Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Uwe Ojii—Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?

Ndị Uwe Ojii—Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?

 Ndị Uwe Ojii—Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?

EWEZỤGA ndị uwe ojii ma eleghị anya anyị ga-enwe ọgba aghara. Ma ọbụna ka e nwere ndị uwe ojii, ụwa anyị ọ̀ dịlanụ nchebe? Taa, n’ihe ka ọtụtụ n’obodo ukwu, dịkwa ka ọ dị n’ọtụtụ ime obodo, o doro anya na e nwere nsogbu ịnọ ná nchebe. Ànyị pụrụ ịtụ anya ka ndị uwe ojii chebe anyị pụọ n’aka òtù ndị omempụ nakwa pụọ n’aka ndị mpụ riri ahụ́? Ànyị pụrụ ịtụ anya ka ndị uwe ojii mee ka okporo ámá anyị dị nchebe? Hà ga-emeri n’agha a na-alụso mpụ?

David Bayley kwupụtara otu echiche n’akwụkwọ ya bụ́ Police for the Future: “Ndị uwe ojii adịghị egbochi mpụ,” ka ọ na-ekwu. “N’ezie, a pụrụ iji ndị uwe ojii tụnyere, nanị ihe e ji kechie ọnyá cancer. . . . Anyị apụghị ịdabere ná ndị uwe ojii ichebe ọha na eze pụọ na mpụ ọbụna mgbe ha ji ịdị uchu na-anwa ịkwụsị ya.” Nnyocha ndị e mere egosiwo na ọrụ atọ bụ́ isi nke ndị uwe ojii—ime mkpagharị n’okporo ámá, ime ihe banyere òkù a kpọrọ maka ọnọdụ mberede, na inyocha  mpụ—adịghị egbochi mpụ. N’ihi gịnị ka nke a ji dị otú a?

Ịgbalị igbochi mpụ site n’ịmụba nnọọ ọnụ ọgụgụ ndị uwe ojii ga-efu ihe dị ukwuu. Ọ bụrụgodị na a pụrụ ịmụba ọnụ ọgụgụ ndị uwe ojii na-eme mkpagharị, o yighị ka ọ̀ ga-egbochi ndị omempụ. Ịza òkù ngwa ngwa adịghịkwa egbochi ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke mpụ. Ndị uwe ojii ekwuwo na ọ gwụkwala ma hà pụrụ irute n’ebe e mere mpụ n’ihe na-erughị otu minit e mesịrị mpụ ahụ, ka ha ga-enwe ike ijide onye mere mpụ. O yiri ka ndị omempụ hà maara na o sikata ike ka e mee ihe ngwa ngwa otú ahụ. Ime nnyocha banyere ndị omempụ adịghịkwa enye aka. Ọbụna mgbe ndị ọrụ nchọpụta mpụ nwere ihe ịga nke ọma n’ịma ndị omempụ ikpe na ịtụ ha mkpọrọ, ihe àmà na-egosi na ọ dịghị akwụsị mpụ. United States na-atụ ndị omempụ mkpọrọ karịa mba ọ bụla ọzọ, ma ọ ka na-enwe ọnụ ọgụgụ dị nnọọ elu nke mpụ; lezienụ Japan, bụ́ nke nwere mmadụ ole na ole n’ụlọ mkpọrọ, bụ otu n’ime mba ndị nwere ọnụ ọgụgụ kasị ala nke mpụ. Ọbụna atụmatụ ndị dị ka iche ógbè nche enwebeghị mmetụta na-adịgide adịgide, karịsịa n’ebe ndị a na-enwe ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke mpụ. Ihe ndị e mere iji kwụsị ụfọdụ mpụ, ndị dị ka ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ịpụnara mmadụ ihe, na-enwe mmetụta dị ịrịba ama ruo obere oge, ma, ọ na-esikwa ike ime ka mmetụta ya dịtee aka.

“O kwesịghị iju ndị na-eche echiche anya na ndị uwe ojii enweghị ike igbochi mpụ,” ka akwụkwọ ahụ bụ́ Police for the Future na-ekwu. “Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ matara na ọnọdụ ndị a na-enwe ná ndụ bụ́ ndị ndị uwe ojii na-apụghị ịchịkwa, nakwa ndị usoro iwu maka ndị omempụ n’ozuzu ya na-apụghị ịchịkwa, na-ekpebi ọ̀tụ̀tụ̀ mpụ a ga-enwe n’ógbè.”

