Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Ọṅụ Anagide Ihe n’Ụwa Ihe Na-aga Ọkụ Ọkụ na Ya

Iji Ọṅụ Anagide Ihe n’Ụwa Ihe Na-aga Ọkụ Ọkụ na Ya

 Iji Ọṅụ Anagide Ihe n’Ụwa Ihe Na-aga Ọkụ Ọkụ na Ya

IHE KA ỌTỤTỤ NÁ NDỊ MMADỤ NA-ANAGIDE NSOGBU NKE NDỤ, MA, Ọ BỤ OLE NA OLE NA-EJI ỌṄỤ ANAGIDE YA. NKE AHỤ CHỌRỌ ỤDỊ AMAMIHE PỤRỤ ICHE.

N’IKWETA nke a, akwụkwọ bụ́ The 24-Hour Society na-ekwu, sị: “Ọ dị anyị mkpa ịzụlite amamihe iji chebe mkpa na ọdịdị mmadụ n’ụwa nke anyị meworo ka ọ ghọọ nke nkà na ụzụ.”

Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na ọ dị mfe inweta ezi amamihe n’akwụkwọ a kasị ekesa n’ụwa—Okwu Chineke, bụ́ Bible. N’ịbụ nke sitere n’ike Onye ghọtara mkpa na ọdịdị mmadụ nke ọma, Bible nwere ụkpụrụ ndị a nwaleworo, bụ́kwa ndị ziri ezi. Itinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ pụrụ inyere gị aka ịchịkwa ndụ gị karị,  na-enye gị ọṅụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ ka ị na-anagide ihe n’ụwa nke taa ihe na-aga ọkụ ọkụ na ya.—Aịsaịa 48:18; 2 Timoti 3:16.

Ụkpụrụ ndị a metụtara ebe atọ bụ́ isi. Nke mbụ, ha na-arụtụ aka n’ebe ị pụrụ iji amamihe belata ihe. Nke abụọ, ha pụrụ inyere gị aka ibute ihe ndị kwesịrị ekwesị ụzọ. Nke atọ, ha na-eme ka a na-ele ndụ anya n’ụzọ ime mmụọ bụ́ nke ka nnọọ echiche ụwa mma. Ka anyị tụlezie akụkụ atọ ndị a.

Na-eme Ka Ndụ Dị Mfe, Dịkwa n’Usoro

Ka e were ya na ị na-aga mkpapụ ịma ụlọikwuu ruo ụbọchị ole na ole. Ị chọrọ inwe ntụsara ahụ, n’ihi ya i were ákwà ụlọikwuu buru ibu na ihe ọ bụla pụrụ ịbata gị n’echiche. I jirikwa obu ngwongwo e bujuru ngwá ụlọ, ihe e ji esi nri, ígwè friza, obere ígwè ọkụ eletrik, bọlb ọkụ, TV, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, tinyekwara ihe oriri. Otú ọ dị, ịhazi ihe a nile ewee gị ọtụtụ awa! Mgbe ahụ, ná ngwụsị ntakịrị oge ezumike gị, i jirikwa oge hà otú ahụ kwakọghachi ihe ndị ahụ—e kwutebeghịdị banyere ibupụtasị ihe ndị a ma ị laruo. N’ileghachi anya azụ, ị ghọta na i nweghị ohere zuru ezi iji nweta ọṅụ ná mkpapụ ịma ụlọikwuu ahụ i mere! I chee ma ò kwesịrị mgbalị nile i tinyere na ya.

Nye ọtụtụ nde ndị mmadụ taa, ndụ n’onwe ya yitụrụ ịga mkpapụ ịma ụlọikwuu ahụ. Ha na-etinye oge buru ibu n’inweta na ịnọgide na-enwe ọtụtụ ihe onwunwe bụ́ ndị ụwa a ga-achọ ime ka anyị kweta na ha dị anyị mkpa iji nwee obi ụtọ. N’ụzọ dị iche, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” (Luk 12:15) Ee, e jighị akụ̀ na ụba nkịtị amata ọdịdị nke ndụ. N’eziokwu, ọtụtụ mgbe akụ̀ na ụba na-eso akpata nrụgide na nchegbu. “Afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra,” ka Eklisiastis 5:12 na-ekwu.

