Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Kwesịrị Ịmara Banyere Krismas

Ihe I Kwesịrị Ịmara Banyere Krismas

 Echiche nke Bible

Ihe I Kwesịrị Ịmara Banyere Krismas

ỌTỤTỤ nde mmadụ gburugburu ụwa na-akwadebe maka oge ememe Krismas nke afọ 2002. Ikekwe ị bụ otu n’ime ha. N’aka nke ọzọ, e nwere ike ị dịghị ekere òkè n’akụkụ ndị metụtara okpukpe nke ememe a na-ewu ewu. Nke ọ sọrọ ya bụrụ, o yighị ka ị ga-agbanahụ mmetụta nke Krismas. Ọ na-emetụta azụmahịa na ntụrụndụ, ọbụna n’ala ndị na-abụghị nke Ndị Kraịst.

Gịnị ka ị maara banyere Krismas? Bible ọ̀ kwadoro ememe ncheta ọmụmụ Kraịst? Olee ihe ndị mere e ji malite ime ememe a na-ewu ewu nke a na-eme na December 25 ọ bụla?

A Machibido Krismas Iwu

Ọ bụrụ na i jiri obere oge nyochaa okwu a, ị ga-achọpụta na Krismas amaliteghị n’ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta Bible nke okpukpe dị iche iche kwetara nke a. N’iburu nke ahụ n’uche, o kwesịghị iju gị anya na n’England, Nzukọ Ndị Isi Cromwell nyere iwu n’afọ 1647 na Krismas ga-abụ ụbọchị iru újú maka mmehie, ma mesịa machibido ya iwu kpam kpam n’afọ 1652. Kwa afọ, malite n’afọ 1644 ruo n’afọ 1656, Nzukọ Ndị Isi ma ụma na-ezukọ na December 25. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Penne L. Restad si kọọ, “ndị ụkọchukwu bụ́ ndị kwusara banyere ọmụmụ Kraịst tinyere onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị a tụbara n’ụlọ mkpọrọ. Ndị na-eje ozi na chọọchị pụrụ ịkwụ nhá n’ihi iji ihe ndị e ji achọ ụlọ mma n’oge Krismas chọọ ụlọ ụka ha mma. Iwu kwadoro ka a na-akpọghe ụlọ ahịa n’ụbọchị Krismas dị ka a ga-asị na ọ bụ ụbọchị azụmahịa ndị ọzọ.” N’ihi gịnị ka e ji mee ihe ndị a gabigara ókè? Ndị Puritan Na-achọ Ka E Nwee Mgbanwe kweere na chọọchị ahụ ekwesịghị iguzobe omenala ndị na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ma kesaa akwụkwọ ndị na-akatọ ememe Krismas.

Àgwà yiri nke ahụ pụtara ìhè n’Ebe Ugwu America. N’agbata afọ 1659 na afọ 1681, a machibidoro Krismas iwu na Massachusetts Bay Colony. * Dị ka iwu e tiri mgbe ahụ si dị, a gaghị eme ememe Krismas n’ụdị ma ọ bụ n’ụzọ ọ bụla. A ga-eri ndị dara iwu a nhá. Ọ bụghị nanị na ndị Puritan nọ na New England enweghị mmasị ime ememe Krismas, ọ masịghịkwa ìgwè ụfọdụ nọ n’obodo Delaware, New Jersy, New York nakwa Pennsylvania. Ndị Quaker nke Pennsylvania nọgidesiri ike n’echiche ha banyere ememe a dị nnọọ ka ndị Puritan. Otu akwụkwọ na-ekwu na “nwa oge mgbe ndị America nweresịịrị onwe ha, Elizabeth Drinker, onye bụ́ onye Quaker n’onwe ya, kewara Philadelphia ụzọ atọ. E nwere ndị Quaker ‘na-ewereghị ya [Krismas] dị ka ụbọchị pụrụ iche karịa ụbọchị ọzọ,’ nwee ndị na-eme ya maka okpukpe, nweekwa ndị ọzọ bụ́ ndị ‘na-eji ya emere oge oké oriri na nkwari na aṅụrụma.’”

