Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Kpakwuo Nne na Nna M Ochie Nso?

Olee Otú M Pụrụ Isi Kpakwuo Nne na Nna M Ochie Nso?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Kpakwuo Nne na Nna M Ochie Nso?

“Nna m ochie abụọ bụcha ndị akụkọ. Akụkọ ha na-enyere m aka ịghọta mmetụta m.”—Joshua.

Ọ DỊ mgbe ọgbọ ndị mejupụtara otu ezinụlọ na-ebikọtakarị ọnụ—ọtụtụ mgbe n’otu ụlọ. Mmadụ isoro nne na nna ya ochie na-enwe mmekọrịta chiri anya bụ ihe a na-ahụkarị.

N’ụbọchị ndị a, ndị na-eto eto pụrụ ịnọ n’ebe dị nnọọ anya site n’ebe nne na nna ha ochie nọ. Ọzọkwa, ịgba alụkwaghịm etisawo ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ezinụlọ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star kọrọ na “ndị nne na nna ochie pụkwara ịbụ ndị ịgba alụkwaghịm metụtara ma bụrụ ndị e gbochiri ịhụ ụmụ ụmụ ha, bụ́ ndị ha hụrụ n’anya.” N’ọnọdụ ndị ọzọ, ihe bụ́ nsogbu bụ na ọtụtụ ndị na-eto eto nwere nnọọ echiche na-ezighị ezi banyere ndị meworo okenye, na-ele ha anya dị ka ndị na-eme ihe mgbe ochie, dị ka ndị echiche ha, ụkpụrụ ha, na ihe ndị na-amasị ha dị nnọọ iche na nke ha. Gịnị na-esi na ya apụta? Ọtụtụ ndị na-eto eto adịghịdị akpa ndị nne na nna ha ochie nso dị ka ha kwesịrị ịdị na-eme.

Nke a dị nnọọ njọ. Dị ka isiokwu bu nke a ụzọ gosiri, mmadụ isoro nne na nna ya ochie na-enwe mmekọrịta chiri anya dị mma, baa uru, ma na-enye ọṅụ—karịsịa ma ọ bụrụ na ha na-atụ egwu Chineke. * Otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma aha ya bụ Rebekah na-ekwu banyere nne na nna ya ochie, sị: “Anyị na-achịkọ ọchị mgbe nile.” Otu nwa okorobịa aha ya bụ Peter kwuru ihe yiri nke ahụ, sị: “Adịghị m atụ egwu ịgwa ha mmetụta m na-enwe ma ọ bụ ihe ndị m na-eme atụmatụ ime. Mgbe ụfọdụ m na-enwe ahụ iru ala n’ebe ha nọ karịa n’ebe ndị mụrụ m nọ. Echere m na m pụrụ ịgwa nne na nna m ochie okwu banyere ihe ọ bụla.”

Gịnị banyere gị? Ikekwe ị na-akpa nne na nna gị ochie nso mgbe ị dị obere. Ma ugbu a ị nọ n’afọ iri na ụma, ọ pụrụ ịbụ na o nwebeghị ezigbo ihe i mere iji wulite mmekọrịta ahụ na nso nso a. Ya bụrụ otú ahụ, ụkpụrụ nke ndụmọdụ Bible dị ná 2 Ndị Kọrint 6:11-13 pụrụ ịba uru na nke a, ya bụ, ‘ịdị obodobo’ ná mmetụta i nwere n’ebe ha nọ. Ajụjụ bụ, N’ụzọ dị aṅaa?

Ibute Ụzọ

‘Ịdị obodobo’ na-enye echiche nke ibute ụzọ n’ụzọ ụfọdụ. E kwuwerị, Bible na-ekwu, sị: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya.” (Ilu 3:27) Mgbe ị dị obere,  ọ pụrụ ịbụ na i nwechaghị “ike” nke ime ihe ọ bụla banyere mmekọrịta gị na nne na nna gị ochie. Ma ugbu a i toliteworo, ma eleghị anya bụrụ onye ntorobịa, ị pụrụ ịchọpụta na e nwere ọtụtụ ihe ziri ezi ị pụrụ ime.

Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nne na nna gị ochie bi nso, ị pụrụ ime ka ọ bụrụ àgwà gị ịdị na-eleta ha mgbe nile. Ọ̀ ga-agwụ ike? Ikekwe ọ ga-agwụ gị ma ọ bụrụ na ị gaa nọdụ nnọọ ebe ahụ n’ekwughị okwu. N’ihi ya malite mkparịta ụka! Gịnị ka ị pụrụ ikwu banyere ya? Ụkpụrụ Bible dị ná Ndị Filipaị 2:4 na-enye aka. Ọ na-agwa anyị ka ‘anyị nile n’otu n’otu ghara ile ihe nke aka anyị anya, kama ka anyị nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe anyị anya.’ N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, gosi mmasị n’ebe nne na nna gị ochie nọ. Mee ka ha kwuo ihe ndị na-amasị ha. Olee otú obi dị ha? Gịnị ka ha nọ na-eme? Ha pụrụ inweta ọṅụ site n’ikwu banyere ihe ndị mere n’oge gara aga. N’ihi ya jụọ ha otú ihe dị mgbe ha na-eto eto. Ma ọ bụ gịnị ka nne ma ọ bụ nna gị dị ka ya mgbe ọ na-eto eto? Ọ bụrụ na nne na nna gị ochie bụ ndị Kraịst, jụọ ha ihe dọtara mmasị ha n’eziokwu Bible.

Nne na nna ochie na-abụkarị ndị e si n’aka ha enweta ọtụtụ akụkọ ihe mere eme nke ezinụlọ, ha pụkwara ịdị nnọọ njikere ịkọrọ gị akụkọ ndị na-akpali mmasị. N’ezie, ị pụrụ ọbụna ịchọ ime ka nke a ghọọ ihe omume na-enye ọṅụ. Gbalịa ịdị na-agba nne na nna gị ochie ajụjụ ọnụ, ikekwe na-edetu ihe ma ọ bụ na-etinye ihe na teepu a na-ege ege ma ọ bụ na vidio. Ọ bụrụ na ị machaghị ihe ị ga-ajụ, rịọ ndị mụrụ gị ka ha nyere gị aka chepụta ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị. Ma eleghị anya ị ga-amụta ọtụtụ ihe ga-enyere gị aka ịghọtakwu nne na nna gị ochie, ndị mụrụ gị, na ọbụna gị onwe gị. “Nna m ochie abụọ bụcha ndị akụkọ,” ka Joshua na-akọ. “Akụkọ ha na-enyere m aka ịghọta mmetụta m.”

Otú ọ dị, echezọla na nne na nna gị ochie nwere nnọọ mmasị ná ndụ gị na n’ihe ndị ị na-eme. Mgbe ị gwara ha ihe ị na-eme, ị na-akpọ ha òkù ka ha bụrụ akụkụ nke ndụ gị. Nke a ga-eme kpọmkwem ka unu na-enwekwu mmekọrịta chiri anya. Otu onye ntorobịa na France aha ya bụ Igor na-ekwu, sị: “Mụ na nne m ochie na-enwe mmasị ịṅụ tii n’ebe a na-ere ihe ọṅụṅụ, na-ekwu banyere ihe anyị abụọ meworo.”

Gịnị Ka Anyị Pụrụ Imekọ Ọnụ?

Mgbe ọ bụla unu maliteworo ikwurịta okwu, ikekwe unu pụrụ ịga n’ihu imekọ ihe ụfọdụ ọnụ. Site n’ibu ụzọ chetụ echiche, ị pụrụ ịchọpụta ihe omume dị iche iche unu pụrụ imekọ ọnụ. Dara na-eto eto na-echeta, sị: “Nne m ochie abụọ akụzichaworo m otú e si esi nri, otú e si etinye ihe na kom kom, otú e si eme bred, otú e si akụ okooko osisi, na otú e si akọ ubi.” Amy esowo nne na nna ya ochie na-enwe nnọkọ oriri na ọṅụṅụ nke ezinụlọ ma na-aga ezumike. Na-adabere n’afọ ndụ ha, ụfọdụ nne na nna ochie na-adị nnọọ gara gara. Ọ na-amasị Aaron iso nne ya ochie kụọ bọl golf. Joshua na-eso nna mama ya egbu azụ̀ ma na-eso nna papa ya arụ ọrụ na gburugburu ụlọ ha.