Ya mere tụlee nke ọ bụla n’ime ihe onwunwe gị nke ọma, ma jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe a ọ̀ dị mkpa n’ezie, ka ọ bụ ihe na-adịghị mkpa? Ọ̀ na-eme ka ọdịdị nke ndụ m ka mma, ka ọ̀ na-eri oge dị mkpa?’ Okwu mmalite nke akwụkwọ bụ́ Why Am I So Tired?, nke Leonie McMahon dere na-ekwu, sị: “Mmepụta e  mepụtara ngwá dịgasị iche, bụ́ ndị e zubere iji na-arụ ọrụ ụlọ ndị siri ike emewo ka ọ dị mkpa na odozi akụ̀ ga-arụ ọrụ ego iji zụta ha ma na-akwụ ụgwọ maka imezi ha.”

Mgbe i mere ka ndụ gị dị mfe, ị ga-enwekwu oge maka ezinụlọ, ndị enyi, nakwa onwe gị. Oge dị otú ahụ dị oké mkpa maka obi ụtọ gị. Adịla ka ndị na-achọpụta mgbe oge gafeworo ná ndụ na ndị enyi na ezinụlọ dị nnọọ mkpa—ma na-enye obi ụtọ—karịa ego na ihe onwunwe dị iche iche. Ọ bụ nanị ndị mmadụ pụrụ ịhụ gị n’anya. Ọ bụ ezie na ego dị n’ụlọ akụ̀, òkè mmadụ nwere n’ụlọ ọrụ dị iche iche, kọmputa, telivishọn, na ngwá eletrik ndị ọzọ pụrụ ịba uru, ndụ ga-aga n’ihu ma ha adịghị, ha abụghị ihe ndị bụ́ isi ná ndụ. Ndị na-ebute ihe ndị dị otú ahụ ụzọ ejighị ndụ ha akpọrọ ihe, ha na-emesịkwa bụrụ ndị na-enweghị afọ ojuju ma ọ bụ ọbụna ndị nwere obi ilu.—1 Timoti 6:6-10.

Mee Ka Oge Zuoro Gị Ma Bute Ihe Ndị Ka Mkpa Ụzọ

N’ọnọdụ ụfọdụ, ime ka oge na-ezu ezu yiri mmadụ ịhazi atụmatụ mmefu ego. Ọ bụrụ na ị nwaa ịfanye ọtụtụ ihe n’ime awa ole na ole i nwere, ị dịghị eme ka oge i nwere zuoro gị. Ụzọ ndụ dị otú ahụ aghaghị ịkpata nkụda mmụọ, nrụgide, na ike ọgwụgwụ. N’ihi ya mụta ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ.

Nke mbụ, chọpụta ihe ndị ka mkpa  ma wepụtara ha oge zuru ezu. Nye ndị Kraịst, nchụso ihe ime mmụọ na-ebute ụzọ mgbe nile. (Matiu 6:31-34) Ọ bụrụ na e mee ihe ndị dị mkpa ọkụ ọkụ ma ọ bụ ghara ime ha nke ọma, ọ na-akpatakarị nnukwu nsogbu. N’ihi ya, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịkwụsị ihe ọ bụla na-eri oge, nke na-adịghịkwa arụpụta ezigbo ihe.

N’ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ, na-echeta mkpa i nwere maka ịnọtụrụ onwe gị—oge maka ntụgharị uche bara uru nakwa ime ka i nwetaghachi ume. “Oge bara uru mmadụ ji nọrọ nanị ya,” ka akwụkwọ bụ́ Psychology Today na-ekwu, bụ “ihe dị mkpa na-enye ume ọhụrụ n’ụwa nke taa ihe na-aga ọkụ ọkụ na ya. . . . Oge mmadụ ji nọọ nanị ya na-akwado ndụ.” Ndị na-enweghị ohere ịtụgharị uche nwere ike ịghọ ndị na-ejighị ndụ akpọrọ ihe.

