Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụaka Kwesịrị Ịbụ Ndị A Chọrọ Ma Hụ n’Anya

Ụmụaka Kwesịrị Ịbụ Ndị A Chọrọ Ma Hụ n’Anya

 Ụmụaka Kwesịrị Ịbụ Ndị A Chọrọ Ma Hụ n’Anya

“Ị HỤTỤ nwatakịrị n’anya, ọ ga-egosighachi gị ịhụnanya dị ukwuu.” Ihe a ka John Ruskin, onye England bụ́ onye nkatọ na-ede edemede na narị afọ nke 19 dere. Ma eleghị anya ihe ka ọtụtụ ná ndị mụrụ ụmụ ga-ekweta na mmadụ ịhụ ụmụ ya n’anya bara uru, ọ bụghị nanị n’ihi ịhụnanya ha ga-egosighachi ha kama, nke ka mkpa, n’ihi mmetụta dị mma ịhụnanya a ga-enwe n’ahụ ha.

Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Love and Its Place in Nature kwuru na “ụmụaka na-anwụkarị” ma e gosighị ha ịhụnanya. Ashley Montagu, onye Britain bụ́ ọkà mmụta mmalite mmadụ, rukwara n’ókè nke ikwu na: “Mmiri ọgwụ ahụ, uto, na akparamàgwà nwatakịrị a na-ahụghị n’anya dị nnọọ iche na nke onye a hụrụ n’anya. Nke mbụ ahụ na-eto ọbụna n’ụzọ dị iche n’otú nke abụọ si eto.”

Akwụkwọ akụkọ bụ́ Toronto Star kọrọ banyere otu nnyocha nke gosiri ihe yiri ya. O kwuru, sị: “Ụmụaka a zụlitere n’ebighị ha ọma, n’emetụghị ha aka mgbe nile . . . na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke mmiri ọgwụ ahụ bụ́ hormone na-akpata nrụgide.” N’ezie, ileghara mmadụ anya n’ụzọ anụ ahụ mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ “pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ọgụgụ isi na n’ikike ncheta ya ruo ogologo oge.”

Nchọpụta ndị a na-emesi ike mkpa ọ dị nne na nna ịnọ ya. Ma ọ bụghị ya, olee otú nne ma ọ bụ nna na nwa pụrụ isi nwee nkekọ siri ike? Ma ọ dị mwute ikwu na ọbụna n’akụkụ ụwa ndị bara ọgaranya, ihe a na-emekarị ugbu a bụ ịnwa inye nwatakịrị ihe na-akpa ya ma ndị mụrụ ya anọghị ya. A na-akpọga ụmụaka ụlọ akwụkwọ, na-akpọga ha Sunday school, na-akpọga ha ọrụ, na-akpọga ha ogige ezumike, a na-enyekwa ha ego ma kpọga ha ebe ntụrụndụ. N’ihi ịbụ ndị nọ n’ebe dị anya site n’ebe ezinụlọ ha nọ, ọtụtụ nde ụmụaka na-echewezi n’onwe ha—ma ọ bụ n’amaghị ụma—na e leghaara ha anya, a chọghị ha, nakwa na a hụghị ha n’anya, na ha nọ n’etiti ndị toworo eto nwere obi ọjọọ. Mmetụta dị otú ahụ ọtụtụ ụmụaka na-enwe pụrụ ịbụ otu ihe mere e ji nwee ihe e mere atụmatụ ya ịbụ ụmụaka 3,000 na-ehi n’okporo ámá na Berlin. Otu ihe atụ bụ Micha, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọ dịghịzi onye chọrọ m.” Otu nwatakịrị nwoke onye Germany dị afọ itoolu mere mkpesa n’otu aka ahụ, sị: “Ọ ga-akara m mma ịbụ nkịta anyị.”

