Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Papa M Ji Hapụ Anyị?

Gịnị Mere Papa M Ji Hapụ Anyị?

 Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Mere Papa M Ji Hapụ Anyị?

“Ọ dịghị mgbe m ghọtara ihe mere nna m ji pụọ. Nanị ihe m maara bụ ihe nne m gwara m.”—James. *

MGBE nna kwakọọrọ ihe ya wee hapụ ụlọ, ihe ọ na-ahapụkarị ka ọ dịgide bụ oké mwute na iwe. “Iwe were m nke ukwuu mgbe mama m na papa m gbasara,” ka James dị afọ 14, bụ́ onye e hotara n’elu, na-ekwu. Ọ bụrụkwa na nna apụọ n’akọwaghị ihe ọ bụla kpatara ya ma gharakwa ịdị na-ezite ozi, ụmụ ya pụrụ ịgbaso mmetụta nke obi amamikpe, nke ndị a jụrụ ajụ na nke iwe mgba ruo ọtụtụ afọ n’ihu. *

Ọ bụrụ na nna gị apụwo, ị pụrụ ịma ihe kpatara ya n’agbanyeghị na ọ na-ewute gị. “Nna m pụrụ gakwuru nwanyị ọzọ,” ka onye ntorobịa aha ya bụ Michael na-ekwu. “Ọ dị mgbe m hụrụ ya na ya, o wekwara m iwe nke ukwuu. Obi m bụ na papa m emejọwo anyị.” Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ịpụ otú ahụ nwere ike iweta obi iru ala. Melissa, bụ́ onye papa ya bụ onye aṅụrụma, na-asị: “A sị na ọ nọgidere n’ụlọ anyị, ihe gaara esiri anyị ike karị.”

Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe ụmụaka adịghị ama ma ọlị ihe mere papa ha ji pụọ, nke a pụkwara ime ka ọnụnọ ọ na-anọghị ya yie ihe mwute ọbụna karị. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ị maara na nne na nna gị na-enwe nsogbu, ma ikekwe ọ dịbeghị mgbe ọ batatụrụ gị n’uche na ha ga-ekewa. Robert na-echeta, sị: “Mgbe papa m pụrụ, aghọtachaghị m ihe nile na-aganụ. Nanị ihe m maara bụ na nsogbu dị n’ihi na ndị mụrụ m na-ese okwu mgbe nile.”

Gịnị mere ụfọdụ ndị nna ji ahapụ ụlọ? Ọ bụrụ na papa gị apụọla, ì kwesịrị iwere ya na ọ bụ gị onwe gị ka a jụrụ ajụ? Ọ̀ bụkwa gịnị nwere ike ime ka ndị mụrụ gị na-ala azụ ịkọrọ gị ọtụtụ ihe banyere ya? Ọ̀ bụ na ha ekwesịghị ịkọrọ gị ihe merenụ?

Ihe Mere Ha Ji Agbachi Nkịtị

Ihe na-eme nna ji apụ adịghị mgbe ọ na-enye obi ụtọ. Ọtụtụ mgbe, ihe na-akpata ya bụ ịkwa iko—bụ́ omume ọjọọ na-abụkarị nke e zopụworo nnọọ n’ebe ezinụlọ nọ. Mgbe nwanyị chọpụtara omume ọjọọ dị otú ahụ, o nwere ike kpebie ịgba di ya alụkwaghịm. Ọ pụrụ ọbụna ịgwa ya ka o jiri nwayọọ pụọ tupu e tinye akwụkwọ ịgba alụkwaghịm ahụ. Ụmụ ha nwere ike ghara ịma ma ọlị ihe mere nke a ji eme.

Otú ọ dị, gbalịa ịghọta ihe mere mama gị  pụrụ iji na-ala azụ ikpughere gị kpọmkwem ihe meworonụ. Otu ihe kpatara ya bụ na ọ ga-eche na ikpughe omume ọjọọ ọ bụla papa gị mere bụ nanị mwute ka ọ ga-akpalite. Ọzọ, cheedị otú ọ ga-esi wute nwanyị ịchọpụta na di ya anọwo na-akwa iko. (Malakaị 2:13, 14) Ya mere, ọ bụrụ na ọ bụ ịkwa iko mere ka ndị mụrụ gị gbasaa, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na o wutere nne gị nke na ọ chọghị ikwu banyere ya.

