Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

 Ikiri Ụwa

Ụlọ Nkwakọba Mkpụrụ Akụ́kụ́

“Ndị ọkà mmụta sayensị na-ebu amụma na n’ime afọ 50 ọzọ, a pụrụ ikpochapụ ihe ruru pasent 25 nke ihe ọkụkụ ndị dị n’ụwa,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ National Post nke Canada kọrọ. Iji chebe ihe ọkụkụ ndị nọ n’ihe ize ndụ, ogige Royal Botanical Gardens dị na Kew, England, arụọla Ebe Nchebe Mkpụrụ Akụ́kụ́ Maka Narị Afọ Iri A (MSB). “Atụmatụ ọrụ MSB gaje ịchịkọta na ịkwakọba ihe karịrị ụdị ihe ọkụkụ 25,000—ihe karịrị pasent 10 nke ihe ọkụkụ dị n’ụwa bụ́ ndị na-amị mkpụrụ,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-akọwa. Ndị haziri MSB na-enwe olileanya iji mkpụrụ akụ́kụ́ ndị ahụ mee ihe mgbe ha dị mkpa iji dozie ala a kọrọ ugbo na ya gabiga ókè, iji belata ohere e nwere maka inwe ụnwụ nri, na iji nweta ihe ọkụkụ ndị e ji emepụta ọgwụ ọdịnala na nke Bekee. Roger Smith, bụ́ onyeisi atụmatụ ọrụ nkwakọba mkpụrụ akụ́kụ́ ahụ, na-ekwu, sị: “Ọ na-abụkarị ihe ọkụkụ ndị kasị baara ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ uru bụ ndị na-ebu ụzọ apụ n’anya.”

Nkụchi Obi nke Na-adịghị Egbu Mgbu

Ọtụtụ mmadụ na-achọpụta ngwa ngwa mgbaàmà nkịtị nke nkụchi obi bụ́ ndị a kasị enwe—ihe na-eyi ka ọ na-akpọgide akpọgide n’obi. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ dị nnọọ nta karị maara na “otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị nile ọ na-arịa agaghị enwe obi mgbu n’oge nkụchi obi,” ka magazin bụ́ Time na-akọ. Nke ahụ na-eme ka a mata ihe mere “ndị nwere nkụchi obi bụ́ ndị na-enweghị obi mgbu na-eji eyigharịkarị ịga ụlọ ọgwụ—ná nkezi nke awa abụọ,” ka otu nchọpụta e bipụtara na The Journal of the American Medical Association na-ekwu. Otú ọ dị, ọ dị ize ndụ igbu oge ọ bụla n’inweta ọgwụgwọ nke pụrụ ịzọpụta ndụ. Gịnị ka i kwesịrị ile anya ya? “Ikekwe mgbaàmà ọzọ kasịnụ bụ oké ume erughị ala,” ka Time na-ekwu. Mgbaàmà ndị ọzọ a pụrụ inwe na-agụnye agbọ onunu, oké ọsụsọ, na “‘obi ire ọkụ’ ọ bụla nke na-akawanye njọ ma ị gagharịa ma ọ bụ megaa ahụ n’ụzọ ọ bụla ọzọ,” ka ihe odide ahụ na-ekwu.

Mkpịsị Ụkwụ Na-anyado Anyado

Ọ pụrụ ịdịrị agụ ụlọ mfe isite n’uko ụlọ nke na-akwọ mụrụmụrụ ka enyo gbafere. Olee otú ha na-esi eme ya? Ndị ọkà mmụta sayensị, bụ́ ndị gbalịworo ịza ajụjụ ahụ ruo ọtụtụ iri afọ, na-eche ugbu a na ha pụrụ ịkọ ihe kpatara ya. Otu ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị na ndị injinịa achọpụtawo na “a na-enwe ike nnyakụdo dị ukwuu nke na-eju anya mgbe ụmụ obere ajị, na ihe ndị yiri ajị, bụ́ ndị dị n’ụkwụ agụ ụlọ na-echitụ n’elu ihe,” ka magazin bụ́ Science News na-akọ. “Site na nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ yiri ajị, ọbụna ụmụ ajị ndị ka obere na-epulite, bụ́ ndị a na-akpọ spatulae. Mgbe ụkwụ agụ ụlọ metụrụ n’elu ihe, ihe dị ka otu ijeri spatulae kpuchiri ọbụ ụkwụ ya na-adị nso n’elu ihe ahụ nke na . . . ikike nke na-adọkọta ha ọnụ pụrụ ịbata n’ọrụ.” Ndị nchọpụta kwukwara na otú agụ ụlọ na-esi ewetu ụkwụ ha “yiri ka ọ na-abịagide ihe ndị ahụ yiri ajị n’elu ihe ma na-eme ka ha nyado n’elu ya.” Nke a na-eme ka “njide nke nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ yiri ajị jidere ihe mụbaa okpukpu iri ma e jiri ya tụnyere nanị ịbịagide ya abịagide,” ka magazin ahụ kwuru.

