Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akụkụ Dị Njọ nke Ịchọ Mma

Akụkụ Dị Njọ nke Ịchọ Mma

 Akụkụ Dị Njọ nke Ịchọ Mma

OBI abụọ adịghị ya na ịchụso ejiji ọ bụla pụtara ọhụrụ pụrụ inye aka mee ka ị makwuo mma ma mee ka i nwekwuo obi ike n’ebe gị onwe gị nọ. Ejiji dị mma pụrụ ikpuchitụ ihe ndị na-adịchaghị mma n’ahụ́ gị, ọbụnakwa mee ka mma gị pụtakwuo. Ọ pụkwara imetụta ụzọ ndị ọzọ si ele gị anya.

Ma e nwere akụkụ dị njọ nke ịchụso ejiji, bụ́ nke a na-apụghị ileghara anya. Ndị na-azụ uwe pụrụ ịnọgide na-azụ uwe ọhụrụ n’esepụghị aka. E kwuwerị, ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ejiji na-anọgide na-emepụta ụdị ejiji ndị ọhụrụ n’ụba. Nke a adịghị eme na mberede, n’ihi na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ejiji na-akpata ego ka ukwuu mgbe ejiji na-ewuteghị aka. Dị ka onye na-emepụta ejiji bụ́ Gabrielle Chanel si kwuo ya, “a na-eme ejiji ka ọ ghara iwute aka.” N’ihi ya, onye na-adịghị akpachapụ anya pụrụ iche na ọ ga-adị mkpa ka ya na-azụ uwe ndị ọhụrụ nanị iji sokwara biri.

E nwekwara ihe ize ndụ nke ịbụ onye e ji mkpọsa ngwá ahịa a na-eme n’ụzọ dị aghụghọ na-adọta. Ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ejiji na-etinye ọtụtụ nde dollar n’ịkpọsa ngwá ahịa ha, ha na-egosikarị ụdị ndụ nke nchekasị na-adịghị na ya, bụ́ nke ndị na-eyi uwe ndị ha mepụtara yiri ka hà na-ebi. Ozi ndị a pụrụ inwe mmetụta dị ike. “Ọ dịghị ihe na-enye ndị nọ n’afọ iri na ụma nsogbu karịa enweghị ụdị akpụkpọ ụkwụ na-ewunụ,” ka otu onye nkụzi nọ na Spen na-ekwu.

Ike Ndọrọ nke Ejiji Ndị Na-ewu Ewu

Ndị ụfọdụ na-eji ụdị ejiji ụfọdụ iji gosi òtù ha so na ya. Ihe ha na-eyi pụrụ igosi na ha anabataghị ihe ndị a na-eme n’obodo, na ha na-ebi ụdị ndụ nke onye mere otú o si masị ya, ma ọ bụ ọbụna na ha bụ ndị na-akwado ime ihe ike ma ọ bụ ịkpa ókè agbụrụ. Ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ụdị ejiji ndị a pụrụ ịbụ ndị jọgburu onwe ha ma ọ bụ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị nọ n’òtù ahụ na-ejikarị otu ụdị ejiji. Ọbụna ụfọdụ ndị na-adịghị akwado òtù ahụ pụrụ inwe mmasị n’ejiji ha. Ndị na-anabata ụdị ejiji ndị a pụrụ inye ndị ọzọ echiche bụ́ na ha kweere ma na-akwalite ihe ndị bụ́ isi òtù ahụ kweere.

Ejiji ndị na-ewu ewu na-emekarị ha pụta ha alaa, ụfọdụ na-abụ n’ime ọnwa ole na ole. Ọ pụrụ ịbụ ndị a ma ama na-eti egwú ma ọ bụ ndị ọzọ mere ka ha malite iwu ewu. Otú ọ dị, ọ bụ ụdị ejiji ole na ole bụ ndị na-adịghị ala ala. Dị ka ihe atụ, jean na-acha anụnụ anụnụ wuuru ndị ntorobịa mere ngagharị iwe n’afọ ndị 1950 nakwa n’afọ ndị 1960. Otú ọ dị, ugbu a, ndị nọ n’afọ ndụ dị iche iche na-eyi ya n’ọnọdụ dịgasị iche iche.