Gịnị Ga-eme Ma Ndị Uwe Ojii Anọghị Ya?

Olee otú i si eme omume ma ọ bụrụ na ọ dịghị ndị uwe ojii na-ele gị anya? Ị̀ na-eji n’ihi na ha anọghị ya mebie iwu? Ọ bụ ihe ijuanya na ọtụtụ ndị a sị na ha bụ ndị a na-asọpụrụ bụ́ ndị nọ n’ọkwá etiti na ọkwá dị elu na-etinye aha ha na ọdịnihu ha n’ihe ize ndụ iji nweta ihe ụfọdụ n’ụzọ aghụghọ site n’ime mpụ n’ọfịs. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kọrọ n’oge na-adịbeghị anya banyere ‘mmadụ 112 e boro ebubo ime atụmatụ aghụghọ, bụ́ ndị e kwuru na ha tinyere aka n’atụmatụ maka ịghọgbu ụlọ ọrụ inshọransị ụgbọala. N’ime ndị ahụ e boro ebubo, e nwere ndị ọkàiwu, ndị dọkịta, ndị na-eji usoro ịgbatị ọkpụkpụ azụ agwọ ọrịa, onye na-eji usoro mmega ahụ́ agwọ ọrịa, onye na-eji ịdụnye ag̣ịga n’ahụ́ agwọ ọrịa, na osote onyeisi Òtù Ndị Uwe Ojii.’

Nnukwute wayo ọzọ e gwuru n’oge na-adịbeghị anya wụrụ ndị ọgaranya na-akwado ndị na-ese ihe akpata oyi mgbe a mara ndị bụbu ọga kpata kpata n’ụlọ ọrụ Sotheby’s dị na New York na Christie’s dị na London ikpe maka ịhụ ọnụ ahịa. Ha na ụlọ ọrụ ahịa mgbuka ha ga-akwụ nhá na ego iti aka n’obi dị ọtụtụ narị nde dollar! Ya bụ na oké anyaukwu maka ego na-emetụta akụkụ nile nke ọha mmadụ.

Ihe mere na Recife, Brazil, na 1997 mgbe ndị uwe ojii gbara abụbọ ọrụ na-egosi na ọ dịghị esiri ọtụtụ ndị ike ịmalite ime mpụ mgbe ha na-enweghị ihe mgbochi. Nkwenkwe okpukpe ọ bụla ha pụrụ inwe adịghị emetụta àgwà ha. Ha pụrụ n’ụzọ dị mfe ịgwagbu ma ọ bụ ịgbahapụ ụkpụrụ omume ọma. Ka a sịkwa ihe mere ndị uwe ojii nọ n’ihe ka n’ọtụtụ  mba ji alụ ọgụ ha na-apụghị imeri emeri na ya n’ụwa nke nwere ọchịchọ imebi iwu, ma ọgụ obere ma nke ukwu.

N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị na-edebe iwu n’ihi na ha na-asọpụrụ ịbụisi. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ na Rom na ha kwesịrị ido onwe ha n’okpuru ịbụisi nke Chineke kwere ka ọ dịrị, ebe ọ bụ na ha na-eme ma ọ dịghị ihe ọzọ ka ọha mmadụ na-eme ihe n’usoro ruo n’ókè ụfọdụ. O dere banyere ịbụisi dị otú ahụ, sị: “Ọ bụ onye na-ejere Chineke ozi, onye na-abọ ọbọ igosipụta ọnụma n’ahụ́ onye na-eme ihe ọjọọ. Ya mere, e nwere ihe dị mkpa mere unu ga-eji doo onwe unu n’okpuru, ọ bụghị nanị n’ihi ọnụma ahụ kamakwa n’ihi akọ na uche unu.”—Ndị Rom 13:4, 5.

Ọnọdụ Ndị Na-agbanwe Agbanwe n’Etiti Ọha na Eze

N’ezie, ọrụ ndị uwe ojii na-enwe mmetụta ụfọdụ n’imeziwanye ọnọdụ ndị e nwere n’etiti ọha mmadụ. Mgbe o doro anya na e mewo ka iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na ime ihe ike kwụsị n’okporo ámá, ndị mmadụ na-agbalị ibi ndụ kwekọrọ n’aha ọma nke obodo ha. Ma n’eziokwu, ọ dịghị ndị uwe ojii ọ bụla pụrụ ịgbanwe ọha mmadụ.

