Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ka Afọ Ime Gị Ghara Ịdịcha Ize Ndụ

Ime Ka Afọ Ime Gị Ghara Ịdịcha Ize Ndụ

 Ime Ka Afọ Ime Gị Ghara Ịdịcha Ize Ndụ

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA MEXICO

DỊ KA Òtù Na-ahụ Maka Ụba Mmadụ nke Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, kwa afọ, ihe karịrị ọkara nde ndị inyom na-anwụ site n’ihe ndị afọ ime kpatara. Tụkwasị na nke ahụ, Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) na-akọ na kwa afọ, ihe karịrị nde ndị inyom 60 na-enwe nsogbu ahụ́ ike ndị dị njọ bụ́ ndị na-esite n’afọ ime nakwa na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ọnụ ọgụgụ ahụ na-enweta mmerụ ahụ́ ma ọ bụ na-ebute ọrịa ndị na-adịru oge ndụ ha nile. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ọtụtụ ndị inyom na-abụ ndị tọrọ atọ n’ọnọdụ nke na-eme ha ịtụrụ ime ọzọ ozugbo ha mụpụrụ nwa, na-eme ka ha ghara ilekọta onwe ha anya, bụ́ nke na-emekwa ka ha bụrụ ndị ahụ́ na-adịghị afọdụ na ndị na-arịa ọrịa. Ee, afọ ime pụrụ imerụ ahụ́—ọbụna dị ize ndụ. Ọ̀ dị ihe ọ bụla nwanyị pụrụ ime iji mee ka afọ ime ya ghara ịdịcha ize ndụ?

Nlekọta Ahụ́ Ike Tupu A Tụrụ Ime

Ime atụmatụ. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ndị di na nwunye kwurịta banyere ụmụ ole ha ga-amụ. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, a na-ahụkarị ndị inyom chị ụmụ, kuru ekuru, burukwa n’afọ. Atụmatụ e ji nlezianya mee na nchebara echiche pụrụ ime ka e kwe ka oge gafetụ mgbe a mụsịrị nwa tupu a tụrụ ime ọzọ, nke a na-eme ka nwanyị zurutụ ike, ma nwee ike ịgbake mgbe ọ mụsịrị nwa.

Ihe oriri. Dị ka Òtù Na-ahụ Maka Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Afọ Ime si kwuo, tupu nwanyị atụrụ ime, ọ dị mkpa ka o chere ruo ma ọ dịkarịa ala ọnwa anọ iji mee ka mmetụta nke ọgwụ ndị na-emerụ ahụ́ ndị ọ pụrụ iṅụwo pụọ ya n’ahụ́ na iji wulite ihe ndị na-edozi ahụ́. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwanyị dị ime aṅụọ ọgwụ folic acid nke ọma, ọ na-ebelata nnọọ ihe ize ndụ nke nwa e bu n’afọ inwe mkpumkpu azụ, bụ́ nke ihe na-akpata ya bụ emechighị nke ọma nke ọwara na-adị n’ọkpụkpụ azụ nke nwa e bu n’afọ. Ebe ọ bụ na ọwara na-adị n’ọkpụkpụ azụ nke nwa e bu n’afọ na-emechi n’agbata ụbọchị nke 24 na nke 28 mgbe a tụsịịrị ime—ogologo oge tupu ọtụtụ ụmụ nwanyị amata na ha dị ime—ndị inyom ụfọdụ bụ́ ndị na-eme atụmatụ ịtụrụ ime na-aṅụ ọgwụ folic acid.

Ihe ọzọ na-edozi ahụ́ nke dị oké mkpa bụ iron. N’ezie, iron ahụ́ nwanyị na-achọ na-amụba okpukpu abụọ mgbe ọ dị ime. Ọ bụrụ na iron o nwere n’ahụ́ dị obere—dị ka ọ na-adị n’ebe ọtụtụ ndị inyom nọ ná mba ndị ka na-emepe emepe nọ—ọ pụrụ inwe ụkọ ọbara nke ụkọ iron na-akpata. Ịtụrụ ime ugboro ugboro pụrụ ime ka ọnọdụ a ka njọ, ebe ọ  bụ na nwanyị nwere ike ghara inwe oge iji mee ka ahụ́ ya nwetaghachi iron. *

Afọ ndụ. Ohere e nwere na ụmụ agbọghọ dị ime bụ́ ndị na-erubeghị afọ 16 ga-anwụ, ji pasent 60 dị elu karịa nke ndị dị afọ 20 na ụma. N’aka nke ọzọ, ndị inyom gaferela afọ 35 yikarịrị ka hà ga-amụ ụmụ ndị nwere nkwarụ, dị ka Down’s syndrome. Ndị nne ndị ka bụ nnọọ ụmụaka ma ọ bụ ndị nke nọ ná ngwụsị nke afọ ndị ha pụrụ ịtụrụ ime yikarịrị ka hà ga-enwe ọrịa preeclampsia. Nsogbu a, nke a na-eji inwe ọbara mgbali elu mgbe izu nke 20 a tụrụsịịrị ime gasịrị nakwa ahụ́ ọzịza na mmụba nke protein dị na mamịrị mara, na-eme ka ohere e nwere na nne na nwa ahụ ga-anwụ rịa elu.

