Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere E Ji Abụ Onye Nkụzi?

Gịnị Mere E Ji Abụ Onye Nkụzi?

 Gịnị Mere E Ji Abụ Onye Nkụzi?

“Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu ná ndị nkụzi na-ahọrọ ọrụ ha n’ihi na ọ bụ ọrụ na-enyere ndị mmadụ aka. [ Nkụzi bụ] mmadụ itinye onwe ya n’iweta mgbanwe ná ndụ ụmụaka.”—Akwụkwo bụ́ Teachers, Schools, and Society.

ỌBỤ ezie na ụfọdụ ndị nkụzi na-eme ka o yie ihe dị mfe, nkụzi pụrụ ijupụta n’ihe mgbochi ndị a na-aghaghị imeri—ịchịkwa klas ụmụ akwụkwọ karịrị akarị na ya, oké ide ihe, ịgbaso ụkpụrụ dị rịgọ rịgọ ma na-agwụ ike, ụmụ akwụkwọ na-adịghị amụta ihe, na ụgwọ ọnwa na-adịghị ezu ezu. Pedro, bụ́ onye nkụzi nọ na Madrid, Spen, si otú a kwuo ya: “Ịbụ onye nkụzi adịghị mfe ma ọlị. Ọ na-achọ nnọọ ịchụ onwe onye n’àjà. Ka o sina dị, n’agbanyeghị ihe isi ike ndị dị na ya, m ka na-ele ọrụ nkụzi anya dị ka nke na-akwụghachi ụgwọ karịa ọrụ ọ bụla ọzọ metụtara azụmahịa.”

Ihe ịma aka dị na ya pụrụ ịkarị akarị n’ụlọ akwụkwọ ndị dị n’obodo ukwu nke ihe ka n’ọtụtụ mba. Ọgwụ ọjọọ, mpụ, omume ọjọọ, nakwa mgbe ụfọdụ àgwà ọ gbasaghị m nke ndị mụrụ ụmụ, na-emetụta nnọọ ọnọdụ e nwere n’ụlọ akwụkwọ nakwa inye ịdọ aka ná ntị. Nnupụisi juru ebe nile. Gịnịzi mere ọtụtụ ndị maara nke a na-akọ ji ahọrọ ịbụ ndị nkụzi?

Leemarys na Diana bụ ndị nkụzi nọ na New York City. Ha na-akụziri ụmụaka ndị dị site n’afọ ise ruo afọ iri ihe. Ha abụọ na-asụcha asụsụ abụọ (Bekee na Spanish), ndị ha na-akụziri ihe karịsịa bụ ụmụaka ndị Spen. Ajụjụ anyị bụ . . .

Gịnị Na-akwali Onye Nkụzi?

Leemarys kwuru, sị: “Ị̀ na-ajụ ihe na-akwali m? Ọ bụ mmasị m nwere n’ebe ụmụaka nọ. Amaara m na n’ebe ụmụaka ụfọdụ nọ, ọ bụ nanị m na-akwado ha ná mgbalị ha.”

Diana kwuru, sị: “Akụziiri m nwa nwanne m ihe, bụ́ nwata nwoke dị afọ asatọ nke na-enwe ihe isi ike n’ụlọ akwụkwọ—karịsịa n’ịgụ ihe. O nyere m afọ ojuju dị ukwuu ịhụ ka ya na ndị ọzọ na-amụta ihe! Ya mere, ekpebiri m na m chọrọ ịdị na-akụzi ihe, akwụsịkwara m ọrụ n’ụlọ akụ̀ m na-arụ ọrụ na ya.”

Teta! jụrụ ndị nkụzi si ná mba dị iche iche otu ajụjụ ahụ, ihe ndị na-esonụ bụkwa ụfọdụ n’ime azịza ndị e nwetara.

Giuliano, bụ́ onye Ịtali nke dị afọ 40 na ụma, kọwara, sị: “Ahọọrọ m ọrụ a n’ihi na ọ masịrị m mgbe m bụ nwa akwụkwọ (n’aka nri). Elere m ya anya dị ka ihe na-eme ka a na-echepụta ihe na nke jupụtara n’ohere nke iji kwalie ndị ọzọ. Mmasị mbụ ahụ m nwere nyeere m aka imeri ihe isi ike ndị m nwetara ná mmalite nke ọrụ m.”

 Nick, bụ́ onye si New South Wales, Australia, kwuru, sị: “Ohere inweta ọrụ ná ngalaba nnyocha ọgwụ m nọ na ya kọrọ ụkọ, ma e nwere ọtụtụ ohere ná ngalaba mmụta. Achọpụtawo m kemgbe na m na-anụ ụtọ ịkụzi ihe, ụmụ akwụkwọ m yikwara ka hà na-anụ ụtọ ihe m na-akụziri ha.”

Ihe nlereanya ndị mụrụ ụmụ abụwo mgbe mgbe isi ihe na-akwali ndị na-ahọrọ ịbụ ndị nkụzi. William, bụ́ onye si Kenya, zara ajụjụ anyị, sị: “N’ụzọ bụ́ isi, nna m, onye bụbu onye nkụzi laa azụ na 1952, mere ka m chọọ ịbụ onye nkụzi. Ịmara na m na-akpụzi uche ndị na-eto eto bụ ihe meworo ka m nọgide n’ọrụ a.”

Rosemary, bụ́ onye sikwa Kenya, gwara anyị, sị: “Ana m enwe ọchịchọ mgbe nile inyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka. Ya mere, aghaghị m ịhọrọ ịbụ onye nọọsụ ma ọ bụ onye nkụzi. Ọrụ nke ịkụzi ihe bu ụzọ bịara m. Eziokwu ahụ bụ́ na m bụkwa nne emewo ka mmasị m nwere n’ọrụ ahụ dịkwuo ukwuu.”

