Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Dị Oké Njọ n’Isi n’Ụlọ Mịpụ?

Gịnị Dị Oké Njọ n’Isi n’Ụlọ Mịpụ?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Dị Oké Njọ n’Isi n’Ụlọ Mịpụ?

“Anyị na-amịpụ n’etiti abalị wee jee n’obere ụlọ oriri iji soro ndị ntorobịa ụfọdụ nọkọọ. Mgbe ahụ anyị na-amalite ịkpagharị n’otu ugwu. Ndị ntorobịa ahụ nile na-ese siga, ọ bụ ezie na esetụghị m. Anyị na-anọdụ ala ma na-ekwurịta banyere ọtụtụ ihe, na-ege egwú rock na-ada oké ụda. Anyị na-alawazi n’elekere 5:00 nke ụtụtụ tupu ndị mụrụ m eteta n’ụra.”—Tara. *

“Mgbe papa m gawara ọrụ, mama m anọrọkwa n’ụra, m na-esi n’ọnụ ụzọ chere ihu n’èzí mịpụ. M na-eghewe ya oghe ka mama m ghara ịnụ mgbe m na-emechi ya—ọ bụ ibo ụzọ e ji ígwè mee. M na-esoro ndị enyi m nọkọọ ruo chi ọbụbọ. O ruzie n’ụtụtụ mgbe anwụ wara, m na-agbalị ịmịbaghachi n’ụlọ. Mgbe ụfọdụ, mama m na-achọpụta na apụọla m, ọ na-akpọchibidokwa m ụzọ n’èzí.”—Joseph.

ỊMỊPỤ N’ỤLỌ—ọ na-ada ka ihe na-akpali mmasị na ihe ikpori ndụ. Ọ bụ ohere nke ịnọrọ onwe gị ruo awa ole na ole, ohere nke ime ihe ị chọrọ ime na isoro onye masịrị gị nọrọ n’azaghị onye ọ bụla ajụjụ. E wezụga nke ahụ, ikekwe ị nụwo ka ndị ọgbọ gị na-etu ọnụ banyere ihe ndị ha na-eme nakwa ndụ ha na-ekpori mgbe ha mịpụrụ n’abalị. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe na-adọrọ adọrọ ịnwa isonyere ha.

N’otu nnyocha e mere ụmụ akwụkwọ 110 nọ kọleji ogo nke nta na ogo nke ukwu n’Ebe Ugwu America, 55 kwetara na ha amịpụwo ma ọ dịghị ihe ọzọ otu ugboro. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha mere otú ahụ na nke mbụ mgbe ha dị afọ 14. Nsogbu ahụ siri ike nke na ụfọdụ ndị ọkachamara atụwo aro ka ndị mụrụ ụmụ tinye mgbịrịgba mgbaàmà n’ebe obibi ha iji gbochie ụmụ ha izoro ezoro pụọ. N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ntorobịa ji eme ihe pụrụ ịkpasu ndị mụrụ ha iwe site n’isi n’ụlọ amịpụ?

Ihe Mere Ụfọdụ Ndị Ji Esi n’Ụlọ Amịpụ

Mgbe ụfọdụ, ndị ntorobịa na-esi n’ụlọ amịpụ nanị n’ihi na ịnọ n’ụlọ agwụla ha ike, ha achọọkwa isoro ndị enyi ha kporie ndụ. Akwụkwọ bụ́ Adolescents and Youth na-akọwa na ndị ntorobịa pụrụ isi n’ụlọ mịpụ “n’ihi mgbochi ụfọdụ, dị ka iwu apụla èzí n’uhuruchi ma ọ bụ mmachibido a machibidoro ha ije nnọkọ ntụrụndụ ụfọdụ. Onye ntorobịa ahụ ga-agakwarị, mgbe ụfọdụkwa ọ na-enwe ike ịlọta n’enweghị onye maaranụ.” Otu nwa agbọghọ dị afọ 16 kọwara ihe ndị mere ọ na-eji esi n’ụlọ amịpụ. “Ọ na-adị m ka m bụ nwa ọhụrụ nakwa ka a na-akpagide m akpagide,” ka o kwuru. “Oge e nyere m ịghara ịnọ n’èzí na-amalite nnọọ n’oge karịa nke onye ọ bụla ọzọ. Ndị mụrụ m adịghịkwa ekwe ka m jee ebe ndị enyi m na-eje . . . Otú ọ dị, m na-ejekwarị ma ghaa ụgha.” Joseph, onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, bidoro ịmịpụ n’ụlọ mgbe ọ dị afọ 14 bụ́ mgbe ọ gara otu ihe nkiri egwú rap nke ndị mụrụ ya machibidoro ya iwu ịga.

