Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alụmdi na Nwunye Kwesịrị Ịbụ Njikọ Na-adịgide Adịgide

Alụmdi na Nwunye Kwesịrị Ịbụ Njikọ Na-adịgide Adịgide

 Alụmdi na Nwunye Kwesịrị Ịbụ Njikọ Na-adịgide Adịgide

DỊ KA a na-egosi ná mmechi ọtụtụ ihe nkiri sịnịma, alụmdi na nwunye bụ ihe mgbaru ọsọ a na-achọsi ike iru. Mgbe mgbe, nwoke

na nwanyị ahụ na-emesị mata onwe ha, lụọ, ma birizie “n’obi ụtọ mgbe nke ahụ gasịrị.” N’ihe nkiri film dị iche iche, ọ bụ n’ebe ahụ ka okwu na-ebikarị.

N’ezie, ọ bụghị n’agbamakwụkwọ ka okwu na-ebi, kama ọ bụ mmalite nke ibikọ ndụ ọhụrụ ọnụ. Olileanya bụkwa na dị ka Eklisiastis 7:8 si kwuo, “ikpeazụ ihe dị mma karịa mmalite ya.”

Njikọ Na-adịgide Adịgide

Ọ dị mkpa ilepụ anya n’ihu. Alụmdi na nwunye aghaghị inwe ntọala ndị siri ike ma ọ bụrụ na ọ ga-adịgide ma na-enye afọ ojuju. Ma ọ́ bụghị ya, nrụgide a ga-enwe ma a gbasịa akwụkwọ pụrụ ịdị nnọọ ukwuu karịa nrụgide e nwere tupu agbamakwụkwọ. Onye Kraịst apụghị ịbanye n’alụmdi na nwunye na-eche, sị: ‘Ọ bụrụ na ọ gaghị nke ọma, enwere m ike ịgba alụkwaghịm mgbe ọ sọrọ m.’ E kwesịrị ile alụmdi na nwunye anya dị ka njikọ na-adịgide adịgide.

Jizọs mere ka o doo anya na alụmdi na nwunye ga-abụ ihe na-adịgide adịgide mgbe ọ zara otu ajụjụ a jụrụ ya banyere izi ezi nke ịgba alụkwaghịm. O kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na [Chineke] onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwanyị wee sị, ‘N’ihi nke a, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:4-6.

Mgbe Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gasịrị

E kwuwo n’ụzọ ziri ezi na ná ndụ Onye Kraịst, alụmdi na nwunye bụ ihe nke abụọ kasị mkpa ma e wezụga nrara ọ raara onwe ya nye Chineke. Nraranye na-ejikọ mmadụ na Onye Okike ya ruo mgbe ebighị ebi, baptizim na-emekwa ka nke ahụ pụta ìhè n’ihu ọha. Alụmdi na nwunye bụ nkwupụta ihu ọha nke nkwa i kwere onye ọzọ—ruo mgbe ebighị ebi. O yighị ka mmadụ ọ̀ ga-arara onwe ya nye Chineke ma ọ bụ nwee nkekọ alụmdi na nwunye mgbe ọ ka na-enwe nnọọ obi abụọ. Ya mere, ndị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-eme nke ọma iji nlezianya nyochaa ihe ndị onye ha na-achọ ịlụ kweere, ihe mgbaru ọsọ ya, akparamàgwà ya, na ụdị onye ọ bụ.

Mgbe a na-akwadebe maka agbamakwụkwọ ahụ, obiọma, ezi uche, na mmụọ nke imekọ ihe  ọnụ dị mkpa. Àgwà ndị dị otú ahụ dị mkpa mgbe ọ gasịrị ọbụna karị, iji mee ka alụmdi na nwunye ahụ gaa nke ọma. Ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ hụrụ ibe ha n’anya, ma mgbe alụmdi na nwunye gasịrị, e kwesịrị icheta na kwa ụbọchị, ịhụnanya ‘adịghị achọ ọdịmma nke ya.’ Ọ bụrụ na a nọgide na-enwe ya site n’afọ ruo n’afọ, “ịhụnanya adịghị ada ada.” (1 Ndị Kọrint 13:5, 8) Ọ bụrụ na e nwee ịhụnanya na-adịgide adịgide, ọ ga-adị mfe karị igosipụta àgwà ndị dị ka ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye—mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Àgwà ndị a dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye.—Ndị Galeshia 5:22, 23.

Akụkụ siri ike bụ ịnọgide na-egosipụta àgwà ndị dị otú ahụ mgbe ụbọchị agbamakwụkwọ gasịrị. Otú ọ dị, isi ihe na-eduga n’inwe ihe ịga nke ọma n’igosipụta ezi àgwà ndị dị otú ahụ bụ nke a: Hụ onye ị lụrụ n’anya, ma dị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà.

Jizọs kwuru na iwu kasịnụ maka ụmụ mmadụ bụ ịhụ Jehova n’anya, o kwukwara na iwu nke abụọ kasịnụ bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị  ka onwe gị.’ (Matiu 22:39) Onye agbata obi kasị nso nke onye lụworo di ma ọ bụ nwunye bụ onye òtù ọlụlụ ya, n’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla n’elu ala nke pụrụ ijikọta mmadụ abụọ otú alụmdi na nwunye pụrụ ime.