Berthold, bụ́ onye si Düren, Germany, nwere ebumnobi dị iche maka ịkụzi ihe: “Nwunye m mere ka m kwenye na m ga-abụ ezi onye nkụzi.” O mesịkwara bụrụ na ihe o kwuru bụ eziokwu. Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọrụ m na-enye m oké ọṅụ ugbu a. Ọ gwụla ma onye nkụzi ọ̀ matara uru agụmakwụkwọ bara ma nwee mmasị n’ebe ndị na-eto eto nọ, ọ gaghị ekwe ya omume ịghọ ezi onye nkụzi nke na-enwe ihe ịga nke ọma, mkpali, na afọ ojuju.”

Otu onye nkụzi bụ́ onye Japan, bụ́ Masahiro, onye si Nakatsu City, kwuru, sị: “Ihe kpaliri m ịghọ onye nkụzi bụ inwe onye nkụzi maara nke a na-akọ n’afọ mbụ m n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị. O ji ezi itinye uche n’ọrụ ya na-akụziri anyị ihe. Isi ihe mekwara m jiworo nọgide n’ọrụ m bụ na m nwere mmasị n’ebe ụmụaka nọ.”

Yoshiya, bụ́ onye dị afọ 54 ugbu a, onye sikwa Japan, nwere ọrụ n’otu ụlọ ọrụ mmepụta ihe na-akwụ ezigbo ụgwọ, ma o nwere mmetụta na ya nọ n’ohu nye ọrụ ahụ nakwa nye ịgbagharị n’ụzọ. “Otu ụbọchị, echere m n’obi m, sị, ‘Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ebi ụdị ndụ a?’ Ekpebiri m ịchọ ọrụ nke metụtara ndị mmadụ karịa nke metụtara ihe ndị ọzọ. Nkụzi bụ ọrụ pụrụ iche. Ị ga na-akụziri ndị na-eto eto ihe. Ọ bụ ọrụ na-eme ka e chebara ndị ọzọ echiche.”

Valentina, bụ́ onye si St. Petersburg, Russia, nwekwara mmasị n’akụkụ ahụ nke ịbụ onye nkụzi. O kwuru, sị: “Nkụzi bụ ọrụ m họọrọ. Abụwo m onye nkụzi ụlọ akwụkwọ elementrị ruo afọ 37. Ana m enwe mmasị ịkụziri ụmụaka ihe, karịsịa ndị ka dị obere. Enwere m mmasị n’ọrụ m, ọ bụkwa ya mere na alabeghị m ezumike nká.”

William Ayers, onye bụkwa onye nkụzi n’onwe ya, dere, sị: “Ndị mmadụ na-aghọ ndị nkụzi n’ihi  na ha nwere mmasị n’ebe ụmụaka na ndị ntorobịa nọ, ma ọ bụ n’ihi na ha na-enwe mmasị ịnọnyere ha, na-ekiri ka ha na-etolite ma na-enwekwu ike ime ihe, na-eru eru karị, na-adịkwu ike n’ụwa. . . . Ndị mmadụ na-akụzi ihe . . . dị ka onyinye mmadụ na-enye ndị ọzọ onwe ya. Ana m akụzi ihe n’olileanya nke ime ka ụwa bụrụ ebe ka mma.”

Ee, n’agbanyeghị ihe isi ike na ihe ndọghachi azụ, a na-adọta ọtụtụ puku ndị inyom na ndị ikom ji ọrụ ha akpọrọ ihe n’ọrụ nkụzi. Olee ụfọdụ n’ime nsogbu ndị bụ́ isi ha na-eche ihu? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Aro Maka Nkwurịta Okwu n’Etiti Onye Nkụzi na Ndị Mụrụ Ụmụ

✔ Mara nne na nna ụmụ akwụkwọ gị. Nke a abụghị igbu oge. Ọ bụ iji oge eme ihe n’ụzọ ga-abara unu nile uru. Ọ bụ ohere i nwere iso ndị pụrụ ịbụ ndị ga-akasị enyere gị aka na-emekọrịta ihe n’ụzọ dị mma.

✔ Na-agwa ndị mụrụ ụmụ okwu n’ụzọ kwesịrị ha—emesola ha ihe dị ka a ga-asị na ị ka ha mara ihe. Zere iji asụsụ e ji mara ndị nkụzi agwa ha okwu.

✔ Mgbe ị na-ekwu okwu banyere ụmụ ha, mee ka ebe ndị ha na-eme nke ọma pụta ìhè. Ịja mma na-arụzu ihe ka mma karịa nkatọ. Kọwaa ihe ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji nyere ụmụ ha aka inwe ihe ịga nke ọma.

✔ Kwe ka ndị mụrụ ụmụ kwuo okwu, geekwa ntị n’ezie.

✔ Ghọta ọnọdụ e nwere n’ebe obibi nwatakịrị. Ya kwe mee, gaa nleta n’ebe obibi ha.

✔ Yie ụbọchị ọzọ gị na ha ga-ekwurịta okwu. Ọ dị mkpa ịdị na-emechi ya anya. Ọ na-egosi na mmasị i nwere bụ nke ezigbo ya.—Ọ dabeere n’akwụkwọ bụ́ Teaching in America.

[Foto dị na peeji nke 6]

‘Nna m bụbukwa onye nkụzi.’—WILLIAM, KENYA

[Foto dị na peeji nke 7]

“Ana m enwe mmasị ịkụziri ụmụaka ihe.”—VALENTINA, RUSSIA

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

“Nkụzi bụ ọrụ pụrụ iche. Ị ga na-akụziri ndị na-eto eto ihe.”—YOSHIYA, JAPAN