 N’eziokwu, ọtụtụ ndị ntorobịa adịghị ebu ihe ọjọọ n’obi amịpụ. Tara, bụ́ otu n’ime ndị ntorobịa ahụ e hotara ná mmalite, kwuru, sị: “Ihe mbụ dị n’uche anyị abụghị ‘Ka anyị gaa mee mmehie dị oké njọ.’ Nanị ihe m chọrọ bụ ịnọnyere nwanne m nwanyị, ọ chọkwara ịpụ jee soro ndị enyi ya kporie ndụ.” Joseph kwuru, sị: “Nanị ihe anyị mere bụ ime mkpagharị. Achọrọ m isoro ndị enyi m kwurịta okwu ma nọnyere ha.” Ma, ọ bụ ezie na mmadụ isoro ndị enyi ya mee mkpagharị nwere ike ọ gaghị edujekarị na mpụ dị oké njọ, ọtụtụ ndị ntorobịa na-adaba n’oké nsogbu.

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya

Ọkachamara n’okwu ahụ ike uche bụ́ Dr. Lynn E. Ponton na-arụ ụka, sị: “O kwesịrị ekwesị ka ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eme ihe dị ize ndụ.” Dr. Ponton gara n’ihu ịkọwa na o kwesịrị ekwesị, ikekwe ọbụnakwa zie ezie ka ndị ntorobịa chọọ inwere onwe ha, ịnwale ihe ọhụrụ, ịnọ n’ọnọdụ ọhụrụ ndị na-adọrọkwa mmasị. Ọ bụ ihe ya na uto na-eso. Ma ọtụtụ ndị ntorobịa na-eme ihe dị ize ndụ gabiga ókè nile ezi uche dị na ha—karịsịa mgbe anya ndị mụrụ ha na-adịghị ahụ ha. Magazin bụ́ Teen na-ekwu, sị: “Njikọta nke nrụgide ndị ọgbọ, ụlọ ịgwụ mmadụ ike, ume a na-ejighị rụọ ọrụ, nakwa ma eleghị anya ihe mkpali ọzọ dị ka biya . . . pụrụ iduba ndị nọ n’afọ iri na ụma n’ihe ize ndụ na-ezighị ezi—ha atụfuokwa ndụ ha.” Otu nnyocha e mere depụtara ụfọdụ n’ime ihe ize ndụ ndị a nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eme, gụnyere iji ụgbọala efe ọsọ, imebisị ihe, ịnya ụgbọala mgbe mmanya na-egbu ha, na izu ohi.

Ozugbo ị malitere inupụtụ isi, ọ dị mfe ịbanye n’omume ndị ka njọ. Ọ bụ dị ka Jisọs kwuru na Luk 16:10, sị: ‘Onye bụ onye ajọ omume n’ihe dịkarịsịrị nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.’ Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na mmadụ iso ndị enyi ya na-amịpụ n’ụlọ pụrụ iduba ná mmehie ndị dị oké njọ. Tara kwara iko. Joseph bidoro ire ọgwụ ọjọọ, a nwụchie ya, ya agaakwa mkpọrọ. Otu onye ntorobịa bụ́ onye Kraịst aha ya bụ́ John bidoro iji ọgwụ ọjọọ eme ihe ma na-ezu ụgbọala. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị ntorobịa na-enwetakwa ihe ndị a na-ahụ anya na-esi n’ụdị akparamàgwà ahụ apụta—afọ ime a na-achọghị, ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ, ma ọ bụ ịbụ onye mmanya ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ riri ahụ.—Ndị Galetia 6:7, 8.

Mbibi Ọ Na-akpata

Mbibi dị nnọọ ukwuu karịa mbibi ọ na-ebibi anụ ahụ gị pụrụ ịbụ mbibi ọ na-ebibi mmetụta uche gị. Nsogbu akọ na uche pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-egbu mgbu. (Abụ Ọma 38:3, 4) Joseph kwuru, sị: “A na-atụ ilu na mmadụ adịghị ama uru ihe o nwere bara ruo mgbe o funahụrụ ya. Mgbe ụfọdụ, m na-echeghachi echiche azụ, ọ na-ejukwa m anya na m kpuburu nnọọ ìsì.”

Ihe ọzọkwa a na-agaghị eleghara anya bụ mmebi ị pụrụ imebi aha ọma gị. Eklisiastis 10:1 na-ekwu, sị: “Ijiji nwụrụ anwụ na-eme ka mmanụ onye na-asụgwa mmanụ otite nke na-esi ísì ụtọ sie ísì ọjọọ, reekwa ure: otú a ka nzuzu nta dị arọ karịa amamihe, karịakwa nsọpụrụ.”  N’oge ochie, ihe dị ntakịrị dị ka ijiji pụrụ imebi mmanụ otite ma ọ bụ ihe na-esi ísì ụtọ bara oké uru. N’otu aka ahụ, nanị “nzuzu nta” pụrụ imebi aha ọma ị tara ahụhụ nweta. Ọ bụrụkwa na ị bụ onye Kraịst, ihe ịrụ ụka adịghị ya na àgwà ọjọọ dị otú ahụ pụrụ igbochi gị inweta ihe ùgwù dị iche iche n’ọgbakọ. E kwuwerị, ị̀ pụrụ isi aṅaa gbaa ndị ọzọ ume ịgbaso ụkpụrụ Bible mgbe ndị ọzọ maara na i mebeghị otú ahụ n’onwe gị?—Ndị Rom 2:1-3.

