Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ekwensu—Ọ̀ Bụ Ajọ Onye Dị Adị n’Ezie?

Ekwensu—Ọ̀ Bụ Ajọ Onye Dị Adị n’Ezie?

Ekwensu—Ọ̀ Bụ Ajọ Onye Dị Adị n’Ezie?

N’ỌTỤTỤ okpukpe, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ amalitewo iwere Ekwensu dị ka ihe sitere na nkwenkwe—ihe ụmụ mmadụ chepụtara. Ya mere Dionigi Tettamanzi, bụ́ achịbishọp nke Genoa—otu n’ime ndị kadinal a ma ama n’Ịtali—kpasuru ọgba aghara site n’akwụkwọ ozi ya dị peeji 40 nke o degaara ndị ụkọchukwu banyere otú a ga-esi lụsoo Ekwensu ọgụ. O depụtara “iwu 10.”

Nke mbụ: “Echefula na ekwensu dị,” n’ihi na “ụgha mbụ” ya bụ iji “mee ka anyị kwere na ya adịghị.”

Nke abụọ: “Echefula na ekwensu bụ onye ọnwụnwa. . . . Agụla onwe gị n’onye ọ na-apụghị ịwakpo ma ọ bụ nweta.”

Nke atọ: “Echefula na ekwensu nwere ọgụgụ isi nke ukwuu, dịkwa akọ. Ọ nọgidewo na-abụ ogbu na nwayọọ site n’ịdị na-adọrọ mmasị, dị ka ọ dọọrọ mmasị nke nwoke mbụ.”

Nke anọ: “Nọrọ na nche: n’anya na n’obi. Dịkwa ike: ná mkpebisi ike na n’omume ọma.”

Nke ise: “Kwenyesie ike ná mmeri Kraịst meriri onye ọnwụnwa ahụ” n’ihi na nke a “ga-eme ka i nwee obi ike na obi iru ala ọbụna ná mwakpo ime ihe ike kasịnụ nke a pụrụ ịwakpo gị.”

Nke isii: “Cheta na Kraịst na-eme ka ị bụrụ onye so na-eketa òkè ná mmeri ya.”

Nke asaa: “Nọgide na-ege ntị n’Okwu Chineke.”

Nke asatọ: “Dị umeala n’obi ma dị njikere idi mweda n’ala.”

Nke itoolu: “Na-ekpe ekpere mgbe nile, n’adaghị mbà,” iji merie ọnwụnwa.

Nke iri: “Na-asọpụrụ Onyenwe anyị bụ́ Chineke gị, na-efekwa nanị ya ofufe.”

Mmetụta dị aṅaa ka akwụkwọ ozi a o degaara ndị ụkọchukwu nwere? Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Okpukpe nke Milan enweghị mmasị n’okwu ndụmọdụ ya. Ụlọ Akwụkwọ ahụ rụrụ ụka na ụdị ‘nchepụta nkà mmụta okpukpe dị otú ahụ yiri echiche e nwere mgbe ụwa na-emepechabeghị anya.’ Dị ka otu ọnụ na-ekwuchitere ha si kwuo, “ịta ekwensu ụta dum pụrụ inye aka n’ịnapụ ndị mmadụ ịbụ ọrụ dịịrị ha [onwe ha].”

Ọ bụ ezie na Bible adịghị eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-agaghị aza ajụjụ maka omume ha, n’ụzọ doro anya ọ na-eme ka a mata Setan bụ́ Ekwensu dị ka “chi nke usoro ihe a,” onye nwara Jizọs ọnwụnwa. Ọ na-ekpughekwa ike Setan nwere na ọchịchọ ya nke bụ́ ime ka “uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.”—2 Ndị Kọrint 4:4; Matiu 4:1-11.

N’ezie, dị ka Pita onyeozi dere, Setan “dị ka ọdụm na-ebigbọ ebigbọ, na-achọ onye ọ ga-eripịa.” (1 Pita 5:8) Ka a sịkwa ihe mere Jọn onyeozi ji chetaghachiri ndị kwere ekwe, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ọ ga-abụrụ anyị amamihe ịghara ileghara ịdọ aka ná ntị Akwụkwọ Nsọ ndị a anya.