Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime Ka Osisi Dịkwuo n’Oké Ọhịa Amazon

Ime Ka Osisi Dịkwuo n’Oké Ọhịa Amazon

 Ime Ka Osisi Dịkwuo n’Oké Ọhịa Amazon

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA BRAZIL

N’AFỌ ndị 1990, a na-ebibi ọtụtụ nde hekta nke ọhịa tooro onwe ha n’ụwa kwa afọ, ka Òtù Nri na Ọrụ Ugbo nke Mba Ndị Dị n’Otu kọrọ. Nanị n’ógbè Amazon dị na Brazil, mgbutu osisi na ịgba ha ọkụ emeworị ka otu nnukwu mpaghara ọhịa nnukwu mmiri ozuzo nke ka Germany ibu ghọọ nanị ala ahịhịa. Kama ịbụ ọhịa osisi jupụtara na ya, ihe a na-ahụzi bụ obosara ala kpọrọ nkụ nke ahịhịa na mkpọrọgwụ osisi ndị anyanwụ na-achakpọ dịgasị n’ime ya.

Ọ bụ ezie na mbibi a na-aga n’ihu a na-ebibi ọhịa dị egwu, e nwetụrụ olileanya. E nweworị ihe ụfọdụ si n’otu ihe omume na-enye nchekwube pụta. A na-akpọ ya agroforestry, otu akwụkwọ kọwakwara ya dị ka “usoro a na-ejikọ ịdọ osisi na ịkụ ihe ọkụkụ ma ọ bụ ahịhịa n’esepụghị aka na ya, n’ụzọ . . . na-ejikọta ha na gburugburu ha.” Olee otú agroforestry si arụ ọrụ? Gịnị ka ọ rụzuworo? Atụmanya dị aṅaa ka ọ na-enye maka ọdịnihu? Iji chọpụta, Teta! jere leta Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Nchọpụta n’Amazon (INPA) dị na Manaus, bụ́ isi obodo Amazonas State nke Brazil.

Mgbapụ Na-eweta Ndakpọ Olileanya

Johannes van Leeuwen, onye Holland bụ́ ọkà n’ọrụ ugbo ná Ngalaba Nkà Mmụta Ọrụ Ugbo n’INPA, esoworo ndị ọrụ ugbo nọ n’Amazon na-arụ ọrụ eri afọ 11 gara aga. Ma oleedị otú ọtụtụ ndị ọrụ ugbo si bịazie biri n’oké ọhịa Amazon? Iji ígwè ọrụ akọ ugbo n’ụzọ dị ukwuu n’ebe etiti na n’ebe ndịda Brazil malitere ime ka ndị na-arụ ntakịrị ọrụ ugbo ghara inwekwa ala na ihe ha ji ebi ndụ, na-eme ka ha kwapụ. Ndị ọrụ ugbo ndị ọzọ, bụ́ ndị na-adọ osisi jute, bụ́ nke e ji eme akpa ajị̀, adịkwaghị enweta ihe ha ji ebi ndụ ka akpa wọtapruf bịara nọchie akpa ajị̀. A manyekwara ndị ọzọ bi n’ebe ndị ụkọ mmiri  ozuzo kpara aka ọjọọ ịkwapụ iji chọta ala na-eme nri karị. Ma olee ebe ha pụrụ ịga? Mgbe ha nụrụ banyere atụmanya nke inweta ala, ụlọ, na ala na-eme nri n’Amazon, ha sooro ụzọ ọhụrụ na-eduga n’ọhịa nnukwu mmiri ozuzo ahụ.

Otú ọ dị, ndị ọrụ ugbo ahụ chọpụtara n’oge na-adịghị anya na ha akwabatawo n’ebe mmiri na-ezosi ike, nke dị udè nke ukwuu, nke okpomọkụ dị, na nke ala ya na-adịghị eme nri. N’ime afọ abụọ ruo afọ anọ, ike agwụla ala ahụ kpam kpam, otu nsogbu ahụ amalitekwa: ndị ogbenye bi n’ala na-adịghị eme nri. Ndị ọrụ ugbo ahụ na-enweghị olileanya mere ihe maka nsogbu ahụ site n’ịsụchakwu ebe ndị ọzọ n’oké ọhịa ahụ maka ịkọ ha ugbo.

