Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchọ A Na-achọ Njem Ụgbọelu Na-adịchaghị Ize Ndụ

Ọchịchọ A Na-achọ Njem Ụgbọelu Na-adịchaghị Ize Ndụ

 Ọchịchọ A Na-achọ Njem Ụgbọelu Na-adịchaghị Ize Ndụ

NANI izu ole na ole tupu September 11, Alex chere na ọ fọrọ nke nta ka ụjọ ọ na-atụ iji ụgbọelu eme njem pụchaa ya n’ahụ́. Ka ụgbọelu ndị njem ọ nọ na ya hapụrụ Athens na-aga Boston, ụjọ malitere ịtụ manịja a nke ngalaba ụlọ ọrụ nke na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze, bụ́ onye dị afọ 42—obi ya malitere ịkụ n’ike n’ike, ọsụsọ malitekwara ịgba ya n’ọbụ aka nakwa n’egedege ihu.

Ma, ọ maara ihe ọ dị ya mkpa ime. Ọkachamara n’ịgwọ ọrịa bụ́ onye na-agbalị inyere ya aka ime ka ụjọ ọ na-atụ iji ụgbọelu mee njem pụọ ya n’ahụ́ adịwo mbụ gwa ya ka ọ na-ekuru ume nke ọma, na-ese onyinyo ebe ndị mara mma, na-ejisi aka oche ya ike ma na-ahapụ ya ugboro anọ n’otu minit. Mgbe nṅagharị na ụzụ ahụ nke na-emenye egwu bịara chọọ isiri ya ike ịnagide, Alex ji anya nke uche ya malite ise onyinyo ebe ọ nọ n’akụkụ ọdọ mmiri dị jụụ. “Echere m na m na-enwe ezi ọganihu,” ka Alex kwuru.

Ọtụtụ nde ndị na-eji ụgbọelu eme njem enwewo mgbe ha tụrụ njem ụgbọelu ụjọ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ ndị amalitewo ịga klas ndị a na-enye ihe ọmụmụ na-enyere mmadụ aka ịkwụsị ịtụ iji ụgbọelu eme njem ụjọ, na-abụ ndị ndị òtù ezinụlọ ha, ndị were ha n’ọrụ, ụlọ ọrụ ụgbọelu bụ́ ndị ebumnobi ha bụcha ime ka ha kweta iji ụgbọelu mee njem na-arụgidekarị. Nye ihe ka ọtụtụ ná ndị njem, ihe ọmụmụ ndị ahụ bara uru; ọtụtụ klas ihe ọmụmụ ndị ahụ na-etu ọnụ na ha enwewo ihe ịga nke ọma ruru pasent 90.

Ma September 11 ahụ gbanwere ihe nile  ahụ. Alex kwụsịrị ịga ihe ọmụmụ ahụ ọ na-aga ozugbo. N’ịbụkwara ụlọ ọrụ were ya n’ọrụ ndakpọ olileanya, ọ kagbukwara atụmatụ ndị e mere ka o jiri ụgbọelu mee njem iji zute otu onye a ma ama bụ́ onye a na-atụ anya ga-aghọ onye ahịa ha. “Ụjọ m na-atụ iji ụgbọelu eme njem na mwakpo ndị na-eyi ọha egwu na-eme,” ka Alex kwuru, “karịrị ihe m ga-enwe ike ịnagide. Usoro ọgwụgwọ akwadebeghị m maka nke ahụ.”

Iji Nlezianya Nyochaa Usoro Nchebe

Ndị na-eji ụgbọelu eme njem bụ́ ndị ụjọ na-atụ na-ekwukwa na a jụrụ ndị ahụ jichiri ụgbọelu ndị ahụ na September 11 otu usoro ajụjụ ndị a na-ajụkarị ndị na-eji ụgbọelu eme njem, ndị dị ka: “Ọ̀ dị onye ị na-amaghị nke gwara gị ka i jidere ya ihe n’ụgbọelu a? Ọ̀ dị ihe ndị i ji na-eme njem ị na-ahụghịzi kemgbe ị kwakọtachara ha?” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ahụ jichiri ụgbọelu ndị ahụ zara ihe ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị mmadụ na-aza: “Ee, e!” Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe banyere nchebe na-elekwa mbanye ha banyere n’ụgbọelu ndị ahụ n’ụzọ gara nke ọma anya dị ka ihe àmà na-egosi na usoro nchebe ndị njem ụgbọelu esighịzi ike. “Ọ dịghị onye ma ọ bụ ihe pụrụ ịgbanwe ọnọdụ ahụ,” ka Jim McKenna, bụ́bu onye ntụzi ọrụ nke Òtù Na-ede Akụkọ Ndị Metụtara Adịghị Ize Ndụ nke Ụgbọelu kwuru. “Ngụkọta nke ụgbọelu anọ e jichiri ma bibie, na ọtụtụ puku ndị e gburu, pụrụ izu ịgbanwe ọnọdụ ahụ.”