Ọrịa ndị e butere ebute. Ọrịa ndị bara n’ọwara mamịrị, n’ọnụ akpa nwa na n’ọtụ, nakwa n’eriri afọ, pụrụ ịka njọ n’oge a dị ime, ọ pụkwara ịmụba ohere nke ịmụchu nwa na nke ịrịa ọrịa preeclampsia. Ọ kasị mma ịgwọ ọrịa ọ bụla e butere tupu a tụrụ ime.

Nlekọta Ahụ́ Ike n’Oge A Dị Ime

Nlekọta ahụ́ ike tupu a mụọ nwa. Nwanyị ịhụ dọkịta ugboro ugboro n’oge nile ọ dị ime na-ebelata ihe ize ndụ nke ya onwe ya ịnwụ. Ọbụna ná mba ndị e nwere ụlọ ahụ́ ike na ụlọ ọgwụ ole na ole, a pụrụ inwe ndị inyom na-ele ime bụ́ ndị a zụrụ nke ọma.

Nlekọta ahụ́ ike tupu a mụọ nwa pụrụ ime ka ndị ọrụ ahụ́ ike a zụrụ azụ mata ọnọdụ ndị pụrụ ime ka ọ dị mkpa inye nlekọta pụrụ iche. Ndị a na-agụnye ibu ihe karịrị otu nwa n’afọ, ọbara mgbali elu, nsogbu obi na nke akụrụ, na ọrịa shuga. Ná mba ụfọdụ, a pụrụ ịgba nwanyị dị ime ọgwụ ọrịa tetanus iji gbochie nwa ọhụrụ ya ịrịa ọrịa tetanus. N’agbata izu nke 26 na nke 28 ọ tụrụsịịrị ime, a pụkwara ile ya ahụ́ iji chọpụta ma ò nwere nje streptococcus nọ n’ìgwè nke B. Nwa ọhụrụ pụrụ ibute nje ndị a n’oge a na-amụpụta ya ma ọ bụrụ na ha dị n’eriri afọ ndị dị otule nso.

Nwanyị ahụ dị ime kwesịrị ịdị njikere inye ndị ọkachamara ahụ́ ike ihe ọmụma nile ọ pụrụ inye, gụnyere nlekọta ahụ́ ike ndị o nwetaworo n’oge gara aga. O kwesịkwara ịjụ ajụjụ n’emeghị ihere. E kwesịrị ịchọ enyemaka ndị ọrụ ahụ́ ike ozugbo ma ọ bụrụ na e nwee ọbara ọgbụgba n’ọtụ, ihu ịza aza na mberede, oké isi ọwụwa ma ọ bụ isi ọwụwa na-ekweghị akwụsị akwụsị ma ọ bụ mkpịsị aka igbu mgbu, anya ịgba itiri ma ọ bụ ịhụ ihe inyoghi inyoghi na mberede, oké afọ mgbu, ịgbọ agbọ n’akwụsịghị akwụsị, oyi ọmụma ma ọ bụ ahụ́ ọkụ, mgbanwe n’ọ̀tụ̀tụ̀ nwa e bu n’afọ ji emegharị ahụ́, mmiri isi n’ọtụ na-agbapụta, inwe ihe mgbu mgbe a na-anyụ mamịrị, ma ọ bụ anyụghị mamịrị.

Mmanya na-aba n’anya na ọgwụ ọjọọ. Nwanyị dị ime ịṅụ mmanya na-aba n’anya na iji ọgwụ ọjọọ (gụnyere ụtaba) eme ihe na-amụba ohere e nwere na nwa ya ga-enwe isi mmebi, nkwarụ, na ọbụna nsogbu akparamàgwà. Ọbụna a hụwo ụmụ ọhụrụ nke ụmụ nwanyị ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ mụrụ dị ka ndị na-enwe mmetụta na-adịghị mma nke yiri nke ndị kwụsịrị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-enwe. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị kweere na ịṅụ otu iko mmanya na-aba n’anya mgbe ụfọdụ adịghị emerụ ahụ́, ndị ọkachamara na-atụkarị aro ka a ghara ịṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọlị n’oge a dị ime. Ndị inyom dị ime kwesịkwara ịkpachara anya ka ha ghara ikuru anwụrụ ọkụ sitere na siga onye ọzọ na-ese.

