Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

 Ikiri Ụwa

Ọnụma Ule Ịkwọ Ụgbọala Na-akpata

“Mwakpo a na-awakpo ndị France 500 bụ́ ‘ndị na-eduzi’ ule ịkwọ ụgbọala na mkparị a na-akparị ha amụbawo ruo pasent 150 kemgbe 1994,” ka akwụkwọ akụkọ Paris bụ́ International Herald Tribune na-akọ. Ihe na-erughị pasent 60 nke ndị nile debara aha ha maka ule ịkwọ ụgbọala na-agafe ule ahụ na-ewe minit 20, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ndị nile na-agabeghị ọzụzụ na-efu oké ego nke ịkwọ ụgbọala na-ada ule ahụ. Ndị daranụ na-egosiwanye ọnụma ha n’ahụ ndị na-eduzi ule, bụ́ ndị a kụworo ọkpọ ma dọrọ ha ná ntutu dọpụta n’ụgbọala. Dị ka otu onye na-eduzi ule kwuru, ọbụna otu nwoke bụ́ onye ji ihe a na-etinye ntụtụ bụ́ nke a mịnyere ọbara ọrịa AIDS dị na ya, chụrụ ya ọsọ. Ná nso nso a, otu nwoke dị afọ 23 bụ́ onye dara ule e lere ya gbara onye na-eduzi ule égbè a fanyejuru mgbọ rọba. Iji gbochie ụdị ime ihe ike ndị ahụ nile, ndị na-eduzi ule na-atụ aro ka a na-agwa ndị na-akwọ ụgbọala ihe ha metara n’ule ha site n’idere ha akwụkwọ ozi kama ịgwa ha ya ihu na ihu.

Ụmụ Akwụkwọ Na-enwe Nchekasị

Oge ule ngwụsị afọ nke ụlọ akwụkwọ na-akpatara ọtụtụ ụmụaka nọ n’India nchekasị dị ukwuu, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Asian Age nke Mumbai na-akọ. Iburu ihe n’isi nwa obere oge tupu ule nakwa nrụgide inweta akara ule dị mma karịrị ihe ụfọdụ ga-emeli, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-ejekwuru ndị na-agwọ isi mgbaka na-amụbakwa okpukpu abụọ n’oge ule. Ụfọdụ ndị nne na nna, n’ịchọ nnọọ ka ụmụ ha mee nke ọma n’ule, na-amachibido ụdị ntụrụndụ nile. “Ndị nne na nna na-arụgide ụmụ ha n’ụzọ dị ukwuu. A na-esokwa ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ ama aka,” ka onye na-agwọ isi mgbaka bụ́ V. K. Mundra na-ekwu. Ọ gbakwụnyere na ọtụtụ ndị nne na nna “aghọtaghị na inyere nwata aka imesara ahụ ga-eme ka uche ya dịghachi nkọ, nyekwara ya aka ịmụ ihe nke ọma karị.” Dr. Harish Shetty kwuru na nchekasị ule na-akpata “emetụtawala ọbụna ụmụ akwụkwọ nọ na klas nke mbụ ruo na nke asaa.”

Ezì Abaa n’Ime Obodo

Ezì ọhịa, ndị na-anọpụkarị iche n’ime ọhịa, achọpụtawo na obodo ukwu na-enye ha ọ bụghị nanị nri bara ụba kamakwa nchebe pụọ n’aka ndị dinta, ka akwụkwọ akụkọ Germany a na-ebipụta kwa izu bụ́ Die Woche na-akọ. Nne ezì ọhịa ọbụna amụwo nwa n’obodo ukwu bụ́ Berlin. Anụmanụ ndị ahụ agụụ na-agụ adịghị agagharị nanị n’ebe e nwere ọhịa ma ọ bụ n’ogige ntụrụndụ ọha. Ha na-ebibisịkwa ubi ndị mmadụ, na-ata mkpọrọgwụ okooko osisi. Ezì ndị ahụ, bụ́ ndị pụrụ ịdị ihe ruru kilogram 350 n’arọ, emenyewo ọtụtụ ndị amaala ụjọ, bụ́ ndị n’ọnọdụ ụfọdụ rịworo elu osisi ma ọ bụ gbaba n’ụlọ telifon maka nchebe. Anụmanụ ndị ahụ akpatawo ọtụtụ ihe ọghọm okporo ụzọ. Mgbe ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ si ọrụ lọta, ha ezutewo ndị mwakpo a ajị siri ike juru ahụ. Otu onye jụrụ, sị: “Olee otú m ga-esi nwee ike ịbanye n’ụlọ mgbe e nwere ezì ọhịa 20 guzo n’agbata ụgbọala m na ihu ụlọ m?”

Alụmdi na Nwunye Ndị Nọ n’Afọ Iri na Ụma

N’India ihe ha ka pasent 36 nke ndị nọ n’oge uto ha bụ́ ndị lụworo di na nwunye nọgasị n’agbata afọ 13 na 16, dị ka otu nnyocha Ahụ Ike Ezinụlọ nke Mba e mere na nso nso a na-egosi. Nnyocha ahụ chọpụtakwara na pasent 64 nke ụmụ agbọghọ nọ n’agbata afọ 17 na 19 amụworị nwa ma ọ bụ dị ime, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Asian Age nke Mumbai na-akọ. Akụkọ ahụ na-ekwu na ndị nne na-eto eto bụ́ ndị dị afọ 15 ruo 19 ji okpukpu abụọ yie ka ha ga-anwụ n’ihi ihe ndị afọ ime na-akpata karịa ndị dị afọ 20 ruo 24. Ọzọkwa, ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ n’etiti ndị ntorobịa dị afọ 15 ruo 24 amụbawo okpukpu abụọ n’afọ ole na ole ndị gaworo aga. Ndị ọkachamara na-ekwu na ihe na-akpata nsogbu a nke na-akawanye njọ bụ amaghị nke a na-akọ nakwa ihe ọmụma na-eduhie eduhie a na-enweta site n’aka ndị ọgbọ na usoro mgbasa ozi banyere mmekọahụ.

Mmetọ Akpata Ihe Otiti nke Ahụhụ Nta

N’ụzọ doro anya, mmetọ a na-emetọ mmiri so na-akpata nsogbu nke ahụhụ ndị na-ata ata na nso Osimiri Chili, bụ́ nke na-asọrọ gabiga Arequipa, otu n’ime obodo ndị kasị ukwuu na Peru. Ndị bi n’ebe ahụ agbachaala ọgwụ ahụhụ ha nwere n’ihi mwakpo nke ahụhụ nta ndị na-ata ata. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ El Comercio nke Lima si kwuo, e kwetara na ihe kpatara ihe otiti ahụ bụ mmetọ e ji ọgwụ metọọ Osimiri Chili. O yiri ka nsí ebibiela ọtụtụ n’ime awọ ndị dị n’osimiri ahụ, bụ́ ndị “bụ ihe ndị dị ndụ e ji na-achịkwa ahụhụ ndị a ruo ọtụtụ afọ,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.