N’ihi mkpọka nke ụgbọelu ndị ahụ gburu ọtụtụ mmadụ, e nyobasiwela anya ike n’ihe nile metụtara ọdụ ụgbọelu na usoro nchebe ụgbọelu. Ná nnọkọ nke otu kọmitii ndị ome iwu hiwere nwere, nnukwu onyeisi Ngalaba Na-ahụ Maka Njem na United States, bụ́ Kenneth M. Mead, kwuru, sị: “N’agbanyeghị usoro nchebe ndị dịbu adị na ndị ọhụrụ dị mkpa, a ka nwere ntụpọ ndị na-emenye egwu n’usoro nchebe nakwa ụfọdụ ebe ndị a na-enweghị nchebe na ha . . . bụ́ ebe ndị e kwesịrị ime ka ha dị nchebe.” Gịnị ka a na-eme iji hụ na e chebere ebe ndị ahụ?

Inyocha Ndị Njem Ndị Pụrụ Ịdị Ize Ndụ

Mgbe a jụrụ nnukwu ọfịsa nchebe n’otu ụlọ ọrụ ụgbọelu buru ibu dị na United States ma ọ̀ na-atụ  ụjọ iji ụgbọelu eme njem, n’egbughị oge ọ zara ee e. Ọ kọwara na ya nwere obi ike n’usoro na-eji kọmputa enyocha ndị njem, bụ́ nke na-edekọ tiketi ọ bụla ụlọ ọrụ na-eji ya eme ihe rere. Usoro a na-egosi ma à zụtara tiketi n’ọfịs ụlọ ọrụ ụgbọelu na-ere tiketi ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka ime njem ma ọ bụ n’Intanet. Ọ na-edekọ ihe ndị ọzọ dị ka ma onye ahụ ọ̀ na-eme njem ahụ nanị ya ka ndị òtù ezinụlọ ya ma ọ bụ ndị ọzọ hà so ya eme njem, tinyere ihe ndị dị ka ma ò nwewo ihe a maara jikọrọ ya na mpụ ma ọ bụ ma è nwewo mgbe ọ̀ kpara àgwà na-ekwesịghị ekwesị megide ụlọ ọrụ ụgbọelu ahụ, ndị ọrụ ha, ma ọ bụ n’ebe ihe onwunwe ha dị.

Oge ọ bụla onye njem gara maka ihe ndị dị mkpa a na-eme n’ọdụ ụgbọelu tupu a banye ụgbọelu, a na-achọpụta ihe ọmụma ndị a ma debanye ihe ọmụma ndị kasị ọhụrụ, gụnyere ihe onye ahụ zara n’ajụjụ ndị a jụrụ ya mgbe a na-enyocha ya. Ihe ọmụma ndị a na-enweta kpọmkwem na usoro a na-eji etinye ihe ọmụma ahụ na kọmputa nakwa nke e ji achọpụta àgwà onye ahụ ka bụ otu n’ime ihe nzuzo ndị ụlọ ọrụ ahụ kasị echebe nke ọma. Gburugburu ụwa, a na-eji usoro dịgasị iche iche yiri usoro nke iji kọmputa enyocha ndị njem eme ihe, ụfọdụ bụ ndị e jikọtara ha na ụlọ ọrụ ndị uwe ojii nke gọọmenti na nke mba nile, dị ka òtù Interpol. N’ọtụtụ ọdụ ụgbọelu ndị dị na Europe, usoro na-enyocha akwụkwọ ikike ngafe pụrụ idekọ ma mata oge na ebe onye njem jiworo ụgbọelu gaa nakwa njem ndị o meworo site n’otu mba gaa ná mba ọzọ.