Ọgwụ. E kwesịghị ịṅụ ọgwụ ọ bụla ọ gwụla ma ọ bụ dọkịta maara banyere afọ ime ahụ bụ́ onye nyochaworo ihe ize ndụ ndị ọgwụ ahụ pụrụ iweta, depụtara ya. Ọgwụ ụfọdụ na-enye vitamin pụkwara imerụ ahụ́. Dị ka ihe atụ, inwe vitamin A n’ahụ́ gabiga ókè, pụrụ ịkpatara nwa e bu n’afọ nkwarụ.

Ibu ibu. Nwanyị dị ime kwesịrị izere imebiga ihe ókè n’akụkụ a. Dị ka akwụkwọ bụ́ Krause’s Food, Nutrition and Diet Therapy si kwuo, ohere e nwere na nwa ọhụrụ ịdị arọ ya na-erughị otú kwesịrịnụ ga-anwụ ji okpukpu 40 dị elu karịa nke nwa ọhụrụ ịdị arọ ya dị otú kwesịrịnụ. N’aka nke ọzọ, iri nri mmadụ abụọ na-akpata oké ibu. Ibu ibu otú kwesịrịnụ—nke na-aka apụta ìhè malite n’ọnwa anọ nke afọ ime gawa—na-egosi na nwanyị ahụ dị ime na-eri ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke nri ahụ́ ya chọkwuru. *

 Ịdị ọcha na nlebara anya ndị ọzọ. A pụrụ ịsa ahụ́ otú a na-esibu asa, ma e kwesịghị iji mmiri ọgwụ saa ime ọtụ. Nwanyị dị ime kwesịrị izere onye ọ bụla na-arịa ọrịa nke nje virus na-akpata, dị ka arụbara. Ọzọkwa, iji gbochie ọrịa toxoplasmosis, ọ ghaghị iji nlezianya zere anụ a na-esigheghị esighe, zerekwa imetụ nsị nwamba aka ma ọ bụ ahụ́. Usoro idebe ihe ọcha ndị bụ́ isi, ndị dị ka ịkwọ aka na ịsa nri ndị a na-esighị esi asa, dị oké mkpa. Inwe mmekọahụ adịghị abụkarị ihe ize ndụ ọ gwụla ma ọ̀ bụ n’izu ndị ikpeazụ nke afọ ime ma ọ bụ ma e nwee ọbara ọgbụgba, afọ mgbu, nakwa ma ọ bụrụ na e nweburu ime ọpụpụ.

Ọmụmụ Nwa Gara nke Ọma

Nwanyị lekọtara onwe ya anya mgbe ọ dị ime ga-enwe ohere dị nnọọ nta nke inwe nsogbu mgbe ọ na-amụ nwa. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ ga-ekpebiwo ma ọ̀ họọrọ ịmụ nwa n’ụlọ ka ọ̀ bụ n’ụlọ ọgwụ. Ọ ga-amakwa, ruo n’ókè dị mma, ihe ọ ga-atụ anya ya na otú ọ ga-esi kwenyere nwanyị na-ele ime ma ọ bụ dọkịta maara ọrụ. N’aka nke ya, onye ahụ ga-amara nhọrọ ndị nwanyị ahụ mere dabere n’ihe ndị ọ maara—n’ihe ndị a pụrụ ime nhọrọ na ha—n’ihe ndị dị ka otú ọ ga-anọ mụọ nwa, mwasawanye a ga-awasawanye ọtụ ya iji mee ka isi nwa ya pụta nke ọma, nakwa iji mkpà e ji ejide akụkụ ahụ́, ọgwụ ndị na-akwụsị ihe mgbu, na kọmputa e ji ele nwa e bu n’afọ, mee ihe. A ghaghịkwa inwe nkwekọrịta n’ihe ndị ọzọ: Olee ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ụlọ ahụ́ ike ha ga-aga ma ọ bụrụ na nsogbu apụta mgbe a nọ n’ụlọ na-amụ nwa? Gịnị kpọmkwem ka a ga-eme ma ọ bụrụ na ọbara agbaa nwanyị nke ukwuu? Ebe ọ bụ na ọbara ọgbụgba na-akpata ọnwụ nke ọtụtụ ụmụ nwanyị dị ime, a ghaghị inwe ihe ndị e ji edochi anya ọbara n’ebe aka ga-eru ha ngwa ngwa maka ndị inyom na-adịghị anara mmịnye ọbara. Ọzọkwa, e kwesịrị ibu ụzọ chebara ihe a ga-eme echiche ma ya dị mkpa na a ga-awa nwanyị ahụ́ iji bupụta nwa ya.