Ị̀ pụrụ iche echiche banyere obodo ebe ndị mmadụ na-edebe nnọọ iwu nke na ndị uwe ojii adịghị ha mkpa? Ị̀ pụrụ iche echiche banyere ụwa nke ndị mmadụ na-echebara nnọọ ibe ha echiche nke na ndị agbata obi na-adị njikere mgbe nile inyere ibe ha aka, nke ọ na-adịghịkwa onye ọ bụla nọ na ya mkpa ịkpọ ndị uwe ojii maka enyemaka? Ikekwe nke ahụ pụrụ ịda dị ka echiche efu. Ma okwu ndị a Jizọs kwuru, ọ bụ ezie na ọ na-ekwu banyere ihe ọzọ, metụtara ọnọdụ a n’ezie. O kwuru, sị: “Nke a agaghị ekwe omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ma n’ebe Chineke nọ ihe nile kwere omume.”—Matiu 19:26.

Bible na-akọwa oge mgbe ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-abụ ndị ọchịchị nke Jehova Chineke guzobere ga-achị n’ọdịnihu. “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie . . . ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa.” (Daniel 2:44) Site n’ịkụziri ndị nile nwere obi eziokwu banyere ụzọ ịhụnanya nke Chineke, ọchịchị ọhụrụ a ga-agbanwe ọnọdụ ndị e nwere n’etiti ọha na-eze bụ́ ndị na-akpata mpụ. “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Eze nke Jehova, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-enwe ike ịkwụsị mpụ nile. “Ọ bụghịkwa dị ka anya ya abụọ si ahụ ka ọ ga-ekpe ikpe, ọ bụghịkwa dị ka ntị ya abụọ si anụ ka ọ ga-aba mba: kama ọ ga-eji ezi omume kpee ndị na-enweghị ike ikpe, ọ ga-ejikwa izi ezi baa mba banyere ndị dị umeala n’obi n’ụwa.”—Aịsaịa 11:3, 4.

A gaghị enwe ndị omempụ ma ọ bụ mpụ. Ndị uwe ojii agaghị adị mkpa. Onye ọ bụla ‘ga-ebi n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.’ (Maịka 4:4) Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịbụ akụkụ nke “ụwa ọhụrụ” ahụ a kọwara na Bible, ugbu a bụ oge iji nyochaa ihe Chineke kweworo ná nkwa n’Okwu ya.—2 Pita 3:13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

Ị̀ pụrụ iche echiche banyere obodo ebe ndị mmadụ na-edebe nnọọ iwu nke na ndị uwe ojii adịghị ha mkpa?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

A gaghị enwe ndị omempụ ma ọ bụ mpụ

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

Ọgụ Ndị Uwe Ojii Na-alụso Ndị Na-eyi Ọha Egwu

Dị ka ihe ahụ mere na September 11, 2001, na New York City na Washington, D.C., gosiri, ndị na-ejichi ụgbọelu, ndị na-ejichi ndị mmadụ, na ndị na-eyi ọha egwu na-abụrụ ndị uwe ojii ụfọdụ ihe ịma aka ndị kasị ike n’ichebe ọha na eze. E nyewo ìgwè ndị uwe ojii pụrụ iche n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa ọzụzụ ịwaba n’ụgbọelu kwụsịrị akwụsị. Ha amụtawokwa nkà nke ịbanye n’ụlọ na mberede—isi n’ụdọ dị n’elu ụlọ rịba n’ime ụlọ, isi na windo mabanye n’ime ụlọ, na ịtụ bọmbụ grenade ndị na-eme ka mmadụ ghara ịma onwe ya na mkpọ tear gas. Ndị uwe ojii dị otú ahụ a zụrụ azụ enwewo ihe ịga nke ọma ọtụtụ mgbe n’ịwakwuru ndị na-eyi ọha egwu na mberede na imeri ha n’emerụchaghị ndị e jichiri ejichi ahụ́.

[Ebe E Si Nweta Foto]

James R. Tourtellotte/Ụlọ Ọrụ United States Maka Mbupụ na Mbubata Ihe

[Foto dị na peeji nke 12]

Ihe ndị na-agakwaghị adị mkpa n’ụwa ọhụrụ Chineke