A na-eji usoro ịchọpụta àgwà mmadụ a eme ihe n’ebumnuche na ndị nwere ajọ obi pụrụ ịbụ ihe ize ndụ karịa ihe ndị dị ka ibu ndị a na-ebu abanye n’ụgbọelu na akpa ndị e nyefeworo ụlọ ọrụ ụgbọelu. N’ihi ya, iji mee ka ọdụ ụgbọelu bụrụkwuo nke na-adịghị ize ndụ, a na-atụle ugbu a ma à ga na-eji ngwá ndị na-enyocha ihe ndị e ji amata mmadụ na kaadị ndị na-echekwa ihe ọmụma banyere mmadụ na-eme ihe, a malitewokwa iji ya eme ihe n’ebe ụfọdụ ka ọ dị ugbu a.

E wezụga ịchọpụta àgwà ndị njem, ọchịchọ nke igbochi ihe ndị dị ize ndụ ịbanye n’ụgbọelu bụ ihe ọzọ dị mkpa na-akpatara nnọọ ndị na-ahụ maka nchebe n’ọdụ ụgbọelu nchegbu. Nnyocha e ji ígwè X-ray eme nwere ntụpọ nke ya. Ọ na-esiri ndị na-ahụ maka nchebe n’ọdụ ụgbọelu ike ịnọgide na-etinye uche n’ihe ruo ogologo oge n’ihi na ikiri ibu ndị onyinyo ha dị inyoghị inyoghị n’ígwè X-ray pụrụ ịbụ ọrụ na-agwụ ike. Ọzọkwa, ngwá ọrụ ndị e ji achọpụta ígwè na-anọgide na-agba àmà ụgha ma ọ hụ mkpịsị ugodi ụlọ, mkpụrụ ego, na isi belt.

Iwu nke Siri Ike Karị

Iji hụ maka ntụpọ ndị dị otú ahụ e nwere, gọọmenti dị iche iche emeghachiwo omume site n’iti iwu ndị na-eme ka usoro nchebe ọdụ ụgbọelu sie ike karị. Na United States, nke a na-achọ na ka ọ na-erule ná ngwụsị afọ 2002, ka a malite itinye n’ọrụ ụkpụrụ nke ibu nanị ibu ndị ndị nwe ha nọ n’ụgbọelu ahụ, inyocha ihe ọ bụla e bubara n’ime ụgbọelu nke ọma, na inyocha ibu nile e nyefeworo ụlọ ọrụ ụgbọelu iji lee ma bọmbụ ọ̀ dị na ha. A malitewo usoro nke ime ka ọnụ ụzọ e si abanye n’ebe ndị na-anya ụgbọelu na-anọ sikwuo ike ma bụrụkwuo nke e chebere echebe. A na-enyekwu ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọelu ọzụzụ banyere ụzọ ha ga-esi mee ihe n’oge ọdachi. A kpọgawokwa ndị soja bu égbè n’ụgbọelu ndị njem.

N’izu na n’ọnwa ndị sochiri September 11, e jiri  aka nyochaa ndị njem na ibu n’ọtụtụ ọdụ ụgbọelu gburugburu ụwa. N’ọnọdụ ụfọdụ, e ji aka nyochaa ndị njem na ihe ndị ha bu banye n’ụgbọelu ugboro abụọ. Ụdị mkpachara anya a abụghị ihe ọhụrụ nye ndị Europe na-eme njem, bụ́ ndị hụrụ ka a na-eme ha n’ebe nile n’afọ ndị 1970, mgbe ijichi ụgbọelu ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu. A machibidowo ndị njem iwu ugbu a iji ihe ọ bụla ọnụ ya dị nkọ banye n’ụgbọelu. Ọ bụ nanị ndị njem nwere ezigbo tiketi ka a na-ekwe ka ha gafere ebe a na-enyocha mmadụ. Ịnọ n’ogologo ahịrị dị iche iche nke ndị na-echere ka e nyochaa ha na ịhụ ndị agha bu égbè bụ́ ndị nọ n’ọdụ ụgbọelu, amarala ọtụtụ ndị ahụ́.

