Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Ọ̀ Chọrọ Mmadụ Nile Ime Ihe n’Otu Ụzọ n’Ihe Nile?

Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Ọ̀ Chọrọ Mmadụ Nile Ime Ihe n’Otu Ụzọ n’Ihe Nile?

 Echiche nke Bible

Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Ọ̀ Chọrọ Mmadụ Nile Ime Ihe n’Otu Ụzọ n’Ihe Nile?

O YIRI ka e ji adịghị n’otu mara okpukpe taa. Ọbụna n’ime otu chọọchị, ndị mmadụ pụrụ ikwere ihe dịgasị iche iche ma a bịa n’ihe banyere nkwenkwe na omume. Otu onye edemede si otú a kwuo ya: “O siri ike ọbụna ịhụ mmadụ abụọ kweere kpọmkwem n’otu Chineke. N’ụbọchị ndị a, o yiri ka onye ọ bụla ò nwere nkà mmụta okpukpe nke ya.”

N’ụzọ megidere nnọọ nke a, Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na Kọrint ume ịdị “na-ekwu otu ihe” na ịbụ ndị ‘e mere ka ha dị n’otu n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ n’otu uche na n’otu ụzọ iche echiche.’ (1 Ndị Kọrint 1:10) Ụfọdụ ndị taa na-akatọ ndụmọdụ ahụ Pọl nyere. ‘Ndị mmadụ dị iche iche,’ ka ha na-ekwu, ‘o zighịkwa ezi isi ọnwụ na Ndị Kraịst nile ga na-eche echiche ma ọ bụ na-eme omume n’otu ụzọ.’ Ma Pọl ọ̀ nọ na-atụ aro na a ga na-agwa ha ihe ọ bụla ha ga-eme? Bible ọ̀ na-enye ohere maka mmadụ inwere onwe ya ime nhọrọ?

Ịdị n’Otu Abụghị Ime Otu Ihe

N’otu n’ime akwụkwọ ozi ya ndị ọzọ, Pọl gbara Ndị Kraịst ume iji ‘ikike iche echiche’ ha na-efe Chineke. (Ndị Rom 12:1) N’ezie, ọ gaghị abụ na ọ nọ na-anwa ime ka ndị nọ n’ọgbakọ Kọrint ghọọ ndị a ga na-agwa ihe ọ bụla ha ga-eme. Ma n’ihi gịnị ka o ji gwa ha ka ha bụrụ ndị ‘e mere ka ha dị n’otu n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ n’otu uche na n’otu ụzọ iche echiche’? Pọl nyere ndụmọdụ a n’ihi na ọgbakọ dị na Kọrint nọ na-enwe nsogbu siri ike. Nkewa batara na ya, nke na ụfọdụ ndị lere Apọlọs anya dị ka onye ndú ha ebe ndị ọzọ họọrọ Pọl ma ọ bụ Pita ma ọ bụ nakwere nanị Kraịst. Adịghị n’otu dị otú ahụ abụghị obere ihe, n’ihi na ọ chọrọ ime ka udo gharazie ịdị n’ọgbakọ ahụ.

Pọl chọrọ ka ndị Kọrint ‘na-edebe ịdị n’otu nke mmụọ nsọ n’ihe nkekọ ịdị n’otu nke udo,’ dị nnọọ ka o mesịrị dụọ  Ndị Kraịst nọ n’Efesọs n’ọdụ. (Ndị Efesọs 4:3) Ọ nọ na-agba ụmụnna ahụ ume ịgbaso Jizọs Kraịst n’ịdị n’otu, ọ bụghị ikewasị n’òtù dịgasị iche iche. N’ụzọ dị otú a, ha ga na-adị n’otu ná nzube ha. (Jọn 17:22) Ya mere, ndụmọdụ Pọl nyere ndị Kọrint nyere aka gbazie echiche ha ma kwalite ịdị n’otu, ọ pụtaghị na ha nọ na-eme otu ihe n’ihe nile.—2 Ndị Kọrint 13:9, 11.

Ịdị n’otu dịkwa mkpa ma a bịa n’ihe banyere nkwenkwe. Ndị na-agbaso nzọụkwụ Jizọs na-aghọta na e nwere n’ezie nanị “otu okwukwe,” dị nnọọ ka e nwere “otu Chineke na Nna.” (Ndị Efesọs 4:1-6) N’ihi ya, Ndị Kraịst na-ejide n’aka na ihe ha kweere na ya kwekọrọ n’eziokwu Chineke kpugheworo n’Okwu ya banyere onwe ya na nzube ya. Ha na-adị n’otu n’ihe ha kweere banyere onye Chineke bụ na ihe ọ chọrọ. Ha na-ebikwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ndị doro anya e dekọrọ n’Okwu Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) N’ụzọ dị otú a, Ndị Kraịst na-anọgide na-adị n’otu, ma na nkwenkwe ma n’omume.

