Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-enwe Nsogbu Ụkwụ Anọghị Jii?

Ị̀ Na-enwe Nsogbu Ụkwụ Anọghị Jii?

 Ị̀ Na-enwe Nsogbu Ụkwụ Anọghị Jii?

Ọ BỤ n’abalị. Ahụ ruru gị ala ka i dina n’àkwà gị. Mgbe ahụ ya amalite—ihe ahụ na-eyi ka ihe ọ̀ na-arị gị n’ime ụkwụ. Ị pụghị ileghara ya anya. Nanị ụzọ isi kwụsị ya bụ site n’ibilite ọtọ ma gagharịa. Ịga ije na-enye aka, ma mgbe i dinara ala ọzọ, ihe ahụ amalite ọzọ. Ị chọrọ ihi ụra, ma i nweghị ike. Ọ bụrụ na nke a yiri ihe na-eme gị, ọ bụghị nanị gị ka ọ na-eme. Dị ka ihe atụ, ma eleghị anya ihe ha ka pasent 15 nke ndị bi na United States nwere nsogbu a.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị dọkịta taa adịghị achọpụta ma ọ bụ agwọtacha nsogbu a, ọ maliteghị ọhụrụ. Na 1685 otu dọkịta dere banyere ndị aka na ụkwụ ha “na-ama nnọọ Jijiji” mgbe ha dịnara n’àkwà, nke na ha “adịghị enwe ike ihi ụra, dị ka a ga-asị na ha nọ n’Ebe A Na-ata Mmadụ Ahụhụ kasị njọ.”

Otu n’ime nsogbu ndị e nwere n’ịghọta nsogbu a bụ na e nweghị nnyocha a na-eme n’ụlọ ime nnyocha nke pụrụ ịchọpụta ma mmadụ o nwere ya. A na-eji mgbaàmà ya amata ya. Dọkịta ma nke a na-akọ pụrụ ịjụ, sị: ‘Ọ̀ na-adị gị ka ihe ọ na-arị gị n’otu ụkwụ ma ọ bụ n’ụkwụ abụọ? Ọ̀ dị mgbe ọ na-adị gị ka ọ na-arị gị n’aka? Nsogbu a ọ̀ na-akwụsị ma ọ bụrụ na i bilie ọtọ ma gagharịa, saa ahụ, ma ọ bụ hịa aka n’ụkwụ gị? Ihe nrịgharị ahụ ọ̀ na-amalite mgbe ụfọdụ ma ọ bụrụ na ị nọdụ ala ruo ogologo oge, dị ka n’ụgbọala ma ọ bụ ụgbọelu? Ọ̀ na-akasị enye gị nsogbu n’abalị? Ọ̀ dị onye n’ime ndị ezinụlọ gị na-enwe otu nsogbu a? Onye gị na ya na-ehi ọ̀ na-ekwu na ị na-emegharị ụkwụ g̣ị mgbe ụfọdụ ma ị na-ehi ụra?’ Ọ bụrụ na azịza gị nye ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị a bụ ee, dọkịta pụrụ ikwubi na i nwere nsogbu ụkwụ anọghị jii (RLS).

Ndị Nwere Ya

Nye ụfọdụ ndị, RLS bụ obere nsogbu na-enwe mgbaàmà mgbe ụfọdụ. Nye ndị ọzọ, ọ na-adị nnọọ njọ karị, na-akpata ehighị ụra nke ọma ruo ogologo oge, na-akpata ike ọgwụgwụ n’oge ehihie bụ́ nke na-emetụta nnọọ ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Otu onye nwere ya na-ekwu, sị: “Ọ na-adị m ka okpo ọ na-arị m n’ime ụkwụ. Aghaghị m imegharị ụkwụ m iji mee ka nrịgharị ahụ kwụsị.”

