Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Na-emegide Akwụkwọ Ndị Ọzọ

Akwụkwọ Na-emegide Akwụkwọ Ndị Ọzọ

 Akwụkwọ Na-emegide Akwụkwọ Ndị Ọzọ

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! N’ỊTALI

N’IHI gịnị ka ọtụtụ ndị ji enwe echiche na-ezighị ezi banyere Bible? Ná mba ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ n’ihi ihe e ji mee ihe iji gbochie “ịjụ okwukwe”—akwụkwọ Index of Forbidden Books (Ndepụta nke Akwụkwọ Ndị A Machibidoro Iwu). Olee otú nke ahụ si mee?

Chọọchị Katọlik jiri ịnụ ọkụ n’obi nabata mmalite a malitere ibi akwụkwọ. Ndị popu ole na ole ọbụna toro ihe ndị ụkọchukwu ụfọdụ kpọrọ “ọrụ nkà sitere n’aka Chineke.” Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ndị isi chọọchị ahụ chọpụtara na a na-eji akwụkwọ ndị e biri ebi agbasa echiche ndị megidere okpukpe Katọlik. N’ihi ya, e tinyere ihe mgbochi n’ọtụtụ dayọsis ndị dị na Europe ná ngwụsị narị afọ nke 15. A malitere ịdị na-anata ikike tupu e bipụta akwụkwọ, n’afọ 1515 kwa, Nzukọ nke Ise nke Lateran nyere ntụziaka iji na-achịkwa mbipụta akwụkwọ. A pụrụ ịchụpụ ndị dara iwu ahụ na chọọchị. Otú ọ dị, mgbe a malitesịrị Ndozigharị ahụ, o gbochighị nkesa nke akwụkwọ ndị chọọchị ahụ lere anya dị ka ndị dị ize ndụ nye nkwenkwe na omume. N’ihi ya, ná ngwụsị narị afọ nke 16, ndị Vatican nwere olileanya na “a gaghịzi na-ebipụta akwụkwọ ruo ọtụtụ afọ.”

Iji gbochie nnupụta nke “akwụkwọ ndị ahụ rụrụ arụ” ji ike na-enupụta—dị ka otu onye Jesuit si Ịtali si kwuo ya n’oge na-adịbeghị anya bụ́ na 1951—chọọchị ahụ  chọrọ ka e nwee ndepụta nke akwụkwọ ndị a machibidoro iwu bụ́ nke ndị Katọlik nile ga na-agbaso. Na 1542, e hiwere òtù Njụta Okwukwe nke Rom. Dị ka ihe àmà na-egosi, iwu mbụ metụtara ọha na eze nke òtù ahụ tiri megidere nnwere onwe ibipụta akwụkwọ okpukpe. Mgbe onye bụ́bu onyeisi òtù njụta okwukwe bụ́ Gian Pietro Carafa ghọrọ Popu Paul nke Anọ n’afọ 1555, o nyere otu òtù iwu ozugbo idepụtasị akwụkwọ ndị a machibidoro iwu. N’ihi ya, na 1559, e biri akwụkwọ Index of Forbidden Books nke mbụ bụ́ nke ndị Katọlik nile ga na-agbaso.

Olee Ụdị Akwụkwọ Ndị A Machibidoro Iwu?

Akwụkwọ Index ahụ nwere “nkebi” atọ. Ná nkebi nke mbụ, e depụtara ndị nile bipụtara akwụkwọ, bụ́ ndị a machibidoro akwụkwọ nile ha bipụtara iwu n’agbanyeghị ihe akwụkwọ ha na-ekwu. Ná nkebi nke abụọ, e depụtara aha akwụkwọ ndị a machibidoro iwu, bụ́ ndị a na-amachibidoghị akwụkwọ ndị ọzọ nke ndị dere ha iwu. Ná nkebi nke atọ, e depụtakwara ọtụtụ akwụkwọ ndị a machibidoro iwu, bụ́ ndị a na-edeghị aha ndị bipụtara ha. N’akwụkwọ Index ahụ, e depụtara isi ihe dị 1,107 e ji katọọ ndị dere ọ bụghị nanị akwụkwọ okpukpe kamakwa ụdị akwụkwọ ndị ọzọ. N’ihe odide ntụkwasị ya, e depụtara mbipụta Bible ndị a machibidoro iwu, na-ekwu kpọmkwem na a machibidoro nsụgharị nile e dere n’asụsụ ndị mmadụ na-ejikarị eme ihe iwu.

