Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Ji Jupụta Ebe Nile?

N’ihi Gịnị Ka Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Ji Jupụta Ebe Nile?

 N’ihi Gịnị Ka Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Ji Jupụta Ebe Nile?

IHE ndị rụrụ arụ bụ́ ndị na-eme ka mmadụ nwee mkpali mmekọahụ malitere laa azụ n’ọtụtụ puku afọ. Ma n’oge ahụ nile ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ dị, ọ na-esi ike mmepụta, n’ihi ya ọ bụkwa ndị bara ọgaranya na ndị na-achị achị na-enweta ya karịsịa. Ibipụta akwụkwọ n’ìgwè na mmepụta e mepụtara foto na ihe nkiri sinima gbanwere ihe nile. Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bịara bụrụ ihe ndị na-abachaghị ọgaranya pụrụ inweta.

Mmepụta e mepụtara ígwè e ji akpọ vidio mere ka ihe ka njọ. N’adịghị ka sinima na foto ndị meworo ochie, kaseti vidio na-adị mfe ndebe, mmepụtaghachi nakwa nkesa. Mmadụ pụkwara ikiri ha n’ebe obibi ya nanị ya. N’oge na-adịbeghị anya, njupụta nke ụlọ ọrụ telivishọn ndị a na-enweta na satellite nakwa n’Intanet emewo ọbụna ka ọ dịkwuo mfe inweta ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Onye na-atụ egwu na onye agbata obi ya ga-ahụ ya n’akụkụ ụlọ ahịa na-ere vidio ndị na-akpali agụụ mmekọahụ pụziri “ịnọ n’ụlọ ma tụọ ọda ya site n’ịpị bọtịn dị na TV ya, ma ọ bụ site n’ịhọrọ ihe omume a na-enweta na satellite,” ka otu onye na-enyocha usoro mgbasa ozi bụ́ Dennis McAlpine na-ekwu. Dị ka McAlpine si kwuo, nnweta a pụrụ inweta usoro ihe omume telivishọn dị otú a n’ụzọ dị mfe esowo mee ka “ọtụtụ ndị mmadụ na-anabatakwu ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ.”

Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ Aghọọ Ihe Ọtụtụ Ndị Na-anabata

Ọtụtụ mmadụ na-enwe uche abụọ banyere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’ihi na ọtụtụ ndị na-anabatazi ya. “O nweelarị mmetụta dị nnọọ ukwuu n’ebe ọdịbendị anyị dị karịa mmetụta nile egwú opera, egwú ballet, ebe ihe nkiri na ọrụ nkà na-enwe,” ka onye edemede bụ́ Germaine Greer na-ekwu. Otú e si ele ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ anya n’oge a pụrụ ịpụta ìhè n’otú ndị a ma ama  si na-eji ejiji ‘yiri nke ndị akwụna,’ nakwa na vidio egwú ndị a na-egosiwanye mmekọahụ na ha, na nnabata ndị na-eme mkpọsa ngwá ahịa n’usoro mgbasa ozi na-anabata “iji ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ eme ihe.” McAlpine kwubiri, sị: “Ọha mmadụ na-anabata ihe ọ bụla e gosiri ya n’usoro mgbasa ozi. . . . Nke ahụ na-enye aka eme ka e nwee echiche bụ́ na ihe ndị a nile dị mma.” N’ihi ya, “ihe ndị ahụ eyighị ka hà na-awụ ndị mmadụ akpata oyi n’ahụ́,” ka Andrea Dworkin, bụ́ onye dere akwụkwọ na-akwa n’arịrị. “O yiri ka ha achọghịdị ịma.”

Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Ekiri Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ

N’ikwu ihe yiri ihe Dworkin, bụ́ onye dere akwụkwọ kwuru, onyeisi ọrụ nke ụlọ ọrụ FBI bụ́ Roger Young na-akọwa na ọtụtụ ndị “adịghị nnọọ ahụcha ihe ọjọọ ndị na-esi n’omume rụrụ arụ apụta nakwa nsogbu ndị ọ na-akpata.” Ụfọdụ na-abụ ndị ndị na-akwado ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ megharịrị anya, na-azọrọ na e nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na foto ndị na-akpali agụụ mmekọahụ na-emetụta ndị mmadụ n’ụzọ na-adịghị mma. “Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ nanị echiche efu,” ka F. M. Christensen, bụ́ onye dere akwụkwọ, na-ekwu, “bụ́ eziokwu nke ndị na-emegide ya yiri ka hà na-enwe ihe isi ike ịghọta.” Ma ọ bụrụ na echiche efu adịghị enwe mmetụta n’ahụ́ mmadụ, oleezi ihe ndị na-eme mkpọsa ngwá ahịa na-adabere na ya eme mkpọsa ha? N’ihi gịnị ka ụlọ ọrụ dị iche iche na-eji emefu ọtụtụ nde dollar n’imepụta mkpọsa ngwá ahịa, vidio, na mkpọsa ngwá ahịa ndị e biri ebi ma ọ bụrụ na ha adịghị enwe mmetụta na-adịgide adịgide n’ebe ndị mmadụ nọ?

