Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Amamikpe—Ọ̀ Dị Njọ Mgbe Nile?

Obi Amamikpe—Ọ̀ Dị Njọ Mgbe Nile?

 Echiche nke Bible

Obi Amamikpe—Ọ̀ Dị Njọ Mgbe Nile?

ỌTỤTỤ ndị taa na-ele obi amamikpe anya dị ka ihe na-adịghị mma. Ha na-ele ya anya otú ọkà ihe ọmụma bụ́ onye Germany bụ́ Friedrich Nietzsche si lee ya anya, bụ́ onye sịrị: “Obi amamikpe bụ ọrịa kasị njọ nke rịatụworo mmadụ.”

Ma ụfọdụ ndị nnyocha na-eru ná nkwubi okwu dị iche ugbu a. “Obi amamikpe bụ otu akụkụ dị mkpa nke ịbụ onye na-enwe mmetụta, nke ga-aza ajụjụ maka omume ya,” ka Susan Forward, Ph.D., bụ́ ọkachamara a ma ama ná mba dị iche iche n’ịgwọ ọrịa na onye na-ede akwụkwọ, na-ekwu. “Ọ bụ otu akụkụ nke ịrụ ọrụ nke akọ na uche.” Ya bụrụ otú ahụ, obi amamikpe nile hà dị njọ? È nwere ọnọdụ ọ bụla ebe obi amamikpe pụrụ ịba uru?

Gịnị Bụ Obi Amamikpe?

Anyị na-enwe obi amamikpe mgbe anyị matara na anyị akpasuwo onye anyị hụrụ n’anya iwe ma ọ bụ mgbe anyị na-emeghị ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ anyị chere na anyị kwesịrị iji na-ebi ndụ. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo ya, a na-ejikọta obi amamikpe na “echiche nke iji ụgwọ n’ihi mmadụ ịbụ onye a pụrụ ịta ụta maka emeghị ihe, ịda iwu, mpụ, ma ọ bụ mmehie.”

N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e jikọtara onye Izrel ebighị ndụ dị ka Iwu Chineke kwuru na ịbụ onye ikpe mara—ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’aka e zoro na ya bụ n’akwụkwọ Bible bụ́ Levitikọs na Ọnụ Ọgụgụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, ọ fọrọ nke nta ka okwu ahụ ghara ịdị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ma n’ebe ole n’ole ọ pụtara, n’otu aka ahụ ọ bụ n’ihe banyere mmehie ndị dị oké njọ megide Chineke.—Mak 3:29; 1 Ndị Kọrint 11:27.

N’ụzọ dị mwute, anyị pụrụ inwe obi amamikpe n’abụghị ndị ikpe mara n’ezie. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ bụ onye na-achọkarị izu okè ma na-esetịpụkarịrị onwe ya ụkpụrụ ndị ezi uche na-adịghị na ha, ọ na-enwe obi amamikpe na-enweghị ezi ihe ndabere mgbe ọ bụla ihe na-agaghị otú e chere. (Eklisiastis 7:16) Ma ọ bụ anyị pụrụ ikwe ka ịkwa ụta ziri ezi n’ihi otu mmehie ihe ma ọ bụ emezighị emezi buo ibu ruo n’ókè nke ịghọ ihere ma ghọọ ịta onwe anyị ahụhụ n’ụzọ na-adịghị mkpa. Mgbe ahụ, olee uru obi amamikpe pụrụ ịba?

 Obi Amamikpe Pụrụ Ịba Uru

Inwe obi amamikpe pụrụ ịba uru ma ọ dịkarịa ala n’ụzọ atọ. Nke mbụ, ọ na-egosi na anyị maara ụkpụrụ ndị a na-anakwere. Ọ na-egosi na anyị nwere akọ na uche na-arụ ọrụ. (Ndị Rom 2:15) N’ezie, otu akwụkwọ Òtù Ndị Na-agwọ Ọrịa Uche n’America bipụtara na-ele enweghị obi amamikpe anya dị ka àgwà na-eyi ọha mmadụ egwu. Ọ na-esiri ndị akọ na uche ha rụrụ arụ ma ọ bụ nwụọ anwụ ike ịhụ ọdịiche dị n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ, nke ahụkwa pụrụ ịdị ize ndụ.—Taịtọs 1:15, 16.

Nke abụọ, akọ na uche na-ama ikpe pụrụ inyere anyị aka izere omume ndị na-ezighị ezi. Dị nnọọ ka ahụ́ mgbu nkịtị na-agbara anyị àmà nsogbu ahụ́ ike pụrụ ibilite, ihe mgbu nke uche nke e jikọtara ya na obi amamikpe na-agbara anyị àmà nsogbu nke omume ma ọ bụ nke ime mmụọ nke chọrọ ka anyị lebara ya anya. Ozugbo anyị matara adịghị ike ndị ahụ, o yikarịrị ka anyị ga-ezere ịkpasu onwe anyị, ndị anyị hụrụ n’anya, ma ọ bụ ndị ọzọ iwe n’ọdịnihu.—Matiu 7:12.

