Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mba nke Kwere Okpukpe Ọzọ Dịrị n’Ọgbọ Na-ekweghị Okpukpe Ọzọ Dịrị

Mba nke Kwere Okpukpe Ọzọ Dịrị n’Ọgbọ Na-ekweghị Okpukpe Ọzọ Dịrị

 Mba nke Kwere Okpukpe Ọzọ Dịrị n’Ọgbọ Na-ekweghị Okpukpe Ọzọ Dịrị

“ONYE Ọ BỤLA PỤRỤ ỊNAKWERE OKPUKPE MASỊRỊ YA N’ABỤGHỊ ONYE A MANYERE AMANYE, Ọ PỤKWARA INWERE ONWE YA ỊKWADO NDỊ NA-EKWUSA BANYERE OKPUKPE YA.”

Ọ BỤRỤ na a sị gị kọọ mgbe e dere okwu ndị ahụ, gịnị ka ị ga-ekwu? Ọtụtụ ndị ga-eche na ha bụ akụkụ nke ụkpụrụ iwu ma ọ bụ iwu banyere ihe ndị ruuru mmadụ nke oge a.

Otú ọ dị, ọ pụrụ iju gị anya ịmata na e mere nkwupụta a ihe karịrị afọ 400 gara aga—n’ala yiri, n’ụzọ ụfọdụ, àgwàetiti e nwere ikwe okpukpe ọzọ dịrị n’ụwa nke jupụtara n’ekweghị okpukpe ọzọ dịrị. Olee ala ọ bụ? Nke mbụ, tụlee ihe ndekọ banyere ya.

Mgbe Àgwà Ekweghị Okpukpe Ọzọ Dịrị Jupụtara Ebe Nile

Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, omume nke ekweghị okpukpe ọzọ dịrị zuru ebe nile, ọ bịakwara ka njọ na narị afọ nke 16. Okpukpe mere ka ajọ agha, bụ́ ndị a kwafuru ọbara na ha, biri ọkụ n’ala ndị dị ka England, France, Germany, na Netherlands. N’agbata afọ 1520 na ihe dị ka afọ 1565, e gburu ihe dị ka mmadụ 3,000 dị ka ndị jụrụ okwukwe na Krisendọm Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbagha ọ bụla a gbaghara ụkpụrụ na echiche—karịsịa ndị metụtara okpukpe—pụrụ ịkpata omume imegide okpukpe ọzọ.

Otu ozizi Chọọchị Katọlik nke a rụwooro ụka ruo ogologo oge bụ Atọ n’Ime Otu—nkwenkwe bụ́ na e nwere ndị atọ n’otu Chineke. N’eziokwu, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Earl Morse Wilbur na-akọwa na ọ “bụ isiokwu ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik, gụnyere ọbụna ndị Popu n’onwe ha rụụrụ nnukwu ụka Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya.” Otú ọ dị, a dịghị agwakebe ndị nkịtị arụmụka dị otú ahụ, bụ́ ndị a na-atụ anya ka ha nakwere ozizi ndị dị otú ahụ dị ka “ihe omimi Chineke,” n’ajụghị ase.

Ma, ụfọdụ ndị nọ na narị afọ nke 16 họọrọ ime ihe megidere ọdịnala ma nyochaa Akwụkwọ Nsọ ná mgbalị ime ka ihe omimi ndị dị otú ahụ doo anya. Ụkpụrụ nduzi ha bụ sola Scriptura (Nanị Akwụkwọ Nsọ). Ndị jụrụ ozizi Atọ n’Ime Otu—ndị e mesịrị kpọọ ụfọdụ n’ime ha Ndị Kwere n’Otu Chineke, iji mee ka ha pụọ iche ná ndị kwere n’Atọ n’Ime Otu—na-abụkarị ndị ma ndị Katọlik ma ndị Protestant na-akpagbu nke ukwuu. Ha ji aha nnọchianya na-ebi akwụkwọ ha a na-agụ n’ebe nile ma na-ezo onwe ha ezo iji zere mkpagbu. Ndị na-emegide ozizi Atọ n’Ime Otu sokwa bute agha a lụrụ maka ikwe okpukpe ọzọ dịrị n’isi. Ọbụna ụfọdụ n’ime ha, dị ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye Spen bụ́ Michael Servetus, jiri ndụ ha kwụọ ụgwọ maka nkwenkwe ha. *