Bible na-ekwu na ụmụ bụ ngọzi sitere n’aka Chineke, “ihe nketa.” (Abụ Ọma 127:3) Ọ bụrụ na nwanyị amara banyere afọ ime ya karị, otú ahụ ka ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma karị. Site n’ilekọta onwe ya anya nke ọma tupu ọ tụrụ ime nakwa mgbe ọ tụrụsịịrị ime, sitekwa n’ibu ụzọ chebara akụkụ dị iche iche nke ọmụmụ nwa echiche, nwanyị ga na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji hụ na afọ ime ya adịchaghị ize ndụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ihe ndị na-enye folic acid na iron n’ahụ́ bụ imeju, ihe oriri na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa, akwụkwọ nri ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, mkpụrụ ndị a na-etiwa etiwa, na mkpụrụ akụ́kụ́ ndị a gwara ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ́. Iji rie nri ndị nwere iron n’ụba, ọ pụrụ inye aka ịgwakọta ha na ihe ndị na-enye vitamin C, dị ka mkpụrụ osisi ndị a ghọtara ọhụrụ.

^ par. 16 Ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị arọ a tụrụ aro na nwanyị nke ịdị arọ ya dị otú kwesịrịnụ mgbe ọ tụụrụ ime ga-etinyekwu bụ agbata kilogram 9 na 12 ka ọ na-erule ngwụsị nke afọ ime ya. Ka o sina dị, ndị nọ n’oge uto ma ọ bụ ndị inyom na-adịchaghị eri ihe na-edozi ahụ́ kwesịrị itinye agbata kilogram 12 na 15 n’ịdị arọ ha, ebe ndị bubigara ibu ókè kwesịrị itinye nanị agbata kilogram 7 na 9.

[Igbe dị na peeji nke 14]

ARO MAKA ỤMỤ NWANYỊ DỊ IME

● Dị ka o kwesịrị ịdị, nri ụbọchị nke nwanyị dị ime kwesịrị ịgụnye mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri (karịsịa ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, ndị na-acha edo edo, na ndị na-acha ọbara ọbara), ihe oriri ndị na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa (ndị dị ka àgwà, lentil, na chick-pea), mkpụrụ akụ́kụ́ (gụnyere ọka wit, ọka nkịtị, ọka oat, na ọka bali—ọ ga-akasị mma ma e rie nanị ha ma ọ bụkwanụ gwaa ha ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ́), ihe oriri ndị sitere n’ahụ́ ụmụ anụmanụ (azụ̀, anụ ọkụkọ, anụ ehi, àkwá, cheese, na mmiri ara ehi, ọ ga-akasị mma ma ọ bụrụ mmiri ara ehi e wepụworo abụba dị na ya). Ọ kasị mma iri abụba, shuga a zara aza, na nnu n’ụzọ na-agabigaghị ókè. Na-aṅụ nnukwu mmiri. Zere ihe ọṅụṅụ ndị nwere caffeine, nakwa ihe oriri ndị nwere ihe nchekwa na ihe ndị na-agbanwe ọdịdị ihe oriri (ndị dị ka ihe ndị aka mere bụ́ ndị na-eme ka nri gbanwee ụcha ya na ndị na-eme ka nri tọwanye ụtọ). Starch, nzu, na ihe ndị ọzọ a na-adịghị eri eri pụrụ ịkpata erighị ihe na-edozi ahụ́, ha pụkwara imerụ ahụ́.

● Kpachara anya maka ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdị na gburugburu ebe obibi, dị ka mmadụ isebiga X-ray ókè na ikpughe onwe ya nye mmiri ọgwụ ndị na-emerụ ahụ́ n’ụzọ gabigara ókè. Belata iji mmiri ọgwụ ndị a na-agba maka ahụhụ na ihe ndị ọzọ a na-agba n’ụlọ eme ihe. Abụla onye ahụ́ kpobigara ọkụ ókè n’ihi ịnọ n’ebe na-ekpo oké ọkụ ma ọ bụ n’inwe mmega ahụ́ gabiga ókè. Zere iguzo ọtọ ruo ogologo oge na ime ndọlị gabiga ókè. Jiri belt oche ụgbọala nke ga-eme ka ị nọrọ otú kwesịrị ekwesị na-eme ihe.