N’ikpeazụ, ikwupụta obi amamikpe pụrụ inyere ma onye nwere obi amamikpe ma onye e mejọrọ aka. Dị ka ihe atụ, obi amamikpe Eze Devid kpataara ya oké nchegbu. “Mgbe m gbara nkịtị, ọkpụkpụ m nile kara nká site n’ọgbụgbọ ụja m ogologo ụbọchị nile,” ka o dere. Ma mgbe o mesịrị kwupụtara Chineke mmehie ya, Devid ji obi ụtọ bụọ abụ, sị: “Iti mkpu nke mgbe a na-eme ka a gbapụ, ndị a ka Ị ga-eme ka ha dị m gburugburu.” (Abụ Ọma 32:3, 7) Nkwupụta mmehie pụrụ ime ka ọbụna obi dị onye ahụ e mejọrọ mma karị n’ihi na ikweta mmejọ ya pụrụ imesi onye ahụ e mejọrọ obi ike na onye nke ọzọ ahụ hụrụ ya n’anya ruo n’ókè nke ịkwa ụta maka ịkpasu ya iwe nke ukwuu.—2 Samuel 11:2-15.

Echiche Ziri Ezi Banyere Obi Amamikpe

Iji nwee echiche ziri ezi banyere obi amamikpe, rịba ama ọdịiche dị nnọọ n’ụzọ Jizọs na ndị Farisii si lee ndị mmehie nakwa mmehie anya. Na Luk 7:36-50, anyị na-agụ banyere otu nwanyị nke na-eme omume rụrụ arụ nke batara n’ụlọ otu onye Farisii, bụ́ ebe Jizọs nọ na-eri nri. O jekwuuru Jizọs, jiri anya mmiri ya saa ụkwụ Ya, teekwa ha mmanụ dị oké ọnụ ahịa nke na-esi ísì ụtọ.

Onye Farisii ahụ na-eme nsọ nsọ ledara nwanyị a anya dị ka onye dị ala n’ebe ọ nọ na onye ọ na-ekwesịghị ilebara anya. O kwuru n’ime onwe ya, sị: “Nwoke a [Jizọs], a sị na ọ bụ onye amụma, [ọ] gaara ama onye na-ebitụ ya aka, nakwa ụdị nwanyị ọ bụ, na ọ bụ onye mmehie.” (Luk 7:39) Jizọs gbaziri echiche ya ozugbo. “I teghị isi m mmanụ,” ka Jizọs sịrị. “Ma nwanyị a tere ụkwụ m mmanụ na-esi ísì ụtọ. N’ihi nke a, asị m gị, a gbagharawo ya mmehie ya n’agbanyeghị na ha dị ọtụtụ, n’ihi na o gosiri ịhụnanya dị ukwuu.” Obi abụọ adịghị ya na okwu obiọma a gbara nwanyị ahụ ume ma mee ka obi ruo ya ala.—Luk 7:46, 47.

Jizọs adịghị eleghara omume rụrụ arụ anya ma ọlị. Kama, ọ na-akụziri onye Farisii ahụ dị mpako otú ịhụnanya sị bụrụ ihe kasị mma dị ka ihe nkwali maka ijere Chineke ozi. (Matiu 22:36-40) N’ezie, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na nwanyị ahụ nwere obi amamikpe n’ihi ndụ rụrụ arụ o biri na mbụ. N’ụzọ doro anya, o nwere nchegharị, n’ihi na o bere ákwá, o meghị mgbalị ọ bụla iji gọpụ omume mbụ ya, o mere ihe ndị pụtara ìhè iji kwanyere Jizọs ùgwù n’ihu ọha. N’ịhụ nke a, Jizọs sịrị ya: “Okwukwe gị azọpụtawo gị; gawara onwe gị n’udo.”—Luk 7:50.

N’aka nke ọzọ, onye Farisii ahụ nọgidere na-eleda nwanyị ahụ anya dị ka onye mmehie. Ma eleghị anya o bu n’obi ‘ime ka ọ tụọ egwu Chineke’ ma menye ya ihere. Ma ọ bụ enweghị ịhụnanya bụ́ ịnọgide na-agbalị ime ka ndị ọzọ na-enwe obi amamikpe ma ọ bụrụ na ha adịghị eme ihe mgbe nile otú anyị chere na ha kwesịrị isi na-eme ya, n’ikpeazụkwa, ọ dịghị arụpụta ihe e bu n’obi. (2 Ndị Kọrint 9:7) A na-arụzu ihe ndị kasị mma site n’iṅomi Jizọs—site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya, iji obi eziokwu na-aja ndị ọzọ mma, na ikwupụta obi ike anyị nwere n’ebe ha nọ ọ bụ ezie na ịdọ aka ná ntị na ndụmọdụ pụrụ ịdị mkpa mgbe ụfọdụ.—Matiu 11:28-30; Ndị Rom 12:10; Ndị Efesọs 4:29.

Mgbe ahụ, obi amamikpe pụrụ ịba uru, ọbụna ịdị mkpa, mgbe anyị meworo ihe na-ezighị ezi. Ilu 14:9 (Knox) na-ekwu, sị: “Ndị nzuzu adịghị eji obi amamikpe nke chọrọ ihe mkpuchi mmehie akpọrọ oké ihe.” Akọ na uche na-ama ikpe pụrụ, o kwesịkwara ịkwali anyị ime nkwupụta mmehie na ihe ọzọ dị mkpa. Otú ọ dị, isi ihe mere anyị ji na-ejere Jehova ozi kwesịrị ịbụ mgbe nile, ọ bụghị obi amamikpe, kama ịhụnanya. (Job 1:9-11; 2:4, 5) Bible na-emesi anyị obi ike na mgbe e bu nke a n’uche wee nye ndị ezi omume agbamume ma nye ha ume ọhụrụ, ha ga-eme ihe nile ha nwere ike ime. Nke kasị mkpa, ha ga-eji obi ụtọ na-eme ya.