Mba nke Ikwe Okpukpe Ọzọ Dịrị Mere Ka Ọ Dị n’Otu

Kama ịlụ agha okpukpe ma ọ bụ ịkpagbu ndị na-ekwenyeghị na nkwenkwe ha, otu mba jiri ụzọ ọzọ dị nnọọ iche mee ihe. Mba ahụ bụ Transylvania, nke bụ́ obodo kwụụrụ onwe ya mgbe ahụ, nke bụ́zi akụkụ Romania dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye Hungary bụ́ Katalin Péter na-akọwa na Eze Nwanyị  Transylvania Di Ya Nwụrụ bụ́ Isabella “gbalịrị izere agha okpukpe site n’ịrụ ọrụ dị ka onye nchebe nke òtù okpukpe nile.” N’agbata 1544 na 1574, Nzukọ Ndị Isi Transylvania, ma ọ bụ Òtù Ndị Ome Iwu, mere iwu 22 na-akwado nnwere onwe ikpe okpukpe.

Dị ka ihe atụ, mgbe e guzobesịrị Òtù Ndị Ome Iwu nke Torda na 1557, eze nwanyị ahụ, ya na nwa ya nwoke, nyere iwu na “onye ọ bụla [pụrụ] ikpe okpukpe ọ bụla masịrị ya, nke nwere ememe okpukpe ndị ọhụrụ ma ọ bụ ndị ochie, ebe Anyị onwe anyị kwa ga-enye ha ohere ime ihe bụ́ uche ha n’ihe banyere okwukwe, ma ọ bụrụhaala, n’ezie, na ha emerụghị onye ọ bụla ahụ́ ma ọlị.” A kpọrọ iwu a “iwu mbụ kwadoro nnwere onwe ikpe okpukpe nke e nweworo ná mba ọ bụla.” Ikwe okpukpe ọzọ dịrị ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu na Transylvania mgbe nwa Isabella bụ́ John nke Abụọ Sigismund na-achị, bụ́ onye malitere ịchị n’onwe ya na 1559.

Arụmụka Ihu Ọha

Onye ọzọ a ma ama n’òtù ahụ na-emegide ozizi Atọ n’Ime Otu na Transylvania bụ onye dọkịta Ịtali aha ya bụ Georgio Biandrata. Ma eleghị anya, ọ malitere inwe obi abụọ n’ozizi Atọ n’Ime Otu n’oge ahụ ọ nọrọ n’Ịtali na Switzerland, bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-emegide ozizi Atọ n’Ime Otu bụ́ ndị gbara ọsọ ndụ gbagara. Mgbe ọ kwagaghachisịrị na Poland, Biandrata kwadoro nnọọ okpukpe bụ́ Minor Church, bụ́ nke e mesịrị mara dị ka okpukpe Polish Brethren. * Na 1563, a họpụtara ya dị ka dọkịta na onye ndụmọdụ Sigismund, ọ kwagakwara Transylvania.

Onye ọzọ gụrụ akwụkwọ nọ na Transylvania bụ́ onye gbaghara ozizi Atọ n’Ime Otu bụ Francis Dávid, bụ́ onye supritendant nke okpukpe Reformed Church na onye nkwusa nke obí eze. N’ihe banyere ozizi ndị dị mgbagwoju anya metụtara Atọ n’Ime Otu, o dere, sị: “Ọ bụrụ na ihe ndị a dị mkpa maka nzọpụta, o doro anya na ọ dịghị onye ogbenye nke nọ n’ọkwá dị ala nke bụ́ Onye Kraịst a ga-azọpụta, n’ihi na ọ dịghị mgbe ọ ga-aghọta ha ná ndụ ya nile.” Dávid na Biandrata jikọrọ aka bipụta  otu akwụkwọ nwere ụfọdụ n’ime ihe ndị Servetus dere; ha raara ya nye Sigismund.

