Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Nnwale ahụ Akụọla Afọ n’Ala’

‘Nnwale ahụ Akụọla Afọ n’Ala’

 ‘Nnwale ahụ Akụọla Afọ n’Ala’

N’ỤWA a, bụ́ obodo nta zuru ụwa ọnụ nke ji ọsọ na-adịwanye ntakịrị, a na-ekwu na ọdịiche dị n’etiti ndị nwere ego na ndị na-enweghị na-ebuwanye ibu. N’ikwu okwu banyere mgbalị ndị a na-eme iji wulite akụ̀ na ụba ụwa, otu ìgwè na-akwalite ime mgbanwe ná mba dị iche iche kwuru, sị: “Ka afọ 50 nke ime nnwale a gasịrị, ọ ka na-adakpọ adakpọ. Kama iwetara mmadụ nile uru n’ụzọ akụ̀ na ụba, o wetaworo mbara ala ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọdachi nke gburugburu ebe obibi, ọgba aghara ọha na eze a na-enwetụbeghị ụdị ya, ndakpọ nke akụ̀ na ụba nke mba ka n’ọnụ ọgụgụ, mmụba nke ịda ogbenye, agụụ, ụkọ ala, ịkwaga ebe ọzọ na mkpaghasị nke ịdị n’usoro ọha na eze. A pụrụ ikwu ugbu a na nnwale ahụ akụọla afọ n’ala.”

Gịnị gahiere? Mgbe ndị mmadụ na-achụso ọdịmma onwe ha nanị, ha ga-emeghasịrịrị ihe. Oji ego achụ ego na ọgbazinye ego bụ́ George Soros na-ekwu, sị: “Azụmahịa na-eme ka ihe ọ bụla, gụnyere ụmụ mmadụ (ndị ọrụ) na ihe e kere eke (ala) ghọọ ngwá ahịa.” Ezughị okè ụmụ mmadụ sokwa na-akpata ya. N’ikwupụtaghachi echiche nke onye ọkà ihe ọmụma bụ́ Karl Popper, Soros kwuru, sị: “Nghọta anyị ezughị okè site n’ọmụmụ; anyị apụghị inweta eziokwu na-enweghị mgbagha, bụ́ ihe zuru okè ọha mmadụ na-adabere na ya.”

Ahaghị nhata n’akụ̀ na ụba abụghị ihe ọhụrụ. Narị afọ asatọ tupu Kraịst abịa, otu onye so dee Bible kwuru banyere “ndị na-emegbu ndị na-enweghị ike, ndị na-azọpịa ụmụ ogbenye.” (Emọs 4:1) Ka ọ hụsịrị ikpe na-ezighị ezi ndị yiri nke a, otu onye ọnụ na-eru n’okwu n’oge ochie dere n’ihe dị ka afọ 3,000 gara aga, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.

Gịnị bụ ngwọta ya? Òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ hà pụrụ idozi oké ahaghị nhata n’akụ̀ na ụba site ná mmekọ ihe ọnụ nke mba nile? “Anyị enweghị òtù mba nile zuru ezu” ka Soros na-ekwu, “maka ichebe nnwere onwe ndị mmadụ n’otu n’otu, ihe ndị ruuru mmadụ, na gburugburu ebe obibi, ma ọ bụkwanụ iji kwalite ikpe ziri ezi n’etiti ọha mmadụ—ya fọdụkwa ịhụ na udo nọgidere na-adị. Ihe ka ukwuu n’òtù ndị anyị nwere bụ òtù nke mba dị iche iche, mba dị iche iche na-ebutekarịkwa ọdịmma nke ha ụzọ tupu ọdịmma mmadụ nile. Òtù Mba Ndị Dị n’Otu enwebeghị ike n’ụzọ ụkpụrụ iwu kwadoro imezu nkwa ndị dị n’okwu mmeghe nke akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ ya.”

Obi ò kwesịrị ikoropụ anyị? Ee e. Ọchịchị ezi omume nke ga-achị ụwa dị nso! Ọ bụ isi ihe Jisọs kwusara. Ọ kpọrọ ya “alaeze Chineke,” ọ kụzikwaara ụmụazụ ya ikpe ekpere maka ya. (Luk 11:2; 21:31) E guzobewo Alaeze Chineke n’eluigwe, n’oge na-adịghịkwa anya ọ ga-ewepụ ikpe na-ezighị ezi nile n’ụwa a. (Mkpughe 11:15, 18) Kama ịbụ ịchịisi e ji eme nnwale nwa oge, Alaeze Chineke ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Daniel 2:44) Ọ ga-agwọta nsogbu nke ịda ogbenye na mmegbu kpam kpam. Lee atụmanya magburu onwe ya ọ bụ nye ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu—n’ezie, nye mmadụ nile!

[Foto dị na peeji nke 30]

Akụ̀ na ụba ụwa agwọtabeghị nsogbu ndị ogbenye—ọtụtụ nde na-adị ndụ n’enweghị mmiri pọmpụ ma ọ bụ ọkụ eletrik