Ọchịchọ A Na-achọ Inwe Ọdịdị Ahụ́ Bụ́ Ịgba

Ndị na-eji ejiji akpọrọ oké ihe pụrụ ịdị na-echegbubiga onwe ha ókè banyere ọdịdị ahụ́ ha. Ndị a na-eji egosi ejiji na-abụkarị ndị toro ogologo ma dị gịrịgịrị, anyị na-ahụkwa foto ha mgbe mgbe. * A na-ejikarị ndị nwere ọdịdị ahụ́ “dị mma” akpọsa ngwá ahịa nile malite n’ụgbọala ruo n’ihe nracha. Ụlọ Ọrụ Nnyocha Na-ahụ Maka Okwu Ndị Metụtara Ọha na Eze na Britain na-eme atụmatụ na “foto ụmụ nwanyị mara mma dị egwu bụ́ ndị ụmụ agbọghọ na-ahụ ugbu a n’ime otu ụbọchị karịrị nke ndị nne anyị ha hụrụ n’oge nile ha toro agbọghọbịa.”

Foto ndị a a na-ewepụta n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu pụrụ inwe mmetụta dị njọ. Dị ka ihe atụ, na United States, otu nnyocha e hotara na magazin bụ́ Newsweek  gosiri na pasent 90 nke ndị ọcha nọ n’afọ iri na ụma enweghị afọ ojuju n’otú ahụ́ ha dị. Ụfọdụ n’ime ha ga-eme ihe ọ bụla ha pụrụ ime iji nwee ‘ọdịdị bụ́ ịgba.’ Ma, Ụlọ Ọrụ Nnyocha Na-ahụ Maka Okwu Ndị Metụtara Ọha na Eze na-azọrọ na ọ bụ ihe na-erughị pasent 5 nke ndị inyom pụrụ inweta ọdịdị ahụ́ yiri nke ahụ a na-egosi n’usoro mgbasa ozi. Ka o sina dị, nsọpụrụ a na-enye ndị dị nnọọ gịrịgịrị emewo ka ọtụtụ nde ụmụ agbọghọ banye n’ohu. O mewo ka ụfọdụ ndị malite inwe nsogbu nke erighị ihe nke ọma n’ihi ịtụ ụjọ ibu ibu, bụ́ nsogbu na-esi ike mgbochi. * Onye Spen a na-eji egosi ejiji bụ́ Nieves Álvarez, bụ́ onye nweburu nsogbu nke erighị ihe nke ọma n’ihi ịtụ ụjọ ibu ibu, na-ekweta, sị: “Ibu ibu tụrụ m ụjọ karịa ka ọnwụ na-atụ m.”

N’eziokwu, ọtụtụ ihe ndị ọzọ pụrụ ịkpata nsogbu ndị dị ka erighị ihe nke ọma n’ihi ịtụ ụjọ ibu ibu nakwa iri ihe ma gbọọ ya n’ihi ịtụ ụjọ ibu ibu. Otú ọ dị, ndị dọkịta bụ́ Anne Guillemot na Michel Laxenaire  na-ekwu, sị: “Oké mmasị a na-enwe n’ịdị gịrịgịrị na-eso akpata nsogbu ahụ.”

