Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa Ebe Ụkwụ Ga-eru Onye Ọ Bụla Ala

Ụwa Ebe Ụkwụ Ga-eru Onye Ọ Bụla Ala

 Ụwa Ebe Ụkwụ Ga-eru Onye Ọ Bụla Ala

“Ebe ọ bụ na nsogbu ndị gbara ọsọ ndụ bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ, ọchịchọ a na-achọ ngwọta aghaghịkwa ịbụ nke zuru ụwa ọnụ.”—Gil Loescher, prọfesọ ná mmekọrịta mba na mba.

DI NA nwunye ahụ na-akatabeghị ahụ́ ji abalị pụọ. N’ichegbu onwe ya banyere nchebe ha, di nwanyị ahụ egbughị oge ọ bụla, n’agbanyeghị na ha nwere otu obere nwa. Ọ nụwo na onye ọchịchị aka ike, nke obi tara mmiri, bụ́ onye na-achị mba ha na-eme atụmatụ ịwakpo obodo ha. Mgbe ha mesịrị njem tara akpụ nke gafere otu narị kilomita, ezinụlọ ahụ n’ikpeazụ gafeere ókè mba ha gaa n’ebe dị nchebe.

E mesịrị mara ezinụlọ a na-abaghị ọgaranya n’ụwa nile. Aha nwatakịrị ahụ bụ Jizọs, aha ndị mụrụ ya bụkwa Meri na Josef. Ndị a gbara ọsọ ndụ ahapụghị ala ha ije chọọ akụ̀ na ụba. Kama, ọnọdụ ha bụ ọnọdụ na-eyi ndụ egwu. Leenụ, ọ bụ nwa ha ka e bu n’obi na-achọ ime mwakpo ahụ!

Dị ka ọtụtụ ndị ọzọ gbara ọsọ ndụ, Josef na ezinụlọ ya mesịrị laghachi n’ala nna ha mgbe ọnọdụ ọchịchị dị n’ebe ahụ kara mma. Ma ọsọ ha gbara n’oge nyere aka zọpụta ndụ obere nwa ha. (Matiu 2:13-16) Ijipt, bụ́ mba ha gbagara, bụ nke a ma ama n’ịnabata ma ndị gbara ọsọ ndụ n’ihi ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ndị gbara ọsọ ndụ n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, nna nna Jizọs chọtara nchebe n’Ijipt mgbe ụnwụ nri kpara ala Kenan aka ọjọọ.—Jenesis 45:9-11.

Ha Nọ ná Nchebe Ma Ha Enweghị Afọ Ojuju

Ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ nakwa ndị nke oge a na-egosi na ịgbaga ná mba ọzọ pụrụ ịzọpụta ndụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka bụụrụ ezinụlọ ọ bụla ahụmahụ na-akpaghasị uche bụ́ ịgbapụ n’ebe obibi ha. N’agbanyeghị otú ebe obibi ahụ dịruru ala, ma eleghị anya ọ bụ ebe mmadụ tinyere oge na ego ya ruo ọtụtụ afọ. Ọ pụkwara ịbụ ihe nketa ezinụlọ nke na-ejikọta ha na ọdịnala ha na ala ha. Ọzọkwa, ndị gbara ọsọ ndụ pụrụ iwere ihe onwunwe ole na ole, ma ha weredị ewere. N’ihi ya, ndị gbara ọsọ ndụ na-aghọkarị ndị ogbenye n’agbanyeghi ọnọdụ ha na mbụ.

Obi iru ala a na-enwe na mbụ mgbe e ruru n’ebe dị nchebe pụrụ imi ala ngwa ngwa ma ọ bụrụ na olileanya ha nwere maka ọdịnihu agwụla ibi n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ. Ka a na-anọtekwu aka n’ebe a gbagara ọsọ ndụ ahụ, otú ahụkwa ka ihe na-atakwu akpụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ha na ndị bi n’ime obodo adịghị emekọrịta ihe. Ndị gbara ọsọ ndụ, dịkwa ka onye ọ bụla ọzọ, chọrọ inwe ebe ụkwụ ga-eru ha ala. Ogige ndị gbara ọsọ ndụ abụtụghị ebe dị mma ịnọ zụlite ụmụ. À ga-emesị nwee oge mgbe onye ọ bụla ga-enwe ebe ọ ga-akpọ ụlọ ya?

Ụgbọ Nwa Mkpi Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta Ya?

