Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Alụmdi na Nwunye Ò kwesịrị Ịbụ Njikọ Na-adịru Ogologo Ndụ Nile?

Alụmdi na Nwunye Ò kwesịrị Ịbụ Njikọ Na-adịru Ogologo Ndụ Nile?

 Echiche Nke Bible

Alụmdi na Nwunye Ò kwesịrị Ịbụ Njikọ Na-adịru Ogologo Ndụ Nile?

N’IHI gịnị ka a ga-ejidị jụọ ajụjụ ahụ? N’ihota okwu dị ná nkwa agbamakwụkwọ a na-eji eme ihe n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ọ̀ bụ na alụmdi na nwunye abụghị “ma ọ̀ dị mma ma ọ dị njọ” nakwa “ruo mgbe ọnwụ kewara anyị”? Ee, nkwa alụmdi na nwunye na-ekwupụtakarị na dị na nwunye ọhụrụ ahụ na-abanye ná nkwekọrịta ga-adịru ogologo ndụ ha nile. Ma ọtụtụ mmadụ adịghịzi ewere onwe ha dị ka ndị na-aghaghị imezu nkwa ahụ siri ike. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị bụ́ di na nwunye na-ekewa—ụfọdụ ndị, mgbe ọnwa ole na ole gafesịrị, ndị ọzọkwa, mgbe ọtụtụ iri afọ gafesịrị. N’ihi gịnị ka ojiji a na-eji alụmdi na nwunye akpọrọ ihe ji na-ebelata? Bible na-enye azịza ya.

Biko tụlee 2 Timoti 3:1-3, ma jiri ya tụnyere ihe ị na-ahụ n’ụwa taa. Ná mkpirikpi, amaokwu ndị ahụ na-ekwu, sị: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, . . . ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha.” Amụma ahụ kwesịrị ịrịba ama n’izi ezi ya. Àgwà ndị ahụ emebiwo mmekọrịta alụmdi na nwunye n’ụwa nile ma mee ka ọ ghara isi ike, bụ́ nke pụtara ìhè n’ịdị elu nke ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm.

N’ụzọ doro anya, ọtụtụ mmadụ adịkwaghị akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù. N’ihi nke a, anyị pụrụ ịjụ, sị: È kwesịrị iji alụmdi na nwunye kpọrọ oké ihe? È nwere ihe dị ka ịdị nsọ nke alụmdi na nwunye? Olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele alụmdi na nwunye anya? Enyemaka dị aṅaa ka Bible na-enye ndị di na nwunye taa?

Echiche Chineke Ọ̀ Gbanweela?

Ná mmalite, Chineke ekwughị banyere ihe nkekọ alụmdi na nwunye dị ka ihe na-adịru nwa oge. A kọrọ banyere njikọta o jikọtara nwoke na nwanyị mbụ na Jenesis 2:21-24, n’ebe ahụkwa, e kwughị okwu banyere nhọrọ ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ nkewa. Kama nke ahụ, amaokwu nke 24 na-ekwu, sị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.” Gịnị ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ pụtara?

Tụlee ahụ mmadụ, otú e si jikọta uru ahụ ya dị iche iche n’enweghị ọnụ ọnụ ebe a dụkọtara ha nakwa otú ọkpụkpụ si ejikọta na nkwonkwo ndị siri ike, ndị na-aga were were. Lee ịdị n’otu ọ bụ! Lee otú o si na-adịgide adịgide! Ma lee oké ihe mgbu a na-enwe mgbe ihe a na-enweghị atụ nke dị ndụ nwere mmerụ ahụ dị ukwuu! N’ihi ya, na  Jenesis 2:24, okwu bụ́ “otu anụ ahụ” na-emesi ike ichi anya na ịdịgide adịgide nke njikọ alụmdi na nwunye. Ọ na-enyekwa ịdọ aka ná ntị doro anya banyere oké ihe mwute ga-adị na ya ma a tọsaa ihe nkekọ ahụ.

Ọ bụ ezie na oké mgbanwe ndị e nwere na narị afọ iri ndị gafeworonụ akpụziwo ma kpụgharịa echiche ụmụ mmadụ, Chineke ka na-ele alụmdi na nwunye anya dị ka nkwekọrịta na-adịru ogologo ndụ nile. N’ihe dị ka afọ 2,400 gara aga, ụfọdụ ndị ikom bụ́ ndị Juu nọ na-agbahapụ ndị nwunye mbụ ha ma na-alụrụ ndị bụ́ ụmụ agbọghọ karị. Chineke katọrọ omume a, na-ekwu site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Malakaị, sị: “Lezienụ anya n’ime mmụọ unu, ka nwoke gharakwa ịghọgbu nwunye ọ lụtara n’okorobịa. N’ihi na Ọ kpọwo nchụpụ nwunye asị, otú a ka Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, sịrị.”—Malakaị 2:15, 16.

Ihe karịrị narị afọ anọ n’ihu, Jisọs kwupụtaghachiri echiche mbụ nke Chineke banyere alụmdi na nwunye mgbe o hotara ihe e dere na Jenesis 2:24 ma nyezie nduzi bụ́: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.” (Matiu 19:5, 6) Ọtụtụ afọ n’ihu, Pọl onyeozi nyere ntụziaka ka “nwunye ghara ikewapụ onwe ya n’ahụ di ya” na ka “di gharakwa ịhapụ nwunye ya.” (1 Ndị Kọrint 7:10, 11) Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-ekwupụta n’ụzọ ziri ezi echiche Chineke banyere alụmdi na nwunye.

Ọ̀ dịtụ mgbe Bible nyere ohere maka itisa alụmdi na nwunye? Ee, alụmdi na nwunye na-akwụsị mgbe di ma ọ bụ nwunye nwụrụ. (1 Ndị Kọrint 7:39) Ịkwa iko pụkwara itisa alụmdi na nwunye ma ọ bụrụ na onye nke aka ya dị ọcha ekpebie ime otú ahụ. (Matiu 19:9) Ma ọ́ bụghị ya, Bible na-agba di na nwunye ume ịnọgide na-ebikọta.

Ụzọ Isi Mee Ka Alụmdi na Nwunye Dịgide

Chineke chọrọ ka alụmdi na nwunye dịgide, ọ bụghị ná ndọlị, kama dị ka njem obi ụtọ. Ọ chọrọ ka di na nwunye dozie nsogbu ha ma nwee obi ụtọ dị ukwuu ná mkpakọrịta ha abụọ. Okwu ya na-enye nduzi maka inwe alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ, nke na-adịgide adịgide. Biko rịba akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ ama.

Ndị Efesọs 4:26: “Ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” * Otu nwoke nke nọ n’alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ kwenyere na akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-enyere ya na nwunye ya aka idozi nghọtahie n’egbughị oge. “Ọ bụrụ na ị pụghị ihi ụra mgbe unu nwesịrị nghọtahie, ọ dị ihe na-agahie agahie. Ị pụghị ịhapụ ka nsogbu ahụ gaa n’ihu,” ka o kwuru. Mgbe ụfọdụ ya na nwunye ya anọwo na-ekwurịta nsogbu ha ruo n’ime abalị. Ma ọ na-adị irè. Ọ gbakwụnyere, sị: “Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ arụpụtawo ihe ndị magburu onwe ha.” Site n’ime nke a, nwoke a na nwunye ya enweela alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ ruo afọ 42.

Ndị Kọlọsi 3:13: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu.” Otu di na-akọwa otú ya na nwunye ya siworo tinye nke a n’ọrụ: “Di na nwunye pụrụ ịkpasu ibe ha iwe n’abụchaghị na ọ dị onye ọ bụla n’ime ha mere ihe na-ezighị ezi, ebe ọ bụ na onye ọ bụla nwere adịghị ike na àgwà ndị na-enye ndị ọzọ nsogbu. Anyị na-anagiderịta ibe anyị site n’ekweghị ka ihe ndị a kewaa anyị.” Obi abụọ adịghị ya na echiche ahụ enyeworo di na nwunye a aka n’ime afọ 54 ha lụworo di na nwunye!

Itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị otú ahụ n’ọrụ na-eme ka ihe nkekọ nke jikọtara di na nwunye na-esikwu ike. N’ụzọ dị otú a, alụmdi na nwunye pụrụ ịbụ ihe na-enye ọṅụ, nke na-enye afọ ojuju, na nke na-adịru ogologo ndụ nile.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Dị ka usoro ọgụgụ oge nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na narị afọ mbụ si dị, ụbọchị na-agwụ mgbe anyanwụ dara. Ya mere Pọl na-agba ndị na-agụ akwụkwọ ya ume iso ndị ọzọ dịrị n’udo tupu ụbọchị nke ọ bụla agafee.