Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchọ Na-aga n’Ihu A Na-achọ Ihe Ngwọta

Ọchịchọ Na-aga n’Ihu A Na-achọ Ihe Ngwọta

 Ọchịchọ Na-aga n’Ihu A Na-achọ Ihe Ngwọta

SITE mgbe ọ malitere kpọmkwem, Òtù Mba Ndị Dị n’Otu anọwo na-egosi mmasị n’ebe ụmụaka nọ nakwa ná nsogbu ha. Ná ngwụsị afọ 1946, o guzobere Òtù Mba Nile Maka Ọnọdụ Mberede Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) dị ka ihe ngwọta ga-adịru nwa oge maka ilekọta ụmụaka n’ebe ndị agha bibiri.

Na 1953 òtù a na-ahụ maka ọnọdụ mberede ghọrọ òtù na-adịgide adịgide. Ọ bụ ezie na a maara ya ugbu a n’ebe nile dị ka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu, ọ ka nwere aha ndebiri mbụ ya, bụ́ UNICEF. N’ihi ya, òtù UNICEF anọwo na-enye ụmụaka nọ n’ụwa nile ihe oriri, uwe, na nlekọta ahụ ike ruo ihe karịrị ọkara narị afọ, ọ nọwokwa na-agbalị igbo mkpa ụmụaka n’ozuzu ha.

E mere ka mkpa ụmụaka pụtakwuo ìhè na 1959 bụ́ mgbe Òtù Mba Ndị Dị n’Otu nakweere Nkwupụta nke Ihe Ndị Ruuru Nwatakịrị. (Lee igbe, peeji nke 5.) E nwere olileanya na ihe ndekọ a ga-akpali mmasị ná nsogbu ụmụaka ma nye aka gwọta ha site n’ịgba ọha na eze ume ka ha nye aka n’ụzọ ego na n’ụzọ ndị ọzọ.

Ma “ka afọ iri abụọ gasịrị,” dị ka akwụkwọ bụ́ 1980 Year Book nke Collier dere si kwuo, “ihe ndị a ‘ruuru mmadụ’—karịsịa ndị metụtara ihe oriri, ahụ ike, na ihe onwunwe ndị dị mkpa—aka-erubeghị ọtụtụ n’ime nde ụmụaka 1.5 nọ n’ụwa aka.” N’ihi ịghọta mkpa na-aga n’ihu nke ịgwọta nsogbu ụmụaka nakwa ime ihe kwekọrọ ná nzube ya e kwupụtara ekwupụta, Òtù Mba Ndị Dị n’Otu kpọrọ 1979 Afọ Nwatakịrị Maka Mba Nile. Òtù Gọọmenti, obodo, okpukpe, na ọrụ ebere ndị dị n’ụwa nile sonyere ngwa ngwa n’ọchịchọ a na-achọ ihe ngwọta.

Ọ̀ Bụ Nanị “Ajọ Egwuregwu”?

N’ụzọ dị mwute, dị ka otu akụkọ sitere n’aka òtù UNICEF si kwuo, ihe agaraghị ụmụaka nọ ná mba ndị na-emepe emepe nke ọma mgbe e nwere Afọ Nwatakịrị Maka Mba Nile. Ná ngwụsị afọ ahụ, ihe dị ka nde 200 n’ime ha ka  nọ n’erighị ihe na-edozi ahụ, ọ pụkwara ịbụ erighị ihe na-edozi ahụ kpatara ọnwụ nke ọkara nde 15 bụ́ ndị nwụrụ mgbe ha na-erubeghị afọ ise. N’ime 100 ụmụaka a na-amụ kwa minit n’afọ ahụ ná mba ndị ahụ, 15 nwụrụ tupu ha agbaa otu afọ. Ihe na-erughị pasent 40 gụsịrị akwụkwọ elementrị. Mgbe ọ na-ekwu banyere akụkọ ahụ sitere n’aka òtù UNICEF, otu uche akwụkwọ akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Indian Express mere mkpesa na Afọ Nwatakịrị ahụ mesịrị bụrụ “ajọ egwuregwu.”

Ndị ụfọdụ matara banyere enweghị ihe ịga nke ọma a tupu o mee. Dị ka ihe atụ, kpọmkwem ná mmalite afọ ahụ, Fabrizio Dentice dere na magazin bụ́ L’Espresso, sị: “A chọrọ ihe karịrị Afọ Nwatakịrị iji gwọta ọnọdụ ahụ.” Magazin ahụ kwuru, sị: “Ụzọ ndụ nke taa na-eme ka anyị bụrụ ihe anyị bụ, ọ bụkwa ya ka ọ dị mkpa ka a gbanwee.”

N’ihi ọchịchọ a na-aga n’ihu nke ihe ngwọta nye nsogbu ụmụaka, e nwere nzukọ ụwa nile n’isi ụlọ ọrụ òtù UN na September 1990. Ọ bụ otu n’ime nzukọ ndị kasị ibu ndị ndú ụwa nweworo n’akụkọ ihe mere eme. Ihe karịrị ndị isi gọọmenti 70 gara ya. Nzukọ ahụ sochiri Nkwekọrịta Maka Ihe Ndị Ruuru Nwatakịrị, bụ́ nke a nakweere na November 20, 1989, ma mee ka ọ dị irè na September 2, 1990. Ka ọ na-erule ná ngwụsị ọnwa ahụ, mba 39 abịanyeworị aka ná nkwekọrịta ahụ.