N’afọ ndị 1990, ihe dị ka nde mmadụ itoolu a chụpụrụ n’ebe obibi ha mesịrị laghachi n’ụlọ ha. Nye ụfọdụ n’ime ndị a, ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ, ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi malite idozigharị ndụ ha. Ma ndị ọzọ nwere nkụda mmụọ. Ha laghachiri nanị n’ihi na ọnọdụ ha nọ na ya ná mba ha gbagara na ya ekwekwaghị ha odidi. Nsogbu ndị ha nwere mgbe ha nọ n’ala ọzọ dị nnọọ njọ nke na ha kpebiri na ọ ga-akara ha mma ịnọ ná mba ha, n’agbanyeghị enweghị nchebe o doro anya na ha ga-eche ihu.

 Ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị mma, ịgbara mmadụ ụgbọ nwa mkpi na-eweta ihe isi ike dị iche iche n’ihi na ọ pụtara mmadụ ịkwakọrọ ihe nile o nwere si n’ebe obibi ya pụọ nke ugbo abụọ. “Ebe mmadụ si enweta ihe e ji ebi ndụ dị ka ala, ọrụ, ebe obibi na anụ ụlọ, na-efunahụ ya n’oge ọ bụla ọ kwagharịrị akwagharị,” ka akwụkwọ bụ́ The State of the World’s Refugees 1997-98 na-ekwu. “Nkwagharị nke ọ bụla bụkwa mmalite nke usoro mweghachi ihe nke tara akpụ.” Otu nnyocha e mere banyere ndị gbara ọsọ ndụ a gbaara ụgbọ nwa mkpi n’ebe etiti Africa gosiri na “nye ndị gbara ọsọ ndụ bụ́ ndị nwetara enyemaka n’ebe ha gbagara, nlaghachi ahụ pụrụ isiri ha ike karịa ibi ná mba ọzọ n’onwe ya.”

Otú ọ dị, ọnọdụ nke ọtụtụ nde ndị gbara ọsọ ndụ bụ́ ndị a na-amanye ịlaghachi ná mba ha n’ụzọ megidere ọchịchọ ha dị mwute ọbụna karị. Ọnọdụ ndị dị aṅaa na-echere ha? “O nwere ike bụrụ na ndị laghachirinụ aghaghị ibi n’ebe a na-enwetụghị ụkpụrụ iwu, ebe izu ohi na mpụ ihe ike jupụtara, ebe ndị bụbu ndị soja na-awakpo ndị nkịtị nakwa n’ebe ihe ka ukwuu ná ndị mmadụ pụrụ inweta obere ngwá agha,” ka otu akụkọ nke Mba Ndị Dị n’Otu wepụtara na-ekwu. O doro anya na ọnọdụ ọjọọ ndị dị otú ahụ adịghị egbo ọbụna mkpa ndị bụ́ isi maka nchebe nke ndị a a chụpụrụ n’ebe obibi ha.

Ime Ka E Nwee Ụwa Ebe Mmadụ Nile Ga-anọ ná Nchebe

Ịgbara ndị mmadụ ụgbọ nwa mkpi ná mmanye ma ọ bụ nke ha na-ejichaghị obi ha dum nabata agatụghị agwọta nsogbu nke ịgba ọsọ ndụ ma ọ bụrụ na e dozighị ihe ndị na-akpata ya. Odoziakụ Sadako Ogata, onye bụbu Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ, kwuru na 1999, sị: “Ihe ndị meworo n’iri afọ a—n’eziekwa, ndị mere n’afọ gara aga—na-egosi n’ụzọ doro anya na a pụghị ịtụle okwu banyere ịgba ọsọ ndụ n’ekwughị okwu ịnọ ná nchebe.”

Ọtụtụ nde ndị mmadụ gburugburu ụwa nọkwa n’enweghị nchebe ma ọlị. Kofi Annan, bụ́ odeakwụkwọ ukwu nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-akọwa, sị: “N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, mba dị iche iche adawo n’ihi ọgụ ndị a na-alụ n’ime mba ahụ nakwa n’etiti ógbè na ógbè, na-eme ka ụmụ amaala ha ghara inwe ezi nchebe. N’ebe ndị ọzọ, gọọmenti dị iche iche, bụ́ ndị na-ajụ ime ihe maka ọdịmma mmadụ nile, ndị na-akpagbu ndị na-emegide ha ma na-ata ndị aka ha dị ọcha so n’ìgwè ka ala n’ọnụ ọgụgụ ahụhụ, etinyewo ịnọ ná nchebe nke ụmụ mmadụ n’ihe ize ndụ.”