Gịnị banyere nna gị? O kwere nghọta na ọ bụrụ na o kwesịghị ntụkwasị obi nye nne gị, ọ ga-esiri ya ike ịgwa gị banyere ya. Ụfọdụ ụmụ nwoke na-enwe obi amamikpe dị ukwuu banyere omume ọjọọ ha nke na ha apụghị ọbụna iche ụmụ ha ihu! Ma, n’agbanyeghị àgwà mmechuihu ha, ọtụtụ ndị nna na-anọgide na-ahụ ụmụ ha n’anya, ha pụkwara ịgbalị ime ka ha na ha maliteghachi imekọrịta ihe.

N’ọnọdụ ụfọdụ, nna na-apụ n’ihi omume rụrụ arụ nke nwunye ya, ọ na-agbalịsikwa ike ịnọgide na-akpa ụmụ ya nso. Ma, n’ọnọdụ ndị ọzọ, ọ bụghị ịkwa iko na-akpata nkewa ma ọlị, kama ọ bụ ihe na-esi n’ọtụtụ afọ nke esemokwu alụmdi na nwunye apụta. * (Ilu 18:24) N’ihi na nke a na-emekarị na nzuzo, e nwere ike ị maghị ihe a na-esere okwu.

Bible na-ekwu n’Ilu 25:9, sị: “Gị na mmadụ ibe gị kwurịta okwu ikpe gị, ekpughekwala izu nzuzo nke onye ọzọ.” Mgbe ụfọdụ, esemokwu alụmdi na nwunye na-emetụta okwu nzuzo dịịrị nanị ndị ahụ. N’ikwu eziokwu, ikekwe ọ kaara gị mma ịghara ịnụ banyere ihe ndị dị otú ahụ. Ọzọkwa, ikpughe “izu nzuzo” na-emekarị ka ọnọdụ dị njọ ka njọ. Ọ ga-adị gị ka ị ga-adụnyere otu onye úkwù—nke ga-eme nanị ka nkewa dị n’ezinụlọ unu sawanye mbara. N’ikpeazụkwa, ọ ga-akara gị mma ma ọ bụrụ na ndị mụrụ gị akọghịrị gị ihe nile na-esere ha okwu.

Lụsoo Mkpasu Iwe Ọgụ Site n’Inwe Ezi Uche

N’agbanyeghị nke ahụ, o siri ike izere iwe iwe mgbe nna gị hapụworo ụlọ, i nweghịkwa ike ịza ajụjụ bụ́ Gịnị mere? Otú ọ dị, n’Ilu 19:11, Bible na-asị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ [ọ bụchaghị ka ọ ghara iwe iwe ma ọlị].” Ọ dịghịkwa gị mkpa ịma ihe nile merenụ iji wee nwee ezi uche.

Dị ka ihe atụ, Bible na-enyere anyị aka ịhụ na ndị mụrụ anyị ezughị okè. Ọ na-asị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ịnakwere eziokwu a dị mwute pụrụ inyere gị aka ile ihe ndị mụrụ gị mehiere anya otú ha dị n’ezie. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nna gị emebiela nkwa alụmdi na nwunye ya, nke ahụ bụ emezighị emezi dị oké njọ—bụ́ nke ọ ga-aza ajụjụ maka ya n’ihu Chineke. (Ndị Hibru 13:4) Ma ọ pụtachaghị na ọ jụwo gị ma ọ bụ na ọ hụghị gị n’anya.

Ndị nile lụrụ di na nwunye na-enwe “mkpagbu n’anụ ahụ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Ụfọdụ ndị ikom na ndị inyom na-ekwe ka omume ọjọọ merie ha n’ihi nrụgide nke ndụ n’ime ụwa nsogbu nke a, ọ bụ ezie na ha enweghị ihe ngọpụ maka ime otú ahụ. Robert na-echeta, sị: “Papa anyị chọrọ ihe kasị mma maka anyị. Ọ kpọgara ezinụlọ anyị n’ebe o chere na ya ga-akpata ihe e ji ebi ndụ karị ka anyị wee nwee ụlọ mara mma, ezinụlọ anyị enweekwa obi ụtọ.” Ma mgbalị ndị nna ya ji ezi obi mee iji mee ka ezinụlọ ya bie ndụ ka mma kụrụ afọ n’ala n’oge na-adịghị anya. Robert na-akọwa, sị: “Papa anyị dara mbà n’ịga nzukọ ndị Kraịst. Ihe ọzọ mere bụ́ na a kwụsịrị  ya ọrụ. Ka obere oge gasịrị, ọ malitere imeso mama m na nwanne m nwanyị omume ọjọọ.” N’oge na-adịghị anya ihe dịwanyere njọ ruo n’ókè nke na nna ya na nne ya gbara alụkwaghịm.