Imegbu Ụmụaka Dị n’Ụdị Dị Iche Iche

Ileghara nwatakịrị anya bụ otu ụdị mmegbu nke na-egosi enweghị ihe Bible kpọrọ “obi mmadụ.” (Ndị Rom 1:31; 2 Timoti 3:3, NW) Ọ pụkwara iduga n’ụdị mmegbu ndị ka njọ. Dị ka ihe atụ, malite n’Afọ Nwatakịrị Maka Mba Nile bụ́ 1979 rute ugbu a, e lebakwuwo anya ná nsogbu imekpọ ụmụaka ọnụ na imetọ ha n’ụzọ mmekọahụ. Otú ọ dị, ọ na-esi ike inweta ndekọ ọnụ ọgụgụ ziri ezi, ha na-adịgasịkwa iche site n’otu ebe ruo ebe ọzọ. Ma obi abụọ adịghị ya na mmetụta ọjọọ ụmụaka e metọrọ n’ụzọ mmekọahụ na-enwe ruo mgbe ha mere okenye na-esi ike nkwụsị.

N’agbanyeghị ụdị mmegbu e ji mee ihe, ọ na-eme ka ụmụaka chee na a hụghị ha n’anya nakwa na a chọghị ha. Nsogbu a yikwara ka ọ na-abawanye ụba. Dị ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Die Welt si kwuo, “ọtụtụ ụmụaka na-etolite na-enwe nsogbu iso ndị ọzọ emekọrịta ihe.” Ọ na-ekwukwasị: “Ụmụaka adịghị enweta mmetụta ịhụnanya n’ebe obibi. Dị ka [Gerd Romeike, bụ́ onyeisi ebe a na-elekọta ụmụaka dị na Hamburg] si kwuo, nkekọ ịhụnanya na-adị n’etiti ụmụaka na ndị mụrụ ha na-abụwanye nke na-esighị ike, ma ọ bụ bụrụ nke a na-enweghị ma ọlị. Ụmụaka dị otú ahụ na-eche na e leghaara ha anya, a dịghịkwa emeju agụụ nchebe na-agụ ha.”

 Ụmụaka a napụrụ ihe ruuru ha nke bụ́ ịbụ ndị a chọrọ ma hụ n’anya pụrụ inwe mwute, na-egosipụta nkụda mmụọ ha n’ahụ ndị leghaara ha anya ma ọ bụ ma eleghị anya n’ahụ ọha mmadụ nile. N’afọ iri gara aga kpọmkwem, otu akụkọ sitere n’aka òtù ọrụ gbalụ gbalụ nke Canada gosiri mkpa ọ dị ime ihe ozugbo ka otu ọgbọ dum “na-eche na ọha mmadụ adịghị eche banyere ha” ghara ịbụ ndị e bibiri.

Ndị na-eto eto a na-ahụghị n’anya nakwa ndị a na-achọghị pụrụ ịbụ ndị a kpaliri ịgbapụ n’ụlọ iji zere nsogbu ha, ma zutezie ndị ka njọ n’obodo ukwu ndị jupụtara n’ime mpụ, ọgwụ ọjọọ, nakwa omume rụrụ arụ. N’eziokwu, n’ihe karịrị afọ 20 gara aga, ndị uwe ojii mere atụmatụ na mmadụ 20,000 gbapụrụ agbapụ bụ́ ndị na-erubeghị afọ 16 bi nanị n’otu obodo ukwu dị na United States. A kọwara ha dị ka “ndị si n’ebe obibi ndị tisara etisa nakwa ndị ndị mụrụ ha na-aṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ riri ahụ na-emekpọkarị ọnụ. Ha na-aghọ ndị akwụna, na-eji ahụ ha akpata ihe ha ji ebi ndụ ma bụrụzie ndị ndị na-akpọtara ha ndị ahịa na-eti ihe nakwa ndị na-enwekwaghị ùgwù onwe onye, na-ebi n’egwu nke ịbụ ndị a wakporo ma ha nwaa ịhapụ ọrụ ahụ iwu na-akwadoghị.” N’ụzọ dị mwute, n’agbanyeghị mgbalị e ji ezi obi na-eme iji gbanwee ọnọdụ ọjọọ a, ọ ka dị.