Ịhụ Banyere Echiche Dịrịtara Iche

Otú ọ dị, nke a apụtaghị na a na-agwa Onye Kraịst ọ bụla kpọmkwem ụzọ ọ ga-esi na-eche echiche na ihe ọ ga-eme kpọmkwem n’ọnọdụ nile nke ndụ. Ọtụtụ ihe na-achọ nhọrọ onwe onye. Tụlee otu ihe atụ. Ọtụtụ Ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na Kọrint nwere obi abụọ banyere iri anụ ndị pụrụ isitewo n’ụlọ arụsị. Ụfọdụ ndị kwenyesiri ike na iri anụ ahụ ga-abụ ife ofufe ụgha, ebe ndị ọzọ chere na ebe anụ ahụ si adịghị mkpa. N’ime ihe banyere okwu a chọrọ nlezianya, Pọl etighị iwu nke ga-agwa Ndị Kraịst ihe ha ga-eme. Kama nke ahụ, o kwetara na ndị mmadụ pụrụ ime mkpebi dịgasị iche iche n’okwu ahụ. *1 Ndị Kọrint 8:4-13.

Taa, Ndị Kraịst pụrụ ime mkpebi ndị dị iche na nke Ndị Kraịst ndị ọzọ ma a bịa n’ihe banyere ọrụ, ahụ́ ike, ntụrụndụ, ma ọ bụ ụfọdụ ihe ndị ọzọ dịịrị nhọrọ onwe onye. Nhọrọ dịgasị iche iche otú ahụ pụrụ ichegbu ụfọdụ ndị. Ha pụrụ iche ma echiche dịgasị iche iche ó nweghị ike ịkpata esemokwu ma ọ bụ nkewa n’ọgbakọ. Otú ọ dị, a pụrụ izere ihe dị otú ahụ. Iji maa atụ: Ndị na-arọ egwú nwere nanị ụda egwú ole na ole ha na-eji arụ ọrụ, ma n’agbanyeghị nke ahụ, ohere ha nwere ịrọ egwú ndị dị mma adịghị agwụ agwụ. N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst na-eme nhọrọ ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke. Otú ọ dị, ha na-enweretụ onwe ha ime nhọrọ mgbe ha na-eme mkpebi onwe onye ụfọdụ.

Olee otú o si ekwe omume ichekwa ịdị n’otu Ndị Kraịst ma na-akwanyekwara nhọrọ ndị mmadụ ùgwù? Ịhụnanya bụ isi ihe dị mkpa na-eme ka o kwe omume. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-akwali anyị iji ọchịchọ obi na-agbaso ihe ndị o nyere n’iwu. (1 Jọn 5:3) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe mmadụ ibe anyị nọ na-akwali anyị ịkwanyere oruru o ruuru ndị ọzọ ime mkpebi onwe onye dị ka akọ na uche ha si dị, ùgwù. (Ndị Rom 14:3, 4; Ndị Galeshia 5:13) Pọl setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a mgbe o doro onwe ya n’okpuru ịchịisi nke òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ n’ihe metụtara ozizi. (Matiu 24:45-47; Ọrụ 15:1, 2) N’otu aka ahụ, ọ gbara mmadụ nile ume ịkwanyere akọ na uche Ndị Kraịst ibe ha ùgwù n’ihe ndị a hapụụrụ anyị ime mkpebi onwe onye na ha.—1 Ndị Kọrint 10:25-33.

N’ụzọ doro anya, ọ dịghị onye e kwesịrị ịkatọ maka ime mkpebi dị ka akọ na uche ya si dị, bụ́ nke na-emegideghị ụkpụrụ Bible. (Jems 4:12) N’aka nke ọzọ, Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe agaghị esi ọnwụ ime ihe ndị ruuru ha ma mebie akọ na uche ndị ọzọ ma ọ bụ kpata adịghị n’otu n’ọgbakọ. Ha ekwesịghịkwa ịzọrọ na ha nweere onwe ha ime ihe Okwu Chineke machibidoro iwu n’ụzọ doro anya. (Ndị Rom 15:1; 2 Pita 2:1, 19) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ kwesịrị ịkwali anyị ime ka akọ na uche anyị kwekọọ n’echiche Chineke. N’aka nke ya, nke a ga-eme ka anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị nọgide na-adị n’otu.—Ndị Hibru 5:14.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị fere arụsị tupu ha aghọọ Ndị Kraịst apụghị ịhụ ọdịiche dị n’etiti iri anụ na ikere òkè n’ofufe. Nchegbu ọzọ kwesịrị ekwesị bụ na Ndị Kraịst na-esichaghị ike n’ụzọ ime mmụọ pụrụ ịghọtahie ya ma sụọ ngọngọ.