Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Obere Mmehie Ihe Ghọrọ Ọdachi

Mgbe Obere Mmehie Ihe Ghọrọ Ọdachi

 Mgbe Obere Mmehie Ihe Ghọrọ Ọdachi

NA July 6, 1988, ndị na-arụ ọrụ n’ígwè ọrụ na-agbapu mmanụ bụ́ Piper Alpha, nke dị n’Oké Osimiri North, nọ na-arụzi otu pọmpụ na-eme ka gas ghọọ mmanụ ma ha arụchaghị ya. N’ihi enweghị nkwurịta okwu, ndị ọzọ bịara ọrụ mgbe ha lara kpọpere pọmpụ ahụ. Ọkụ nwuuru. Ebe ọ bụ na ndị ọrụ ahụ tọrọ n’ebe dị elu n’oké osimiri, n’enweghịkwa ebe mgbapụ ọ bụla, mmadụ 167 nwụrụ.

Afọ 12 mgbe nke ahụ gasịrị, na July 25, 2000, otu ụgbọelu bụ́ Concorde nke na-agba ọsọ nke ukwuu nọ na-agbada n’ụzọ ụgbọelu si efeli n’Ọdụ Ụgbọelu Charles de Gaulle dị na Paris, France. Ka ụgbọelu ahụ gbasiwere ọsọ ike, otu mpekere ígwè dị nnọọ obere nke tọgbọrọ n’ụzọ ahụ ụgbọelu si efeli mere ka taya ya gbawaa, nke a gbapukwara tankị mmanụ ụgbọelu dị na nku ya. Mmanụ ụgbọelu sọbajuru n’injin ndị dị n’aka ekpe, mee ka ha gharazie ịrụ ọrụ, meekwa ka ire ọkụ dị mita 60 n’ogologo nwuru na ya. Mgbe ihe dị ka minit abụọ gasịrị, ụgbọelu ahụ kpọkanyere n’otu họtel, gbuo mmadụ nile nọ n’ime ya nakwa ụfọdụ ndị nọ n’ala.

N’icheghachi echiche azụ n’ihe ọghọm ndị dị otú ahụ, James Chiles kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Inviting Disaster—Lessons From the Edge of Technology, sị: “N’ụwa ọhụrụ anyị, bụ́ nke ígwè ọrụ ndị na-adịghị ekwe nchịkwa mgbe ụfọdụ jupụtara na ya, ọ dị anyị mkpa ịghọta mbibi dị ukwuu nke mmehie ihe ndị na-adịghị ihe ha bụ pụrụ ịkpata ugbu a.” N’ịtụleghachi akwụkwọ Chiles, magazin bụ́ Science na-ekwu, sị: “Ọganihu dị ịrịba ama, nke na-aga ngwa ngwa e nweworo na sayensị na nkà na ụzụ n’ime narị afọ ole na ole gafeworonụ abụrụwo nke na-akpali akpali. Ọ na-eme ka anyị chee na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ ga-ekwe anyị omume ịghọta na ịchịkwa ụwa nkịtị n’enwetụghị ihe mgbochi. [Ma] e nweghị ihe mere anyị ga-eji chee na anyị apụghịzi imehie ihe otú anyị na-emebu.”

Banyere nkà na ụzụ ndị dị ize ndụ karị, Science na-ekwu, sị: “Ọbụna ntakịrị ihe ize ndụ [nke mmehie ihe] dị nnọọ ukwuu. A bịa n’ihe banyere nkà na ụzụ ndị ahụ, anyị aghaghị isi ọnwụ ka a na-eme ihe n’ụzọ zuru okè.” Ma ihe ndị ihe a kpọrọ mmadụ meworo n’oge gara aga hà na-egosi na a pụrụ iru n’izu okè? Ọ dịghị ma ọlị! Ya mere, ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-anọgide na-enwe otu ụdị ọdachi ma ọ bụ ọzọ bụ́ ndị mmehie ihe na-akpata.

Ma ha agaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ndị na-atụ egwu Chineke pụrụ ilepụ anya n’ọdịnihu bụ́ mgbe ụmụ mmadụ na-agaghị na-anwụchu ọnwụ n’ihi mmehie ihe ma ọ bụ erughị eru nke mmadụ. N’ihi gịnị? N’ihi na Chineke, site n’ọchịchị Alaeze eluigwe ya, ga-ewepụ ihe nile na-akpata ọnwụ, iru újú, na ihe mgbu.—Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:3, 4.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

AP Photo/Toshihiko Sato