Henry Ward Beecher, bụ́ onye America a ma ama na-ekwu okwuchukwu, onye a zụlitere n’ezinụlọ na-ekpe okpukpe Calvin, amachaghị banyere Krismas ruo mgbe ọ gbara afọ 30. “Nye m, Krismas abụghị akụkụ nke ndụ m,” ka Beecher dere n’afọ 1874.

Ndị chọọchị Baptist na ndị Congregationalist nke oge mbụ ahụghịkwa ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ ọ bụla maka ime ememe ọmụmụ Kraịst. Otu akwụkwọ  na-ekwu na ọ bụ na December 25, 1772, ka Chọọchị Baptist nke dị na Newport [Àgwàetiti Rhode] mere ememe Krismas na nke mbụ ya. Nke ahụ bụ ihe dị ka afọ 130 e guzobesịrị chọọchị Baptist mbụ na New England.

Mmalite nke Krismas

Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-ekweta, sị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị a mụrụ Kraịst. Oziọma ndị ahụ ekwughị ụbọchị ma ọ bụ ọnwa ọ bụ . . . Dị ka nchepụta H. Usener si dị . . . bụ́kwa nke ọtụtụ ndị ọkà mmụta Bible nke oge a kwenyere na ya, e wepụtara etiti oge oyi (December 25 na Kalenda Julius, January 6 na nke ndị Ijipt) dị ka ụbọchị a mụrụ Kraịst, n’ihi na n’ụbọchị ahụ, mgbe anyanwụ malitere ịlaghachi n’ebe ugwu, ndị ọgọ mmụọ na-efe Mithra mere ememe dies natalis Solis Invicti (ụbọchị ọmụmụ nke chi anyanwụ a na-apụghị imeri emeri). Na Dec. 25, 274, Aurelian akpọsaalarị na chi anyanwụ bụ onye nchebe bụ́ isi nke alaeze ukwu ahụ ma rara otu ụlọ nsọ dị na Campus Martius nye ya. Krismas malitere mgbe ofufe nke anyanwụ jupụtara na Rom karịsịa.”

Cyclopœdia nke M’Clintock na Strong dere na-ekwu, sị: “Ọ bụghị Chineke guzobere ememe Krismas, ọ maliteghịkwa n’A[gba] Ọ[hụrụ]. A pụghị ịchọta ụbọchị a mụrụ Kraịst n’A[gba] Ọ[hụrụ] ma ọ bụ, n’ezie, n’ebe ọ bụla ọzọ.”

“Aghụghọ Efu”

Dabere n’ihe e kwuru n’elu, ezi Ndị Kraịst hà kwesịrị ikere òkè n’omenala Krismas? Ọ̀ na-atọ Chineke ụtọ ma a gwakọta ofufe ya na nkwenkwe na ememe okpukpe nke ndị na-adịghị efe ya ofufe? Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị ná Ndị Kọlọsị 2:8, sị: “Nọrọnụ na nche: eleghị anya a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.”

Onyeozi ahụ dekwara, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere? Ọzọkwa, olee nkwekọ dị n’etiti Kraịst na Belial [Setan]? Ma ọ bụ olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwere?”—2 Ndị Kọrint 6:14, 15.

N’ihi ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha e ji n’aka, Ndịàmà Jehova adịghị ekere òkè n’ememe Krismas. N’ikwekọ n’Akwụkwọ Nsọ, ha na-agbalị ife ‘ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya,’ site n’idebe onwe ha “n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị.”—Jems 1:27.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Massachusetts Bay Colony, nke ndị Puritan si England guzobere na 1628, bụ ebe obibi kasị saa mbara ma na-enwe ihe ịga nke ọma na New England.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]

Nzukọ Ndị Isi nke England machibidoro Krismas iwu n’afọ 1652

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

“Nye m, Krismas abụghị akụkụ nke ndụ m”HENRY WARD BEECHER, ONYE AMERICA BỤ́ ỤKỌCHUKWU

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị ọgọ mmụọ na-efe Mithras na chi anyanwụ (nke e gosiri ebe a kpụrụ ya akpụ) mere ememe December 25

[Ebe E Si Nweta Foto]

Musée du Louvre, Paris