Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ị Ga-eji Na-agụrụ Ụmụ Gị Ihe n’Olu Dara Ụda?

Gịnị Mere Ị Ga-eji Na-agụrụ Ụmụ Gị Ihe n’Olu Dara Ụda?

 Gịnị Mere Ị Ga-eji Na-agụrụ Ụmụ Gị Ihe n’Olu Dara Ụda?

“Ọ bịakwutere m, rịgota n’apata m na-adọkpụ otu akwụkwọ dọkachara adọka nke e ji . . . ahụekere a kwọrọ akwọ tetọchaa peeji ya, meekwa dị ka ọ na-asị . . . , ‘Gụtụrụnụ m ya, Papa; gụtụrụnụ m ya.’”—Dr. Clifford Schimmels, prọfesọ mmụta.

ỤMỤAKA—ha na-amụta nnọọ ihe ngwa ngwa. Nnyocha na-egosi na ụbụrụ ụmụaka na-erubeghị afọ atọ na-eto ngwa ngwa. Ihe dị iche iche nne na nna na-eme kwa ụbọchị dị ka, ịgụ akwụkwọ, ịbụ abụ, na igosi ịhụnanya pụrụ ikere òkè dị ukwuu n’ime ka nwatakịrị na-eto n’ụzọ dị mma. Otú ọ dị, dị ka otu nnyocha gosiri, ọ bụ nanị ihe dị ka ọkara nke ndị nile mụrụ ụmụaka dị n’agbata afọ abụọ na asatọ na-agụrụ ụmụ ha ihe kwa ụbọchị. Ị pụrụ iche, sị, ‘Ọ̀ bara uru n’ezie ịgụrụ nwa m ihe?’

Ime Ka E Nwee Mmasị n’Ịgụ Ihe

Ndị ọkachamara na-egosi na azịza ya bụ ee. “Otu ihe omume kasị mkpa n’iwulite ihe ọmụma a chọrọ maka imesị gaa nke ọma n’ịgụ ihe bụ ịgụrụ ụmụaka ihe n’olu dara ụda. Nke a dị otú a karịsịa tupu ha eruo ogo ịga ụlọ akwụkwọ elementrị,” ka akụkọ bụ́ Becoming a Nation of Readers na-ekwu.

Ka ha na-ege akụkọ ndị a na-agụpụta n’akwụkwọ, ụmụaka na-esi na nwata amụta na mkpụrụ akwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ kwekọrọ n’okwu ndị anyị na-ekwu ekwu. Ha na-amụtakwa nke ọma otú e si eji okwu eme ihe n’akwụkwọ. “Oge ọ bụla anyị gụụrụ nwatakịrị ihe, anyị na-eme ka ụbụrụ nwatakịrị ahụ nwee mmetụta dị ụtọ. Ị pụrụ ọbụna ịkpọ ya mkpọsa ihe, bụ́ nke na-akpụzi uche nwatakịrị ahụ ile akwụkwọ na ihe e biri ebi anya dị ka ihe na-enye ọṅụ,” ka otu akwụkwọ nta nke na-ekwu banyere ịgụ ihe n’olu dara ụda na-ekwu. Ndị nne na nna na-akwalite ịhụnanya dị otú a maka akwụkwọ ga-akụnye n’ime ụmụ ha ọchịchọ ga-adịru oge ndụ nile maka ịbụ ndị na-agụ ihe.

Inyere Ha Aka Ịghọta Ihe Ndị Gbara Ha Gburugburu

Ndị nne na nna na-agụrụ ụmụ ha ihe n’olu dara ụda pụrụ inye onyinye bara uru—ihe ọmụma banyere ndị mmadụ, ebe, na ihe dị iche iche. Ha nwere ike “ịgazu” ụwa nile site n’akwụkwọ n’emefeghị nnukwu ego. Tụlee ihe atụ nke Anthony dị afọ abụọ, bụ́ onye nne ya nọworo na-agụrụ ihe kemgbe a mụrụ ya. Nne ya na-ekwu, sị: “Oge mbụ ọ gara n’ogige a na-edebe anụ ọhịa bụụrụ ya njem nchọpụtaghachi.” Ọ́ sịrị nchọpụtaghachi? Ee, ọ bụ  ezie na ọ bụ nke mbụ ya Anthony na-ahụ ịnyịnya ọhịa, ọdụm, anịgọ, na anụmanụ ndị ọzọ n’ìhè, ọ maraworị banyere ihe ndị a e kere eke.

Nne ya kọwakwuru, sị: “Ọ bụwo ihe obi ụtọ nye Anthony ịmata ọtụtụ ndị mmadụ, anụmanụ, ihe na echiche dị iche iche, ha nile n’ime akwụkwọ, n’afọ abụọ mbụ nke ndụ ya.” Ee, ịgụrụ ụmụaka ihe n’olu dara ụda mgbe ha dị obere pụrụ ime ka ha ghọtakwuo nnọọ ụwa ha bi n’ime ya.

