Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nrụgide Ndị Ọgbọ—Ò Siri Nnọọ Ike n’Ezie?

Nrụgide Ndị Ọgbọ—Ò Siri Nnọọ Ike n’Ezie?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Nrụgide Ndị Ọgbọ—Ò Siri Nnọọ Ike n’Ezie?

“Echeghị m na m na-enwe mmetụta nke nrụgide ndị ọgbọ.”—Pamela, onye na-aga ụlọ akwụkwọ dị elu.

“Echeghị m na nrụgide ndị ọgbọ na-enwekwa mmetụta siri nnọọ ike ọzọ n’ahụ́ m. Ihe ka ọtụtụ n’ime nrụgide ndị m nwere si m n’aka.”—Robbie, onye ntorobịa.

Ọ̀ DỊWO mgbe i nwere mmetụta dị otú ahụ n’onwe gị? N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na ị maara na Bible sịrị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (1 Ndị Kọrint 15:33) N’agbanyeghị nke ahụ, i nwere ike ịdị na-eche sị, ‘À na-eche na nrụgide ndị ọgbọ dị ike karịa otú ọ dị—ma eleghị anya ọ dịchaghị nnọọ ike dị ka ndị mụrụ m na ndị ọzọ tọrọ m kwuru na ọ dị?’

Ọ bụrụ na ị na-enwe obi abụọ dị otú a site n’oge ruo n’oge, ị bụghị onye na-eto eto mbụ nwetụrụla ya. Ma anyị chọrọ ka ị tụlee ihe a. Nrụgide ndị ọgbọ ò siri ike karịa otú i chere? Ike nke nrụgide ndị ọgbọ ejuwo ọtụtụ ndị ntorobịa anya. Dị ka ihe atụ, Angie kwetara na ọ pụrụ ịbụ na ya na-eme ihe dị ukwuu iji dị ka ibe ya karịa otú ya chere. O kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ nrụgide ndị ọgbọ na-esi nnọọ ike nke na ị gaghịdị amata na ọ bụ nrụgide ndị ọgbọ. I nwere ike ịmalite iche na ọ bụ nrụgide nke i nwere n’ime gị.”

N’otu aka ahụ, Robbie, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’elu, kwuru na nrụgide kasịnụ ya na-enwe na-esite na gburugburu ya. Ma, o kwetara na o siri ike ibi nso ná nnukwu obodo mepere emepe. N’ihi gịnị? N’ihi nrụgide ndị ọgbọ na-esite na gburugburu ebe obibi nke hụrụ ihe onwunwe n’anya. Ọ sịrị: “Akụ̀ na ụba bụ nnọọ oké ihe n’ebe a.” N’ụzọ doro anya, nrụgide ndị ọgbọ bụ ikike a na-ekwesịghị ileghara anya. Gịnịzi mere ọtụtụ ndị na-eto eto ji na-eche na nrụgide ndị ọgbọ anaghị emetụta ha?

Nduhie Ya Siri Ike

Nrụgide ndị ọgbọ pụrụ iduhie eduhie—n’ezie, o nwere ike anyị agaghị achọpụta ya ma ọlị. Iji maa atụ: Ọ bụrụ na anyị nọ n’elu ala, nnukwu  ikuku dị n’elu na-emetụta anyị mgbe nile. * Ị nwere ike ibi n’okpuru mmetụta dị otú ahụ kwa ụbọchị, ma o siri ike ka ị chọpụta. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ marala gị ahụ́.

N’ezie, ikike ikuku nke dị anyị gburugburu adịchaghị emerụ ahụ́. Ma mgbe ndị mmadụ rụgidere anyị n’ụzọ na-apụtaghị ìhè, ha pụrụ ime ka anyị jiri nwayọọ nwayọọ gbanwee. Pọl onyeozi ghọtara ike nrụgide ndị ọgbọ nwere. Ọ dọrọ Ndị Kraịst nọ na Rom aka ná ntị, sị: “Ekwela ka ụwa nke gbara gị gburugburu kpụzie gị otú o si chọọ.” (Ndị Rom 12:2, The New Testament in Modern English) Ma, olee otú nke a pụrụ isi mee?

