Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okpukpe Dị Iche Iche Agaa Assisi Ịchọ Udo

Okpukpe Dị Iche Iche Agaa Assisi Ịchọ Udo

 Okpukpe Dị Iche Iche Agaa Assisi Ịchọ Udo

“Ime ihe ike agaghị adị ọzọ ma ọlị! Agha agaghị adị ọzọ ma ọlị! Iyi ọha egwu agaghị adị ọzọ ma ọlị! Ka okpukpe nile mee ka ikpe ziri ezi na udo, mgbaghara na ndụ nakwa ịhụnanya, dịrị n’elu ụwa, n’aha Chineke!”—Popu John Paul nke Abụọ.

ASSISI, ỊTALI, January 24, 2002—Ndị Nnọchiteanya nke njikọ okpukpe dị iche iche nke ụwa gbakọtara ka ha kpee ekpere maka udo, bụ́ udo nke iyi ọha egwu, ekweghị ibe nọrọ, na ikpe na-ezighị ezi chọrọ ibibi. Ọ bụ popu mara ọkwa nzukọ ahụ ihe dị ka ọnwa abụọ mgbe Ụlọ Elu Abụọ ahụ Yiri Ibe Ha dakpọsịrị na New York City. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe jiri ịnụ ọkụ n’obi nabata òkù Vatican kpọrọ ha.

Ugboro abụọ tupu mgbe ahụ—otu oge n’afọ 1986, oge ọzọkwa n’afọ 1993—popu kpọrọ òkù maka ekpere otu ụbọchị n’otu obodo ahụ dị n’Ịtali. * Ihe karịrị otu puku ndị odeakụkọ sitere gburugburu ụwa bịara ikiri ihe a ga-eme ná nzukọ nke afọ 2002 a. Ọtụtụ okpukpe nwere ndị nnọchiteanya n’ekpere ahụ e kpere maka udo—ndị nke Krisendọm (ndị Katọlik, ndị okpukpe Lutheran, ndị Anglịkan, ndị okpukpe Ọtọdọks, ndị Metọdist, ndị okpukpe Baptist, ndị okpukpe Pentikọstal, ndị okpukpe Mennonite, ndị okpukpe Quaker, na ndị ọzọ), Alakụba, okpukpe Hindu, okpukpe Confucius, okpukpe Sikh, okpukpe Jain, okpukpe Tenrikyo, okpukpe Buddha, okpukpe ndị Juu, okpukpe Ọdịnala ndị dị n’Africa, okpukpe Shinto, na okpukpe Zoroaster. Ndị nnọchiteanya nke okpukpe ndị ọzọ, nakwa onye nnọchiteanya nke Kansụl Chọọchị Ụwa, bịakwara.

Nkwupụta Maka Udo

Nzukọ ahụ malitere n’elekere 8:40 nke ụtụtụ, mgbe “ụgbọ okporo ígwè udo” si n’otu obere ọdụ ụgbọ okporo ígwè Vatican kwọpụ. N’ịbụ nke nwere nkeji asaa ndị e tinyere ọtụtụ ihe ga-eme ka mmadụ nwee ntụsara ahụ́, helikọpta abụọ duuru ụgbọ okporo ígwè ahụ gawa iji chebe ya. Popu na ndị ndú okpukpe ndị ọzọ mere njem awa abụọ ruo Assisi. E nwere ọtụtụ ihe  nchebe—ihe dị ka otu puku ndị uwe ojii nọrọ na nche.

Ndị ndú okpukpe ahụ gbakọtara na mbara ámá ebe a na-eme ihe nkiri n’oge ochie nke e ji nnukwute ákwà marquee kpuchie elu ya. N’ime ya, e nwere nnukwute ebe ihe nkiri na-acha ọbara ọbara nke a rụrụ n’ọdịdị mkpụrụ akwụkwọ V bụ́ ebe ndị nnọchiteanya okpukpe dị iche iche nọ, oche popu adịrị n’etiti. Ọ dị otu osisi oliv dị n’akụkụ ebe ihe nkiri ahụ—ihe na-anọchite anya udo. N’ihu ebe ihe nkiri ahụ, e nwere ihe karịrị ndị ọbịa 2,000 e jiri nlezianya họta bụ́ ndị nọ na-ege ntị. Ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị Ịtali bụ́ ndị ọkwá ha kasị elu nọdụrụ ala n’ahịrị oche dị n’ihu. E kwutụ okwu, òtù ukwe buru ibu ekwee ukwe maka udo. N’akụkụ ndị ọzọ nke obodo ahụ, ọtụtụ puku mmadụ, bụ́ nke ndị na-eto eto mejupụtakarịsịrị, bugharịrị ihe ndị e dere okwu ndị na-akatọ agha n’ọtụtụ asụsụ ma na-abụ abụ maka udo. Ọtụtụ ndị bu alaka osisi oliv.

