Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnọ na Quebec Leta Jeruselem

Ịnọ na Quebec Leta Jeruselem

 Ịnọ na Quebec Leta Jeruselem

NDỊ na-aga nleta na Jeruselem nke oge a pụrụ ịgbalị iji anya nke uche ha hụ ihe ọ na-aghaghị ịdịwo ka ya n’oge Bible. Otú ọ dị, a pụrụ n’ezie ịnọ n’otu obodo nta dị n’akụkụ Osimiri St. Lawrence dị na Canada, bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 8,500 site n’ebe ọdịda anyanwụ Jeruselem, hụ obodo ochie a n’ụzọ pụrụ iche. N’ebe ahụ, ndị bịara nleta na-ahụ Jeruselem na gburugburu ya nile. Ma olee otú nke ahụ pụrụ isi mee? Ka anyị kọọ.

Otu n’ime ihe osise ndị kasị ukwuu n’ụwa bụ́ ndị gara ahụ́ ụlọ gburugburu, bụ́ Nnukwu Ihe Osise nke Jeruselem, dị n’ime otu ụlọ dị okirikiri nke dị n’obodo Sainte Anne de Beaupré, Quebec. Nnukwu ihe osise a dị mita 14 n’ịdị elu, dịkwa mita 110 n’okirikiri. Ọ bụ ezie na ihe nile e sere na ya ezichaghị ezi, ihe osise ahụ ka na-adọrọ mmasị ndị mmụta Bible, n’ihi na ọ na-egosi, n’ụzọ dị ukwuu, otú e si bie ndụ na Jeruselem n’oge Bible.

Ọ bụrụ na ndị bịara nleta anọrọ n’ebe gbalitere elu, nke dị n’etiti ụlọ ahụ na-ekiri ihe osise ahụ, ha na-ahụ obodo nta ndị gbara Jeruselem nke narị afọ mbụ gburugburu. Ka ha na-ekiri ihe osise ahụ gara ahụ́ ụlọ gburugburu, ha na-ahụ obodo ahụ a ma ama n’onwe ya tinyere nnukwu mgbidi ya, ụlọ nsọ ya dị ebube, na obí ndị mara mma dị na ya. Ha lere ya na-aga, ha na-ahụ ihe osise ọzọ nke na-egosi oge ikpeazụ Jizọs biri ndụ n’ụwa. Nnukwu ihe osise a na-adị nnọọ ka a ga-asị na ọ bụghị ihe e sere ese nke na ọ na-adị ndị na-ekiri ya ka hà nọ n’obodo ahụ kpọmkwem, soro ìgwè mmadụ nọ n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem na-agagharị.

N’ụzọ dị ịtụnanya, ọ bụghị taa ka ihe osise a nke yiri ihe dị adị ma na-akpali mmasị, dịwara. N’ezie, Paul Philippoteaux, bụ́ omenkà a ma ama si Paris, rụrụ ọrụ na ya site na 1878 ruo 1882. Mmadụ ise ọzọ na-ese ihe—mmadụ abụọ si United States, mmadụ abụọ si France, na otu onye si England—nyeere ya aka ise ihe osise ya ahụ. Otú ọ dị, ọ bụ onye Germany na-ese ihe, bụ́ Bruno Piglhein, bụ́ onye kpebisiri ike ime ka ọha mmadụ mara banyere ndụ e biri n’oge Bible, chepụtara ihe osise ahụ. Mgbe e sechara ya na Munich, Germany, e gosiri ya n’isi obodo ukwu ndị dị na Europe. Kemgbe 1895, a nọwo na-egosi ya na Canada.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

Foto nile: Cyclorama de Jérusalem inc.