Iwulite Mmekọrịta Chiri Anya

N’oge ụmụaka ka na-eto eto, ha na-azụlite àgwà ndị ga-emetụta omume ha n’afọ ndị na-abịa n’ihu. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ tọọ ntọala mmekọrịta chiri anya nke e ji ntụkwasị obi, nkwanyerịta ùgwù, na nghọta mara. Ịgụrụ ha ihe pụrụ ikere òkè dị mkpa n’usoro a.

Mgbe ndị mụrụ ụmụ wepụtara oge iji kuru ụmụ ha n’aka ha ma gụọrọ ha ihe, ozi ọ na-ezi doro anya: “Ahụrụ m gị n’anya.” Phoebe, onye bụ́ nne na Canada, kwuru banyere ịgụrụ nwa ya nwoke, bụ́ onye dị afọ asatọ ugbu a, ihe, sị: “Mụ na di m na-eche na nke a esowo nnọọ mee ka Nathan nwee mmetụta nke ịkpa anyị nso. Ọ na-agwa anyị eziokwu, na-akọkwara anyị mgbe nile mmetụta ọ na-enwe. O mewo ka anyị nwee nkekọ pụrụ iche.”

Cindy emewo ka ọ bụrụ àgwà ya ịdị na-agụrụ nwa ya nwanyị ihe n’olu dara ụda kemgbe ọ dị ihe dị ka otu afọ ma na-enwe ike ịnọdụ ala ma gee ntị ruo otu minit ma ọ bụ abụọ. Ò kwesịrị oge na mgbalị nile e tinyere? Cindy na-ekwu, sị: “Ịgụkọ ihe n’udo dị ka enyi na enyi na-abụkarị nanị ihe a chọrọ iji mee ka Abigail kọọrọ anyị ihe ụfọdụ mere n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ nsogbu ya na enyi ya nwere. Olee nne ma ọ bụ nna ọ na-agaghị agụsi agụụ ike inweta mmeghachi omume dị otú ahụ?” N’ezie, ịgụ ihe n’olu dara ụda pụrụ ime ka e nwee nkekọ siri ike n’etiti nne ma ọ bụ nna na nwa.

Ịkụnye Nkà Ndị Dị Mkpa ná Ndụ

“Taa, ụmụ anyị na-ahụ ọtụtụ ihe na-abaghị uru site na telivishọn nakwa site n’ihe ndị ọzọ, nke na ọ dị ha mkpa karịa mgbe ọ bụla ọzọ inweta nri nke uche, echiche dị nkọ, amamihe, ihe ga-eme ka uche ha kwụsie ike bụ́ nke ga-enyere ha aka ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ọma ha na ile ndụ ha anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị,” ka akwụkwọ bụ́ 3 Steps to a Strong Family, na-ekwu. Ndị mụrụ ụmụ nọ n’ọnọdụ kasị mma inwe mmetụta dị mma nke na-ewuli elu n’ebe ụmụ ha nọ.

Ime ka nwatakịrị mata ahịrịokwu ndị e dere nke ọma bụ́ ndị dị n’akwụkwọ pụrụ ịbụ ihe dị mma maka ịkụziri ya ikwu okwu na ide ihe nke ọma. Dorothy Butler, bụ́ onye dere akwụkwọ bụ́ Babies Need Books, na-ekwu, sị: “Ọdịdị nke echiche mmadụ ga-adabere n’ọdịdị nke asụsụ ya. N’ezie, asụsụ bụ ebe ịmụta ihe na ọgụgụ isi hiwere isi.” Ikike nke ikwurịta okwu nke ọma bụ ihe kasị mkpa n’ezi mmekọrịta.

Ịgụ ihe site n’akwụkwọ ndị kwesịrị ekwesị pụkwara ịkwalite omume na ụkpụrụ omume ọma. Ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị na-agụrụ ụmụ ha ihe ma soro ha na-atụgharị uche pụrụ inyere ha aka ịzụlite nkà ndị e ji edozi nsogbu. Ka Cindy na-agụrụ nwa ya nwanyị bụ́ Abigail ihe, o ji nlezianya na-achọpụta otú Abigail na-esi emeghachi omume n’ọnọdụ ndị a kọrọ n’akụkọ  dị iche iche. “Dị ka ndị mụrụ ụmụ, anyị pụrụ ịmatakwu banyere omume aghụghọ ndị o nwere ma jiri olileanya nyere ya aka iwezụga echiche na-ezighị ezi n’oge ọ ka bụ nnọọ nwata.” N’ezie, ịgụrụ ụmụaka ihe n’olu dara ụda pụrụ ịzụ ma uche ma obi ha.

