerụ emerụ nke ise siga, na àgwà na-emebi ahụ́ ike nke ịṅụbiga mmanya ókè. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 2 Ndị Kọrint 7:1; Ndị Efesọs 5:5) Ndị na-agbaso ndụmọdụ a na-emefu ego dị nta ma na-enwe ahụ́ ike ka mma.

Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa Karịa Ọlaọcha Ma Ọ Bụ Ọlaedo

Ka o sina dị, a pụghị iji nanị ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe egosi na mmadụ nwere ihu ọma Chineke ma bụrụ onye ọ na-agọzi. Dị ka ihe atụ, Jizọs kpughere ọnọdụ ọjọọ nke ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Leọdisịa nọ n’ụzọ ime mmụọ mgbe ọ gwara ha, sị: “Ị na-asị: ‘Abara m ọgaranya, enwetawokwa m akụ̀ na ụba, ọ dịghịkwa ihe na-akpa m ma ọlị,’ ma ị maghị na ị nọ ná nhụsianya, bụrụkwa onye e kwesịrị imere ebere nakwa onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ.” (Mkpughe 3:17) N’aka nke ọzọ, nye Ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana dara ogbenye ma gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ, Jizọs kwuru, sị: “Amaara m mkpagbu na ịda ogbenye gị—ma ị bara ọgaranya.” (Mkpughe 2:9) N’ihi ikwesị ntụkwasị obi ha, o yiri ka Ndị Kraịst a hà tara ahụhụ n’aka ndị na-akpagbu ha ma a bịa n’ihe banyere ego, n’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere akụ̀ nke dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo.—Ilu 22:1; Ndị Hibru 10:34.

Jehova Chineke na-agọzi mgbalị nke ndị na-agbasi mbọ ike ime uche ya. (Abụ Ọma 1:2, 3) Ọ na-enye ha ume na ihe onwunwe iji nagide ọnwụnwa, iji gboo mkpa ezinụlọ ha, na iji buru ụzọ na-achọ Alaeze ya. (Abụ Ọma 37:25; Matiu 6:31-33; Ndị Filipaị 4:12, 13) Ya mere, kama ile akụ̀ na ụba anya dị ka ihe bụ́ isi Chineke ji agọzi mmadụ, ezi Ndị Kraịst na-agbalịsi ike ‘ịba ọgaranya n’ezi ọrụ.’ Site n’iso Onye Okike na-enwe mmekọrịta chiri anya, Ndị Kraịst “na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe.”—1 Timoti 6:17-19; Mak 12:42-44.