Mgbe popu nọdụsịrị ala n’ebe ihe nkiri ahụ, ọ nabatara ndị nnọchiteanya okpukpe dị iche iche. Ma, mgbe ha gụsịrị otu ukwe n’asụsụ Latin bụ́ nke dabeere n’Aịsaịa 2:4—bụ́ nke buru amụma banyere mgbe ‘mba na-agaghị ebuli mma agha megide mba’—ndị nnọchiteanya iri na abụọ, bụ́ ndị onye nke ọ bụla n’ime ha yi uwe e ji mara okpukpe ya, mere nkwupụta ndị siri ike maka udo. Ndị a bụ ụfọdụ n’ime ha.

“N’oge ihe akụkọ a, ọ dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa ịhụ ngosipụta nke udo na ịnụ nkwupụta nke olileanya.”—Kadinal François Xavier Nguyên Van Thuân.

Chineke “abụghị Chineke nke agha na esemokwu kama ọ bụ Chineke nke udo.”—Onyeisi Ndị Bishọp bụ́ Bartholomeus nke Mbụ.

“Ndịrịta iche okpukpe ekwesịghị ime ka [ndị mmadụ] leghara ndị dị iche anya, ma ọ bụ ọbụna kpọọ ha asị.”—Dr. Setri Nyomi, nke òtù World Alliance of Reformed Churches.

“Idé abụọ dị mkpa bụ́ ndị jigidere ezi udo dị n’etiti ụmụ mmadụ bụ ikpe ziri ezi na ịhụnanya ụmụnna.”—Chiifu Amadou Gasseto, onye nnọchiteanya nke okpukpe ọdịnala ndị dị n’Africa.

“Ọ bụ nanị udo dị nsọ, ọ dịghị mgbe ọ bụla agha dị nsọ!”—Andrea Riccardi, Chọọchị Katọlik.

Ụfọdụ ndị nnọchiteanya ahụ kwetara na ụta dịịrị nnọọ okpukpe maka ịkpata ekweghị ibe nọrọ na agha. Onye nnọchiteanya nke Njikọ Òtù Lutheran n’Ụwa Nile kwuru na ụwa abụwo nke “mara jijiji n’ihi oké ịkpọasị nke ikwenyesi ike n’ozizi bụ́ isi kpaliri.” Otu onye nnọchiteanya nke okpukpe ndị Juu kwuru, sị: “Okpukpe ekerewo òkè n’ịkpata ọtụtụ agha ndị dị egwu bụ́ ndị a kwafuru ọbara na ha.” Onye nnọchiteanya nke okpukpe ndị Hindu kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, ihe ndị mere n’oge gara aga na-egosi mgbe ndị kpọrọ onwe ha ndị nzọpụta nke okpukpe ji okpukpe gosipụta ike ha n’ahụ́ ndị mmadụ ma kpata nkewa.”

Mgbe ha katọsịrị iyi ọha egwu na agha n’ụzọ siri ike, ndị nnọchiteanya ahụ siri ebe ahụ pụọ, onye ọ bụla agaa n’ebe e kenyere ya, ịga kpegara chi ha dị iche iche ekpere maka udo.

Ekpere Maka Udo

Ndị nnọchiteanya nke okpukpe dị iche iche nke Krisendọm kpekọrọ ekpere ọnụ na chọọchị Roman Katọlik nke St. Francis, nke dịdewere  ili nke e si na ya nweta aha chọọchị ahụ. E jiri “ekpere Atọ n’Ime Otu” nke popu na ndị nnọchiteanya atọ ọzọ kpere malite ihe omume ahụ. E kpetụ ekpere, e kwetụ ukwe e ji eto udo, rịọtụkwa arịrịọ maka udo, gụtụkwa akụkụ dị iche iche nke Bible metụtara otu isiokwu ahụ. N’otu ekpere a rịọrọ ka e guzobe “okpukpe a na-ekewaghị ekewa.” Iji mechie ememe ahụ, ndị keere òkè na ya gụrụ Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe n’asụsụ Latin, bụ́ nke dabeere na Matiu isi 6, amaokwu nke 9 ruo 13.

N’otu oge ahụ, ndị nnọchiteanya nke okpukpe ndị ọzọ nọ n’ebe ndị ọzọ na-ekpe ekpere. N’otu ụlọ ezumezu nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ Mecca, ndị Alakụba gburu ikpere na kapet, na-akpọku Allah. Ndị Zoroaster, bụ́ ndị kpere ekpere n’ebe dịdewere ebe ndị okpukpe Jain na ndị okpukpe Confucius nọ, mụnyere ọkụ nsọ. Ndị nnọchiteanya nke okpukpe ọdịnala ndị dị n’Africa kpegaara mmụọ nke ndị nna nna ha hà ekpere. Ndị okpukpe Hindu rịọrọ chi ha maka udo. Ha nile rịọrọ chi ha dị ka ememe okpukpe ha si dị.