Nke bụ́ eziokwu bụ na, dị ka mkpọsa ngwá ahịa nile na-aga nke ọma, nzube ndị mmadụ ji eji ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ eme ihe bụ iji kpalie  agụụ a na-enwebughị. “Ọ dịghị ihe ọzọ na-akpata iji ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ eme ihe ma ọ bụghị uru ahịa,” ka ndị nnyocha bụ́ Steven Hill na Nina Silver na-ede. “N’ọmà ahịa a a na-ere ihe aghara aghara, a pụrụ ire ihe ọ bụla iji nweta uru, karịsịa ahụ́ ndị inyom na ndị na-enwe mmekọahụ.” Greer ji ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ tụnyere nri onye ọ dị ngwa ngwa nke na-eri nnọọ mmadụ ahụ́, bụ́ nke na-enweghị ihe na-edozi ahụ́, nke e tinyekwara ihe ga-eme ka ọ tọkwuo ụtọ nakwa mmiri ọgwụ. “Mmekọahụ a na-egosi n’usoro mgbasa ozi,” ka ọ na-ekwu, “bụ mmekọahụ adịgboroja . . . Mkpọsa ihe oriri na-akwalite orire nke ihe oriri ndị na-adịghị enye ihe n’ahụ́, mkpọsa mmekọahụ na-akwalitekwa mmekọahụ na-adịghị enye afọ ojuju.”

Ụfọdụ ndị dọkịta na-ekwu na ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ pụrụ ịkpali omume riri mmadụ ahụ́ nke siri ike nkwụsị karịa ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ́. A na-amalitekarị ịgwọ ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ site n’ime ka ọgwụ pụsịa ha n’ahụ́. Ma mmadụ ịbụ onye ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ riri ahụ́, ka Dr. Mary Anne Layden nke Mahadum Pennsylvania na-akọwa, “na-etinye onyinyo na-adịgide adịgide n’uche onye na-eji ya eme ihe, ọ na-aghọkwa akụkụ nke usoro ịrụ ọrụ nke ụbụrụ.” Ọ bụ ya mere ndị mmadụ pụrụ iji cheta n’ụzọ doro anya foto ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ́ ndị ha kiriri n’afọ ndị gara aga. O kwubiri, sị: “Nke a bụ ihe mbụ na-eri mmadụ ahụ́ nke a na-enweghị olileanya ọ bụla nke ime ka ọ pụsịa n’uche mmadụ.” Ma nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ gaghị ekwe mee mmadụ inwere onwe ya pụọ ná mmetụta nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ? Oleekwa ihe ọjọọ ndị ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ pụrụ ịkpata?

[Igbe dị na peeji nke 5]

Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Ihe Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ n’Intanet

▪ Ihe dị ka pasent 75 nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet na-esite na United States. Ihe fọrọ nke nta ka o ruo pasent 15 na-esite na Europe.

▪ A na-eme atụmatụ na ihe dị ka nde mmadụ 70 na-aga n’ebe ndị a na-edebe ihe ndị na-akpali ag̣ụụ mmekọahụ n’Intanet n’otu izu. Ihe dị ka nde mmadụ 20 n’ime ndị a nọ na Canada nakwa na United States.

▪ Nnyocha e mere gosiri na n’ime otu ọnwa na-adịbeghị anya, Germany nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet na Europe, ndị ọzọ na-esochi ha bụ Great Britain, France, Ịtali, na Spen.

▪ Na Germany, ndị na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet na-etinye nkezi nke minit 70 kwa ọnwa n’ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet.

▪ N’etiti ndị Europe na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet, ndị gafeworo afọ 50 na-etinye oge kasị ukwuu n’ịga n’ebe ndị a na-edebe ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet.

▪ Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, pasent 70 nke ọtụtụ ndị na-ekiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet na-ekiri ya n’ehihie.

▪ Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe e mere atụmatụ ịbụ 100,000 ebe ndị a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nwere foto ụmụaka ndị na-akpali agụụ mmekọahụ.

▪ Ihe dị ka pasent 80 nke foto ụmụaka ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Intanet bụ́ ndị a na-ere ere sitere na Japan.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ aghọọla ihe ọtụtụ ndị pụrụ inweta