Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Uwe Ojii—n’Ihi Gịnị Ka Ha Ji Dị Mkpa?

Ndị Uwe Ojii—n’Ihi Gịnị Ka Ha Ji Dị Mkpa?

 Ndị Uwe Ojii—n’Ihi Gịnị Ka Ha Ji Dị Mkpa?

OLEE otú ndụ ga-adị ma ndị uwe ojii anọghị ya? Gịnị mere na 1997 mgbe ndị uwe ojii 18,000 gbara abụbọ ọrụ n’obodo ukwu Recife nke Brazil, ihe karịrị otu nde ndị bi na ya anọrọ n’enweghị ndị uwe ojii?

“N’ime ụbọchị ise jupụtara n’ọgba aghara n’obodo ukwu a dị n’ụsọ mmiri, ọ̀tụ̀tụ̀ igbu ọchụ kwa ụbọchị rịrị elu okpukpu atọ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Washington Post, kọrọ. “E zuwo ohi n’ụlọ akụ̀ asatọ. Òtù ndị omempụ emerela ihe ike banye n’ụlọ azụmahịa ma gabiga n’ógbè ebe ndị oké ozu bi ma na-agba égbè. Ọ dịghịkwa onye na-edebe iwu okporo ụzọ. . . . Njupụta nke mpụ emewo ka ebe nchekwa ozu gharazie ịba aba ma mee ka ndị mmadụ jupụta n’ụlọ ọgwụ kasị ukwuu ná mba ahụ, bụ́ ebe e nyiwechara ndị a gbara égbè na ndị a mara mmà n’ala paseeji dị iche iche.” A kọrọ na onyeisi ngalaba na-ahụ maka okwu ikpe kwuru, sị: “E nwetụbeghị ụdị mmebi iwu a mbụ n’ebe a.”

Ebe ọ bụla anyị bi, omume ọjọọ na-ezo n’okpuru aghụghọ nke mmepeanya. Nchebe nke ndị uwe ojii dị anyị mkpa. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị anụwo banyere omume obi ọjọọ, nrụrụ aka, àgwà ọ gbasaghị m, na iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nke ụfọdụ ndị uwe ojii. Omume ndị a na-adị njọ ruo n’ókè dị iche iche site n’otu mba ruo mba ọzọ. Ma gịnị ka anyị ga-eme ma ndị uwe ojii anọghị ya? Ọ́ bụghị eziokwu na ndị uwe ojii na-eje ozi bara uru ọtụtụ mgbe? Teta! jụrụ ụfọdụ ndị uwe ojii n’akụkụ dị iche iche nke ụwa ihe mere ha ji họrọ ọrụ a.

Ozi A Na-ejere Ógbè na Ọha na Eze

“M na-enwe mmasị inyere ndị mmadụ aka,” ka Ivan, bụ́ onye uwe ojii na Britain kwuru. “Ihe dịgasị iche iche a na-arụ na ya  dọọrọ mmasị m. Ọtụtụ ndị amaghị na ịlụso mpụ ọgụ mejupụtara nanị pasent 20 ruo 30 nke ọrụ ndị uwe ojii. Ọ bụ nnọọ ozi a na-ejere obodo nakwa maka ọdịmma ọha na eze. N’ụbọchị ọrụ dị otú o kwesịrị, apụrụ m ime ihe banyere ọnwụ mberede, ihe mberede okporo ụzọ, mpụ, na agadi nke nwere ihe mgbagwoju anya nke enyemaka dị mkpa. Ọ pụrụ ịbụ ihe kasị enye afọ ojuju ịkpọla nwa furu efu ma ọ bụ inyere onye e mesoro mpụ aka ịnagide mkpasasị uche o nwere.”

Stephen bụbu onye uwe ojii na United States. Ọ na-ekwu, sị: “Dị ka onye uwe ojii, i nwere ikike na oge iji nyere ha aka n’ụzọ kasị mma mgbe ndị mmadụ ji obi eziokwu chigharịkwute gị maka enyemaka. Ọ bụ ya kpaliri m ịrụ ọrụ ahụ. Achọrọ m inye ndị mmadụ onwe m ma buoro ha ibu arọ ha. Echere m na enyere m aka chebe ndị mmadụ pụọ na mpụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ. Ejidere m ihe karịrị 1,000 mmadụ n’ime afọ ise. Ma ịchọta ụmụaka furu efu, inyere ndị na-arịa ọrịa Alzheimer bụ́ ndị kpafuru akpafu aka, na ịchọta ụgbọala e zuru ezu, ha nile mere ka m nwee afọ ojuju. A kpalikwara m ịchụ na ijide ndị a na-enye enyo.”

“Achọrọ m inyere ndị nọ n’ọnọdụ chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa aka,” ka Roberto, bụ́ onye uwe ojii nọ na Bolivia, na-ekwu. “N’oge m bụ nwata, enwere m mmasị n’ebe ndị uwe ojii nọ n’ihi na ha na-echebe ndị mmadụ pụọ n’ihe ize ndụ. Ná mmalite nke ọrụ m, ọ bụ m na-elekọta ndị uwe ojii na-eji ụkwụ agagharị bụ́ ndị na-anọ n’etiti obodo ukwu, bụ́ ebe e nwere ọfịs dị iche iche nke gọọmenti. Anyị na-achịkwa njegharị iwe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị. Ọrụ m bụ ime ka ihe a na-eme ghara ịghọ ime ihe ike. Achọpụtara m na ọ bụrụ na m emesoo ndị ndú ha n’ụzọ enyi nakwa n’ụzọ ezi uche dị na ya, apụrụ m igbochi ọgba aghara ndị pụrụ ịkpataworo ọtụtụ ndị mmadụ mmerụahụ. Nke ahụ na-enye afọ ojuju.”

Ozi ndị uwe ojii na-eje dị ọtụtụ. Ha emewo ihe banyere ọnọdụ ndị metụtara ikutu nwamba tọrọ n’elu osisi ruo n’ịnapụta ndị ndị na-eyi ọha egwu ji eji na ibuso ndị ohi ụlọ akụ̀ agha. Ka o sina dị, malite n’oge e hiwere ndị uwe ojii nke oge a, ha abụwo ndị bụ́ isi na-akpali olileanya na egwu. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe kpatara ya.

 [Foto ndị dị na peeji nke 2, 3]

Peeji nke 2 na 3: Iduzi ụgbọala na Hong Kong; ndị uwe ojii na-achịkwa ọgba aghara na Gris; ndị uwe ojii nọ na South Africa

[Ebe E Si Nweta Foto]

Linda Enger/Index Stock Photography

[Foto dị na peeji nke 3]

Ụlọ ahịa a kwakọọrọ ihe na ya n’oge ndị uwe ojii gbara abụbọ ọrụ na Salvador, Brazil, na July 2001

[Ebe E Si Nweta Foto]

Manu Dias/Agência A Tarde

[Foto dị na peeji nke 4]

Stephen, U.S.A.

[Foto dị na peeji nke 4]

Roberto, Bolivia