Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okpukpe Nile Hà Bụ Ụzọ Dị Iche Iche Na-eduga n’Ebe Chineke Nọ?

Okpukpe Nile Hà Bụ Ụzọ Dị Iche Iche Na-eduga n’Ebe Chineke Nọ?

 Echiche nke Bible

Okpukpe Nile Hà Bụ Ụzọ Dị Iche Iche Na-eduga n’Ebe Chineke Nọ?

“Ọ NA-ESIRI m ike ikweta na Chineke nke eluigwe na ala nile ekpebiwo ka e site n’otu okpukpe mara ya,” ka Marcus Borg, bụ́ onye na-ede akwụkwọ, kwuru. Onye nwetara Onyinye Nobel Maka Udo bụ́ Desmond Tutu, kwuru, sị: “Ọ dịghị okpukpe pụrụ ịzọrọ na ya nwere eziokwu nile banyere ihe omimi” nke okpukpe. Echiche zuru ọnụ ndị Hindu nwere bụ “Jotto moth, totto poth,” nke pụtara, ma a sụgharịa ya n’ụzọ nwere echiche sara mbara, na okpukpe nile bụ nanị ụzọ dị iche iche ndị na-eduga n’otu nzube ahụ. Ndị Buddha nwekwara echiche a. N’ezie, ọtụtụ nde mmadụ kwenyere na okpukpe nile bụ ụzọ dị iche iche na-eduga n’ebe Chineke nọ.

Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Geoffrey Parrinder, kwuru, sị: “A na-ekwu mgbe ụfọdụ na okpukpe nile nwere otu nzube, ma ọ bụ na ha bụ ụzọ hà nhata nke isi chọta eziokwu ahụ, ma ọ bụ ọbụna na ha nile na-ezi otu ihe.” Ozizi, ememe, na chi nke okpukpe dị iche iche yiri ibe ha n’ezie. Ihe ka ọtụtụ n’okpukpe na-ekwu banyere ịhụnanya ma na-ezi na igbu mmadụ, izu ohi, na ịgha ụgha dị njọ. N’ihe ka ọtụtụ n’òtù okpukpe, ụfọdụ ndị na-eji obi eziokwu eme mgbalị inyere ndị ọzọ aka. Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ ji obi eziokwu kwere n’ihe o kweere ma na-agbalị ibi ndụ dị mma, okpukpe ọ nọ na ya ọ̀ dị ihe o mere? Ka okpukpe nile hà bụ nanị ụzọ dị iche iche na-eduga n’ebe Chineke nọ?

Nanị Obi Eziokwu—Ò Zuru?

Tụlee ihe banyere nwoke onye Juu nke narị afọ mbụ aha ya bụ Sọl, onye ghọrọ onye Kraịst bụ́ onyeozi a maara dị ka Pọl. Ọ bụ onye ji nnọọ ịnụ ọkụ n’obi na-ekpe okpukpe ndị Juu, nke a dugakwara ya n’ịgbalị ikpochapụ ofufe nke ndị na-eso ụzọ Kraịst, bụ́ ofufe o chere na o zighị ezi. (Ọrụ 8:1-3; 9:1, 2) Ma site n’ebere Chineke Sọl bịara ghọta na ndị ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu dị ka ya onwe ya pụrụ ịdị na-anụrụ Chineke ọkụ n’obi, ma, n’ihi amaghị eziokwu nile, ha nwere ike ihie ụzọ. (Ndị Rom 10:2) Mgbe Sọl mụtakwuru banyere uche na ọrụ Chineke, ọ gbanwere ma malite isoro ndị ahụ ọ nọworo na-akpagbu—ndị  na-eso ụzọ Jisọs Kraịst— na-efe ofufe.—1 Timoti 1:12-16.

