Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

 Echiche nke Bible

Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

DỊ KA Bible si kwuo, e nwere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi e kere eke bi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. (Daniel 7:9, 10; Mkpughe 5:11) Site ná mmalite ruo ná ngwụsị, Akwụkwọ Nsọ na-ezo aka ọtụtụ narị ugboro n’ebe ndị mmụọ ozi nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke nọ. Ma, ọ bụ nanị abụọ n’ime ndị mmụọ a e kere eke ka a kpọrọ aha. Otu bụ mmụọ ozi Gebriel, bụ́ onye ji ọnụ ya zie mmadụ atọ dị iche iche ozi sitere n’aka Chineke n’ime oge dị afọ 600. (Daniel 9:20-22; Luk 1:8-19, 26-28) Mmụọ ozi nke ọzọ a kpọrọ aha na Bible bụ Maịkel.

N’ụzọ doro anya, Maịkel bụ n’ezie mmụọ ozi pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Daniel, a kọwara na Maịkel lụsoro ndị mmụọ ọjọọ ọgụ n’ihi ndị Jehova. (Daniel 10:13; 12:1) N’akwụkwọ ozi sitere n’ike mmụọ nsọ nke Jud dere, Maịkel na Setan sere okwu banyere ozu Mozis. (Jud 9) Akwụkwọ Mkpughe na-egosi na Maịkel busoro Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agha, chụpụkwa ha n’eluigwe. (Mkpughe 12:7-9) Ọ dịghị mmụọ ozi ọzọ a kọwara na o nwere nnukwute ikike dị otú ahụ n’ebe ndị iro Chineke nọ. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Bible na-ezo aka n’ụzọ ziri ezi n’ebe Maịkel nọ dị ka “onyeisi ndị mmụọ ozi.”

Arụmụka Banyere Onye Bụ́ Maịkel

Okpukpe ndị nke Krisendọm nakwa okpukpe ndị Juu na Alakụba nwegasịrị echiche dị iche iche n’okwu banyere ndị mmụọ ozi. Nkọwa ụfọdụ edoghị anya. Dị ka ihe atụ, The Anchor Bible Dictionary na-ekwu, sị: “A pụrụ inwe otu mmụọ ozi ka elu na/ma ọ bụ obere ìgwè ndị mmụọ ozi bụ́ ndị isi (ndị na-adịkarị anọ ma ọ bụ asaa).” Dị ka The Imperial Bible-Dictionary si kwuo, Maịkel bụ “aha nke onye karịrị mmadụ ike, bụ́ onye e nweworo n’ozuzu ya echiche abụọ dịrịtara iche banyere ya, na ọ bụ Onyenwe Anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, ma ọ bụkwanụ na ọ bụ otu n’ime ndị mmụọ ozi asaa ahụ a sị na ha bụ ndị isi.”

N’ọdịnala ndị Juu, ndị mmụọ ozi asaa a bụ́ ndị isi bụ Gebriel, Jeremiel, Maịkel, Raguel, Rafel, Sariel, na Uriel. N’aka nke ọzọ, okpukpe Alakụba kwenyere ná ndị mmụọ ozi anọ bụ́ ndị isi, ha bụ, Jibril, Mikal, Izrail, na Israfil. Okpukpe Katọlik  kwekwara ná ndị isi mmụọ ozi anọ: Maịkel, Gebriel, Rafel, na Uriel. Gịnị ka Bible na-ekwu? È nwere ọtụtụ ndị mmụọ ozi bụ́ ndị isi?

Azịza Bible

E wezụga Maịkel, ọ dịghị onyeisi ndị mmụọ ozi a kpọtụrụ aha n’ime Bible, Akwụkwọ Nsọ ejighịkwa okwu ahụ bụ́ “onyeisi ndị mmụọ ozi” mee ihe n’ụzọ na-egosi ihe karịrị otu. Bible na-akọwa Maịkel dị ka onyeisi ndị mmụọ ozi, na-egosi na ọ bụ nanị ya na-aza aha ahụ. N’ihi ya, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na Jehova Chineke enyewo otu onye, nanị otu onye n’ime ndị o kere eke nọ n’eluigwe ikike n’ebe ndị mmụọ ozi nile ndị ọzọ nọ.