Otú ọ dị, njikọ nkịtị nke anụ ahụ́ n’onwe ya apụghị imerịrị ka e nwee nkwekọ nke uche. Njikọ nke anụ ahụ́ abụọ adịkarịghị abụ njikọ nke uche abụọ. Ka njikọ mmekọahụ wee nwee ike inye nnọọ afọ ojuju, a ghaghịkwa inwe njikọ nke abụọ—njikọ nke obi na ebumnobi. Ọtụtụ mgbe, ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà maka onye nke ọzọ na-abụ ụgwọ ọ dị mkpa ka a kwụọ iji mee ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma. Ònye kwesịrị ịchụ àjà ndị ahụ? Ọ̀ bụ di? Ọ̀ bụ nwunye?

Igosi Ịhụnanya na Nsọpụrụ

Okwu Chineke na-enye iwu, sị: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Ọ bụrụ na ị pụrụ ime ya, chụọ àjà ahụ ọbụna tupu di ma ọ bụ nwunye gị arịọ ka i mee otú ahụ. E kwuwerị, ihe e nwetara mgbe a rịọworo arịrịọ ugboro ugboro maka ya na-abụ nke a na-adịchaghịzi eji akpọrọ ihe. Kama nke ahụ, onye òtù ọlụlụ nke ọ bụla kwesịrị ịzụlite àgwà nke ibute ụzọ n’inye onye nke ọzọ nsọpụrụ.

Dị ka ihe atụ, e nyere ndị bụ́ di iwu ịdị “na-ekenye [ndị bụ́ nwunye] nsọpụrụ dị ka ihe ka bụrụ nke na-esighị ike, ihe bụ́ nwanyị, . . . ka e wee ghara igbochi ekpere [ha].” (1 Pita 3:7) Ọ bụrụ na di adịghị enye nwunye ya nsọpụrụ, ọ ga-enwe mmetụta dị njọ ọbụna n’ekpere ọ na-ekpegara Chineke. Gịnịdị ka mmadụ inye nwunye ya nsọpụrụ pụtara? Ọ pụtara ịdị na-echebara ya echiche mgbe nile, na-ege ntị n’uche ya, na-ahapụ ya ka o buru ụzọ họta ihe n’ihe ụfọdụ ọtụtụ mgbe. Nwunye pụkwara inye di ya nsọpụrụ n’otu ụzọ ahụ, site n’ịgbalịsi ike ịbụ onye inyeaka na-ekwenye ekwenye.—Jenesis 21:12; Ilu 31:10-31.

Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, n’ihi na ọ dịghị nwoke kpọtụworo anụ ahụ́ nke ya asị; kama ọ na-azụ ma na-elezi ya anya, dị ka Kraịst ahụ na-emekwara ọgbakọ ahụ.” Olee ókè Kraịst hụruru ụmụazụ ya n’anya? Ọ dị njikere ịnwụ n’ihi ha. Bible na-ekwukwa, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu [ndị bụ́ di] n’otu n’otu sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya.” (Ndị Efesọs 5:28-33) Okwu Chineke na-agwakwa ndị bụ́ nwunye “ịhụ di ha n’anya, . . . na-edo onwe ha n’okpuru di nke aka ha, ka e wee ghara ikwujọ okwu Chineke.”—Taịtọs 2:4, 5.

Na-anabata Mmehie Ihe

Ebe ọ bụ na a mụrụ mmadụ nile n’ezughị okè, ha ga-emehie ihe. (Ndị Rom 3:23; 5:12; 1 Jọn 1:8-10) Ma kama ime ka mmejọ ahụ hie nne karịa otú ọ hà n’ezie, gbasoo ndụmọdụ Bible bụ́: “Karịsịa ihe nile, nweenụ ịhụnanya siri ike maka ibe unu, n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” (1 Pita 4:8) A na-akasị edozi obere mmejọ site n’ịgabiga ha, ilefuru ha anya. Ọ pụkwara ịdị otú ahụ n’ebe ndị ka njọ dị. Ndị Kọlọsi 3:12-14 na-ekwu, sị: “Yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi. Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpam kpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a nile, yikwasịnụ onwe unu ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”

Ruo ókè hà aṅaa ka anyị kwesịrị ịdị na-agbaghara njehie na mmejọ nkịtị nke di ma ọ bụ nwunye anyị? Pita jụrụ Jizọs, sị: “‘Onyenwe anyị, ugboro ole ka nwanna m ga-emehie megide m, mụ agbaghara ya? Ọ̀ bụ ruo ugboro asaa?’ Jizọs sịrị ya: ‘Asị m gị, ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa.’” (Matiu 18:21, 22) Ebe ọ bụ na Jizọs nọ na-ekwu nke a banyere ndị na-anọghị ná njikọ alụmdi na nwunye, lezienụ otú mgbaghara na-aghaghị isi dị oké mkpa n’etiti di na nwunye!