“Nkwekọrịta ahụ,” ka òtù UNICEF kwuru na nso nso a, “aghọwo n’egbughị oge nkwekọrịta maka ihe ndị ruuru mmadụ e nwetụworo, bụ́ nke a kasị nabata n’ebe nile, na-eme ka e nwee ihe mkpali zuru ụwa ọnụ maka ụmụaka.” N’ezie, na November 1999, mba 191 nakweere Nkwekọrịta ahụ. Òtù UNICEF turu ọnụ, sị: “E nwere ọganihu n’ịmata na ichebe ihe ndị ruuru ụmụaka n’iri afọ ahụ mgbe a nakweresịrị Nkwekọrịta Maka Ihe Ndị Ruuru Nwatakịrị karịa ka e nwere n’oge ọ bụla ọzọ hà ka ya n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.”

N’agbanyeghị ọganihu a, a kpaliri President ndị Germany bụ́ Johannes Rau ikwu, sị: “Ọ dị mwute na n’oge anyị, ọ ka dị mkpa ichetara anyị na ụmụaka nwere ihe ndị ruuru ha.” Ma ọ bụ ichetara anyị na ha ka nwere nsogbu ndị siri ike! N’ikweta na November 1999 na “a ka nwere  ọtụtụ ihe a ga-eme,” òtù UNICEF kọwara, sị: “N’ụwa nile, ihe ndị a pụrụ igbochi n’ụzọ kasị mfe na-egbu ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde ụmụaka 12 na-erubeghị afọ ise kwa afọ. Ihe dị ka nde ụmụaka 130 nọ ná mba ndị na-emepe emepe adịghị aga akwụkwọ praịmarị . . . Ihe dị ka nde ụmụaka 160 adịtụghị eri ihe na-edozi ahụ ma ọ bụ ha ana-eri ya nanị obere. . . . Ọtụtụ ụmụaka a na-achọghị na-ahụsi anya n’ogige ụmụ mgbei na n’ụlọ nlekọta ndị ọzọ, ha adịghị aga akwụkwọ, a dịghịkwa enye ha nlekọta ahụ ike kwesịrị ekwesị. A na-etikarị ụmụaka ndị a ihe. A na-eji ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde ụmụaka 250 arụ ọrụ ego ụfọdụ.” E kwukwara banyere nde ụmụaka 600 dara ogbenye ọnụ ntụ nakwa nde 13 bụ́ ndị ma ọ dịkarịa ala nne ma ọ bụ nna ha ga-anwụ n’ihi ọrịa AIDS mgbe ọ na-erule ná ngwụsị afọ 2000.

Ihe ngwọta na-eju afọ nye nsogbu ndị a yiri ka o rubeghị ndị ndú ọchịchị aka. Ma, nsogbu ụmụaka adịghị nanị ná mba ndị na-emepe emepe. Ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ụmụaka na-anọ n’ụkọ n’ụdị dị iche.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

“Ọ dị mwute na n’oge anyị, ọ ka dị mkpa ichetara anyị na ụmụaka nwere ihe ndị ruuru ha”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Nkwupụta Òtù UN nke Ihe Ndị Ruuru Nwatakịrị:

● Ikike inwe aha na mba a mụrụ ya.

● Ikike ịbụ onye e gosiri mmasị, ịhụnanya, na nghọta nakwa inwe ihe onwunwe ndị dị mkpa.

● Ikike inweta ihe oriri zuru ezu, ụlọ, na nlekọta ahụ ike.

● Ikike inweta nlekọta pụrụ iche ma o nwee ọrụsị, ma ọ̀ bụ nke anụ ahụ, uche, ma ọ bụ nke mmekọrịta ọha na eze.

● Ikike iso ná ndị mbụ ga-enweta nchebe na ihe enyemaka n’ọnọdụ nile.

● Ikike ịbụ onye e chebere pụọ n’ụdị nile nke nleghara anya, mmekpọ ọnụ, na nrigbu.

● Ikike inwe ohere zuru ezu igwuri egwu na inwe ntụrụndụ na ohere hà nhata nke inweta agụmakwụkwọ bụ́ iwu na a ga-agụ ya n’efu, iji mee ka nwata ahụ nwee ike ịzụlite ikike dị iche iche nke onwe ya na ịghọ onye bara uru n’obodo.

● Ikike ịzụlite nkà ya n’ụzọ zuru ezu n’ọnọdụ nile nke inwere onwe na ịdị ùgwù.

● Ikike ịbụ onye a zụlitere ná mmụọ nke nghọta, ikwe ibe nọrọ, ọnọdụ ịbụ enyi n’etiti ndị mmadụ, udo, na òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ.

● Ikike irite uru ihe ndị a ruuru ya n’agbanyeghị agbụrụ, ụcha, ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, okpukpe, okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ echiche ọzọ, mba ma ọ bụ ụdị ọha mmadụ o si na ya, na ihe onwunwe, ọmụmụ, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Nchikọta a dabeere n’akwụkwọ bụ́ Everyman’s United Nations

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 3]

FOTO UN 148038/Jean Pierre Laffont▼

Foto UN

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]

Foto ndị dị na peeji nke 4 na nke 5 Giacomo Pirozzi/Panos Pictures