Iji Ọrụ Nlekọta Kpọrọ Ihe

Cheedị echiche banyere ọnọdụ a a na-enwekarị: Mgbe onye njem gafesịrị ọtụtụ ebe ndị a na-enyocha mmadụ, n’ikpeazụ ọ chọtara onwe ya n’ebe ndị njem na-esi abanye n’ụgbọelu, na-eche ịnụ mgbe onye ọrụ ụgbọelu ga-ama ọkwa ka a banyewa n’ụgbọelu. “Ị̀ nụkwara?” ka onye njem yi kootu na-acha ntụ ntụ bụ́ onye nọ ya n’akụkụ jụrụ. “Ụgbọelu a agaghị apụ n’oge n’ihi na e nwere ihe ndị a ga-arụzi na ya.” Ya erugharịa anya ma gbakwụnye, sị: “Ya abụkwala na ha ga-eme ka ụgbọelu a buru anyị gawa n’ejighị injin!”

Ihe ọtụtụ ndị njem na-amataghị bụ na ụlọ ọrụ ụgbọelu nwere usoro nnyocha siri ike a na-eji nlezianya eme. A na-amata ihe ndị ga-adị mkpa ka a rụzie site n’iji nlezianya nyochaa akwụkwọ ndekọ njem ụgbọelu bụ́ nke na-ekwu ihe ndị mere na njem ndị ahụ. N’eziokwu, ụlọ ọrụ ụgbọelu ndị dị otú ahụ na-achọ ka e jiri nlezianya na-enyocha ụgbọelu na injin ha ma na-arụzi ha dị ka e si dokwaa ya—ọtụtụ ugboro karịa nnọọ ka a na-eme ụgbọala—ọbụna ma ọ bụrụ na ụgbọelu ahụ enwetụbeghị nsogbu n’ihe ndekọ ya.

Otu onye na-arụzi ụgbọelu n’otu nnukwute ụlọ ọrụ ụgbọelu pụrụ ịgba akaebe nke a. “N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 15 m nọworo n’ụlọ ọrụ a,” ka ọ  na-ekwu, “ahụtụbeghị m ma ọ bụ soro onye ọ bụla na-arụzi ụgbọelu bụ́ onye na-ejighị nchebe kpọrọ oké ihe kwurịta okwu. E kwuwerị, ndị enyi na ndị ezinụlọ nke onye ọrụ ahụ na-ejikwa ụgbọelu ọ na-arụzi eme njem, n’ihi ya ha adịghị eleghara ihe ọ bụla anya.”

Ndị na-arụzi ụgbọelu na-eburu n’uche mgbe nile na ha ga-aza ajụjụ maka ihe ọ bụla merenụ. Otu n’ime ha na-echeta, sị: “Agaghị m echezọ otu abalị ụgbọelu DC-10 anyị kpọkara na Sioux City, Iowa. Ana m arụ ọrụ dị ka onye na-arụzi ụgbọelu mgbe ahụ, anọkwa m na-enyocha ma na-arụzi ụmụ obere ihe n’ọdụdụ nakwa na nku ụdị ụgbọelu ahụ. N’oge ahụ, anyị nwetara ihe ọmụma dị nnọọ nta banyere ihe mere ụgbọelu ahụ jiri kpọkaa. Ana m echeta otú m si tinye nnọọ uche m n’ọrụ n’ụzọ pụrụ iche n’abalị ahụ, na-eche, sị: ‘Gịnị mere ụgbọelu ahụ? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ dị ihe mmadụ hapụrụ ime nke m pụrụ ịchọpụta ugbu a wee si otú ahụ gbochie ọdachi dị otú ahụ ime ọzọ? Ànọ m na-eme ihe nile kpọmkwem otú m kwesịrị isi mee ya?’ Anọrọ m ogologo oge n’ọdụdụ ụgbọelu ahụ n’abalị ahụ, na-enyocha ma na-eche echiche.”

A na-enye ndị na-arụzi ụgbọelu ọzụzụ mgbe nile n’ihe nile metụtara ọrụ ha, site n’ọrụ ndị a na-arụ mgbe nile ruo ná nnyocha ndị tara akpụ nakwa nkà nke ịchọpụta na idozi nsogbu dị iche iche. Kwa afọ, a na-etinye ihe ndị ọhụrụ n’ihe ọmụmụ e ji enye ndị ọrụ ụgbọelu ọzụzụ iji hụ na e lekọtara ụdị ọnọdụ ọ bụla a pụrụ ichetụ n’echiche nke pụrụ ịdapụtanụ, site na nke a na-ahụkarị ruo na nke a na-adịghị ahụkebe.