Ọ bụrụ na nne na nna gị ochie na-efe Jehova, ọ pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-enye ọṅụ iso ha na-ekere òkè n’akụkụ dị iche iche nke ofufe Jehova, dị ka ịgwa ndị ọzọ banyere Bible. Igor so nne ya ochie gaa mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova e nwere na Poland. “Ọ bụ ahụmahụ anyị nwere nke m na-agaghị echezọ echezọ, anyị ka na-enwetakwa ọṅụ site n’ikwu banyere ya,” ka ọ na-ekwu. N’eziokwu, ọ bụghị nne na nna ochie nile nwere ikike nke ịgagharị agaghị otú ahụ. Ma, ọ bara uru iwepụta oge soro ha nọkọọ.

Ihe Nketa Ime Mmụọ

N’oge Bible otu nwanyị aha ya bụ Lọịs keere òkè dị mkpa n’inyere nwa nwa ya, bụ́ Timoti, aka ịghọ onye nke Chineke pụtara ìhè. (2 Timoti 1:5) Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ nne na nna ochie bụ́ ndị Kraịst na-ekere òkè dị otú ahụ taa. Joshua kwuru banyere nna ya ochie abụọ, sị: “Ha ejeworo Jehova ozi ogologo oge karịa ka m dịworo ndụ, n’ihi ya m na-akwanyere ha ùgwù nke ukwuu, ọ bụghị nanị dị ka ndị bụ nna m ochie kama dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe.” Amy na-ekwu, sị: “Nne na nna m ochie na-ekwu mgbe nile na ha na-enweta agbamume na obi ụtọ dị ukwuu ịhụ ka m ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi. Ma, ịhụ ezi ihe nlereanya ha na ịnụ ọkụ n’obi ha maka Jehova dị ka ndị ọsụ ụzọ [ndị na-ezisa ozi ọma oge nile] enyeworo m aka ịnọgide n’ozi ọsụ ụzọ m.”

Chris na-akpọ nne ya ochie “onye kasị kwalie  m ịmụ ihe na ito eto.” O kwukwasịrị: “Agaghị m echezọ ma ọlị mgbe o kwuru na ‘anyị aghaghị imere Jehova ihe nile anyị nwere ike ime.’” Nne na nna ochie Pedro ekerewo òkè dị nnọọ ukwuu n’uto ime mmụọ ya. Ọ na-ekwu, sị: “Ahụmahụ ha enyeworo m aka nke ukwuu. Nne na nna m ochie na-akpọrọ m mgbe nile aga ime nkwusa, m nwere ekele dị ukwuu maka nke ahụ.” Ee, ịkpa nne na nna ochie na-atụ egwu Chineke nso pụrụ inyere gị aka ijere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu karị.

Nne na Nna Ochie Nọ n’Ebe Dị Anya

Gịnị ma ọ bụrụ na nne na nna gị ochie bi n’ebe dị anya? Ọ bụrụ na o kwe mee, na-agbalị ileta ha mgbe nile. Tupu ị gaa ọzọ, mee ihe nile i nwere ike ime iji nọgide na-ezigara ha ozi. Hornan na-ahụ nne na nna ya ochie nanị ugboro atọ n’afọ, ma ọ na-ekwu, sị: “M na-akpọ ha na fon kwa Sunday.” Dara, bụ́ onye bikwa n’ebe dị anya site n’ebe nne na nna ya ochie bi, na-ekwu, sị: “Ha na-egosi mmasị ná ndụ m, anyị na-akpọrịta òkù fon ma ọ bụ na-ezirịta ozi E-mail ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa izu.” Ozi E-mail na ịkpọ òkù fon dịcha mma, ma elelịla ikike nke akwụkwọ ozi e ji aka dee bụ́ ihe mgbe ochie. O juwo ọtụtụ ndị na-eto eto anya ịchọpụta na nne na nna ha ochie echekwawo akwụkwọ ozi nile ha dere kemgbe ha bụ nwata. A pụrụ ịgụ akwụkwọ ozi ma gụgharịa ha—jirikwa ha kpọrọ ihe. Ya mere hụ na ị na-edegara ha akwụkwọ!

Ndị nne na nna ochie na-enwekarị ịhụnanya pụrụ iche maka ụmụ ụmụ ha. (Ilu 17:6) E nwere ọtụtụ ụzọ isi wulite ma nọgide na-esoro nne na nna gị ochie na-enwe mmekọrịta chiri anya, ma hà bi nso ma hà bi n’ebe dị anya. Hụ na i tinyere mgbalị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]