Nkwa E Kwekọrọ Ọnụ Ịkwalite Udo

Ndị nnọchiteanya ahụ gbakọtaghachiri n’okpuru ákwà marquee ahụ iji mechie ememe ahụ. Ndị mọnk nyere ndị nnọchiteanya ahụ oriọna ndị na-enwu enwu—ihe ndị na-anọchi anya olileanya maka udo. Ebe ahụ ewee maa mma. Mgbe ahụ, ndị nnọchiteanya ahụ gụgasịrị nkwekọrịta maka udo, onye nke ọ bụla kwuru ihe dị iche.

“Iwulite udo chọrọ mmadụ ịhụ onye agbata obi ya n’anya.”—Onyeisi Ndị Bishọp bụ́ Bartholomeus nke Mbụ.

“Ime ihe ike na iyi ọha egwu ekwekọghị n’ihe okpukpe pụtara n’ezie.”—Dr. Konrad Raiser, onye nnọchiteanya nke Kansụl Chọọchị Ụwa.

“Anyị na-arara onwe anyị nye ịkụziri ndị mmadụ banyere ịkwanyere ibe ha ùgwù na iji ha kpọrọ oké ihe.”—Bhai Sahibji Mohinder Singh, onye nnọchiteanya nke okpukpe Sikh.

“Udo nke ikpe ziri ezi na-adịghị na ya abụghị ezi udo.”—Bishọp ndị Ọtọdọks bụ́ Vasilios.

N’ikpeazụ, popu gụrụ okwu ndị ahụ dị ná mmalite isiokwu a. E mechiri nzukọ ngwakọta ofufe a site ná ndị nnọchiteanya ahụ ịmakụ onwe ha dị ka ihe na-egosi udo. E jiri ememe sochie okwu ndị e ji nlezianya kwadebe ma kwupụta n’ụzọ na-akpali akpali. Otú ọ dị, olee otú e si meghachi omume nye nnukwu ememe a?

‘Ọ Bụrụ na E Mee Ihe E Kwuru Eme’

Akwụkwọ akụkọ na ụlọ ọrụ telivishọn dị iche iche jara nzọụkwụ ahụ popu weere mma. Ọbụna ụfọdụ kpọrọ popu “ọnụ na-ekwuchitere Krisendọm nile.” Akwụkwọ akụkọ Vatican bụ́ L’Osservatore Romano kọwara nzukọ ahụ e nwere n’Assisi dị ka “ihe dị ịrịba ama ná mgbalị a na-eme iji kwalite udo.” Isi akụkọ nke akwụkwọ akụkọ bụ́ Corriere dell’Umbria bụ “Assisi Enye Udo Ìhè.”

Ọ bụghị ndị nile kiriri ihe merenụ nwere mkpali otú ahụ. Ụfọdụ kwuru na ha na-enwe obi abụọ n’ihi na n’agbanyeghị oge ndị ọzọ e kpere ekpere maka udo n’afọ 1986 na 1993, agha ndị a lụrụ n’aha okpukpe anọgidewo na-emekpọ ihe a kpọrọ mmadụ ọnụ. Ịkpọasị okpukpe kpalikwuru ogbugbu e gburu ndị mmadụ na Uganda, ebe bụbu Yugoslavia, Indonesia, Pakistan, Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, nakwa na Northern Ireland.

Akwụkwọ akụkọ Ịtali bụ́ La Repubblica kwuru na ụfọdụ ndị na-akatọ nnọkọ ahụ weere ya dị ka “nanị ihe ngosi.” Onye so ná Nzukọ Ndị Isi Europe kwuru na iji kwalite udo, ndị ji okpukpe kpọrọ ihe kwesịrị “ịdị na-eme omume n’ụzọ kwekọrọ n’Oziọma ahụ”—ya bụ, idebe okwu bụ́ “na-ahụ ndị iro gị n’anya, tụgharịakwa ntì nke ọzọ.” N’echiche ya, nke ahụ bụ ihe “ọ na-adịghị onye na-eme ya.”