Agha, mkpagbu, na ime ihe ike agbụrụ—isi ihe ndị na-akpata anọghị ná nchebe nke Kofi Annan kọwara—na-esitekarị n’ịkpọasị, ajọ mbunobi, na ikpe na-ezighị ezi. A gaghị ewepụ ajọ ihe ndị a n’ụzọ dị mfe. Nke ahụ ọ̀ pụtara na nsogbu ịgba ọsọ ndụ ga-akarịrị njọ?

Ọ bụrụ na a hapụrụ ya ụmụ mmadụ, obi abụọ adịghị ya na ọ ga-aka njọ. Ma n’ime Bible, Chineke na-ekwe nkwa na ya “na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:9) Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaịa, ọ kọwakwara oge mgbe ndị mmadụ “ga-ewukwa ụlọ, biri  n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. . . . Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri: n’ihi na mkpụrụ nke ndị Jehova gọziworo ka ha bụ, ha na ụmụ ga-esi n’ahụ́ ha pụta.” (Aịsaịa 65:21-23) N’ezie, ọnọdụ ndị dị otú ahụ ga-ewepụ nsogbu nke ịgba ọsọ ndụ. À pụrụ imezu ya?

“Ebe agha na-amalite n’uche ndị mmadụ, ọ bụ n’uche ndị mmadụ ka a na-aghaghị iwunye ihe nchebe maka udo,” ka okwu mmalite nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu. Onye Okike anyị maara nke ọma na ọ dị mkpa ka e nwee mgbanwe echiche. Otu onye amụma ahụ na-akọwa ihe mere onye ọ bụla nọ n’ụwa ga-eji nọrọ ná nchebe otu ụbọchị, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.

Ndịàmà Jehova achọpụtaworị na ihe ọmụma Jehova pụrụ imeri ajọ mbunobi na ịkpọasị. N’ọrụ nkwusa ha zuru ụwa ọnụ, ha na-agbalị ịkwalite ụkpụrụ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-akụbanye ịhụnanya kama ịkpọasị, ọbụna ná mba ndị agha tisasịrị. Ha na-enyekwara ndị gbara ọsọ ndụ aka n’ụzọ ọ bụla ha nwere nnọọ ike.

N’aka nke ọzọ, ha ghọtara na ngwọta zuru ezu nye nsogbu nke ịgba ọsọ ndụ dị n’aka Eze Chineke họpụtara, bụ́ Jizọs Kraịst. Ọ maara n’ezie otú ịkpọasị na ime ihe ike pụrụ isi bibie ndụ ndị mmadụ n’ụzọ dị mfe. Bible na-emesi anyị obi ike na ọ ga-eji ezi omume kpee ndị nwere obi dị umeala ikpe. (Aịsaịa 11:1-5) N’oge ọchịchị eluigwe ya ga na-achị, uche Chineke ga-eme n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe. (Matiu 6:9, 10) Mgbe oge ahụ ruru, ọ dịghị onye ọ ga-adịtụdị mkpa ịghọ onye gbara ọsọ ndụ. Onye ọ bụla ga-enwekwa ebe ọ ga-akpọ ụlọ ya.

[Igbe dị na peeji nke 24]

Gịnị Dị Mkpa Iji Gwọta Nsogbu nke Ịgba Ọsọ Ndụ?

“Igbo mkpa nke ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha n’ụwa—ma ndị gbara ọsọ ndụ ma ndị na-enweghịzi ebe obibi n’obodo ha—gụnyere nnọọ ọtụtụ ihe na-abụghị nanị inye nchebe na enyemaka nwa oge. Ọ gụnyere ime ihe maka mkpagbu, ime ihe ike na ọgụ bụ́ ndị na-akpatadị mmadụ isi n’ebe obibi ya gbapụ. Ọ gụnyere ịghọta ihe ndị ruuru ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka nile bụ́ inwe udo, nchebe na ùgwù n’enweghị mgbe ha ga-esi n’ebe obibi ha gbapụ.”—The State of the World’s Refugees 2000.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ngwọta Dị Aṅaa Ka Alaeze Chineke Na-enye?

“N’ebe nile n’ala ahụ, a ga-eme ihe n’ezi omume na n’ikpe ziri ezi. N’ihi na onye ọ bụla ga-eme ihe ziri ezi, a ga-enwe udo na nchebe ruo mgbe ebighị ebi. Ndị nke Chineke ga-enwerekwa onwe ha pụọ ná nchekasị dị iche iche, ebe obibi ha ga-enwekwa udo na nchebe.”—Aịsaịa 32:16-18, Today’s English Version.