N’ụzọ doro anya, ejiji na-ewu ewu nwere akụkụ dị mma nakwa akụkụ dị njọ. Ọ na-emeju ọchịchọ bụ́ isi mmadụ na-enwe ịdị mma n’anya nakwa iyi ihe ọhụrụ. Ma ịchụso ejiji na-ewu ewu gabiga ókè pụrụ iduga anyị n’iyi uwe ndị na-eme ka ndị ọzọ nwee echiche na-ezighị ezi banyere anyị. Ọ bụrụkwa na anyị ejiri ọdịdị ahụ́ anyị kpọrọ ihe gabiga ókè, anyị pụrụ ịmalite inwe echiche na-ezighị ezi bụ́ na uru anyị bara na-adabere n’otú anyị dị n’ile anya kama ịdabere n’omume anyị. “Anyị aghaghị ịmalite iji ikike na omume mmadụ kpọrọ ihe karịa iji nanị ọdịdị elu ahụ́ ya akpọrọ ihe,” ka Álvarez, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, na-ekwu. Ma o yighị ka a ga-enwe mgbanwe ụkpụrụ dị otú ahụ n’isi nso. Ya mere, olee otú anyị pụrụ isi na-ele ejiji anya n’ụzọ ziri ezi?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 A na-achọkarị ka ndị a na-eji egosi ejiji dịrị “ma ọ dịkarịa ala mita 1.74 n’ogologo, dị nnọọ gịrịgịrị, nwee egbugbere ọnụ buru ibu, ọkpụkpụ ntì pụtara apụta, mkpụrụ anya gbara ọkpụrụkpụ, ụkwụ ogologo na imi guzo kwem nke na-apịghị apị nke ukwuu,” ka magazin bụ́ Time na-ekwu.

^ par. 10 Òtù Mba United States Na-ahụ Maka Nsogbu nke Erighị Ihe nke Ọma n’Ihi Ịtụ Ụjọ Ibu Ibu Nakwa Nsogbu Ndị Yiri Ya na-eme atụmatụ na nde mmadụ asatọ na-enwe nsogbu nke erighị ihe nke ọma n’ihi ịtụ ụjọ ibu ibu na United States nanị, nakwa na ụfọdụ n’ime ha na-anwụ. Ọnụ ọgụgụ buru ibu n’ime ha (pasent 86) na-amalite inwe nsogbu iri ihe tupu ha eruo afọ 21.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

Ọ̀ Dị Onye Ga-eyili Ihe ahụ n’Ezie?

Kwa oge opupu ihe ubi nakwa oge mgbụsị akwụkwọ, ụlọ ọrụ ndị na-egosi ejiji bụ́ ndị dị na New York, Paris, na Milan na-egosi uwe ndị dị oké ọnụ bụ́ ndị ndị a ma ama na-emepụta ejiji mepụtara. E wezụga na ha na-ada oké ọnụ, ọtụtụ n’ime uwe ndị ahụ na-eyi ihe na-abaghị uru, ma ha fọdụkwa iyiwedị ha eyiwe. “A dịghị ebu ọha na eze n’obi emepụta ejiji ndị ahụ gbapụrụ nnọọ iche ị na-ahụ, bụ́ ndị jọgburu onwe ha,” ka onye Spen na-emepụta ejiji bụ́ Juan Duyos na-ekwu. “Nzube e ji eme ngosi ejiji ahụ pụrụ ịbụ iji dọrọ uche gaa n’ebe onye mepụtara ya nọ ma ọ bụ n’aha e ji mara ejiji ahụ kama ịbụ iji ree uwe ndị ahụ a na-egosi. Dị ka ihe atụ, uwe ọhụrụ ndị usoro mgbasa ozi kwuru okwu nke ukwuu banyere ha pụrụ inye aka mee ka senti na-esi ísì ọma nke nwere aha ahụ gaa ahịa.”

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọ pụrụ ifu oké ihe ịchụso ejiji na-ewu ewu

[Foto dị na peeji nke 7]

Iji ejiji n’ụzọ ụfọdụ pụrụ ime ka a mara gị dị ka onye so n’otu òtù

[Foto dị na peeji nke 7]

E dugawo ụfọdụ ndị n’inwe nsogbu nke erighị ihe nke ọma n’ihi ịtụ ụjọ ibu ibu, bụ́ nsogbu na-esi ike mgbochi