Mgbe e nwesịrị ọdachi ụgbọelu,  a na-atụle ihe ọmụma e nwetara ma tinye ha n’ụgbọelu nnwale na-egosi ihe atụ nke otú ihe mberede ahụ pụrụ isiwo mee. Ndị na-anwale ụgbọelu na ndị injinia ụgbọelu na-anya ụgbọelu nnwale ahụ iji mata ihe ngwọta ndị ọzọ ha pụrụ ịchọpụta iji mee ka ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọelu nwee ike idozi nsogbu ndị yiri ya nke ọma karị n’ọdịnihu. Mgbe nke ahụ gasịrị, a na-edokwa usoro ọzụzụ ndị metụtara ọnọdụ a maka ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọelu ka e wee nwee ike inye ha ntụziaka ụfọdụ a kapịrị ọnụ. Nnyocha ndị dị ka nke a na-eme ka a gbanwee ọdịdị na akụkụ ahụ́ ụgbọelu, na-enwe olileanya na mmebi dị otú ahụ pụrụ ịbụ nke a ga-amụta ihe na ya ma bụrụ nke a pụrụ ibelata.

Otu onye na-arụzi ụgbọelu kwubiri, sị: “A na-agwa anyị nile na ‘ịdị nchebe adịghị abịara onwe ya—a ghaghị ime ndokwa maka ya.’”

Iji Ụgbọelu Eme Njem Ọzọ

Mgbe ọnwa anọ Alex kpebiri n’onwe ya na ya agaghị eji ụgbọelu mee njem ọzọ gasịrị, o kpebiri na oge eruwo ka ya mee ihe banyere ụjọ ya na-atụ. Ọnụnọ ndị uwe ojii na ndị soja nọ n’Ọdụ Ụgbọelu Mba Nile nke Logan dị na Boston eyighị ka ọ tụrụ ya ụjọ. Ahịrị ndị dị ogologo nke ndị na-egosi tiketi ha na nnyocha e ji aka na-enyocha ibu ya eweghị ya iwe ma ọlị.

Nye Alex, ihe ndị ahụ bụ ihe mmesighachi obi ike n’ọchịchọ ọ na-achọ ka e nwee njem ụgbọelu ndị na-adịchaghị ize ndụ. Ọsụsọ ka na-agbatụ ya, obi ka na-akụtụkwa ya akụ. Ma, ka Alex na-etinye ibu ya e ji aka nyochaa n’ebe a na-etinye ibu n’elu ebe oche ya dị, o kwuru, sị: “Ugbu a, obi eruola m ala karị.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Iji Ụgbọelu Eme Njem

Dị ka atụmatụ ndị e mere gosiri, ihe dị ka 1 onye n’ime mmadụ 5 ọ bụla na-eji ụgbọelu eme njem na-atụ ụjọ. Otú ọ dị, ọ bụghị ha nile na-eche na iji ụgbọelu eme njem dị ize ndụ. Ọtụtụ mgbe, nchegbu ndị ha na-enwe na-esite n’ụjọ ndị ọzọ ha na-atụ, ndị dị ka ịtụ ebe dị nnọọ elu ụjọ ma ọ bụ ịtụ ebe ndị mmadụ jupụtara ụjọ.

[Chaatị dị na peeji nke 8]

RUO ÓKÈ HA AṄAA KA O YIRI KA À GA-ENWE AJỌ IHE MBEREDE?

Ohere e nwere na Ohere e nwere na a

a ga-enwe ya n’ime ga-enwe ya n’oge

otu afọ bụ 1 n’ime: ndụ nile bụ 1 n’ime:

Ụgbọala 6,212 81

Igbu ọchụ 15,104 197

Ígwè ọrụ 265,000 3,500

Ihe mberede ụgbọelu 390,000 5,100

Mmiri iri mmadụ

n’ọkwá ịsa ahụ́ 802,000 10,500

Anụmanụ na okooko

osisi ndị nwere nsí nde 4.2 55,900

Àmụ̀mà nde 4.3 56,000

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Kansụl Na-ahụ Maka Nchebe nke Mba

[Foto dị na peeji nke 6]

Usoro nchebe ka ukwuu n’ọdụ ụgbọelu

[Ebe E Si Nweta Foto]

AP Photo/Joel Page

[Foto dị na peeji nke 7]

Ịchọpụta àgwà na inyocha ndị njem

[Foto dị na peeji nke 7]

Usoro e meziwanyere emeziwanye esi arụzi ụgbọelu

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndị na-anya ụgbọelu bụ ndị ọkachamara a zụrụ nke ọma