Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ngwọta Ya n’Ikpeazụ!

Ihe Ngwọta Ya n’Ikpeazụ!

 Ihe Ngwọta Ya n’Ikpeazụ!

CHEEDỊ banyere ụwa ebe a chọrọ ụmụaka nile n’ezie, ebe a hụrụ ha n’anya n’ezie, ebe e ji nne na nna na-ahụ n’anya gọzie ha, bụ́ ndị nwere ezi ọchịchọ inye nwa ha nduzi kasị mma ha pụrụ inye. Cheedị banyere ụwa ebe nwatakịrị ọ bụla nwere ma ahụ ike ma ọgụgụ isi, ebe a na-enwekwaghị ụmụaka na-ehi n’okporo ámá, nakwa ebe a na-enwekwaghị ụmụaka bụ́ ndị mkpa ego mere ka ha na-arụ ọrụ bibiri oge ịbụ nwata ha!

Ọ̀ bụ ihe a na-achọsi ike? Eenụ. Ọ̀ ga-eme eme? Ndịàmà Jehova chere otú ahụ, nke a bụkwa n’ihi ihe abụọ.

Ndị Mụrụ Ụmụ Pụrụ Inye Otu n’Ime Ihe Ngwọta Ya

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekweta na ndị toworo eto nwere ike nke ịgwọta—mgbe ụfọdụ ọbụna igbochi—ụfọdụ n’ime nsogbu ụmụaka. Otú ọ dị, a ga-eme nke a ma ọ bụrụhaala  na ha, ndị toworo eto, dị njikere ime otú ahụ. Ee, ndị nne na nna n’onwe ha nwere otu n’ime ihe ngwọta nke nsogbu ahụ.

Dị ka ihe atụ, ndị toworo eto bụ́ ndị nwere ike ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́ ka “nwunye ghara ikewapụ onwe ya n’ahụ di ya . . . ka di gharakwa ịhapụ nwunye ya” enweghị ụmụaka na-ahụju anya n’ihi ibi n’ụlọ nkewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm tịsasịrị.—1 Ndị Kọrint 7:10, 11.

Ndị toworo eto bụ́ ndị dị njikere ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́ “na-ejegharị dị ka o kwesịrị anyị . . . ọ bụghị n’ite egwú na ịṅụbiga mmanya ókè,” enweghị ụmụaka na-ahụju anya n’ihi inwe nne na nna na-aṅubiga mmanya ókè ma ọ bu ndị nke ọgwụ ọjọọ riri ahụ.—Ndị Rom 13:13; Ndị Efesọs 5:8.

Ndị toworo eto bụ́ ndị dị njikere ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́ “ghara ịkwa iko” na-enye aka ebelata ohere ụmụ ha nwere itolite ghọọ ndị a na-achọghị, ma eleghị anya n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3; Matiu 19:9.

Ndị toworo eto bụ́ ndị dị njikere ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible, bụ́ “akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha,” nakwa ndị “na-ahụ ụmụ ha n’anya” agaghị enwe ụmụ nwere ihe mgbu anụ ahụ ma ọ bụ nke uche nke ụdị mmetọ ọ bụla na-akpata.—Ndị Kọlọsi 3:21; Taịtọs 2:4.

Ná nchịkọta, ọ bụrụ na ndị nile toworo eto dị njikere ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible Jisọs nyere, bụ́, “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu,” à ga-enwe ọtụtụ nde ụmụntakịrị a na-achọghị, a na-ahụghịkwa n’anya?—Matiu 7:12.

Ọ bụ ihe obi ụtọ na e nwere ọtụtụ ndị toworo eto dị njikere ime ihe nile ahụ dị n’elu. Ma, ọ dị mwute ikwu na ọ bụghị mmadụ nile dị njikere, ọ bụkwa n’ebe a ka nsogbu dị. Ọbụna ndị dị njikere na-achọpụtakwa na ezughị okè mmadụ na ihe ndị ha na-apụghị ịchịkwa na-emebikarị mgbalị ha. Ụmụ mmadụ pụrụ inye ụfọdụ n’ime ihe ngwọta nke nsogbu ụmụaka, ma o doro anya na ha apụghị inye ihe ngwọta zuru ezu.