Ụmụaka nọ n’ọnọdụ ndị ahụ a kọwara n’elu na-etolite ghọọ ndị toworo eto na-enweghị echiche ziri ezi, ọtụtụ mgbe ha adịghị enwe ike ịzụlite ụmụ nke ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ihi ịbụ ndị a na-achọghị na ndị a na-ahụghị n’anya n’onwe ha, ha na-emesị mụọ ndị dị ka ha—ụmụaka na-eche na a chọghị ha nakwa na a hụghị ha n’anya. Otu onye Germany bụ́ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị si otú a kwuo ya ná nkenke: “Ụmụaka a na-ahụghị n’anya na-aghọ ndị toworo eto na-akpọ ajọ asị.”

Otú ọ dị, ọtụtụ nde ndị mụrụ ụmụ na-eme ike ha nile iji jide n’aka na ụmụ ha maara na a chọrọ ha ma hụ ha n’anya. Ọ bụghị nanị na ha na-agwa ha otú ahụ kamakwa ha na-egosipụta ya site n’inye ụmụ ha nlekọta ịhụnanya na nke onwe onye e kwesịrị inye nwatakịrị ọ bụla. Ma, nsogbu ka dị—nsogbu ndị o doro anya na ndị nne na nna apụghị ịkwụsị. Dị ka ihe atụ, n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, usoro akụ̀ na ụba na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè adịghị enye ụmụaka nlekọta ahụ ike zuru ezu, agụmakwụkwọ kwesịrị ekwesị, na ihe oriri zuru ezu, nakwa nchebe pụọ n’ihe otiti nke iji ụmụaka akpa ego na ọnọdụ ibi ndụ ndị dị njọ. Ọtụtụ mgbe ndị toworo eto nwere anyaukwu, na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, na-adịghịkwa eche banyere ndị ọzọ, na-eme ka ọnọdụ ndị a ka njọ.

Kofi Annan, odeakwụkwọ ukwu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu, kwuru banyere nsogbu ụfọdụ bụ́ isi ụmụaka na-eche ihu taa mgbe o dere, sị: “Ọtụtụ nde ụmụaka ka nọ n’ọnọdụ mweda n’ala dị egwu nke ịda ogbenye na-akpata; agha na nsogbu akụ̀ na ụba na-emetụta ọtụtụ narị puku; ọtụtụ iri puku na-enwe nkwarụ n’agha; HIV/AIDS na-egbu ọtụtụ ndị ọzọ ma ọ bụ mee ka ha ghọọ ụmụ mgbei.”

 Ma ọ bụghị akụkọ ahụ dum dị njọ! Òtù ndị òtù UN ji eme ihe, dị ka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) na Òtù Ahụ Ike Ụwa, arụsiwo ọrụ ike iji meziwanye ọdịmma ụmụaka. Annan kwuru, sị: “A na-amụ ọtụtụ ụmụaka ji ahụ, a na-agbakwa ọtụtụ ọgwụ mgbochi ọrịa; ọtụtụ pụrụ ịgụ na ide ihe; ọtụtụ nweere onwe ha ịmụ ihe, igwurị egwu na ibi nnọọ ka ụmụaka karịa ka a gaara eche na ọ ga-ekwe omume ọbụna n’iri afọ na-adịbeghị anya.” Ma, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ugbu a abụghị oge inwe afọ ojuju nanị n’ihe ndị a rụzuru n’oge gara aga.”

Ndị E Kwesịrị Inye Nlekọta Pụrụ Iche

E kwesịrị inye ụmụaka ụfọdụ nlekọta pụrụ iche. Ná mmalite afọ ndị 1960, akpata oyi wụrụ ụwa n’ahụ ịnụ akụkọ ndị sitere n’ọtụtụ mba banyere ọmụmụ nke ọtụtụ puku ndị a sị na ha bụ ụmụ thalidomide. Mgbe ndị inyom dị ime ṅụrụ mkpụrụ ọgwụ nkụjụ ahụ na ụra bụ́ thalidomide, ha nwere mmetụta ọjọọ a na-atụghị anya ya n’ahụ ha, bụ́ nke mere ka ha mụọ ụmụ nwere aka ma ọ bụ ụkwụ kpọnwụrụ akpọnwụ ma ọ bụ ndị ọ na-adịghị nke ha nwere. Aka na ụkwụ ha na-eyikarị nnọọ nku azụ̀.