Ọ bụ ezie na e nweburu akwụkwọ ndị a machibidoro iwu n’ógbè dị iche iche, “ma ebe ọ bụ na iwu a metụtara okpukpe Katọlik n’ozuzu ya, ọ bụ nke mbụ ya chọọchị ahụ na-ekwupụta mmachibido ọ machibidoro ibipụta, ịgụ, na inwe Akwụkwọ Nsọ nke dị n’asụsụ ndị mmadụ na-ejikarị eme ihe,” dị ka Gigliola Fragnito, bụ́ onye na-akụzi akụkọ ihe mere eme nke oge a na Mahadum Parma, Ịtali, na-ekwu. Ndị na-ere akwụkwọ na ndị editọ nakwa gọọmenti dị iche iche, bụ́ ndị na-erite uru n’ibipụta akwụkwọ, megidere n’ụzọ siri ike mbipụta e bipụtara akwụkwọ Index ahụ. N’ihi mmegide a na ihe ndị ọzọ, e dezigharịrị ma bipụtaghachi ya n’afọ 1564, bụ́ mgbe e nwesịrị Nzukọ nke Trent.

N’afọ 1571, e guzobere Òtù Na-ahụ Maka Akwụkwọ Index nke ọrụ ya kpọmkwem bụ idezigharị ya. N’otu oge, ihe hà ka ngalaba atọ kpebiri akwụkwọ ndị ha ga-amachibido iwu—Òtù Ndị Nọ n’Ọkwá Dị Nsọ, Òtù Na-ahụ Maka Akwụkwọ Index, na onye nlekọta obí dị nsọ, bụ́ onye nọ n’ọkwá dị elu nke ya na popu na-arụkọ. Otu ụdị ọrụ ngalaba ndị ahụ nọ na-arụ na nkwekọrịta ha na-enweghị n’ihe banyere ma à ga-enyekwu ndị bishọp ikike ka ọ bụ ndị njụta okwukwe, so n’ihe ndị mere e ji gbuo oge n’ibipụta ndepụta nke atọ nke akwụkwọ ndị a machibidoro iwu. Òtù Ndị Nọ n’Ọkwá Dị Nsọ kwuru ka a ghara ikesa akwụkwọ Index ahụ, bụ́ nke Òtù Na-ahụ Maka Akwụkwọ Index dezigharịrị nakwa nke Clement nke Asatọ mere ka ọ ghọọ iwu na March 1596, ruo mgbe akwụkwọ ahụ ga-ekwu hoo haa na a machibidowo ịgụ Bible nile e dere n’asụsụ ndị mmadụ na-ejikarị eme ihe, iwu.

Mbipụta akwụkwọ Index of Forbidden Books nke a nwetụrụ ọdịdị a na-agbanweghị agbanwe n’agbanyeghị ihe ọmụma ọhụrụ ndị a nọ na-etinye na ya n’ime narị afọ ndị gafeworonụ. Ọtụtụ ndị Protestant, bụ́ ndị a gụnyere akwụkwọ ha na ya, kọwara ya dị ka “akwụkwọ kasị depụta akwụkwọ ndị kasị baa uru.” Otú ọ dị, a ghaghị iburu n’uche na n’oge ahụ, echiche ndị Protestant na-eyi nnọọ nke ndị Katọlik ma a bịa n’ihe banyere akwụkwọ ndị a ga-amachibido iwu.

Akwụkwọ Index ahụ nwere mmetụta dị njọ n’ebe ọdịbendị dị, bụ́ nke mere ka ọdịbendị nke mba ndị dị ka Ịtali “na-alazi azụ,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Antonio Rotondò, na-ekwu. Onye ọzọ bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Guido Dall’Olio, na-ekwu na akwụkwọ Index ahụ bụ “otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mere ka ọdịbendị Ịtali ghara inwe ọganihu, ma e jiri ya tụnyere nke ihe ka ọtụtụ n’akụkụ ndị ọzọ nke Europe.” N’ụzọ dị iche n’ihe e bu n’uche, e bibighị akwụkwọ ụfọdụ n’ihi na e debere ha n’ebe pụrụ iche, bụ́ ebe a sị na ọ bụ ili akwụkwọ, ebe a rụrụ n’ọtụtụ ọbá akwụkwọ chọọchị maka ịkpọchigide akwụkwọ ndị a machibidoro iwu.

