Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ịgbalị Ime Ọtụtụ Ihe Na-efu

Ihe Ịgbalị Ime Ọtụtụ Ihe Na-efu

 Ihe Ịgbalị Ime Ọtụtụ Ihe Na-efu

MBA NDỊ DỊ N’EBE ỌDỊDA ANYANWỤ TAA NWEBIGARA MMASỊ ÓKÈ N’IME IHE ỌSỌ ỌSỌ NA NÁ NTỤSARA AHỤ

ÍGWÈ ndị e ji asa efere na-eme ka a ghara igbu oge na kichin. Ígwè ndị e ji asa ákwà na-emekwa otú ahụ n’ebe a na-asa ákwà. Ọ dịghịzi ọtụtụ nde mmadụ mkpa ọbụna ịga n’onwe ha ịzụrụ ihe nakwa ịga itinye ma ọ bụ iwere ego n’ụlọ akụ̀—nanị ihe ha na-eme bụ ịgbanye kọmputa ha ma jiri Internet mee ha.

Ee, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ, ụwa jupụtara n’ụdị ngwá nile na-eme ka a ghara igbu oge ma na-eme ka ọrụ dị mfe. N’ihi ya, ị ga-eche na ndị mmadụ ga-enwe oge buru ibu iji soro ezinụlọ ha nọkọọ nakwa maka ntụrụndụ. Ma, ọtụtụ mgbe, ọtụtụ ndị na-ekwu na ha na-enwe ike ọgwụgwụ na nchegbu karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ihe ndị na-akpata ya dị ọtụtụ ma dị mgbagwoju anya.

Nsogbu ọnọdụ akụ̀ na ụba so n’ihe ndị bụ́ isi na-akpata ya. Ụlọ Ọrụ Australia Na-ahụ Maka Inyocha Mmekọrịta Ụlọ Ọrụ Mmepụta Ihe na Inye Ọzụzụ nyochara awa ole ndị mmadụ na-etinye n’ọrụ ná mba ahụ ma chọpụta na “ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị mmadụ na-etinye ihe karịrị awa 49 n’ọrụ mgbe nile kwa izu” nakwa na “mmụba a e nwere n’oge ọrụ yiri ka ọ̀ ga-enwe mmetụta dị nnọọ njọ ná ndụ ezinụlọ na nke obodo.” Ọtụtụ ndị ọrụ na-ahọrọ ibi ná mpụga obodo ukwu bụ́ ebe dị jụụ karị, ebe ndị mmadụ na-ebighị nnukwu. Nke ahụ pụrụ ịpụta iji ọtụtụ awa kwa izu—ma ọ bụ ọbụna kwa ụbọchị—na-agba ụgbọ okporo ígwè na bọs na-ebu ọtụtụ mmadụ ma ọ bụ na-aga n’okporo ụzọ ụgbọala jupụtara. Ya mere, nke a na-akpata mmụba nke oge a na-etinye n’ọrụ n’ụbọchị, na-emekwa ka obi erughị ala ọ na-akpata ka njọ.

Ì Ji Ụgwọ Ụra?

Ọtụtụ ndị na-enwezi nsogbu ehilighị ụra n’afọ ndị na-adịbeghị anya nke na e mepewo ụlọ ahụ ike ndị na-ahụ maka nsogbu ehilighị ụra n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Ndị nnyocha chọpụtara na ọ bụrụ na ndị mmadụ adịghị ehi ụra otú o kwesịrị mgbe mgbe, ha na-abụ ndị ji ụgwọ ụra. Dị ka ọ na-adịkarị, ahụ ha ga-achọ ịkwụ ụgwọ a ma kpalie ha site n’ime ka ike gwụ ha. Ma n’ihi ụzọ ndụ nke taa na-adịghị ekwe ka e hie ụra, ọtụtụ ndị na-anọgide na-enwe oké ike ọgwụgwụ.