N’eziokwu, ọ bụghị ndị na-arụ ntakịrị ọrụ ugbo kasị akpata mbibi a na-ebibi oké ọhịa Amazon. Ebe ndị buru ibu a na-akpa ehi, ọrụ ugbo buru ibu e ji eme azụmahịa, ọrụ igwupụta ihe n’ala na ịwa osisi, na ịrụ ebe ndị e ji mmiri enye ọkụ eletrik akpatawo mbibi kasị ukwuu. Otú o sina dị, nnubata nke ndị na-arụ ntakịrị ọrụ ugbo nakwa ụdị ọrụ ugbo nke ịsụ na ịgba ọhịa ọkụ ha na-arụ esowo na-ebibi oké ọhịa.

Ịkpọtụrụ “Ọbá Akwụkwọ Ndị Dị Ndụ”

“N’agbanyeghị ókè ihe ha na-eme oké ọhịa ahụ hà,” ka Van Leeuwen na-ekwu, “ndị ọrụ ugbo a ọ na-enweghị ka ọ hà ha anọrọla ebe a, ọ  dịghịkwa ebe ọzọ ha ma ha ga-aga. Ya mere, iji belata igbukpọsị oké ọhịa, anyị aghaghị inyere ha aka inweta ihe nkwado n’ala ha n’enweghị ihe mere ha ga-eji sụkwuo ọhịa.” Ọ bụkwa nke a ka ihe omume agroforestry chọrọ ịrụzu, na-akụzi ụdị ọrụ ugbo na-egbochi ibibi ala ma mee ka ndị ọrụ ugbo jiri otu ibé ala ahụ ha gbukpọsịworo osisi ndị dị na ya mee ihe ruo ọtụtụ afọ. Olee otú ndị nchọpụta si nweta ụmụ irighiri ihe ndị dị mkpa n’ihe omume ahụ?

E bu ụzọ mee nnyocha, jiri fọm ajụjụ mee ihe, wetakwa ihe ụfọdụ n’ọhịa ruo ọtụtụ afọ tupu a malite ihe omume agroforestry nke ụlọ ọrụ INPA. E nwetara ihe ọmụma karịsịa site n’ajụjụ ọnụ a gbara “ọbá akwụkwọ ndị dị ndụ”—ndị American Indian, ụmụ amaala Brazil, ndị na-abụchaghị ndị ọcha, ndị isi ojii, na ndị nna nna ha si India bịa biri n’akụkụ osimiri Amazon.

Ndị a bi n’Amazon nwere ihe ọmụma dị ukwuu. Ha maara ihu igwe na ụdị ala dị n’ebe ahụ—ájá ojii, ụrọ uhie, ụrọ ọcha, ájá ọcha, na ájá na ụrọ gwara ọgwa—nke ọma nakwa ọtụtụ mkpụrụ osisi a na-enweta ebe ahụ, ụdà, na ahịhịa ndị e ji agwọ ọrịa a na-enweta n’ọhịa ahụ. Site n’inweta ihe ọmụma a, ndị ọkà ọrụ ugbo na ndị ọrụ ugbo ghọrọ ndị na-emekọ nchọpụta ọnụ—njikọ aka mere ka ọdịdị ihe omume ahụ dịwanye mma.

Ọhịa ahụ Abụghị Ebe A Na-egwupụta Ihe n’Ala

E ji nwayọọ nwayọọ jiri ihe omume agroforestry ahụ mee ihe. Ihe mbụ e mere bụ ime ka ndị ọrụ ugbo ghara ile ọhịa ahụ anya dị ka ebe a na-egwupụta ihe n’ala—ebe a ga-arụ ọrụ ma gbahapụ—kama ka ha na-ele ya anya dị ka ihe pụrụ ịdịghachi mma. Ọzọ, a dụrụ ha ọdụ ka ha na-akụ ọ bụghị nanị akpụ, unere, ọka, osikapa, àgwà, na ihe ọkụkụ ndị ọzọ na-eto ngwa ngwa kamakwa osisi. Ị̀ sịrị “osisi?” ka ndị ọrụ ugbo ahụ jụrụ. “N’ihi gịnị?”