Chọọchị Ọtọdọks nke Gris Ewee Iwe n’Ihi Ihe E Kpebiri n’Ikpe

Iwepụ aha okpukpe ụmụ amaala Gris na “kaadị obodo nke e ji amata mmadụ emewo ka iwe nke Chọọchị Ọtọdọks nke Gris dịkwuo ọkụ.” Nke ahụ bụ ihe otu akụkọ sitere na Newsroom.org na-akọ. Mkpebi ahụ na-esochi akụkọ Njikọ Mba Nile nke Òtù Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Helsinki kọrọ na 1998 nke “kwuru na Gris na-akpa ókè megide chọọchị ndị na-abụghị ndị nke Ọtọdọks nakwa na iwu ahụ e nyere ka aha okpukpe mmadụ dịrị na kaadị ndị e ji amata ya na-akpata ịkpa ókè n’iwe mmadụ n’ọrụ nakwa n’otú ndị uwe ojii si emeso mmadụ.” Gọọmenti Gris na-ekwu na mgbanwe ahụ ga-eme “ka kaadị ahụ kwekọọ n’ụkpụrụ nke Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe nakwa n’iwu mba ahụ nke1997 maka nchebe nke ihe ndị dịịrị mmadụ,” ka isiokwu ahụ na-ekwu. Ka o sina dị, onye ndú Chọọchị Ọtọdọks nke Gris akọwawo ndị chọrọ ka e wepụ aha okpukpe na kaadị ndị ahụ dị ka “ndị na-arụ ọrụ ọjọọ.”

Ọgụ China Na-alụso Oké Ifufe Na-ebu Uzuzu

Oké ifufe na-ebu uzuzu nke na-esite n’ebe ndị bụ́ ọzara n’Inner Mongolia efeferewo n’ebe ugwu China n’afọ ndị na-adịbeghị anya, na-ebibi ihe ọkụkụ na anụ ụlọ ndị ọnụ ahịa ha ruru ọtụtụ nde dollar, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ China Today na-akọ. N’afọ 2000, ọtụtụ oké ifufe na-ebu uzuzu feere ruo n’isi obodo ahụ, bụ́ Beijing. N’afọ 1998, otu oké ifufe na-ebu uzuzu bibiri akụ́kụ́ a kụrụ n’ala karịrị hekta 33,000, gbuokwa anụ ụlọ dị 110,000. Mmadụ ejighị ala mee ihe n’ụzọ ziri ezi abụrụwo  ihe bụ́ isi a chọpụtara kpatara ya. E mewo ka ala sara nnọọ mbara ghara inwekwa ahịhịa ndụ ma mee ka ọ ghọọ ọzara. Dị ka ihe atụ, na 1984, ndị bi n’Ógbè Ningsia Hui Kwụụrụ Onwe Ya, bụ́ nke dị n’etiti ebe ugwu nke ọdịda anyanwụ China, malitere igwupụta mkpọrọgwụ bụ́ licorice nke ha ga-eji mere ọgwụ mkpọrọgwụ ndị China. “N’ihe na-erughị afọ 10,” ka magazin bụ́ China Today na-ekwu, “e bibiri ala ahịhịa dị hekta 600,000, meekwa ka ala ubi dị hekta 13,333 ghọọ ọzara.” E meela ka ebe ndị ọzọ ghọọ ọzara site n’anụmanụ ịtabiga ahịhịa ókè na ha nakwa site n’iji mmiri dị na ha mebiga ihe ókè. Iji lụsoo nsogbu ahụ ọgụ na iji kwụsị mgbasawanye nke ebe ndị bụ́ ọzara, e meela mgbalị dị ukwuu ịkụghachi osisi na ahịhịa.

Izu Ohi Ihe E Ji Amata Mmadụ

Kpachara anya maka ndị omekome bụ́ ndị na-eme ka hà bụ gị iji gwuo ndị i ji ụgwọ wayo, ka otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ Mexico City bụ́ El Economista dọrọ aka ná ntị ya. Mgbe ha nwetasịrị ihe ọmụma banyere gị site n’izuru akwụkwọ ozi gị ma ọ bụ pọọsụ gị, ndị omekome na-eji aha gị tinye akwụkwọ maka inweta kaadị e ji azụrụ ihe n’aka ma kwuo ka e ziga ha n’adres nke ha. Ha na-ejizi ihe ndị e ji amata gị azụgasị ihe ma ọ bụ achọta ụlọ site n’iji telifon ma ọ bụ Internet eme ihe. Ndị e mesoro mpụ a pụrụ iji ọtụtụ afọ, ikekwe ọtụtụ iri afọ, na-akwụ ụgwọ ndị ahụ, ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị pụọ n’ịbụ onye e zuuru ihe e ji amata ya? El Economista na-adụ ọdụ, sị: Ejila akwụkwọ ndị dị mkpa na-agagharị ọ gwụla ma ị gaje iji ha eme ihe, detuo ihe nile i ji kaadị e ji azụ ihe n’aka zụọ ma jiri ha nyochaa ihe ndị a gbara gị ụgwọ ha n’akwụkwọ na-egosi ọnọdụ ihe ndekọ ego gị, dọkaa risit kaadị e ji azụrụ ihe n’aka tupu ị tụfuo ha, ezipụkwala ihe ndekọ banyere onwe gị site n’igwe nzipụ ozi, nweekwa ihe ndekọ nke nọmba kaadị nile i ji azụrụ ihe n’aka, oge ha ga-akwụsị ịdị irè, na nọmba telifon nke ndị nyere gị kaadị ndị ahụ ka i wee nwee ike ịkọrọ ha maka kaadị ndị furu efu ma ọ bụ ndị e zuuru.