N’otu ala dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, oge ụra  ejiwo pasent 20 belata n’ime narị afọ gara aga, site ná nkezi nke awa itoolu n’abalị ọ bụla ruo awa asaa. Ndị nnyocha enwetala ọtụtụ ihe àmà na-egosi na iji ụgwọ ụra na-akpata nsogbu ịmụta ihe na nke ike ncheta, mbelata nke ikike akwara ozi, ma na-eme ka usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ dị ala. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị achọpụtawo n’onwe anyị na onye nwere ike ọgwụgwụ pụkwara imehie ihe. Ọ dị mwute ikwu na mmehie ihe ndị a pụrụ ịdị njọ ma fuo nnukwu ihe.

Nnukwu Ihe Ike Ọgwụgwụ Na-efu

E kwuru na oké ike ọgwụgwụ nke ịrụ ọrụ ruo ọtụtụ awa na-akpata na igbubilata ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ esowo kpata ụfọdụ n’ime ọdachi ndị kasị njọ e nwere ná ngwụsị narị afọ nke 20. Ụfọdụ n’ime ndị a bụ ọdachi mberede nke nuklia mere na Chernobyl, Ukraine; mgbawa nke ụgbọ mbara igwe bụ́ Challenger; na nkwafu mmanụ e nwere mgbe ụgbọ mmiri bụ́ Exxon Valdez na-ebu mmanụ kpọkaara nkume na Prince William Sound, Alaska.

Mgbawa ahụ mere na Chernobyl mere n’oge a na-eme nnwale pụrụ iche n’ụlọ ọrụ ahụ. N’akwụkwọ ya bụ́ The 24-Hour Society, Martin Moore-Ede kwuru na ndị na-elekọta nnwale ahụ “bụ ìgwè ndị injinịa eletrik ike gwụrụ bụ́ ndị nọworo n’ụlọ ọrụ ahụ ruo ma ọ dịkarịa ala awa iri na atọ ma ọ bụkwanụ karịa n’ihi awa iri a lara n’iyi tupu e nye ha ikike ịmalite.” N’agbanyeghị ihe ọ bụ, dị ka nnyocha e mere na nso nso a si gosi, otu ihe na-adịte aka nke nkupụ nke ụzarị ọkụ ahụ kpatara bụ mmụba dị okpukpu iri nke ọrịa cancer olu ụmụaka Ukraine na-enwe kemgbe 1986.

Mgbe e mesịrị nnyocha zuru ezu banyere mgbawa nke ụgbọ mbara igwe bụ́ Challenger, otu akụkọ si n’aka otu ìgwè president zigara ịmata ihe merenụ kwuru na otu ìgwè ndị ọrụ ngo rụfere awa 20 a sịrị ka a na-arụdebe n’ọrụ nrụfe oge ọrụ ugboro 480, ìgwè ọzọ mere ya ugboro 2,512. Akụkọ ahụ kwukwara na ike ọgwụgwụ ndị nlekọta ọrụ ahụ nwere, bụ́ nke “mgbanwe a na-agbanwegharị oge ọrụ ruo ọtụtụ ụbọchị na ehighị ụra nke ọma” kpatara, bụkwa otu ihe dị ịrịba ama so kpata nkwado ahụ ezi uche na-adịghị na ya a kwadoro ka a gbapụ ya. Akụkọ ahụ kwuru na “mgbe a rụfere oge ọrụ gabiga ókè, ịdị irè nke ndị ọrụ na-ebelata, ohere mmadụ nwere imehie ihe na-amụbakwa.”

Dị ka ndị isi nke otu òtù si kwuo, mgbubilata nke ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ, nke e kwuru na e mere iji belata mmefu ego, pụtara na ndị ọrụ ụgbọ mmiri bụ́ Exxon Valdez aghaghị ịrụkwu ọrụ ọtụtụ awa, rụọkwa ọrụ ntụkwasị. Akụkọ banyere ọdachi ahụ na-akọwa na onye nke atọ na-esote onyeisi ụgbọ mmiri ahụ, bụ́ onye na-akwọ ụgbọ ahụ mgbe o chiri n’ala ka ọ gafetụrụ etiti abali, jiri isi isi ụtụtụ malite ọrụ n’ụbọchị ahụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ lita mmanụ 42,000,000—nkwafu mmanụ kasịnụ n’akụkọ ihe mere eme nke United States—bibiri ụsọ mmiri na ụmụ anụmanụ n’ụzọ dị njọ ma fuo ihe karịrị ijeri $2 iji kupụ ya.