Ebe ọ bụ na ndị ọrụ ugbo na-esikarị n’ebe ndị osisi na-adịghị aba uru n’ọrụ ugbo abịa, ebe ọ bụkwa na ha amaghị ụdị osisi ndị dị n’Amazon, ndị nnyocha mere ka abamuru nke ịdọ osisi doo anya. Ha kọwara na ájá dị n’ọhịa enweghị ihe ndị na-azụ ala dị ihe ọkụkụ ndị a na-eri eri mkpa. Dị ka ihe atụ, mmiri na-ekpochapụ ihe ndị na-azụ ala tupu ihe ọkụkụ dị ka ọka enwee ike ịmịrị ha. N’ụzọ dị iche, osisi na-ejisi ike amịrị ma na-amịkọba ihe ndị na-azụ ala, na-emekwa ka ala nọgide na-enwe ikike ime nri. Ọzọkwa, osisi na-eme ka ụmụ anụmanụ nwee nri na ndo. Ndị ọrụ ugbo pụkwara iji osisi mere ihe ndị dị ndụ e ji gbaa ogige iji gosi ókèala nke ihe onwunwe ha. N’ezie, osisi ndị na-amị mkpụrụ pụkwara ịbụ ebe e si enweta mkpụrụ osisi ndị na-enye ego na osisi.

A gbakwara ndị ọrụ ugbo ahụ ume ịdọ ọtụtụ ụdị osisi dị iche iche. N’ihi gịnị? Ka e wee nwee ike inweta ụdị mkpụrụ osisi na osisi dị iche iche. Onye ọrụ ugbo ga-esi otú a zere imesị nweta nanị nnukwu otu ụdị mkpụrụ osisi ma ọ bụ abụọ n’ugbo bụ́ ndị ọ na-aghaghị ire n’ọnụ ego dị ala n’ihi na mmadụ nile na-ere otu ihe ubi ahụ n’otu oge.

Ihe Omume Ọhụrụ Arụpụtawa Ezigbo Ihe

Ụdị osisi ndị dị aṅaa ka a na-adọ? “Ka ọ dị ugbu a, anyị na-eji site n’agbata osisi 30 na 40 na-amị mkpụrụ bụ́ ndị a kpọtụrụ aha ebe a eme ihe,” ka ọkà n’ọrụ ugbo bụ́ Van Leeuwen na-ekwu ka ọ na-enyefe ndepụta osisi 65 bụ́ ndị nwere aha pụrụ nnọọ iche. Iji gosi na ihe omume ahụ dị irè, Van Leeuwen chịpụtara foto dị iche iche nke otu ibé ala a sụchara asụcha bụ́ ndị e sere n’oge dịgasị iche.—Lee igbe bụ́ “Ụzọ Ọhịa Pụrụ Isi Dịghachi Mma.”

Nleta e mere n’ahịa ndị a na-ere ihe oriri na ha na Manaus na-egosi na ihe omume agroforestry bụ́ nke a malitere ọhụrụ na-arụpụta ezigbo ihe. Ihe karịrị ụdị dị iche iche nke mkpụrụ osisi 60 a na-amepụta n’ebe ahụ agbaworị n’ahịa ndị a. N’ihe banyere ọdịnihu, ndị ọkà n’ọrụ ugbo nwere olileanya na ka ihe omume agroforestry na-enwetakwu ọnọdụ, otú ahụ ka igbukpọsị oké ọhịa ga na-ebelata. E kwuwerị, mgbe onye ọrụ ugbo mụtaworo otú e si ejighachi ala ọ na-akọbu nri eme ihe, o nwere ike ghara ịsụcha ọhịa iji nweta ugbo ọhụrụ.

O yiri ka mgbalị ndị a kwesịrị ịja mma agaghị akwụsị egwu a na-eyi njikọ nke ihe ndị dị ndụ n’ụwa na gburugburu ha. Ma ha na-egosi ihe a pụrụ ime mgbe e ji nkwanye ùgwù were ihe onwunwe anyị dị oké ọnụ ahịa na-eme ihe.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]

Oroma na Acerola Enye Ohere

Oroma, ihe ahụ a ma ama na-enye vitamin C, enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere mkpụrụ osisi a na-eto dị ka “eze nwanyị ọhụrụ na-enye vitamin C.” Ọbụna acerola, bụ́ eze mkpụrụ osisi ndị jupụtara na vitamin C, aghaghị ikweta na e meriwo ya. Olee nke bụ́ eze ọhụrụ ahụ? Ọ bụ otu obere mkpụrụ osisi siri ike, na-acha odo odo bụ́ nke fọrọ nke nta ka o buruo ibu ka grape, ọ na-etokwa n’akụkụ osimiri Amazon. Gịnị bụ aha ya? Camu-camu. Ocheeze ahụ ò kwesịrị ya? Otu magazin Brazil na-ekwu na oroma dị 100 gram na-enwe miligram 41 nke vitamin C, ebe acerola dị 100 gram na-enwe miligram 1,790 nke vitamin C. Ma, camu-camu hakwa otú ahụ na-enwe nnọọ miligram 2,880 nke vitamin C—o ji okpukpu 70 karịa nke oroma!