Ka iri afọ anọ gasịrị, ihe yikarịsịrị ka ọ ga-akwarụ ụmụaka bụ ogbunigwe. * Ụfọdụ mere atụmatụ na site na nde 60 ruo nde 110 nke ogbunigwe a na-agbawabeghị agbawa tọgbọgasị n’ụwa nile. Ha na-egbu ma ọ bụ na-akwarụ ihe dị ka mmadụ 26,000 kwa afọ—gụnyere ọtụtụ ụmụaka. Kemgbe afọ 1997, mgbe Jody Williams nwetara Onyinye Nobel Maka Ime Udo n’ihi mkpọsa o mere iji machibido ogbunigwe iwu, e lebarawo nsogbu a anya nke ukwuu. Ma a ka nwere ebe ndị e liri ogbunigwe. Onye Germany bụ́ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwuru banyere mgbalị a na-eme ikpochapụ ogbunigwe n’ụwa, sị: “O yiri ịnwa iji obere ngaji kupụsịa mmiri dị n’ọ́kwá ịsa ahụ ka mmiri pọmpụ na-agbanye n’ime ya.”

Ìgwè ụmụaka ọzọ chọrọ nlebara anya pụrụ iche bụ ndị na-enweghị nne na nna. Jehova Chineke, Onye Okike mmadụ, zubere ka ụmụaka tolite ná nlekọta ịhụnanya nke ma nne ma nna. Nwatakịrị chọrọ ma kwesị inweta ọzụzụ dị otú ahụ guzoziri eguzozi.

Ogige ụmụ mgbei na òtù ndị na-ekuchi nwa na-agbalị igbo mkpa ụmụaka na-enweghị ma nne ma nna. Otú ọ dị, ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ n’ime ụmụaka ụwa na-atụ n’ọnụ bụ́ ndị nkuchi dị mkpa karịsịa bụ ndị a kasị eleghara anya—ndị na-arịa ọrịa, ndị nwere nsogbu ịmụta ihe, ndị nwere ọrụsị ma ọ bụ ndị ndị mụrụ ha bi ná mba ọzọ.

E guzobewo ọtụtụ òtù na-agba ndị mmadụ ume ịtụ ego mgbe nile ma si otú a “kuchie” nwatakịrị bi ná mba na-abachaghị ọgaranya. A na-eji ego a tụrụ azụ nwatakịrị ahụ ma ọ bụ enye ya ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Ọ bụrụ na a chọọ, a pụrụ ọbụna inyerịta foto na akwụkwọ ozi iji wusie mmekọrịta ahụ ike. Ọ bụ ezie na ọ na-enye aka, ndokwa a abụghị ihe ngwọta kasị mma.

Ihe atụ ọzọ na-adọrọ mmasị banyere ihe e meworo iji nyere ụmụaka na-enweghị nne na nna  aka bụ nke otu òtù mere, nke mere ememe na 1999 maka ihe ndị ha rụzuru n’ọkara narị afọ.

Obodo Nta nke Ụmụaka SOS

Na 1949, Hermann Gmeiner guzobere ihe ọ kpọrọ Obodo Nta nke Ụmụaka SOS n’Imst, Austria. Site ná mmalite a dị nta, òtù ya agbasaala nwee ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obodo nta na ụlọ ọrụ 1,500 ndị yiri ya dị ná mba 131 nke Africa, America, Esia, na Europe.