 Ihe Na-apụtachaghị Ìhè Ike Ọgwụgwụ Na-efu

Dị ka otu atụmatụ e mere si gosi, ọ dịkarịa ala ike ọgwụgwụ na-efu ụwa ijeri $377 kwa af! Ma ọ dịghị ọnụ ego pụrụ ịha ka aka ọjọọ ọ na-akpa ndụ mmadụ na ahụ ike, bụ́ ndị ọ na-emetụtakwa nnọọ ọtụtụ mgbe. Were ihe mberede okporo ụzọ dị ka ihe atụ. Dị ka otu ụlọ ahụ ike na-ahụ maka nsogbu ehilighị ụra dị na Sydney, Australia, si kwuo, ihe na-akpata site na pasent 20 ruo pasent 30 nke ihe mberede okporo ụzọ a na-enwe ná mba ahụ bụ ụra na-eburu ndị ọkwọ ụgbọala ka ha na-akwọ ụgbọala. A na-eme atụmatụ na na United States, iro ụra na-eso akpata ma ọ dịkarịa ala 100,000 ihe mberede okporo ụzọ kwa afọ.

Ma, ọ bụghị nanị ihe ndị a ka ike ọgwụgwụ na-akpata. Onye nwere ihe mberede e bugara ngwa ngwa n’ụlọ ọgwụ maka ịwa ahụ nwere olileanya na anya doro dọkịta ya. Ma n’ihi enweghị ohere na ịrụ ọrụ ruo ọtụtụ awa, anya nwere ike ghara ido dọkịta ahụ! Otu akụkọ nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ahụ Ike na Ọdịmma Ọha na Eze n’Australia kpughere na ihe dị ka pasent 10 nke ndị dọkịta na-arụfe awa 65 n’otu izu, pasent 17 nke ndị ọkachamara nile n’ihe banyere ahụ ike na-arụfe awa karịrị nke ahụ, pasent 5 nke “ndị malitere ọrụ dọkịta ọhụrụ” na-arụfe awa 80 n’otu izu!

“Akwụkwọ ntụziaka, akwụkwọ mmapawa ịdọ aka ná ntị na inye ọzụzụ na-echebe ígwè ọrụ,” ka Martin Moore-Ede na-ekwu. “Ndị mmadụ na-abịa n’ụwa a n’enweghị ihe nchebe dị otú ahụ. . . . Eziokwu na-awụ akpata oyi n’ahụ bụ na anyị maara banyere akọrọ ngwá na ihe ọmụma kọmputa nke mmadụ na-eji arụ ọrụ karịa ka anyị maara banyere ihe ndị mejupụtara mmadụ ahụ.”

Ahụ anyị enweghị ọkụ ịdọ aka ná ntị na mgbaàmà ndị na-agwa anyị ka anyị kwụsị ma ọ bụ jiri nwayọọ. Ka o sina dị, ọ na-enye anyị ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị. Ndị a na-agụnye oké ike ọgwụgwụ, mgbanwe nke ọnọdụ uche, ịda mbà n’obi, na ibutekarị n’ụzọ dị mfe nje virus ndị jupụtara n’ebe nile. Ọ bụrụ na i nwere mgbaàmà ndị a—ka e werekwa ya na i nweghị nsogbu anụ ahụ ma ọ bụ nke ahụ ike ndị ọzọ na-apụtaghị ìhè—ọ pụrụ ịbụ oge ịtụleghachi ụzọ ndụ gị.

Ihe Enweghị Nnọọ Ohere Na-efu Ndị Mmadụ

Ụzọ ndụ nke na-akpata nrụgide na ehighị ụra na-akpakwa mmekọrịta mmadụ na ibe ya aka ọjọọ. Tụlee ihe mere otu di na nwunye lụrụ ọhụrụ, bụ́ John na Maria. * Ha chọrọ ihe ndị ka ọtụtụ ná ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ na-achọ—ebe obibi dị mma na ego ga-ezuru ha. N’ihi ya ha abụọ malitere ịrụ ọrụ oge nile. Ma n’ihi ịgbanwegharị oge ọrụ ha, ha na-enwe obere oge iji nọkọọ. N’oge na-adịghị anya mmekọrịta ha malitere ịbụ nke na-echighị anya. Otú ọ dị, ha leghaara mgbaàmà ndị ahụ anya ma nọgide na-agbaso usoro ihe omume ha na-eri oge ruo mgbe alụmdi na nwunye ha, bụ́ nke ka malitere amalite, tisara.