 Otú ọ dị, echiche ọhụrụ ọha na eze nwere n’oge a bịara nwekwuo mmepeanya so mee ka e wepụ “ngwá ọrụ kasịnụ e jitụworo megide nnwere onwe ibipụta akwụkwọ.” N’afọ 1766, onye editọ si Ịtali dere, sị: “Mmachibido iwu nke Rom adịghị egosi ma akwụkwọ ọ̀ dị mma ma ọ bụ na ọ dịghị mma. Ọ bụ ọha na eze na-ekpebi akwụkwọ dị mma.” Ikike nke akwụkwọ Index ahụ belatawara, n’afọ 1917 kwa, e kposara Òtù Na-ahụ Maka Akwụkwọ Index ahụ. Kemgbe afọ 1966, akwụkwọ Index ahụ “adịghịzi irè dị ka iwu sitere n’aka ndị isi chọọchị na dị ka akwụkwọ na-amachibido akwụkwọ dị iche iche iwu.”

Bible E Dere n’Asụsụ Ndị Mmadụ Na-ejikarị Eme Ihe

Akụkọ banyere akwụkwọ Index ahụ na-egosi na n’ime ‘akwụkwọ ndị ahụ nile rụrụ arụ,’ otu kasị kpatara ndị isi chọọchị nchegbu—Bible e dere n’asụsụ ndị mmadụ na-ejikarị eme ihe. Na narị afọ nke 16, e depụtara “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mbipụta 210 nke Bible n’ozuzu ya ma ọ bụ nke Agba Ọhụrụ” n’akwụkwọ Index ndị ahụ, ka ọkachamara bụ́ Jesús Martinez de Bujanda, na-akọwa. Na narị afọ nke 16, a maara ndị Ịtali dị ka ndị na-eji ịnụ ọkụ n’obi agụ Bible. Ma, mmachibido kpụ ọkụ n’ọnụ nke akwụkwọ Index ahụ machibidoro Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’asụsụ ndị mmadụ na-ejikarị eme ihe metụtara n’ụzọ dị ukwuu ojiji mba ahụ na-eji Okwu Chineke eme ihe. “N’ịbụ nke a machibidoro iwu ma wezụga n’ụsọ dị ka ihe ndị na-eme ka a jụ okwukwe, ndị Ịtali bịara ghọtahie Akwụkwọ Nsọ dị ka ihe odide nke ndị jụrụ okwukwe,” ka Fragnito na-ekwu, bụ́ onye kwukwara, sị: “Nye ndị Katọlik nọ n’ebe ndịda Europe, ihe na-eweta nzọpụta bụ Katikizim,” ‘ha họkwaara ndị na-amaghị nke a na-akọ n’ihe banyere okpukpe karịa ndị ma nke a na-akọ.’

Ọ bụ nanị na 1757 ka Popu Benedict nke Iri na Anọ nyere ikike ka a na-agụ ‘nsụgharị Bible ndị e dere n’asụsụ ndị mmadụ na-ejikarị eme ihe bụ́ nke popu ahụ na ndị ọrụ ya kwadoro.’ N’ihi ya, a pụziri ide nsụgharị Ịtalian ọhụrụ, bụ́ nke dabeere na Latin Vulgate. N’eziokwu, ndị Katọlik bụ́ ndị Ịtali aghaghị ichere ruo n’afọ 1958 iji nweta nsụgharị Bible mbụ ha zuru ezu, bụ́ nke dabeere kpọmkwem n’asụsụ ndị mbụ a na-eji eme ihe.

Taa, ka Fragnito na-ekwu, ọ bụ ndị na-abụghị ndị Katọlik kasị arụsi ọrụ ike iji “na-ekesa Akwụkwọ Nsọ n’ebe nile.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Ndịàmà Jehova so ná ndị kasị arụsi ọrụ ike, ha ekesawo ihe karịrị nde anọ nke New World Translation of the Holy Scriptures n’asụsụ Italian. Ha esiwo otú ahụ nyere ọtụtụ ndị aka ịmaliteghachi ịhụ Okwu Chineke n’anya. (Abụ Ọma 119:97) Gịnị ma ị mata akwụkwọ a pụrụ iche nke ọma karị?

[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

Peeji ụfọdụ nke akwụkwọ Index of Forbidden Books

[Ebe E Si Nweta Foto]

Su concessione del Ministero per i Beni e le Attività Culturali

[Foto dị na peeji nke 28]

Bible e dere n’asụsụ Italian, nke narị afọ nke 16, bụ́ nke chọọchị ahụ machibidoro iwu

[Foto dị na peeji nke 28]

“New World Translation” emewo ka ọtụtụ ndị maliteghachi ịhụ Okwu Chineke n’anya