Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Ga-eleghara Adịghị Ike Anyị Anya?

Chineke Ọ̀ Ga-eleghara Adịghị Ike Anyị Anya?

 Echiche nke Bible

Chineke Ọ̀ Ga-eleghara Adịghị Ike Anyị Anya?

‘Abụghị m onye ajọ omume! Agbalịsiwo m ike ịhapụ àgwà ọjọọ m, ma enweghị m nnọọ ike ịkwụsị ya!’

NKE a ọ̀ bụ mmetụta gị onwe gị ma ọ bụ onye ị maara na-enwe? Ọtụtụ ndị na-ekwubi na ọ gaghị ekwecha omume imeri adịghị ike ndị gbanyeworo mkpọrọgwụ n’omume mmadụ. Ụfọdụ ndị bụ ndị mmanya na-aba n’anya, ụtaba, ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ riri ahụ́. Anyaukwu eriela ndị ọzọ ahụ́. E nwekwara ndị mikpuworo onwe ha ná mmekọahụ, na-ekwu na mmekọahụ eriwo ha ahụ́ nke na ọ gaghị ekwekwa ha nkwụsị.

Dị ka e gosiri na Matiu 26:41, Jizọs ji obi ebere gosi na ọ ghọtara adịghị ike mmadụ. * N’ezie, ihe nile e dekọrọ na Bible na-eme ka o doo anya na ma Jehova Chineke ma Jizọs nwere obi ebere n’ezie n’ebe ụmụ mmadụ nọ. (Abụ Ọma 103:8, 9) Ma ànyị pụrụ ịtụ anya na Chineke ga-eleghara emezighị emezi anyị nile anya?

Mozis na Devid

Tụlee ihe ndekọ banyere Mozis. A maara ya dị ka “onye dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala,” ọ gbalịsikwara ike ịnọgide na-enwe àgwà ọma ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) N’oge ụmụ Izrel ji ụkwụ na-agafe ọzara ahụ, ha mere omume n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya ọtụtụ mgbe ma gosi enweghị nkwanye ùgwù n’ebe Chineke na ndị nnọchiteanya ya nọ. N’oge ahụ nile, Mozis ji ịdị umeala n’obi na-achọ nduzi Chineke.—Ọnụ Ọgụgụ 16:12-14, 28-30.

Otú ọ dị, ka ogologo njem ahụ, nke na-agwụ ike na-eru ná njedebe ya, o were oké iwe n’ihu mba ahụ dum ma nupụ isi ná ntụziaka Chineke. Chineke gbaghaara ya, ma Ò leghaara ihe ahụ merenụ anya? Ee e. Ọ gwara Mozis na Erọn, sị: “N’ihi na unu ekweghị na Mụ . . . , unu agaghị eme ka mkpọkọta nke a baa n’ala ahụ nke M nyeworo ha.” Mozis agaghị aba n’Ala Nkwa ahụ. Mgbe ọ gbalịsiworo ike ruo afọ 40 iji nweta ihe ùgwù ahụ magburu onwe ya, nnukwute adịghị  ike nke mmadụ mere ka ọ ghara inweta ụgwọ ọrụ ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 20:7-12.

Eze Devid bụ nwoke ọzọ tụrụ egwu Chineke, onye nwere adịghị ike. N’otu oge, o kwere ka agụụ mmekọahụ merie ya o wee soro nwunye nwoke ọzọ nwee mmekọahụ. Mgbe ahụ, ọ gbalịrị ikpuchi mmehie ahụ site n’igbu di nwanyị ahụ. (2 Samuel 11:2-27) N’ikpeazụ, ọ kwara ụta nke ukwuu maka mpụ ndị o mere, Chineke gbaghakwaara ya. Ma Devid ebibiwo otu ezinụlọ, Jehova echebeghịkwa ya pụọ n’ajọ ọdachi ndị sochirinụ. Nwa nwoke a mụụrụ Devid malitere ịrịasi ọrịa ike, Jehova agwọghịkwa ya, n’agbanyeghị ekpere nile Devid kpere n’ihi nwa ya. Nwa ya ahụ nwụrụ, mgbe nke ahụ gasịkwara ọtụtụ ọdachi ndị ọzọ weere ọnọdụ n’ezinụlọ Devid. (2 Samuel 12:13-18; 18:33) Nkwere Devid kwere ka adịghị ike n’omume merie ya furu ya ihe dị ukwuu.

Ihe atụ ndị a na-egosi na ụmụ mmadụ ga-aza Chineke ajụjụ maka omume ha. Ndị chọrọ ijere ya ozi aghaghị ịrụ ọrụ n’ebe ndị ha na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ ma ghọọ Ndị Kraịst ka mma. Na narị afọ mbụ, ọtụtụ ndị mere otú ahụ.