Arụmarụ banyere ozizi Atọ n’Ime Otu malitere ịrị elu, o mekwara ka a chọọ ka ọha na eze tinye ọnụ n’arụmụka ahụ. N’ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ bụ́ sola Scriptura, Biandrata kwuru na ọ bụ nanị asụsụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ọ bụghị nke dabeere na nkà ihe ọmụma, ka a ga-eji na-eme ihe n’arụmụka ndị dị otú ahụ. Mgbe e nwesịrị arụmụka na-arụpụtaghị ihe ọ bụla na 1566, Sigismund nyere ndị na-emegide ozizi Atọ n’Ime Otu ígwè obibi akwụkwọ iji gbasaa echiche ha.

Biandrata na Dávid jiri ịnụ ọkụ n’obi malite ọrụ ha, wee bipụta akwụkwọ bụ́ De falsa et vera unius Dei Patris, Filii, et Spiritus Sancti cognitione (Ezi Ihe Ọmụma na nke Ụgha Banyere Ịdị n’Otu nke Chineke Bụ́ Nna ahụ, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ). Akwụkwọ ahụ nyochakwara akụkọ ihe mere eme banyere ndị jụrụ ikwenye n’Atọ n’Ime Otu. Otu Isiakwụkwọ dị na ya nwere ihe osise ndị ihe àmà na-egosi na e sere ha iji kwaa ụzọ e si ese Atọ n’Ime Otu na chọọchị dị iche iche emo. Ọ wụrụ ndị mmegide akpata oyi, ha ana-ekwu na ihe oyiyi ndị ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́, ha gbalịkwara ibibi akwụkwọ ahụ nile. E nwekwuru nkwurịta okwu n’ihi akwụkwọ ahụ na-ese okwu. Sigismund meghachiri omume site n’ime ndokwa maka nrụrịta ụka nke abụọ.

Mmeri Maka Ịdị n’Otu

Nrụrịta ụka ahụ malitere n’elekere ise nke ụtụtụ na March 3, 1568. E nwere ya n’asụsụ Latin, o wekwara ụbọchị iri. Onye ndú nke akụkụ kwadoro ozizi Atọ n’Ime Otu bụ Peter Melius, bụ́ onye ndú nke okpukpe Reformed Church nke Transylvania. Ya na ndị na-akwado ozizi Atọ n’Ime Otu jiri ụkpụrụ okwukwe, Ndị Nna Chọọchị, nkà mmụta okpukpe Ọtọdọks, na Bible, mee ihe. N’aka nke ọzọ, Dávid jiri nanị Bible mee ihe. Dávid mere ka a mata na Nna ahụ bụ Chineke, na Ọkpara ahụ nọ n’okpuru Nna ahụ, nakwa na mmụọ ahụ bụ ike nke Chineke. N’ịbụ onye nwere mmasị miri emi n’okwu banyere okpukpe, Sigismund keere òkè, na-ekwere na nkwurịta okwu bụ ụzọ kasị mma isi mee ka eziokwu pụta ìhè. Ọnụnọ ya nyere aka mee ka e enwee nkwurịta okwu ghere oghe na nke eziokwu, n’agbanyeghị na ọ kpụ ọkụ n’ọnụ.

E weere ya na ọ bụ ndị na-emegide ozizi Atọ n’Ime Otu meriri n’arụmụka ahụ. A nabatara Dávid dị ka dike n’obodo ya bụ́ Kolozsvár (bụ́ Cluj-Napoca, Romania ugbu a). Dị ka ọdịnala si kwuo, ozugbo ọ lọtara, o guzooro n’elu nnukwute okwute dị n’akụkụ okporo ámá ma kwuo banyere okwukwe ya n’ụzọ na-eme nnọọ ka e kwenye nke na o mere ka onye ọ bụla kweta ịnakwere ozizi ya.

Ntọghata na Ọnwụ

E nwere arụmụka ndị bu ụzọ n’asụsụ Latin, bụ́ asụsụ nanị ndị gụrụ akwụkwọ na-aghọta. Otú ọ dị, Dávid, chọrọ iwegara ndị mmadụ ozi ya. N’ihi ya, site ná nkwado nke Sigismund, e nwere arụmụka ọzọ n’asụsụ Hungary na Nagyvárad (bụ́ Oradea, Romania ugbu a) n’October 20, 1569. Ọzọkwa, Sigismund nọrọ dị ka onye nduzi okwu n’etiti ìgwè abụọ ahụ.