Obi Umeala na Iji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe

Obi umeala na iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe bụ ihe abụọ n’ime ihe ndị kasị mma ị pụrụ inwe ma a bịa n’ihe banyere ibi ndụ obi ụtọ, nke ziri ezi. Obi umeala dị mkpa n’ihi na ọ na-enyere gị aka izere iburu ibu ọrụ ndị ezi uche na-adịghị na ha. Ọ bụrụ na ị dị obi umeala, ị ga-ama mgbe ị ga-ajụ ịrụfe oge ọrụ ma ọ bụ ihe omume ndị ọzọ ga-egbochi ihe ka mkpa. Ndị dị obi umeala adịghị enwe anyaụfụ maka ihe ndị ọzọ nwere ma na-eme; n’ihi ya, ha na-enwekarị afọ ojuju karị. N’aka nke ya, ezi obi umeala, bụ otu akụkụ nke iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, nke bụ́ ihe ọzọ dị oké mkpa n’ịchịkwa ndụ anyị karị.—Maịka 6:8; 1 Jọn 2:15-17.

Iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, dabere n’ezi ihe ọmụma nke Bible, na-eme ka ị bụrụ onye nwere ezi uche na nghọta karị—onye a na-adịghị aghọgbu site n’okwu efu nke ụwa banyere inwe ọganihu. Ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ amamihe dị na ya dị ná 1 Ndị Kọrint 7:31: “Ka ndị na-eji ụwa mee ihe wee dị ka ha ejibigaghị ya ókè: n’ihi na ụwa nke a ka e si ahụ ya anya na-agabiga agabiga.” Ndị Kraịst “na-eji ụwa eme ihe” mgbe ha na-enweta ihe onwunwe maka onwe ha na ezinụlọ ha, ma ha adịghị ekwe ka ụwa lomie ha. Ha maara na ọ dịghị enye ezi nchebe na n’oge na-adịghị anya a ga-ebibi ya kpam kpam nakwa na ezi ọganihu—nchebe na ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs—na-adabere ná mmekọrịta mmadụ na Chineke. (Abụ Ọma 1:1-3; 37:11, 29) N’ihi ya na-aṅa ntị na ndụmọdụ Jisọs, na-ejikwa amamihe eme atụmatụ site n’ịkpado “akụ̀ n’eluigwe . . . , ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghị egwupukwa, ha adịghị ezukwa ohi.”—Matiu 6:20.

Zere Nchegbu Ma Chọta Ezi Udo

Ka usoro ihe dị ugbu a na-abịa ná njedebe, ihe ịrụ ụka adịghị ya na nrụgide na ihe ndị ị ga-eji oge gị mee ga-amụba. Otú ọ dị, lee ka o si dị mkpa ka ị gbalịa itinye ndụmọdụ Bible a n’ọrụ: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” Udo dị otú ahụ agaghị eru onye ọ bụla na-achọ ihe ụwa aka bụ́ onye na-ahụghị uru ekpere bara.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Ma, Jehova ga-eme ihe karịrị inye gị udo nke uche. Ọ ga-enyere gị aka iburu ibu arọ gị kwa ụbọchị ma ọ bụrụ na ị ‘tụkwasị Ya nchegbu nile ị na-echegbu onwe gị.’ (1 Pita 5:7; Abụ Ọma 68:19) Ya mere, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ige Chineke ntị kwa ụbọchị site n’ịgụ otu akụkụ nke Okwu ya. Ònye pụrụ inye gị ndụmọdụ ka nke Onye kere gị mma? (Abụ Ọma 119:99, 100, 105) Ee, ahụmahụ egosiwo na a na-enyere ndị na-edebe Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha aka iji ọṅụ na-anagide ihe n’ụwa nke taa ihe na-aga ọkụ ọkụ na ya.—Ilu 1:33; 3:5, 6.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

Na-ebute ihe ndị ka mkpa ụzọ, gụnyere igbo mkpa i nwere maka ịnọrọ onwe gị na iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe

[Foto dị na peeji nke 9]

Ị̀ pụrụ ime ka ndụ gị dị mfe, dịkwa n’usoro?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ị̀ na-edebe ihe dị iche iche ka ọ bụ ndị mmadụ n’ọnọdụ mbụ?