 Nsogbu RLS na-emetụta ma ndị ikom ma ndị inyom, ọ na-emetụtakwa ndị meworo okenye n’ụzọ kasị ukwuu na n’ụzọ ka njọ. A kasị achọpụta ya n’ahụ ndị nọ n’afọ 50 na ụma ha, ọ bụ ezie na mgbaàmà ya na-amalitekarị ọtụtụ iri afọ tupu a chọpụta ya. Mgbe ụfọdụ mgbaàmà ya pụrụ ịmalite laa azụ n’oge a bụ nwata. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe a dịghị ahụ nsogbu RLS n’ahụ ụmụaka. N’ihi na ha na-akpa aghara ma ọ bụ bụrụ ndị na-apụghị ịnọdụ otu ebe, a na-akpọ ndị na-eto eto nwere nsogbu RLS “ndị na-adịghị anọ jii.”

Ọ bụ ezie na ndị ọkachamara ghọtara na RLS bụ nsogbu akwara ozi, ọ na-esi ike ikwu kpọmkwem ihe na-akpata ya. N’ihe ka ọtụtụ ná ndị nwere ya, a maghị ihe kpatara ya. Otú ọ dị, a matawo ihe ụfọdụ na-akpata nsogbu RLS. Dị ka ihe atụ, a na-enwetakarị nsogbu RLS n’ezinụlọ, ndị mụrụ ụmụ na-esi ná mkpụrụ ndụ ihe nketa ebufere ya ụmụ ha. Ndị inyom ụfọdụ dị ime na-enwe mgbaàmà RLS, karịsịa n’ọnwa ndị ikpeazụ nke ime ha. Mgbe ha mụsịrị nwa, nsogbu ahụ na-akwụsịkarị. Mgbe ụfọdụ nsogbu ahụ ike, dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala nke iron ma ọ bụ ụkọ vitamin ụfọdụ, na-akpali mgbakasị ahụ nke nsogbu RLS na-akpata. Ọrịa na-adịghị ala ala pụkwara ịkpata mgbaàmà RLS—karịsịa ọrịa akụrụ, ọrịa shuga, ọrịa rheumatoid arthritis, na nsinwụ akụkụ usoro akwara ozi, mmebi nke akwara ozi ndị dị n’aka na ụkwụ.

Ọchịchọ A Na-achọ Ọgwụgwọ Ya

Ọ dị mwute na nsogbu RLS enweghị ọgwụgwọ, mgbaàmà ya na-akakarịkwa njọ ka afọ na-agafe. Otú ọ dị, akụkọ ọma dịnụ bụ na a pụrụ ịgwọta nsogbu RLS, ọtụtụ mgbe n’ejighị ọgwụ. E nweghị otu ihe e ji agwọ ya; ihe rụrụ ọrụ n’ahụ otu onye nwere ike ghara ịrụ ọrụ n’ahụ onye ọzọ. Ọ dị mkpa ka ndị nwere ya chọpụta àgwà, ihe omume, ma ọ bụ ọgwụ na-eme ka mgbaàmà ya ka njọ ma ọ bụ belata.

Ihe mbụ a ga-eme n’ịgwọ ya bụ ikpebi ma è nwere nsogbu ahụ ike a pụrụ ịgwọta agwọta bụ́ nke na-akpata mgbaàmà RLS. Nye ndị nwere ụkọ iron na vitamin, iji iron na vitamin B12 na-enyere ihe oriri aka pụrụ ịbụ nanị ihe a chọrọ iji kwụsị mgbaàmà RLS. Otú ọ dị, ịṅụbiga vitamin na mineral ókè pụrụ itinye ahụ ike mmadụ n’ihe ize ndụ. N’ihi ya, onye na-enye nlekọta ahụ ike kwesịrị ikpebi ma mmadụ o kwesịrị ịṅụ iron ma ọ bụ vitamin ntụkwasị.