Onye na-akwado ozizi Atọ n’Ime Otu bụ́ Peter Melius kwupụtara na n’ọhụụ n’abali bọtara ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị kpugheere ya otú ọ dị n’ezie. Eze ahụ zaghachiri, sị: “Pastọ Peter, ọ bụrụ na a kụziiri gị n’abalị ụnyaahụ banyere onye Ọkpara Chineke bụ, gịnị, ka m jụọkwa, ka ị nọworo na-ekwusa tupu mgbe ahụ? O doro anya na tupu ugbu a ị nọwo na-eduhiegharị ndị mmadụ!” Mgbe Melius gwara Dávid okwu ọjọọ, Sigismund baara ya mba, na-echetara onye ahụ na-akwado ozizi Atọ n’Ime Otu na “nkwenkwe bụ onyinye sitere n’aka Chineke” nakwa na “a pụghị ịmanye akọ na uche mmadụ ịnabata ihe ọ  na-achọghị.” N’okwu o ji mechie arụmụka ahụ, eze ahụ kwuru, sị: “Anyị chọrọ ka ndị anyị na-achị nwere onwe ha ime ihe kwekọrọ n’akọ na uche ha.”

Mgbe arụmụka ahụ gasịrị, e mere ka Sigismund na ihe ka ọtụtụ ná ndị ndụmọdụ ya dụnyere Ndị Kwere n’Otu Chineke úkwù. Na 1571, eze tiri iwu na-eme ka a nakwere Chọọchị Unitarian (Ndị Kwere n’Otu Chineke) dị ka iwu si dị. Transylvania bụ nanị mba ebe ndị Unitarian, ndị Katọlik, ndị okpukpe Lutheran, na ndị okpukpe Calvin nọ n’otu ọkwá, a matakwara Sigismund dị ka nanị eze nabataworo nkwenkwe megidere ozizi Atọ n’Ime Otu. N’ụzọ dị mwute, nwa obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, eze ahụ dị afọ 30 merụrụ ahụ́ mgbe ya na Dávid na Biandrata gara ịchụ nta, ọ nwụkwara mgbe ọnwa ole na ole gasịrị.

Onye nọchiri ya, bụ́ onye Katọlik bụ́ Stephen Báthory, nyeghachiri iwu na-echebe okpukpe ndị a nabatara ma kwuo na ya agaghị anabata mgbanwe ọzọ. Na mbụ, Stephen kwuru na ya na-achị ndị mmadụ, ọ bụghị akọ na uche ha. Ma n’oge na-adịghị anya, ọ machibidoro ibi akwụkwọ, bụ́ ụzọ bụ́ isi ndị mmadụ si agwa ndị ọzọ ihe ha kweere. A chụturu Dávid n’ọkwá, e wepụkwara ndị okpukpe Unitarian ndị ọzọ n’òtù ndị ndụmọdụ eze nakwa n’ọfịs gọọmenti.

Mgbe Dávid malitere ịkụzi na e kwesịghị ife Kraịst ofufe, e nyere iwu machibidoro ya ikwusa ozi ọma. N’agbanyeghị mmachibido iwu a, Dávid kwusara ozi ọma ugboro abụọ na Sunday na-esote ụbọchị ahụ. E jidere ya, boo ya ebubo “iwebata ihe ọhụrụ” n’okpukpe, ma maa ya ikpe ịga nga mkpụrụ ọka. Ọ nwụrụ n’ụlọ mkpọrọ dị n’okpuru ala n’obí eze na 1579. Tupu ya anwụọ, Dávid dere ná mgbidi ụlọ nga ya, sị: “Ojiji ndị popu na-eji ma ike . . . ma iyi egwu eme ihe agaghị akwụsị ọganihu nke eziokwu. . . . Ekwenyesiri m ike na mgbe m nwụsịrị ozizi ndị amụma ụgha ga-adakpọ.”

