Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ka Ahụ́ Kpoo Ọkụ Na-ebelata Ihe Ize Ndụ nke Ibute Ọrịa

Ime Ka Ahụ́ Kpoo Ọkụ Na-ebelata Ihe Ize Ndụ nke Ibute Ọrịa

Ime Ka Ahụ́ Kpoo Ọkụ Na-ebelata Ihe Ize Ndụ nke Ibute Ọrịa

IHE IZE NDỤ NKE ỌNYÁ IBUTE ỌRỊA MGBE A WASỊRỊ MMADỤ AHỤ́ bụ nsogbu nọgideworo na-adị. Otú ọ dị, “ime ka ahụ́ kpoo ndị ọrịa ọkụ tupu a waa ha ahụ́ pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke ibute ọrịa ruo ihe karịrị pasent 60,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na-akọ.

Ndị nnyocha nọ n’Ụlọ Ọgwụ Mahadum dị n’Ebe Ugwu Tees, England, kewara ihe karịrị ndị ọrịa 400 ụzọ atọ bụ́ ndị a na-aga ịwa ahụ́ n’ara, n’akwara zara aza, ma ọ bụ ndị a na-aga ịwa hernia. E meghị ka ahụ́ kpoo otu ìgwè ọkụ, e mekwara ka akụkụ ahụ́ nwere nsogbu ma ọ bụ ahụ́ nile nke ìgwè abụọ ndị ọzọ kpoo ọkụ ruo ma ọ dịkarịa ala ọkara awa tupu a waa ha ahụ́. Gịnị si na ya pụta?

Mgbe a wasịrị ha ahụ́, ọ bụ nanị pasent 5 nke ndị ọrịa ahụ e mere ka ahụ́ ha kpoo ọkụ butere ọrịa n’ọnyá ha, ma e jiri ya tụnyere pasent 14 nke ndị a na-emeghị ka ahụ́ ha kpoo ọkụ. Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na ime ka ahụ́ kpoo ọkụ egosiworị na ọ na-adị irè n’ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ mbute ọrịa n’ebe ndị ọrịa a na-awa ahụ́ n’eriri afọ nọ.