Ọgụ A Na-alụ Iji Kwụsị Omume Mmehie

A na-ele Pọl onyeozi anya n’ụzọ ziri ezi dị ka onye bụ́ ihe nlereanya nke otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ebi ndụ. Ma ị̀ maara na ọ lụsoro adịghị ike ya ọgụ mgbe nile? Ndị Rom 7:18-25 kọwara ọgụ a ma ọ bụ dị ka amaokwu nke 23 si kọwaa ya, ‘ịlụ agha a,’ n’ụzọ doro anya. Pọl lụrụ ọgụ n’esepụghị aka, n’ihi na ọ maara na mmehie dị adị mgbe nile.—1 Ndị Kọrint 9:26, 27.

Ụfọdụ ndị, bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Kọrint oge ochie bụbu ndị ime ihe ọjọọ maara ahụ́. Bible na-ekwu na ha bụbu ‘ndị na-akwa iko, ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị ikom na-edina ndị ikom, ndị ohi, ndị anyaukwu, ndị aṅụrụma.’ Ma o kwukwara na ‘a sachara’ ha. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) N’ụzọ dị aṅaa? Ezi ihe ọmụma, mkpakọrịta Ndị Kraịst, na mmụọ Chineke mere ka ha dị ike iji kwụsị omume ọjọọ ha. N’ikpeazụ, Chineke kpọrọ ha ndị ezi omume n’aha Kraịst. Ee, Chineke gbaghaara ha, si otú ahụ mee ka ha nwee akọ na uche dị ọcha.—Ọrụ 2:38; 3:19.

Pọl nakwa Ndị Kraịst nọ na Kọrint ewereghị omume ime mmehie ha dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ. Kama nke ahụ, ha lụsoro ya ọgụ, sitekwa n’enyemaka Chineke ha meriri ya. Ndị ahụ fere ofufe na narị afọ mbụ ahụ ghọrọ ndị omume ha dị mma, n’agbanyeghị ebe ha bi na ọchịchọ anụ ahụ́ na-ezughị okè ha nwere. Gịnị banyere anyị?

Chineke Na-atụ Anya Ka Anyị Na-alụso Adịghị Ike Anyị Ọgụ

Ịlụso otu adịghị ike ọgụ nwere ike ọ gaghị eme ka a kwụsịchaa ya kpam kpam. Ọ bụ ezie na anyị ekwesịghị ikwe ka ezughị okè anyị merie anyị, anyị apụghị ibibi ya. Ọ na-amụpụta adịghị ike ndị pụrụ isi ike imeri. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị ekwesịghị ikwenyere adịghị ike anyị. (Abụ Ọma 119:11) N’ihi gịnị ka nke a ji dị oké mkpa?

N’ihi na Chineke enyeghị ohere ka ezughị okè bụrụ ihe a ga-eji na-eme ngọpụ mgbe nile maka ịkpa àgwà ọjọọ. (Jud 4) Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ mee ka ndụ ha dị ọcha, ka ha na-ebi ndụ ziri ezi. Bible na-ekwu, sị: “Na-akpọnụ ihe ọjọọ asị.” (Ndị Rom 12:9) Gịnị mere Chineke ji na-ele ihe anya n’ụzọ siri ike otú a?

Otu ihe kpatara ya bụ na mmadụ ikwe ka adịghị ike merie ya na-eweta mmerụ ahụ́. “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa,” ka Bible na-ekwu ná Ndị Galeshia 6:7. Ndị na-ekwe ka ihe ndị na-eri ahụ́ rie ha ahụ́, ndị na-ekwe ka anyaukwu, na inwe mmekọahụ aghara aghara merie ha na-enwetakarị ụgwọ ọrụ dị oké njọ ná ndụ ha. Ma e nwere ihe ọzọ ka mkpa kpatara ya.

Mmehie na-akpasu Chineke iwe. Ọ “na-akpa ókè” n’etiti anyị na Jehova. (Aịsaịa 59:2) Ebe ọ bụ na ndị na-eme mmehie agaghị enweta ihu ọma ya, ọ na-agba ndị dị otú ahụ ume, sị: “Saanụ ahụ́; meenụ onwe unu ka unu dị ọcha; . . . hapụnụ ime ihe ọjọọ.”—Aịsaịa 1:16.

Onye Okike anyị na-ahụ n’anya ma na-eme ebere. “Ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Ikwe ka adịghị ike na-emeri anyị mgbe nile na-egbochi anyị inweta ihu ọma Chineke. Ebe ọ bụ na Chineke adịghị eleghara adịghị ike anyị anya, anyị ekwesịghịkwa ileghara ha anya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Jizọs sịrị: “Mmụọ na-anụ ọkụ, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”