E wezụga Onye Okike n’onwe ya, ọ bụ nanị otu onye kwesịrị ntụkwasị obi ka e kwuru banyere ya dị ka onye ndị mmụọ ozi nọ n’okpuru ya—ya bụ, Jizọs Kraịst. (Matiu 13:41; 16:27; 24:31) Pọl onyeozi hotara kpọmkwem, “Onyenwe anyị Jizọs” na “ndị mmụọ ozi ya dị ike.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:7) Pita kọwakwara Jizọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie site n’ikwu, sị: “Ọ nọ n’aka nri nke Chineke, n’ihi na ọ gawara eluigwe; e mekwara ka ndị mmụọ ozi na ikike na ike nọrọ n’okpuru ya.”—1 Pita 3:22.

Ọ bụ ezie na e kwughị n’ime Bible kpọmkwem na Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi ahụ bụ Jizọs, e nwere otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke na-ejikọta Jizọs na ọkwá onyeisi ndị mmụọ ozi. N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Tesalonaịka, o buru amụma, sị: “Onyenwe anyị n’onwe ya ga-esite n’eluigwe rịdata na-eji ọkpụkpọ òkù na-ada ụda, na-eji olu onyeisi ndị mmụọ ozi, na-ejikwa opi nke Chineke, ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu ga-ebukwa ụzọ bilie.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:16) N’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, a kọwara Jizọs dị ka onye maliteworo ịchị achị dị ka Eze Mezaịa nke Chineke. Ma, ọ “na-eji olu onyeisi ndị mmụọ ozi” na-ekwu okwu. Rịbakwa ama na o nwere ikike nke ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.

Mgbe ọ nọ n’ụwa dị ka mmadụ, Jizọs mere ka ọtụtụ ndị si n’ọnwụ bilie. Site n’ime otú ahụ, o ji olu ya kpọọ òkù ndị dara ụda. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-akpọlite nwa nke otu nwanyị di ya nwụrụ n’ọnwụ n’obodo Nen, o kwuru, sị: “Nwa okorobịa, asị m gị, Bilie!” (Luk 7:14, 15) Mgbe e mesịrị, kpọmkwem tupu ọ kpọlite enyi ya bụ́ Lazarọs n’ọnwụ, Jizọs “ji oké olu tie mkpu, sị: ‘Lazarọs, pụta!’” (Jọn 11:43) Ma n’oge ndị ahụ, olu Jizọs bụ olu nwoke zuru okè.

Mgbe Jizọs n’onwe ya bilitesịrị n’ọnwụ, e buliri ya gaa “n’ọkwá ka elu” n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke. (Ndị Filipaị 2:9) Ebe ọ na-abụkwaghị mmadụ, o nwere olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi. Ya mere, mgbe opi Chineke kpọrọ òkù ka a kpọlite “ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu” n’ọnwụ gaa n’eluigwe, na nke ugbu a, Jizọs ‘ji olu onyeisi ndị mmụọ ozi’ kpọọ “òkù na-ada ụda.” Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na ọ bụ nanị onyeisi ndị mmụọ ozi ga-eji “olu onyeisi ndị mmụọ ozi” kpọọ òkù.

Ee, e nwere ndị mmụọ ozi ndị ọzọ e kere eke bụ́ ndị nọ n’ọnọdụ dị elu, dị ka ndị seraf na ndị cherub. (Jenesis 3:24; Aịsaịa 6:2) Ma, Akwụkwọ Nsọ na-ezo aka n’ebe Jizọs Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie nọ dị ka onyeisi nke ndị mmụọ ozi nile—Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi.