Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Sayensị Ọ̀ Pụrụ Iweta Ndụ Ebighị Ebi?

Sayensị Ọ̀ Pụrụ Iweta Ndụ Ebighị Ebi?

 Echiche nke Bible

Sayensị Ọ̀ Pụrụ Iweta Ndụ Ebighị Ebi?

ỌTỤTỤ afọ gara aga, ajụjụ dị otú ahụ aghaghị iyiwo ihe ezi uche na-adịghị na ya. Otú ọ dị, ugbu a, ụfọdụ ndị na-echesi echiche ike banyere atụmanya ahụ. Site n’itinye n’ọrụ usoro ndị ụfọdụ ndị mmadụ chere na a pụrụ iji mee ihe n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ndị ọkà mmụta sayensị enweworị ike ịgbatị oge ndụ nke ijiji na ikpuru okpukpu abụọ.

Nchọpụta egosiwo na mkpụrụ ndụ mmadụ nke dị otú o kwesịrị na-anwụ anwụ, na-ekewa ruo ugboro ole a kpaara ókè. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha na-akwụsị ikewa. Ọ bụ usoro e jiworo tụnyere klọọkụ ime ahụ nke na-achịkwa mgbe ndị mmadụ ji aka nká ma nwụọ. Ndị ọkà mmụta sayensị na-arụ ọrụ ugbu a iji gbanwee ihe klọọkụ a na-akụ.

Otu nchepụta na-ewu ewu na-ekwu na isi ihe na-akpata ịka nká dị n’ọnụ eriri DNA nke ọ bụla, akụkụ a na-akpọ telomere. E jiwo telomere tụnyere rọba na-adị n’isi eriri akpụkpọ ụkwụ, bụ́ nke e mere iji gbochie eriri ndị ahụ ịtọghe. Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na oge ọ bụla mkpụrụ ndụ ụfọdụ kewara, telomere ahụ na-asụlata dị ka rọba na-ere ọkụ. N’ikpeazụ, o yiri ka telomere ahụ ọ̀ na-asụlata ruo n’ókè nke mkpụrụ ndụ na-akwụsị ikewa. Otú ọ dị, telomere adịghị asụlata ma e nwee otu mmiri ọgwụ mkpụrụ ndụ. N’ihi ya, dị ka nchepụta ahụ si kwuo, nke a pụrụ ime ka mkpụrụ ndụ nwee ike ịnọgide na-ekewa n’akwụsịghị akwụsị. Otu onyeisi ụlọ ọrụ so na-eme nchọpụta a kwuru, sị: “Nke a bụ mbụ anyị na-eche banyere anwụghị anwụ nke mmadụ.” Ma ọ bụghị ndị ọkà mmụta sayensị nile kwere.

Otú Ọnwụ Si Malite

N’ezie, ndị nwere okwukwe na Bible ekwenyewo ruo ọtụtụ narị afọ iri na mmadụ pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi. Ntụkwasị obi ha abụghị n’ebe ndị mmadụ bụ́ ndị ọkà mmụta sayensị nọ kama n’Ọkà Mmụta Sayensị Ukwu ahụ, bụ́ onye kere ihe nile dị ndụ, Jehova Chineke.—Abụ Ọma 104:24, 25.

Bible na-egosi na ọnwụ mmadụ esoghị ná nzube Onye Okike. E kere di na nwunye mbụ n’onyinyo Chineke ma tinye ha n’ogige paradaịs. Ha zuru okè, n’enweghị ntụpọ nke uche ma ọ bụ nke anụ ahụ. N’ihi ya, ha nwere atụmanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala. Nke ahụ bụ ọchịchọ Chineke maka ha. O nyere ha ntụziaka ịmụ ụmụ na iji nwayọọ nwayọọ gbasaruo Paradaịs n’elu ala dum.—Jenesis 1:27, 28; 2:8, 9, 15.

Dị ka e gosipụtara na Jenesis isi 3, Adam ma ụma nupụrụ Chineke isi, ọ bụ ezie na ọ maara na ntaramahụhụ ọ ga-enweta bụ ọnwụ. Ọzọkwa, site n’ịgbaso ụzọ nke nnupụisi, o wetaara ụmụ ya a na-amụbeghị amụ mmehie na ọnwụ. Pọl  onyeozi kọwara ya otú a, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, n’ihi na Adam mehiere, ahụ ya ezukwaghị okè. O ji nwayọọ nwayọọ kaa nká ma nwụọ. Ụmụ ya ketakwara ntụpọ ahụ.

Ya mere ọnwụ mmadụ malitere n’ihi nnupụisi Adam na ikpe Chineke sochiri ya. Ndị mmadụ agaghị enwe ihe ịga nke ọma n’imegharị ikpe ahụ. Ọ bụ ezie na sayensị enwewo ọtụtụ ọganihu n’ịgwọ ọrịa, ihe Mosis kwuru site n’ike mmụọ nsọ, bụ́ nke e dekọrọ n’afọ 3,500 gara aga ka bụ eziokwu: “Ụbọchị afọ nile anyị dị [iri afọ asaa]; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo [iri afọ asatọ], otú ọ dị, nganga ha bụ nanị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na ajọ ihe; n’ihi na ọ gbapụwo ọsọ ọsọ, anyị wee felaa dị ka nnụnụ.”—Abụ Ọma 90:10.

Ndokwa Jehova Maka Ndụ Ebighị Ebi

Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na e nwere olileanya! Ọ bụ ezie na ka ọ dị ugbu a mmadụ nile na-emesị nwụọ, ọ bụghị nzube Jehova ka ọnọdụ a dịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ezie na Adam na Iv kwesịrị ịnwụ anwụ, Chineke maara na a ga-enwe ọtụtụ n’ime ụmụ ha a na-amụbeghị amụ ga-eji obi ekele nabata nlekọta ịhụnanya ya. Maka ndị dị otú ahụ, o mere ndokwa maka ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ma olee otú a ga-esi mezuo nke a?

Nke a agaghị eme site na mmadụ ịmata ihe omimi nke DNA. Kama nke ahụ, ndụ ebighị ebi bụ onyinye Jehova ga-enye ndị nwere okwukwe na ya. Ebe ọ matara na nnapụta dị ụmụ Adam na Iv mkpa, o wetara ihe ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi—àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. Jisọs zoro aka ná ndokwa a mgbe o kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Dị ka Adam, Jịsọs bụ mmadụ zuru okè. N’adịghị ka Adam, Jisọs rubeere Chineke isi n’ihe nile. Jisọs si otú a nwee ike ịchụ ndụ mmadụ ya zuru okè n’àjà iji kwụọ ụgwọ mmehie Adam. Site n’omume ịhụnanya a, bụ́ nke mezuru ikpe ziri ezi, ụmụ Adam ga-enwe ike ịbụ ndị a tọhapụrụ n’amamikpe ọnwụ. N’ihi ya, ndị nile nwere okwukwe na Jisọs ga-enweta onyinye Chineke bụ́ ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 5:18, 19; 1 Timoti 2:5, 6.

Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ nwere ike imeri ezughị okè ma wetara onwe ha ndụ ebighị ebi, a garaghị enwe mkpa nke ihe mgbapụta. Bible na-enye ndụmọdụ a amamihe dị na ya, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi. Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ Onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya: Onye meworo eluigwe na ụwa, na oké osimiri, na ihe nile nke dị n’ime ha; Onye na-edebe eziokwu ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 146:3-6.

Ndụ ebighị ga-abịa, ọ bụghị site ná nchọpụta sayensị, kama site n’aka Jehova. Ihe ọ bụla Chineke chọrọ ime, ọ pụrụ ime ya, ọ ga-emezukwa ya. “Ọ dịghị okwu ọ bụla si Chineke n’ọnụ pụta nke na-agaghị adị irè.”—Luk 1:37.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 22]

© Charles Orrico/SuperStock, Inc.