Ọchịchị Chineke Ga-enye Ihe Ngwọta Zuru Ezu

Onye edemede bụ́ John Ruskin, a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, kwenyesiri ike na “ọrụ mbụ Ọchịchị kwesịrị ịrụ bụ ịhụ na e nyere nwatakịrị ọ bụla a mụrụ n’ókèala ya ebe obibi, uwe, ihe oriri dị mma, nakwa na a kụziiri ya ihe ruo mgbe o toruru ịma ihe.” Otú ọ dị, Ruskin kwetara na “iji [mezuo] nke a Gọọmenti aghaghị inwe ikike n’ebe ndị mmadụ nọ, bụ́ nke anyị na-apụghị ịtụ anya ya ugbu a.”

Ọ bụ nanị ọchịchị Chineke kwadoro pụrụ inwe ikike ahụ dị nro bụ́ nke Ruskin kwuru banyere ya. E kwewokwa ọchịchị dị otú ahụ ná nkwa n’ezie—nke Jisọs kwuru banyere ya na Matiu 6:9, 10. Ozugbo ọchịchị a nke Chineke malitere ịchịkwa ihe ndị a na-eme n’ụwa, ọ ga-enwe ike n’ahụ ndị nile—na-enye ndị nile ọ na-achị, gụnyere ụmụaka ebe obibi, uwe, ihe oriri, na ọzụzụ. (Aịsaịa 65:17-25) Ma ọchịchị a zuru okè ga-eme ọbụna karịa nke a.

Alaeze Chineke ga-enyeghachi ụmụ mmadụ ọnọdụ izu okè, na-eme ka ha nwee ike ijiri nguzozi zuru okè na-azụ ụmụaka. (Job 33:24-26) A ga-azụ ụmụaka ná mmụọ nke udo na òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ, bụ́ ụkpụrụ a kọwapụtara ná Nkwupụta Òtù UN nke Ihe Ndị Ruuru Nwatakịrị. (Abụ Ọma 46:8, 9) Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ a ga-enwe mkpa nke Afọ Nwatakịrị Maka Mba Nile ma ọ bụ nke Nkwekọrịta Maka Ihe Ndị Ruuru Nwatakịrị.

Inyeghachi ndị mụrụ ụmụ na ụmụaka nwere nkwarụ ahụ ike zuru okè ga-abụrụ Jisọs Kraịst, bụ́ Eze ọchịchị eluigwe a, obere ọrụ. Ọrịa ndị ọ gwọrọ n’ụzọ ọrụ ebube mgbe ọ nọ n’ụwa bụ ihe àmà. (Luk 6:17-19; Jọn 5:3-9; 9:1-7) Ọbụna ịkpọlite ụmụaka na ndị nne na nna nwụrụ anwụ n’ọnwụ agaghị abụ ihe ọ na-agaghị emeli!—Matiu 9:18-25.

Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịmata na oge Chineke ga-eme ihe maka ụmụaka nọ n’ụwa dị nso!

 [Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 12]

Ihe Enyemaka Maka Ndị Na-eto Eto

Ndịàmà Jehova nwere mmasị dị ukwuu ma n’inyere ndị na-eto eto aka izere nsogbu dị iche iche ma n’igosi ha ụzọ kasị mma isi nagide nsogbu ndị a na-apụghị izere ezere. N’ihi ya, kemgbe ọtụtụ afọ ha ebipụtawo ọtụtụ ihe enyemaka e mere iji gboo mkpa ndị na-eto eto—malite n’ụmụaka na-etorubeghị ịga akwụkwọ ruo ná ndị nọ n’afọ iri na ụma. Mbipụta ndị a gụnyere akwụkwọ bụ́ Akwukwọm nke Akukọ Bible na Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè nakwa vidio a kpọrọ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? Ị pụrụ inweta ha n’aka Ndịàmà Jehova bi n’ógbè unu ma ọ bụ site n’idetara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.

N’ihe banyere ụmụ ha, Ndịàmà Jehova na-egosi ha na a chọrọ ha ma hụ ha n’anya site n’isoro ha na-ekwurịta banyere nsogbu ha mgbe nile. Ndị mụrụ ụmụ na-ejikarị ihe ọmụma mara mma dị n’ihe ndị a na-enye aka ịmụ ihe a kpọtụrụ aha n’elu eme ihe dị ka ihe ndabere maka usoro ọzụzụ na-aga n’ihu a na-enye ndị ntorobịa mgbe nile. Ikekwe ọ pụrụ ịmasị gị ịgbaso usoro yiri ya maka ụmụ gị.