Agha A Na-ebuso Nje Bacteria Ezighị Ezi

“Ndị na-azụ ihe n’America na-ebu agha hiere ụzọ megide ụmụ nje ndị dị n’ebe obibi,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today kọrọ. Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ sị kwuo, otu dibịa na ọkà mmụta n’ụmụ ihe ndị dị ndụ na Mahadum Tufts bụ́ Stuart Levy na-ekwu na “mmụba nke ihe ndị na-egbu nje bacteria . . . na-eyi egwu ịkpasu mpụta nke nje bacteria ndị na-eguzogide ọ bụghị nanị ncha ndị na-egbu nje bacteria, kamakwa ọgwụ nje.” Iji ihe ndị na-egbu nje bacteria na-eme ihe na gburugburu ebe obibi iji gbuo ụmụ nje yiri iji “hama egbu ijiji,” ka Levy na-ekwu. N’aka nke ọzọ, ihe ndị e ji ehicha ụlọ dị ka bleach, hydrogen peroxide, nakwa mmiri ọkụ na ncha na-ewepụ unyí ma ha adịghị akpali nje bacteria ịgbanwe gaa n’ụdị ndị ọzọ na-eguzogide ihe ndị dị otú ahụ. “Nje bacteria bụ ndị anyị na ha na-ejikọ aka,” ka Levy na-ekwu. “Ọ dị mkpa ka anyị na ha dị n’udo.”

Ndị Britain Bụ Ndị Kasị Ekiri TV

“Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị Britain na-eji oge há ka nke ha ji arụ ọrụ n’izu dị otú o kwesịrị wee na-ekiri telivishọn,” ka akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Independent na-akọ. Dị ka ndị nchọpụta si kwuo, ihe ka ọtụtụ ná ndị Britain na-eji awa 25 ekiri telivishọn kwa izu, ebe pasent 21 na-ekiri telivishọn ha ruo ihe karịrị awa 36. “Ọ bụghị nanị ndị na-eto eto na-ekiribiga ya ókè, ebe ọ bụ na nchọpụta ndị ahụ bụkwa eziokwu n’ebe ndị ikom na ndị inyom na ndị mere okenye nọ,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Otu ezinụlọ, bụ́ ndị na-eji ihe dị ka awa 30 na-ekiri telivishọn kwa izu, kwuru na telivishọn mere ka ha nwee “ndọpụ uche dị ha mkpa.” Otú ọ dị, àgwà dị otú ahụ nke ikiribiga telivishọn ókè na-efu ihe. N’otu nchọpụta banyere mba 20, United Kingdom “gbara nnọọ ndị mbụ n’ikiri TV,” ka akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Guardian Weekly na-akọ. Ma, “Britain nọ nnọọ n’ọkara nke ala ala n’ihe atọ kasị mkpa e ji atụ ịma ka e si agụ na ka e si ede n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.”

Mmụta Banyere Mmekọahụ Malite na Nwata

N’oge na-adịghị anya, a ga na-akụziri ụmụaka nọ na Bangkok, Thailand, banyere mmekọahụ n’ụlọ akwụkwọ ọta akara, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Bangkok Post na-akọ. Dị ka Dr. Suwanna Vorakamin nke Ngalaba Na-ahụ Maka Atụmatụ Otú Ezinụlọ Ga-aharu na Nchịkwa Ụba Mmadụ, si kwuo, “a ga-azụ ndị nkụzi na ndị ọrụ ahụ ike n’ụzọ pụrụ iche maka ịkụzi na ikwu banyere mmekọahụ n’ụzọ nkà mmụta sayensị,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ọ gbakwụnyere, sị: “E zubeghị ịmalite ịkụzi banyere mmekọahụ n’oge a nọ n’ọta akara iji gbaa ụmụaka ume itinye aka n’omume mmekọahụ malite na nwata. . . . Ihe a ga-akụziri ụmụaka ga-enyere ha aka izere akparamàgwà na-adịghị mma nakwa ihe ize ndụ nke afọ ime a na-achọghị mgbe ha nọ n’afọ iri na ụma,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.