Ihe Ndị A Ga-amụta n’Aka Eze Ahụ

Eze John Sigismund kwalitere agụmakwụkwọ, egwú, na nkà. Otú ọ dị, o biri ndụ dị mkpirikpi, ọ rịakwara ọrịa ọtụtụ mgbe. Ọchịchị ya n’onwe ya bụ nke ndị nọ ná mba ya yiri egwu—ọ dịkarịa ala a kpara nkata ugboro itoolu igbu ya—ndị si mba ọzọ yikwara ya egwu, ebe ọ bụ na mba ndị ọzọ kpaliri nnupụisi. Ọtụtụ mgbe, e kpewo eze a kwere ka okpukpe ọzọ dịrị ikpe n’ụzọ obi ọjọọ dabere n’echiche ndị o nwere banyere okpukpe. Otu onye mmegide mesịrị kwuo na “obi abụọ adịghị ya na [eze ahụ] gara hel.”

Otú ọ dị, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Wilbur, nyere aka mee ka e lee ihe anya n’ụzọ ziri ezi: “N’afọ ahụ mgbe Eze John [Sigismund] wepụtara akwụkwọ na-edepụta ihe ndị ruuru mmadụ, na-enye ọbụna òtù nile a gbanwere agbanwe bụ́ ndị a kasị emegide, nnwere onwe zuru ezu nke ikpe okpukpe, ndị ọkà mmụta okpukpe Protestant ka nọ na-eto Calvin maka ịkpọ Servetus ọkụ ná ndụ, e jiri Njụta Okwukwe ahụ kwafuo ọbara ndị Protestant na Netherlands, . . . ihe karịkwara afọ 40 ka ga-agafe tupu a kwụsị ịkpọ ndị mmadụ ọkụ n’elu osisi n’England n’ihi inwe echiche okpukpe na-ezighị ezi.”

N’ezie, dị ka otu onye nkọwa si kwuo ya, “dabere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụkpụrụ ọ bụla—dabere n’ezie n’ụkpụrụ e nwere n’oge ya—Eze John Sigismund bụ onye ọchịchị dị ịrịba ama. . . . O mere ka ikwe okpukpe ọzọ dịrị bụrụ ihe e ji mara ọchịchị ya.” N’ịmata na udo okpukpe na-abara mba ya uru, ọ ghọrọ onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-echebe nnwere onwe nke mmadụ ime ihe kwekọrọ n’akọ na uche ya nakwa nnwere onwe ikpe okpukpe.

N’oge nke anyị, bụ́ mgbe ekweghị okpukpe ọzọ dịrị ka na-eselite isi, anyị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe bara uru iche echiche banyere obere mba ahụ nke dịrị ogologo oge gara aga. N’ime mkpirikpi oge, Transylvania bụ n’ezie mba kwere okpukpe ọzọ dịrị n’ọgbọ na-ekweghị okpukpe ọzọ dịrị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Lee Teta! (Bekee), nke November 22, 1988, peeji nke 19-22.

^ par. 13 Lee Ụlọ Nche, nke January 1, 2000, peeji nke 21-23.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]

“A pụghị ịmanye akọ na uche mmadụ ịnabata ihe ọ na-achọghị . . . anyị chọrọ ka ndị anyị na-achị nwere onwe ha ime ihe kwekọrọ n’akọ na uche ha.”—Eze John nke Abụọ Sigismund

[Foto ndị dị na peeji nke 14, 15]

Georgio Biandrata

Peeji ndị e nwetara n’akwụkwọ Biandrata na Dávid bipụtara, gụnyere foto abụọ n’ime foto ndị wụrụ ndị kwere n’Atọ n’Ime Otu akpata oyi n’ahụ́

Francis Dávid mgbe ọ nọ n’ihu Òtù Ndị Ome Iwu nke Torda

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ihe osise abụọ nke Atọ n’Ime Otu e ji ahịrị ndị gbara okpotokpo see: © Cliché Bibliothèque nationale de France, Paris; foto ndị ọzọ nile: Országos Széchényi Könyvtár

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 16]

Peeji nke 2 na nke 16: Országos Széchényi Könyvtár