Otú Nrụgide Ndị Ọgbọ Na-esi Arụ Ọrụ

Ị̀ na-enwe obi ụtọ ịbụ onye ndị ọzọ kwadoro ma nabata? Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị ga-ekweta na anyị na-enwe. Otú ọ dị, ọchịchọ ebumpụta ụwa anyị nwere maka nkwado dị otú ahụ pụrụ imetụta anyị n’ụzọ abụọ. Ruo n’ókè ha aṅaa ka anyị ga-eru iji nweta nnabata anyị na-achọsi ike? Ọ bụrụgodị na anyị tụkwasịrị onwe anyị obi n’ụzọ dị otú ahụ, gịnị banyere ndị gbara anyị gburugburu? Hà na-agbalị iguzogide nrụgide ndị ọgbọ, ka hà na-ekwe ka ọ kpụzie ha?

Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị taa na-ele ụkpụrụ Bible maka omume ọma anya dị ka ihe oge ya gafeworo ma ọ bụ ihe na-adịghị irè n’ụwa nke oge anyị a. Ọtụtụ ndị chere na ọ dịchaghị mkpa ife Chineke ofufe otú ọ gwara anyị n’ime Okwu ya ka anyị si na-efe ya. (Jọn 4:24) Gịnị mere ha ji enwe echiche dị otú ahụ? Azịza ya, n’otu akụkụ, pụrụ ịbụ nrụgide ndị ọgbọ. Ná Ndị Efesọs 2:2, Pọl na-ekwu banyere usoro ihe nke ụwa dị ka nke nwere “mmụọ,” ma ọ bụ àgwà nke na-achịkwa ya. Mmụọ ahụ na-arụgide ndị mmadụ iche echiche otú ụwa nke na-amaghị Jehova si eche echiche. Olee otú nke a pụrụ isi metụta anyị?

Ihe ndị anyị na-eme n’ụlọ akwụkwọ kwa ụbọchị, ọmụmụ ihe, ibu ọrụ ezinụlọ, na ọrụ na-agụnyekarị mkpa nke iso ndị na-enweghị ụkpụrụ anyị nke Ndị Kraịst na-akpakọrịta. Dị ka ihe atụ, n’ụlọ akwụkwọ, e nwere ndị ga-eme ihe ọ bụla ha pụrụ ime iji bụrụ ndị a ma ama n’ụzọ ọ bụla, ndị na-enwe mmekọahụ́ rụrụ arụ, ma ọ bụ ọbụna ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe ma na-aṅụbiga mmanya na-aba n’anya ókè. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị esi n’etiti ndị na-eme omume dị otú ahụ họrọ ndị enyi anyị na ha ga na-akpachi anya ma ọ bụ nabata omume ahụ dị ka ihe ziri ezi, ma ọ bụ ọbụna ihe kwesịrị otuto? Anyị nwere ike ịmalite—ikekwe nwayọọ nwayọọ na mbụ—na-anabata àgwà ndị yiri ya. “Mmụọ” nke ụwa ma ọ bụ “ikuku” ya ga-arụgide anyị, na-akpụzi anyị otú ụwa si chọọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya.

Ọ dị mma ịmata na ndị ọkà mmụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke oge a emewo nchọpụta nke kwadoro ụkpụrụ Bible ndị ahụ. Tụleedị nchọpụta ahụ kwesịrị ịrịba ama nke Asch mere. A kpọrọ otu onye ka o sonyere otu ìgwè mmadụ nọdụkọrọ ala. Dr Asch gosiri otu kaadị buru ibu nke nwere akara kwụ ọtọ, e gosikwara kaadị ọzọ nwere akara atọ kwụ ọtọ bụ́ ndị dị iche iche n’ibu. Mgbe nke ahụ gasịrị ọ jụrụ onye ọ bụla n’ime ìgwè ahụ akara nke ya na nke mbụ yiritara n’ime akara atọ ahụ. Azịza ya dị mfe. Mgbe a jụrụ ha ugboro ole na ole, ha nile kweere. Ma ná nnwale nke atọ, ihe gbanwere.