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mkpụrụ osisi acerola na camu-camu: Silvestre Silva/Reflexo

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 27]

Nkà nke Ịdọ Osisi n’Usoro

Mgbe ndị ọrụ ugbo kwetasịrị ịnakwere akụkụ ụfọdụ nke ihe omume agroforestry ahụ, ọkà n’ọrụ ugbo bụ́ Johannes van Leeuwen pụrụ inyefe ha atụmatụ sara mbara karị—otú ugbo osisi ha ga-enwe n’ọdịnihu ga-adị. Kama ịhọrọ ma na-adọkọta nnọọ osisi ọ bụla ọnụ aghara aghara, a na-eji usoro iji kọmputa anwale njikọ ihe ọkụkụ na gburugburu ya eme ihe iji nye aka mata ụdị ndị e kwesịrị ịdọ na otú e kwesịrị isi hazie ha. E nwere nkà nke ịdọ ụdị osisi nta, ndị na-ebuchaghị ibu, na osisi ndị buru ibu n’ìgwè na n’usoro.

Dị ka ihe atụ, a na-adọkọta ìgwè nke mbụ, bụ́ nke ihe mejupụtara ya bụ gova, osisi guarana, na cupuaçu n’otu ebe. Osisi ndị a na-anọ nwa oge ma malite ịmị mkpụrụ. Ìgwè nke abụọ, bụ́ ndị nke na-ebuchaghị ibu dị ka biribá, ube Bekee, na murumuru, ga-achọ ebe sara mbara karị. N’ozuzu ya, osisi ndị dị n’ìgwè nke mbụ na-ebu ndị dị na nke a ụzọ amị mkpụrụ. Ìgwè nke atọ, bụ́ nke nwere osisi ukwu ndị dị ka Brazil nut, piquia, na mahogany, chọrọ ọbụna ebe sara mbara karị. Osisi ụfọdụ dị n’ìgwè nke ikpeazụ a na-amị mkpụrụ, ndị ọzọ na-emepụta osisi ndị bara uru, ebe a na-enweta ha abụọ ná ndị nke ọzọkwa. Mgbe ìgwè osisi atọ nile a tolitere n’otu ebe, ugbo ahụ na-adị ka ọhịa tooro onwe ya.

[Foto]

Johannes van Leeuwen (n’isi isi aka nri)

Otu ahịa dị na Manaus bụ́ ebe a na-ere mkpụrụ osisi a na-akọpụta n’ebe ahụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

J. van Leeuwen, INPA, Manaus, Brazil

 [Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 28]

Otú Ọhịa ahụ Pụrụ Isi Dịghachi Mma

1. February 1993—A sụchara mpaghara ọhịa a dị n’ebe etiti Amazon ma gbaa ya ọkụ na September 1992. Na January 1993, a kụrụ ya akwụoro. Ka otu ọnwa gasịrị, a kụkwara ya osisi ndị na-amị mkpụrụ.

2. March 1994—Akwụoro ndị ahụ etowo, osisi ndị ahụ na-amị mkpụrụ etolitewakwala. Obere ihe ndị a mapawara n’osisi bụ́ ndị a rụnyere n’akụkụ osisi ndị ahụ na-egosi na ha bụ abiu, Brazil nut, na osisi peach palm, n’ịkpọtụ ole na ole aha. Ahịhịa ndị ọrụ ugbo ahụ bọchara gburugburu ihe ọkụkụ ndị ahụ bakwaara osisi ndị ahụ uru. Dị ka a ga-asị na ọ bụ iji gosipụta ekele, osisi ndị ahụ amalitewo ime ka ala ahụ mewe nri ọzọ.

3. April 1995—E werewo ihe ubi nke ihe ọkụkụ ndị ahụ na-eto ngwa ngwa, e riwokwa ha ma ọ bụ ree ha eree, ụdị dị iche iche nke osisi ndị na-amị mkpụrụ ka na-etokwa.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto 1-3: J. van Leeuwen, INPA-CPCA, Manaus, Brazil