Onyeisi nke Ndị Juu Nọ n’Ịtali kwuru na “ọ ga-adị mma ịhụ ihe ga-eme ugbu a, ya bụ, ma ọ bụrụ na a ga-eme ihe e kwuru eme.” Onye nnọchiteanya nke Ndị okpukpe Buddha nọ n’Ịtali kwukwara otu ihe ahụ, na-ekwu na mmadụ kwesịrị “ijide n’aka na arịrịọ ọ na-arịọ maka udo agaghị ejedebe nanị n’ịbụ ezi nzube.” Otu odeakụkọ, site n’ihe o dere na magazin Ịtali bụ́ L’Espresso, nyere echiche na nnọkọ ahụ e nwere  n’Assisi mezuru nzube ọzọ maka okpukpe Krisendọm bụ́ ndị ndị nnọchiteanya ha bịara nnọkọ ahụ. Ọ kpọrọ ya “njikọ aka megide enweghị mmasị n’okpukpe, enweghị ụkpụrụ, na ekweghị ekwe,” nakwa mgbalị ịlụso “ịgbasochi echiche ụwa anya” ọgụ bụ́ nke na-emetụta Europe n’agbanyeghị “ọmụma a maara ya kemgbe ụwa dị ka ebe bụ́ nke Ndị Kraịst.”

N’ime ndị katọsiri ihe omume ahụ ike karị bụ ndị na-agbaso ọdịnala okpukpe Katọlik, bụ́ ndị na-atụ egwu na a ga-eme ka ozizi chọọchị ha gharazie isi ike. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya na telivishọn, Vittorio Messori, bụ́ onye edemede Katọlik a maara nke ọma, kwuru na ihe ize ndụ dị na ya bụ na ihe ahụ e mere n’Assisi pụrụ ime ka a ghara ịmatacha ọdịiche dị n’etiti okpukpe dị iche iche. N’ezie, ndị isi chọọchị leziri anya iji zere ime ka e chee na ha na-agwakọta okpukpe dị iche iche. Popu n’onwe ya kwuru okwu iji gbaghaa ebubo dị otú ahụ. Ka o sina dị, nye ọtụtụ ndị, ụzọ e si mee ihe omume ahụ yiri ka ọ̀ na-egosi na okpukpe dị iche iche bụ nanị ụzọ dị iche iche e si agakwuru otu ikike ka elu.

Okpukpe na Udo

Otú ọ dị, gịnị ka njikọ okpukpe pụrụ ime iji mee ka udo dị? Ụfọdụ ndị na-eche na ajụjụ ahụ na-emegide onwe ya, n’ihi na okpukpe dị iche iche yiri ka hà na-eme ihe iji kpata agha karịa ka ha na-eme iji gbochie ya. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ekwuwo banyere ụzọ ndị isi ọchịchị siworo jiri okpukpe kpata agha. Otú ọ dị, ajụjụ na-ebilite bụ: N’ihi gịnị ka okpukpe dị iche iche jiworo kwe ka e jiri ha mee ihe?

Okpukpe dị iche iche nke Krisendọm, ma ọ dịghị ihe ọzọ, nwere ụkpụrụ dị nsọ bụ́ nke gaara enyere ha aka izere obi amamikpe nke ibu agha. Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ‘agaghị abụ akụkụ nke ụwa.’ (Jọn 15:19; 17:16) Ọ bụrụ na okpukpe dị iche iche nke Krisendọm biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwu ahụ, ha na ndị isi ọchịchị agaraghị ejikọta onwe ha, ha ewee na-akwado ma na-agọzi usuu ndị agha na agha.

N’ezie, iji bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwu ndị dị mma e kwuru n’Assisi, ndị ndú okpukpe aghaghị ịnọpụ iche n’ebe ndị isi ọchịchị nọ. Ọzọkwa, ha aghaghị izi ndị ha na-edu ụzọ nke  udo. Otú ọ dị, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ndị na-eme ihe ike n’ụwa gụnyere ọtụtụ ndị kwere na Chineke—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ, ndị na-ekwu na ha kwere na Chineke. N’oge na-adịbeghị anya, otu uche akwụkwọ akụkọ kwuru, sị: “N’oge na-adịghị anya mgbe Sept. 11 gasịrị, otu onye dere okwu ndị a na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ma na-akpali iche echiche n’otu mgbidi dị na Washington, D.C.: ‘Ezigbo Chineke Anyị, zọpụta anyị n’aka ndị kwere na gị.’”

Oké ngosi na ememe nile e mere n’Assisi azaghị ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị siri ike. Ma eleghị anya, ọ dịghị ajụjụ dị ọtụtụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe mkpa—ma ọ bụ na-enye ha nsogbu n’obi—karịa nke a: N’ihi gịnị ka o ji yie ka Chineke ọ̀ jụrụ ịza ekpere ndị okpukpe ndị e nwere n’ụwa kpeworo maka udo ruo ugbu a?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Iji matakwuo banyere ụbọchị ekpere maka udo nke afọ 1986 ahụ, biko lee Teta! nke November 8, 1988.

[Foto dị na peeji nke 21]

Ndị nnọchiteanya bu oriọna ndị na-enwu enwu—na-egosi olileanya e nwere maka udo

[Credit Line]

AP Photo/Pier Paolo Cito

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]

AP Photo/Pier Paolo Cito