Mee Ka Ịgụ Ihe Na-atọ Ụtọ

Gụọ ihe “n’enweghị nrụgide ọ bụla,” na-eme ka ọnọdụ e nwere bụrụ nke ntụsara ahụ, na nke na-eme ka e nwee ahụ iru ala. Ndị mụrụ ụmụ anya ruru ala na-ama mgbe ha kwesịrị ịkwụsị ịgụrụ nwa ha ihe. Lena na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ ike na-agwụcha nnọọ Andrew, bụ́ onye dị afọ abụọ, ọ dịghịkwa anọ jụụ ruo nnọọ ogologo oge. Anyị na-ebelata oge anyị na-eji agụrụ ya ihe dị ka ọnọdụ uche ya si dị. Anyị achọghị ka Andrew nwee mmetụta ọ bụla na-adịghị mma banyere ịgụ ihe, n’ihi ya anyị adịghị amanye ya ige ya karịa ókè o nwere ike.”

Ịgụ ihe n’olu dara ụda gụnyere nnọọ ihe karịrị nanị ịgụpụta ihe e biri ebi. Mata mgbe i kwesịrị ịsafe peeji akwụkwọ nwere foto iji kpalie atụmanya. Gụọ ya were were. Mgbanwe ụda olu na imesi echiche okwu ike pụkwara iso mee ka akụkọ ahụ kpoo ọkụ. Ụda olu gị nke na-egosi ịhụnanya pụrụ ịkụnye mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’ime nwa gị.

Abamuru ya na-ebu ibu karịsịa mgbe nwa gị sonyere na ya n’ụzọ zuru ezu. Na-akwụsị site n’oge ruo n’oge, ma jụọ ajụjụ ndị a na-adịghị eji otu okwu aza. Tinyekwuo ihe n’ihe nwa gị zara site n’ikwu ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi zaa ya.

Na-eme Nhọrọ n’Akwụkwọ Ndị I Ji Eme Ihe

Otú ọ dị, ikekwe ihe kasị mkpa na ya bụ ịhọrọ akwụkwọ ndị dị mma. Ime otú ahụ chọrọ imetụ nnyocha. Jiri nlezianya nyochaa akwụkwọ dị iche iche, ma jiri nanị ndị nwere ihe ọmụma dị mma, na-ezikwa ihe ma bụrụ akụkọ nwere ezi ihe mmụta mee ihe. Leruo ihu akwụkwọ ahụ, ihe osise dị na ya, na otú e si dee ya, anya. Họrọ akwụkwọ ndị na-adọrọ mmasị nke ma nne ma ọ bụ nna ma nwatakịrị. Ọtụtụ mgbe ụmụaka na-ekwu ka a gụọrọ ha akụkọ ahụ ugboro ugboro.

N’ụwa nile ndị mụrụ ụmụ anụwo ụtọ Akwukwọm nke Akukọ Bible. * A kwadebere ya maka ndị mụrụ ụmụ iji ya na-agụrụ ụmụntakịrị ha ihe, ọ bụghịkwa nanị na ọ pụrụ inyere ụmụaka aka ịghọ ndị na-agụ ihe nke ọma kama ọ na-emekwa ka ha nwee mmasị na Bible.

Ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị na-agụrụ ụmụ ha ihe n’olu dara ụda pụrụ ime ka ha nwee àgwà ziri ezi n’ebe ịgụ ihe dị, bụ́ nke pụrụ ịrụpụta ihe dị mma n’oge ndụ ha nile. JoAnne kwuru banyere nwa ya nwanyị, sị: “Ọ bụghị nanị na Jennifer mụtara otú e si agụ na otú e si ede ihe tupu ya amalite ịga akwụkwọ ma malite inwe mmasị n’ịgụ ihe kamakwa, nke ka mkpa, ọ zụlitewo ịhụnanya n’ebe Onye Okike Ukwu anyị, bụ́ Jehova nọ. Jennifer amụtawo ịdabere n’Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible, ka ọ na-eduzi ya ná mkpebi ya nile.” N’ezie, ihe i nyeere nwatakịrị aka inwe mmasị na ya pụrụ ịdị mkpa karịa ihe i nyeere ya aka ịmụta.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

Mgbe Ị Na-agụrụ Nwa Gị Ihe

• Malite mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ.

• Hapụ nwa gị ka ọ nọrọ jụụ tupu ị gụọrọ ya ihe.

• Gụọ akụkọ ndị na-amasị unu abụọ.

• Gụọ ihe mgbe mgbe ruo ókè i nwere ike, jirikwa mmetụta na-agụ ya.

• Mee ka nwa gị kere òkè site n’ịjụ ya ajụjụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

Foto e sere n’Ogige A Na-edebe Anụ Ọhịa nke Òtù Na-echekwa Anụ Ọhịa na Bronx