N’ikpeazụ, cheedị banyere oké mwute nke ọpụpụ gị pụrụ ịkpatara ndị mụrụ gị mgbe a chọpụtara ya. Otu nne kọrọ banyere egwu tụrụ ya mgbe ọ chọpụtara na nwa ya nwanyị dị afọ 15 anọghị n’ụlọ. Ọ kọwara na ya na di ya ‘nwere oké nchegbu’ n’ihi amaghị ebe nwa ha nwanyị gara. Ị̀ chọrọ ịkpatara ndị mụrụ gị ihe mgbu na ihe mwute dị otú ahụ?—Ilu 10:1.

Inwetakwu Nnwere Onwe

O kwere nghọta na ọ pụrụ ịkụda gị mmụọ ma ọ bụrụ na ndị mụrụ gị eyie ndị dị aka ike. Ma ịmịpụ n’ụlọ ọ̀ bụ ihe ngwọta ya n’ezie? Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a ga-ejide gị n’ikpeazụ. Ọ bụrụgodị na ị dị nnọọ akọ ịghọgbute ndị mụrụ gị, Jehova Chineke na-ahụ ihe ị na-eme, ọbụna ndị ị na-eme n’ọchịchịrị. (Job 34:21) N’ihi ya, mee elu mee ala a ga-ekpughe gị, ma eleghị anya na-ebibi ntụkwasị obi ọ bụla ndị mụrụ gị nwere n’ebe ị nọ tupu mgbe ahụ. Gịnị ga-esi na ya pụta? Ihe dị ukwuu n’ime ihe ahụ ị chọrọ kpọmkwem—nnwere onwe—ga-efunahụ gị!

Cheta: Iji nwere onwe gị, ọ dị mkpa ka i mee ka ndị mụrụ gị tụkwasị gị obi. Ụzọ kasịkwa mma isi mee nke ahụ bụ irubere ha isi. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ndị mụrụ gị adịghị egosicha ezi uche, soro ha nwee ezi nkwurịta okwu—nakwa n’ụzọ nkwanye ùgwù. Ha pụrụ ichebara ihe i kwuru echiche nke ọma. N’aka nke ọzọ, ị pụrụ ịchọpụta na ha nwere ezi ihe mere ha ji na-egbochi gị n’ụzọ ụfọdụ. Ọ bụrụgodị na i kweghị, echefula na ha hụrụ gị n’anya, burukwa ọdịmma gị n’obi. Nọgide na-ewulite ntụkwasị obi ha nwere n’ebe ị nọ, mgbe oge rukwara, ị ga-enweta nnwere onwe ahụ na-agụ gị agụụ. *

“Esola Ha Jee”

Laa azụ n’oge ochie, a na-anwakarị ndị ntorobịa na-atụ egwu Chineke isoro ndị ọgbọ ha na-akpa aghara. N’ihi ya, Solomọn gbara ndị ntorobịa ume, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie araa gị ụrà, ekwela. . . . Esola ha jee n’ụzọ.” (Ilu 1:10, 15) Ṅaa ndụmọdụ ahụ ntị mgbe ndị sịrị na ha bụ ndị enyi gị na-anwa ime ka ị mịpụ n’ụlọ. Solomọn dọrọ aka ná ntị ọzọ, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.”—Ilu 22:3.

Ọ bụrụ na ị malitelarị ịmịpụ n’ụlọ, kwụsị ya! Ị ga-ebibi nnọọ onwe gị n’ikpeazụ. Gwa ndị mụrụ gị ihe ị nọworo na-eme, narakwa ntaramahụhụ ọ bụla ma ọ bụ ihe mgbochi ndị ha pụrụ inye gị. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, họrọ ndị enyi ọhụrụ—bụ́ ndị enyi ga-enwe mmetụta dị mma n’ahụ gị. (Ilu 13:20) Chọpụta ụzọ ndị dị mma karị na ndị na-adịchaghị ize ndụ ị ga-esi na-ekpori ndụ.

Nke kasị mkpa, rụọ ọrụ banyere ọnọdụ ime mmụọ gị site n’ịgụ Bible nakwa ije nzukọ ndị Kraịst. “Gịnị ka okorobịa ga-eji mee ka ụzọ ya dị ọcha?” ka ọbụ abụ ahụ jụrụ. Ọ na-aza, sị: “Ọ bụ n’ilezi ya anya dị ka okwu [Chineke] si dị.” (Abụ Ọma 119:9) Ka i ji nwayọọ nwayọọ na-agbanwe obi gị ime ihe ziri ezi, ị ga-ekwubi na ọ bụ ezie na isi n’ụlọ amịpụ pụrụ ịbụ ihe mkpori ndụ nakwa ihe na-akpali akpali, o kwesịtụghị nnọọ ihe ize ndụ ndị dị na ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha.

^ par. 19 Maka inweta ihe ọmụma banyere inwetakwu nnwere onwe, lee isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

‘Ndị mụrụ m adịghị ekwe ka m jee ebe ndị enyi m na-eje . . . M na-ejekwarị ma ghaa ụgha’

[Foto dị na peeji nke 16]

Isi n’ụlọ amịpụ na-edujekarị n’oké nsogbu