“Nnyocha na-egosi na ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm n’ezinụlọ ndị a na-agbanwegharị oge ọrụ ha ji pasent 60 karịa nke ndị na-aga ọrụ a na-adịghị agbanwe oge ya,” ka akwụkwọ bụ́ The 24-Hour Society na-ekwu. N’agbanyeghị nke  ahụ, ma à na-agbanwegharị oge ọrụ ha ma ọ bụ na a dịghị agbanwegharị ya, ọtụtụ di na nwunye na-agbalị ịfanye ọtụtụ ihe ná ndụ ha, n’ihi ya, ha na-etisa alụmdi na nwunye ha. Nye ndị ọzọ, nrụgide na ike ọgwụgwụ pụrụ iso kpata nsogbu ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụbiga mmanya ókè na àgwà erighị nri nke ọma—ihe ndị na-abụghị nanị na ha na-akpatakwu oké ike ọgwụgwụ kama ha pụkwara ịkpata ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ, ọbụna idina ụmụaka.

Iji nyere ndị mụrụ ụmụ aka ịnagide enweghị ohere, ebe ndị a na-elekọta ụmụaka na-abawanye ụba, ụfọdụ na-arụ ọrụ ọbụna ehihie na abalị. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ụmụaka, TV bụ ihe na-eku nwa n’ezie. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ụmụaka ga-etolite ghọọ ndị toworo eto na-akpa ezi àgwà ma nwee ezi mmetụta uche, ọ dị ha mkpa ka ndị mụrụ ha na-ewepụta oge buru ibu iji nọnyere ha. N’ihi ya, ndị mụrụ ụmụ ike na-agwụ nnọọ iso ụmụ ha nọkọọ n’ihi ịgbalị ịnọgide na-ebi ndụ dị oké elu ga-eme nke ọma ịgụkọ ihe ọ ga-efu—ihe ọ ga-efu ụmụ ha nakwa ha onwe ha.

N’ọha mmadụ na-eji nkà na ụzụ nke na-enwe nnọọ ọganihu eme ihe taa, ndị ọzọ na-ata ahụhụ bụ ndị agadi. Ụzọ dị ngwa ihe ji agbanwe na njupụta nke ngwá eletrik ndị ọhụrụ na-ejupụta n’ahịa mgbe nile na-eme ka ọtụtụ ha nwee mgbagwoju anya, ghara iji onwe ha n’aka, na-atụ ụjọ, ma ọ bụ ọbụna chee na oge nke ha agafeela. N’ihi ya gịnị na-echere ha n’ọdịnihu?

Ọ̀ bụ anyị nile—ma okenye ma nwata—ka ụwa nke yiri ka ihe aghaghị ịnọgide na-aga ọkụ ọkụ karị na ya na-achịkwa kpam kpam? Ka è nwere ihe ndị anyị pụrụ ime iji nyere onwe anyị aka ịnagide ya ma mee ka ọdịdị nke ndụ anyị ka mma? N’ụzọ na-enye obi ụtọ, e nwere, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 A gbanwewo aha ha.

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ọ pụrụ ịbụ na ike ọgwụgwụ so kpata ọdachi mberede nke nuklia mere na Chernobyl, mgbawa nke ụgbọ mbara igwe bụ́ “Challenger,” na nkwafu mmanụ nke ụgbọ mmiri bụ́ “Exxon Valdez”

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Site n’ikike a na-atara Ihe Omume Mba Nile Maka Ike Nuklia nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ike Nuklia na United States

Foto NASA

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ụzọ dị oké ọkụ ihe si aga ná ndụ pụrụ ime ka e nwee alụmdi na nwunye ndị na-adịghị agazi agazi

[Foto dị na peeji nke 8]

Ná mgbalị ha ịnagide ọnọdụ ahụ, ụfọdụ na-aṅụbiga mmanya ókè