Iwe gaara erikpu Robert n’ihi emezighị emezi nke nna ya. Ma inwe ezi uche banyere ọnọdụ nna ya emewo ka iwe ya dajụtụ. Ọ bụ ezie na nkewa nne na nna ya kewara bụ ajọ ọdachi, ọ kụziworo Robert ihe bara uru. Robert na-asị: “Mgbe m ga-enwe ezinụlọ, ihe ime mmụọ ga-ebuterịrị ụzọ.”

Michael, a kpọrọ aha na mbụ, agbasowokwa iwe mgba. “Achọrọ m ịkpasu papa m iwe maka ihe o mere anyị,” ka ọ na-ekweta. Ma ọ nọgidere soro nna ya na-emekọrịta ihe. Ka oge na-aga, Michael nwere ike ọbụna ịkwụsịcha iwe iwe ma gaa n’ihu ná ndụ ya.

Gị onwe gị kwa pụrụ ịchọ ịgbalị ka gị na nna gị nọgide na-emekọrịta ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka ọnọdụ kwere. N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na ọ kpasuwo gị na mama gị iwe. Ma o yikarịrị ka ị maghị ihe nile merenụ. Ọ bụrụgodị na ị maara na o mere ihe ọjọọ, ọ ka bụ nna gị. Ị ghaghị inye ya nsọpụrụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo n’ókè ụfọdụ. (Ndị Efesọs 6:1-3) Zere “ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu” mgbe gị na ya na-emekọ ihe. (Ndị Efesọs 4:31) Ọ bụrụ na o kwere omume, etinyela aka n’esemokwu alụmdi na nwunye dịịrị nanị nne na nna gị. Site n’imesi nne gị na nna gị obi ike na ị hụrụ ha n’anya, ọ pụrụ ikwe mee gị na ha abụọ imekọrịta ihe nke ọma.

Ụta Adịrịghị Gị

Nna gị ịhapụ ụlọ nwere ike ịbụ otu n’ime ihe kasị akpata mwute metụrụla gị. Ma ọ bụrụgodị na ị chọpụtaghị ihe nile mere o ji pụọ, ọ dịghị mkpa gị iche na ụta dịịrị gị. N’eziokwu, ọ pụrụ ịdị gị ka ọ bụ gị onwe gị ka ọ jụrụ. Ma ọ na-esi ike tupu ya abụrụ ụmụ mere alụmdi na nwunye jiri gbasaa. Nne na nna gị kwere nkwa n’ihu Chineke na ha ga-ebikọ ọnụ. Ọ bụ ibu ọrụ ha—ọ bụghị nke gị—imezu ya.—Eklisiastis 5:4-6.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị nọ ná mgbagwoju anya, obi gị ana-ama gị ikpe, ma ọ bụ ị na-eche na ọ bụ gị kpatara ya, gịnị ma ị gbalịa ịkọrọ ya ndị mụrụ gị? Ha nwere nnọọ ike ịmalite ikwu obi ha wee nye gị mmesi obi ike kwesịrị ekwesị. James, bụ́ onye e hotara ná mmalite, na-ekweta, sị: “M na-adị eche na ọ bụ m ka ụta dịịrị, ruo mgbe nne m na nna m wepụtara oge gwa m okwu.” Obi Nancy na-eto eto makwara ya ikpe n’otu aka ahụ mgbe nna ya na nne ya gbasara. Mgbe ya na nne ya kparịtasịrị ụka ọtụtụ ugboro, Nancy nwere ike ikwubi, sị: “Ụmụaka ekwesịghị ịta onwe ha ụta maka ihe ndị mụrụ ha na-eme.” Ee, ịhapụ ndị mụrụ gị ka ha ‘buru ibu ọrụ nke ha’ pụrụ ime ka ị ghara ịbụ onye echiche na-anyịgbu. (Ndị Galetia 6:5) Ma olee otú ị pụrụ isi nagide ya ugbu a i bi n’ụlọ na-enweghị nna? Isiokwu a ga-enwe n’ọdịnihu n’usoro isiokwu a ga-enye azịza ụfọdụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị a.

^ par. 4 Lee usoro isiokwu bụ́ “Ezinụlọ Ndị Na-enweghị Nna—Ịkwụsị Nsogbu Ahụ,” nke dị ná mbipụta Teta! nke February 8, 2000.

^ par. 12 Otú ọ dị, Bible na-eme ka ọ pụta ìhè na nanị ihe ndabere sitere n’Akwụkwọ Nsọ maka ịtọsa alụmdi na nwunye bụ́ nke ga-enyekwa mmadụ abụọ ahụ ohere ịlụ onye ọzọ bụ ịkwa iko.—Matiu 19:9.

[Foto dị na peeji nke 17]

Atala onwe gị ụta maka nsogbu alụmdi na nwunye ndị mụrụ gị na-enwe