Gmeiner ji ụkpụrụ anọ bụ́ isi guzobe ọrụ ya—nne, ụmụnne, ebe obibi, na obodo nta. “Nne” bụ ntọala nke “ezinụlọ” nwere ụmụ ise ma ọ bụ isii—o nwere ike karịa. Ya na ha na-ebi, ọ na-agbalịkwa igosi ha ịhụnanya ma na-enye ha nlekọta a chọrọ n’aka nne mụrụ ha. Ụmụaka ahụ na-anọkọ ọnụ n’otu “ezinụlọ,” nwee otu “nne” ruo mgbe oge ga-eru ka ha hapụ “ụlọ.” Ụmụaka nọ n’afọ ndụ dị iche iche na-anọ “n’ezinụlọ” ahụ. Ebe ha nwere ma “ụmụnne nwoke” ma “ụmụnne nwanyị” ndị tọrọ ha na ndị ha tọrọ, ụmụaka ahụ na-amụta ilekọta ibe ha, si otú a na-enyere ha aka izere iche banyere onwe ha nanị. A na-eme mgbalị ịkpọbata ụmụaka ahụ “n’ezinụlọ” n’oge ha bụ ụmụaka ngwa ngwa o kwere mee. A na-edebekarị ndị otu nne na nna mụrụ n’otu “ezinụlọ.”

Ihe mejupụtara obodo nta dị iche iche bụ ihe dị ka “ezinụlọ” 15, nke ọ bụla na-ebi n’ụlọ nke ya. A na-azụ ụmụaka nile ahụ inyere “nne” ha aka rụọ ọrụ ụlọ ndị dị mkpa na gburugburu ebe obibi. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ha agaghị enwe nna, a na-eme ndokwa maka nkwado nke onye bụ́ nwoke iji na-enye ndụmọdụ nna na ọzụzụ kwesịrị ekwesị. Ụmụaka ahụ na-aga ụlọ akwụkwọ dị n’ógbè ha. “Ezinụlọ” nke ọ bụla na-enweta ego mmachi akpa a kapịrị ọnụ iji kwụọ ụgwọ ihe ndị ha na-emefu. Ha na-azụta ihe oriri na uwe n’ógbè ha. Nzube ya bụ ime ka ụmụaka ahụ biwe ndụ ezinụlọ na-ebikarị, na-enwetakwa nsogbu na ọṅụ ya nile, na-eme ka ha nwee ike bie ndụ dị otú o kwesịrị ruo ókè o kwere mee. Nke a na-akwadebe ha inwe ezinụlọ nke ha ozugbo ha mere okenye.

A Ka Na-achọ Ihe Ngwọta Kasị Mma

Ụlọ ọrụ ndị na-ekuchi nwa, ogige ụmụ mgbei, Obodo Nta nke Ụmụaka SOS, òtù UNICEF, na òtù ma ọ bụ ìgwè ndị yiri ha na-emezu nzube dị mma mgbe ha na-agbalị inyere ụmụaka ụwa na-atụ n’ọnụ aka. Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha pụrụ ịgọnahụ eziokwu ahụ bụ́ na ụwa na-atụ ndị ụfọdụ n’ọnụ. Ọ bụ ezie na ọ ga-amasị ha inye nwa ngwụrọ ụkwụ dị mma, imezi uche nwatakịrị nwere nsogbu ọgụgụ isi, ijikọtaghachi nwatakịrị na ndị mụrụ ya kewara ekewa ma ọ bụ gbara alụkwaghịm, ma ọ bụ ime ka ọ dịghachi n’obi nne ma ọ bụ nna ya na-ahụ n’anya nwụrụ anwụ, ma ha apụghị ime ha.

N’agbanyeghị otú ha pụrụ ịgbalịru, ụmụ mmadụ apụghị iweta ihe ngwọta kasị mma nye nsogbu ụmụaka n’ezie. Ma a ga-agwọta ha! Ee, a pụkwara ịgwọta ha ngwa ngwa karịa otú ị tụrụ anya ya. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Lee usoro isiokwu bụ́ “Land Mines—What Can Be Done?” (“Ogbunigwe Ndị E Liri n’Ala—Gịnị Ka A Pụrụ Ime?”) pụtara ná mbipụta May 8, 2000 (Bekee).

[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]

Nwatakịrị chọrọ ma kwesị inweta ịhụnanya nne na nna