Ọ bụ ezie na a na-awakpo njikọ alụmdi na nwunye n’afọ ndị a, n’ikpeazụ, alụmdi na nwunye ga-alanarị n’ihi na ọ bụ Chineke guzobere ya, ihe ọ bụla o guzobekwara ‘na-adị mma.’ (Jenesis 1:31) Oge ya agaghị agafe agafe. Ọ pụkwara ịga nke ọma, karịsịa n’etiti ndị na-asọpụrụ ma na-agbaso iwu Chineke. Ma ihe ịma aka dị na ya bụ: Mmadụ abụọ ahụ hà ga-emezu nkwa ahụ ha kwere n’ụbọchị agbamakwụkwọ bụ́ ịhụ ibe ha n’anya na ilekọta onwe ha? N’ezie nke ahụ pụrụ ịbụ ihe ịma aka, ị ghaghịkwa itinye mgbalị siri ike iji nwee mmeri. Ma ihe ọ ga-arụpụta ga-ekwesị mgbalị i tinyere!

[Igbe dị na peeji nke 10]

ỊGBA ALỤKWAGHỊM NA NKEWA

Chineke, bụ́ Onye Malitere alụmdi na nwunye, mere ya ka ọ bụrụ njikọ na-adịgide adịgide. Ma è nwere ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro ga-eme ka mmadụ gbaa di ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm—bụ́kwa nke ga-enye ya ohere ịlụ di ma ọ bụ nwunye ọzọ? Jizọs kwuru banyere nke a site n’ikwu, sị: “Asị m unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ na-akwa iko.” (Matiu 19:9) Ọ bụ nanị ekwesịghị ntụkwasị obi nke di ma ọ bụ nwunye n’ụzọ mmekọahụ bụ ihe mgbakwasị ụkwụ e nwere maka ịgba alụkwaghịm nke ga-enye onye nke aka ya dị ọcha ohere ịlụ di ma ọ bụ nwunye ọzọ.

Tụkwasị na nke a, okwu Bible dị ná 1 Ndị Kọrint 7:10-16 n’agbanyeghị na ọ na-agba di na nwunye ume ibikọ ọnụ nyere ohere maka nkewa. Ụfọdụ ndị, mgbe ha gbalịsiworo ike ichebe alụmdi na nwunye ha, na-eche na ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime ma ọ́ bụghị ikewa. Gịnị pụrụ ịbụ ihe mgbakwasị ụkwụ dị mma dabeere n’Akwụkwọ Nsọ maka ime ihe dị otú ahụ?

Otu bụ ịma ụma jụ inye nkwado. Mgbe onye bụ́ di lụrụ nwunye, ọ na-eburu ibu ọrụ nke igbo mkpa nwunye ya na ụmụ ya. Nwoke nke ma ụma ghara ịdị na-enye ezinụlọ ya ihe ndị dị mkpa e ji ebi ndụ ‘ajụwo okwukwe, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.’ (1 Timoti 5:8) Ya mere, a pụrụ ikewa.

Ọzọ bụ iti ihe n’ụzọ gabigara ókè. Ya mere, ọ bụrụ na di na-etikarị nwunye ya ihe, nwunye ya pụrụ ikewara. (Ndị Galeshia 5:19-21; Taịtọs 1:7) “Onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi [Chineke] na-akpọ asị.”—Abụ Ọma 11:5.

Ihe mgbakwasị ụkwụ ọzọ maka nkewa bụ itinye kpam kpam ọnọdụ ime mmụọ nke onye kwere ekwe n’ihe ize ndụ—mmekọrịta mmadụ na Chineke. Mgbe mmegide nke onye òtù ọlụlụ mmadụ, ikekwe gụnyere ihe mgbochi nkịtị, mere ka ọ ghara ikwe omume ka onye ahụ fee ezi ofufe ma tinyekwa ọnọdụ ime mmụọ nke onye ahụ kwere ekwe n’ihe ize ndụ, mgbe ahụ, ụfọdụ ndị kwere ekwe ahụwo ya dị ka ihe dị mkpa ikewara. *Matiu 22:37; Ọrụ 5:27-32.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmadụ achọọ ịgba alụkwaghịm n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ gaghị enwere onwe ya ịbanye n’alụmdi na nwunye ọhụrụ. Dị ka Bible si kwuo, nanị ihe mgbakwasị ụkwụ ziri ezi e nwere maka ịgba alụkwaghịm bụ́ nke na-enye ohere maka ịlụ di ma ọ bụ nwunye ọzọ bụ “ịkwa iko.”—Matiu 5:32.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Lee Ụlọ Nche nke November 1, 1988, peeji nke 22-23, maka ntụle nke nkewa.

[Foto dị na peeji nke 9]

E kwesịrị ile alụmdi na nwunye anya dị ka ndokwa na-adịgide adịgide

[Foto dị na peeji nke 10]

Jizọs sịrị na anyị kwesịrị ịgbaghara “ugboro iri asaa na asaa”