Nye ndị ụfọdụ caffeine na-eme ka mgbaàmà RLS ka njọ. Kọfị, tii, chocolate, na ọtụtụ mmanya ọtọ bịrịbịrị nwere caffeine. Ibelata caffeine ha na-aṅụ ma ọ bụ ịkwụsị ịṅụ ya pụrụ inye aka belata ma ọ bụ kwụsị mgbaàmà RLS. Ịṅụkwa ihe na-aba n’anya na-emekarị ka mgbaàmà ya dịtee aka ma ọ bụ ka njọ. Site n’ibelata ma ọ bụ iwepụ ihe na-aba n’anya n’ihe ha na-eri, ahụ na-adị ụfọdụ mma.

Ịnagide Nsogbu RLS

Ọ bụrụ na i nwere nsogbu RLS, ime mgbanwe n’ụzọ i si ebi ndụ pụrụ inyere gị aka. Ebe ọ bụ na ike ọgwụgwụ na iro ụra na-emekarị ka mgbaàmà ya ka njọ, inwe otu oge i ji alakpu ụra mgbe dum pụrụ ịbụ ezi ihe enyemaka. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ọ kasị mma inwe ebe ihi ụra dị jụụ, jụrụ oyi ma na-enye ntụsara ahụ. Ịlakpu ụra n’otu oge kwa abalị na iteta n’otu oge kwa ụtụtụ na-enyekwa aka.

Imega ahụ mgbe nile ga-enyere gị aka ihi ụra nke ọma n’abalị. Otú ọ dị, imega ahụ gabigara ókè n’ime awa isii tupu ị lakpuo ụra pụrụ ịkpata ihe dị iche. Ndị ụfọdụ nwere nsogbu RLS na-achọpụta na mmega ahụ na-agabigaghị ókè nke ha nwere obere oge tupu oge ịlakpu ụra na-enyere ha aka ihi ụra. Nwalee ụdị mmega ahụ dịgasị iche iji chọpụta nke kasị dịrị gị mma.

Egbochila ọchịchọ nke imegharị ahụ. Mgbaàmà ya ga-akakarị njọ ma ọ bụrụ na ị nwaa igbochi mmegharị ahụ. Ọtụtụ mgbe ihe ngwọta ya kasị mma bụ ibilite n’àkwà ma gagharịa. Ndị ụfọdụ na-enweretụ onwe ha site n’ịga ije, ịgbatị onwe ha, iji mmiri ọkụ ma ọ bụ mmiri oyi saa ahụ, ma ọ bụ ịhịa aka n’ụkwụ ha. Ọ bụrụ na ị ghaghị ịnọdụ ala ruo ogologo oge, dị ka mgbe ị na-eme njem, ọ pụrụ inye aka ma ọ bụrụ na i tinye uche gị nke ọma n’ịgụ ihe.

Gịnị banyere ọgwụ? Òtù Na-ahụ Maka Nsogbu Ụkwụ Anọghị Jii, bụ́ nke dị na Raleigh, North Carolina, U.S.A., na-ekwu na “ịmalite usoro iji ọgwụ agwọ ọrịa pụrụ ịdị mkpa.” Ebe ọ bụ na e nweghị otu ọgwụ na-arụ ọrụ n’ahụ ndị nile nwere nsogbu RLS, ọ pụrụ ịdị mkpa ka onye na-enye gị nlekọta ahụ ike chọpụta nke kasị arụ ọrụ n’ahụ gị. Ndị ụfọdụ na-achọpụta na ịgwakọta ọgwụ dị iche iche na-akasị arụ ọrụ. Mgbe ụfọdụ ọgwụ rụrụ ọrụ ruo oge ụfọdụ agaghịzi arụ ọrụ. Ebe ọ bụ na ịṅụ ọgwụ nakwa karịsịa ịgwakọta ọgwụ dị iche iche nwere ihe ize ndụ ahụ ike, ọ dị mkpa iso nnọọ onye na-enye gị nlekọta ahụ ike rụkọọ ọrụ iji mata ihe kasị arụ ọrụ n’ahụ gị.