Bible ọ̀ na-ekwu na e nwere ọtụtụ narị okpukpe a ga-esi na ha mee nhọrọ nakwa na Chineke ga-anabata nke ọ bụla anyị họọrọ? Pọl onyeozi nwetara ntụziaka site n’aka Jisọs Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie bụ́ onye kwuru ihe dị nnọọ iche. Jisọs zipụrụ ya ịgakwuru ndị mba ọzọ “ịsaghe anya ha, ka ha wee si n’ọchịchịrị chịgharịa baa n’ìhè, sikwa n’ike Setan chigharịkwute Chineke.” (Ọrụ 26:17, 18) N’ụzọ doro anya, okpukpe anyị họọrọ nwere ihe o mere. Ọtụtụ n’ime ndị e zigara Pọl ịgakwuru enweelarị okpukpe ha nọ na ya. Ma ha nọ “n’ọchịchịrị.” N’ezie, ọ bụrụ na okpukpe nile bụ nanị ụzọ dị iche iche na-eduga ná ndụ ebighị ebi na n’ihu ọma Chineke, ọ garaghị adị mkpa ka Jisọs zụọ ndị na-eso ụzọ ya maka ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ahụ o nyere ha ịrụ.—Matiu 28:19, 20.

N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jisọs kwuru, sị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” (Matiu 7:13, 14) Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya na e nwere “otu okwukwe.” (Ndị Efesọs 4:5) N’ụzọ doro anya, ọtụtụ ndị nọ n’ụzọ ahụ dị “obosara” nwere okpukpe ha nọ na ya. Ma ha enweghị “otu okwukwe” ahụ. Ebe e nwere nanị otu ezi ụdị ofufe, ndị chọrọ ịchọta ezi okwukwe ahụ aghaghị ịchọta ya.

Chọọ Ezi Chineke Ahụ

Malite kpọmkwem mgbe e kere mmadụ, Chineke gwara ụmụ mmadụ ihe ọ chọrọ ka ha mee. (Jenesis 1:28; 2:15-17; 4:3-5) Taa a kọwara n’ụzọ doro anya ihe ndị ọ chọrọ n’ime Bible. Nke a na-eme ka o kwe anyị mee ịmata ihe dị iche n’etiti ofufe a na-anakwere na ofufe a na-adịghị anakwere. (Matiu 15:3-9) Ụfọdụ ndị ketara okpukpe ha eketa, ebe ndị ọzọ nanị na-agbaso ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’ógbè ha. Nye ọtụtụ ndị, okpukpe ha dabeere na mgbe na ebe a mụrụ ha. Otú ọ dị, ì kwesịrị ikwe ka okpukpe gị bụrụ nke i nwetara site n’ihe ndabara ma ọ bụ kwe ka ndị ọzọ meere gị mkpebi a?

Okpukpe nke ị na-ahọrọ kwesịrị isite n’ihe ị maara dabere ná nnyocha i ji nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ. Na narị afọ mbụ, ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ anakwereghị nnọọ ihe ndị Pọl onyeozi kwuru n’ajụghị ase. Ha ‘nyochara ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a dị otú a.’ (Ọrụ 17:11; 1 Jọn 4:1) Gịnị ma i mee otú ahụ n’onwe gị?

Bible na-akọwa Chineke nke eluigwe na ala dị ka onye na-achọ ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye ya n’eziokwu. Dị ka e dekọrọ na Jọn 4:23, 24, Jisọs kọwara, sị: “Ma oge awa na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya. Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye Ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” Ọ bụ nanị “okpukpe . . . nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị” ka ọ na-anakwere. (Jemes 1:27) Chineke agọziwo ọchịchọ ọtụtụ nde mmadụ na-achọ ụzọ ahụ dị warara nke na-eduba ná ndụ. Ọ gaghị enye ndị na-achọghị ịma banyere ya ndụ ebighị ebi kama nke ahụ ọ ga-enye ya ndị na-etinye ezi mgbalị ịchọta ụzọ ahụ dị warara o setịpụworo ma na-agbasozi ya.—Malakaị 3:18.