Dị ka ọ dị ná mbụ, ọ dị mfe ikwu akara nke ya na ibe ya ha n’ibu. Ma onye ahụ a na-ele ule amaghị na a kwụrụ ndị ọzọ so n’ìgwè ahụ ụgwọ ime ka ndị so ná ndị e ji eme nchọpụta ahụ. Ha nile kwenyere n’azịza ahụ na-ezighị ezi. Gịnị meziri? Ọ bụ nanị pasent 25 nke ndị e lere ule nọgidesiri ike n’ihe ha maara bụ́ eziokwu. Ndị ọzọ nile kweere ihe ìgwè ahụ kwuru ọ dịkarịa ala otu ugboro—ọ bụ ezie na nke a pụtara ha ịgọnahụ ihe pụtara ìhè ha ji anya ha hụ nke ọma!

N’ụzọ doro anya, ndị mmadụ na-achọ ime ihe otú ndị nọ ha gburugburu si eme—nke na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-agọnahụ ọbụna ihe ha maara bụ́ eziokwu. Ọtụtụ ndị na-eto eto enwewo mmetụta nke nrụgide a. Daniel, bụ́ onye dị afọ 16, kwetara, sị: “Nrụgide ndị ọgbọ pụrụ ime ka ị gbanwee. Mgbe gị na ọtụtụ mmadụ nọ, nrụgide ahụ na-adịwanye ukwuu. I nwere ike ịmalite chewa na ihe ha na-eme ziri ezi.”

Angie, onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, kọrọ otu ihe atụ nke nrụgide dị otú ahụ a na-enwe n’ụlọ akwụkwọ, sị: “Mgbe ị nọ na kọleji, ị na-ewere ụdị uwe ị na-eyi dị ka ihe dị oké mkpa. Ị ghaghị inwe ụdị uwe ndị nwere aha na-ewu ewu. Ị chọghị n’ezie imefu $50 maka otu efe—gịnị mere  mmadụ ga-eji chọọ ime nke ahụ?” Dị ka Angie tụrụ aro ya, o siri ike ịchọpụta nrụgide ahụ mgbe ọ na-emetụta gị. Nrụgide ndị ọgbọ ò nwere ike imetụta anyị n’ihe ndị dị mkpa karị?

Ihe Mere Nrụgide Ndị Ọgbọ Pụrụ Iji Dị Ize Ndụ

Ka e were ya na ị na-egwu mmiri n’oké osimiri. Ka ị na-egwu mmiri, ebili mmiri eburu gị na-aga, e nwekwara ikike ndị dị ike pụrụ ịnọ n’ọrụ bụ́ ndị ị na-amaghị. Ebili mmiri ahụ na-ebu gị aga n’ikperé mmiri, ma a pụkwara inwe mmiri na-achị ọkụ n’okpuru. Nwayọọ nwayọọ ọ na-ebu gị na-aga akụkụ akụkụ. N’ikpeazụ mgbe i lere anya n’ikperé mmiri ahụ, i nwekwaghị ike ịhụ ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị. Ị maghị na mmiri ahụ na-achị ọkụ eburula gị banye n’otu akụkụ dị nnọọ anya! N’otu aka ahụ, ka anyị na-arụ ọrụ ndị dịịrị anyị n’ụbọchị, a na-emetụta echiche anyị mgbe nile. Tupu anyị achọpụta ihe na-emenụ, mmetụta ndị a nwere ike iburu anyị pụọ nnọọ n’ụkpụrụ ndị anyị chere na anyị ga-ejigidesi ike mgbe nile.

Dị ka ihe atụ, Pita onyeozi bụ nwoke nwere obi ike. O ji mma agha mee ihe n’atụghị egwu mgbe o chere ìgwè mmadụ ahụ obi tara mmiri ihu n’abalị ahụ e jidere Jizọs. (Mak 14:43-47; Jọn 18:10) N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị nrụgide ndị ọgbọ dubara ya ile mmadụ anya n’ihu n’ụzọ pụtara ìhè. O zeere Ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst—n’agbanyeghị na o nwetaworị ọhụụ sitere n’aka Kraịst nke gwara ya ka ọ ghara ile Ndị Jentaịl anya dị ka ndị na-adịghị ọcha. (Ọrụ 10:10-15, 28, 29) Ọ pụrụ ịbụ na o siiri Pita ike iche nleda anya nke ndị mmadụ ihu karịa iche ọnụ mma agha ihu! (Ndị Galeshia 2:11, 12) N’ezie, nrụgide ndị ọgbọ pụrụ ịdị ize ndụ.

Ọ Dị Oké Mkpa Ịghọta Ike nke Nrụgide Ndị Ọgbọ

Ihe atụ nke Pita pụrụ ịkụziri anyị ihe mmụta dị mkpa. Mmadụ ịgbasi ike n’ụzọ ụfọdụ apụtaghị ịgbasi ike n’ihe nile. Pita nwere ebe ndị ọ na-adịghị ike, dị ka anyị nile nwere. N’agbanyeghị onye anyị bụ, ọ dị anyị mkpa ịmata ebe ndị anyị na-adịghị ike. Anyị nwere ike iji obi eziokwu jụọ onwe anyị, sị: ‘Olee ebe m na-adịghị ike? M̀ na-enwe agụụ siri ike ibi ndụ okomoko? Mpako n’ihi ihe ndị m rụzuru ọ̀ gbanyela mkpọrọgwụ n’obi m? Ruo n’ókè ha aṅaa ka m chọrọ inweta otuto, ùgwù, na ịbụ onye a ma ama?’

Ikekwe ọ dịghị mgbe anyị ga-akpachara anya tinye onwe anyị n’ihe ga-emerụ anyị ahụ́ site n’ịhọrọ isoro ndị na-eme omume rụrụ arụ bụ́ ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ndị na-enwe mmekọahụ aghara aghara na-akpakọrịta. Otú ọ dị, gịnị banyere adịghị ike anyị ndị na-apụtachaghị ìhè? Ọ bụrụ na anyị ahọrọ isoro ndị ga-emetụta anyị n’akụkụ anyị na-adịghị ike na-akpakọrịta n’ụzọ chiri anya, mgbe ahụ anyị na-etinye onwe anyị n’ọnọdụ ga-eme ka anyị bụrụ ndị nrụgide ndị ọgbọ ga na-achịkwa—ikekwe ọ ga-emerụ anyị ahụ́ ruo ebighị ebi.

Otú ọ dị, akụkọ ọma e nwere bụ na ọ bụghị nrụgide ndị ọgbọ nile dị njọ. Ànyị nwere ike ịchịkwa nrụgide ndị ọgbọ—ọbụna mee ka ọ baara anyị uru? Olee otú anyị pụrụ isi lụso nrụgide ndị ọgbọ na-adịghị mma ọgụ? A ga-atụle ajụjụ ndị ahụ n’isiokwu “Ndị Na-eto Na-ajụ sị . . . ” nke na-abịa n’ihu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Nchọpụta dị mfe na-egosi ịbụ eziokwu nke ọ̀tụ̀tụ̀ ikuku. Ọ bụrụ na i were karama plastik ihe na-adịghị n’ime ya gaa n’elu ugwu, hapụ ya ka ikuku banye n’ime ya, kwuchie ya nke ọma, gịnị ga-eme karama ahụ mgbe i si n’elu ugwu ahụ na-agbadata? Ọ ga-akụkpọ. Ọ̀tụ̀tụ̀ ikuku gbara karama ahụ gburugburu karịrị nnọọ ọ̀tụ̀tụ̀ ikuku na-adịchaghị arọ bụ́ nke dị n’ime ya.

[Foto dị na peeji nke 15]

Gburugburu ebe obibi ebe a hụrụ ihe onwunwe n’anya pụrụ ịkwalite nrụgide ndị ọgbọ gabigara ókè