Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Usoro Ọgwụgwọ Ọzọ—Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Ji Eji Ya Eme Ihe

Usoro Ọgwụgwọ Ọzọ—Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Ji Eji Ya Eme Ihe

 Usoro Ọgwụgwọ Ọzọ—Ihe Mere Ọtụtụ Ndị Ji Eji Ya Eme Ihe

ỤDỊ ọgwụgwọ ọzọ, ma ọ bụ nke nkwado, na-agụnye ọtụtụ ụzọ e si agwọ ọrịa. A na-akpọkọta ọtụtụ n’ime ha naturopathy (iji ihe nkịtị agwọ ọrịa), bụ́ ụzọ ịgwọ ọrịa nke na-adaberekarị n’iji ihe ndị si n’okike ma ọ bụ ihe nkịtị edozi ahụ ma hapụ ya ka o jiri aka ya gwọọ onwe ya. Ọ dịwo anya nkà ọgwụ na ahụ ike ọgbara ọhụrụ gbahapụrụ ma ọ bụ leghara ọtụtụ n’ime usoro ọgwụgwọ ndị a anya, bụ́ ndị e jiworo mee ihe ruo ọtụtụ narị afọ.

Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ Journal of the American Medical Association nke August 27, 1960, kwuru na ịtụkwasị ihe jụrụ oyi n’ebe ọkụ dara mmadụ bụ ihe “ndị mgbe ochie maara ma yie nke ndị dọkịta nakwa ndị nkịtị leghaara anya. Ọ bụ ezie na aka ụfọdụ e zoro n’akwụkwọ dị iche iche ji otu olu na-eto ụdị ọgwụgwọ a, mmadụ nile adịghị eji ya eme ihe taa. N’ezie, ihe ka ọtụtụ ná ndị dọkịta na-ekwu na ‘a naghị eme ya,’ ọ bụ ezie na ọ dịghị onye maara nnọọ ihe kpatara ya.”

Otú ọ dị, n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị ọgwụ Bekee amalitewo ọzọ ịkwado ịwụkwasị mmiri oyi ma ọ bụ ịtụkwasị ihe jụrụ oyi n’ebe  ọkụ dara mmadụ. Magazin bụ́ The Journal of Trauma nke September 1963, kọrọ, sị: “Mmasị e nwere n’ịwụkwasị mmiri oyi ná mmalite n’ebe ọkụ dara mmadụ amụbawo kemgbe Ofeigsson na Schulman nyesịrị akụkọ ha na 1959 na 1960. Anyị ejiwo ụzọ a na-agwọ ndị ọkụ dara kemgbe otu afọ gara aga; ihe ndị ọ rụpụtara mere ka anyị nwee olileanya.”

Iji mmiri oyi agwọ ọrịa adịghị ize ndụ ruo n’ókè ụfọdụ, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ na-ebelatakwa ahụ ụfụ n’ezie. Iji mmiri agwọ ọrịa, bụ́ nke a na-eji mmiri eme ihe na ya n’ụzọ dị iche iche iji gwọọ ọrịa, bụ nke e ji eme ihe n’ụdị ọgwụgwọ ọzọ, ugbu a kwa nkà ọgwụ na ahụ ike ọgbara ọhụrụ na-anakwerekwa ụdị ọgwụgwọ dị iche iche dị otú ahụ. *

N’otu aka ahụ, ndị na-eji usoro ọgwụgwọ ọzọ eme ihe na-ejikarị ahịhịa agwọ ọrịa. E jiwo nke a na-eme ihe eri ọtụtụ narị afọ—ọbụna ọtụtụ puku afọ—n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa. Dị ka ihe atụ, eri ogologo oge, iji mkpá akwụkwọ eme ihe anọwo na-abụ ụzọ bụ́ isi nke isi na-agwọ ọrịa n’India. Taa, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe nile, ọtụtụ ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike amatawo ike ịgwọ ọrịa nke ahịhịa ụfọdụ.

Ahụmahụ Kwesịrị Ịrịba Ama

N’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, ihe mere ezigbo enyi ya na-eto eto, bụ́ Sepp Schwab dị afọ iri nwere mmetụta n’ahụ Richard Willstätter, bụ́ onye mesịrị mụwa ihe banyere mmiri ọgwụ nke ahịhịa. Sepp bu ọrịa dị njọ n’ụkwụ ya, bụ́ nke dọkịta kwuru na ọ dị mkpa ka e bepụ iji zọpụta ndụ ya, ma ndị mụrụ Sepp yigharịrị ịwa ahụ ahụ ka ọ bụrụ n’ụtụtụ echi ya. Ka ọ dịgodị, ha chọtara otu onye ọzụzụ atụrụ a ma ama n’iji mkpá akwụkwọ agwọ ọrịa. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ chịkọtara ahịhịa dị iche iche, berie ha irighiri irighiri ruo mgbe ha bịara yie akwụkwọ nri e siri esi, jirikwa ya nyachie ọnyá ahụ.

Mgbe ọ na-erule n’ụtụtụ ọnyá ahụ akala mma, e yigharịkwara ịwa ahụ ahụ ọzọ. A gara n’ihu n’inye ya ọgwụgwọ ahụ, ka oge na-agakwa, ọnyá ahụ lara kpam kpam. Willstätter gara mụọ chemistry (mmụta ọdịdị na mgbanwe ọnọdụ ihe) na Mahadum Munich dị na Germany ma mesịa nweta onyinye Nobel maka nchọpụta ndị o mere n’ihe ọmụmụ ya banyere ihe dị n’ahịhịa nke na-eme ka ihe nwee àgwà, karịsịa chlorophyll (ihe na-eme ka ahịhịa na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ). N’ụzọ dị ịrịba ama, a na-eji mmiri ọgwụ si n’ahịhịa emepụta n’ozuzu ma ọ bụ akụkụ ụfọdụ nke ihe dị ka pasent 25 nke ọgwụ ndị e ji eme ihe ugbu a.

Mkpa Ọ Dị Inwe Echiche Ziri Ezi

Ma, e kwesịrị ịghọta na a bịa n’ihe banyere ịgwọ ọrịa, ihe na-arụ nnọọ ọrụ n’ahụ otu onye pụrụ ịrụ obere ọrụ n’ahụ onye ọzọ. Ịdị irè nke ụdị ọgwụgwọ ọ bụla na-adabere n’ọtụtụ ihe, gụnyere ụdị ọrịa ọ bụ na otú o siruru n’ike nakwa ọnọdụ ahụ ike nke onye ọrịa ahụ n’ozuzu ya. Ọbụna oge e ji ya eme ihe pụrụ ikere òkè.

Ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ na-arụkarị ọrụ nwayọọ nwayọọ karịa ụdị ọgwụgwọ Bekee, n’ihi ya ọrịa a gaara agwọpụ ma a sị na a chọpụtara ma gwọọ ya n’oge pụrụ iri mmadụ ahụ ruo n’ókè nke na a ga-achọ ọgwụ ndị siri ike—ọbụna ịwa ahụ—iji zọpụta ndụ. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe na-adịghị na ya ịrapagidesi ike n’otu ụdị ọgwụgwọ dị ka a ga-asị na ọ bụ nanị ụzọ e si agwọ nsogbu ahụ ike.

Otú ụdị ọgwụgwọ ọzọ si emetụta ahụ ike dị iche n’otú usoro ọgwụgwọ Bekee si emetụta ya. Ụzọ o si agwọ ọrịa na-abụkarị site n’igbochi ọrịa egbochi, ha na-elekwasịkwa  anya n’ụzọ ndụ na gburugburu ebe obibi mmadụ nakwa otú ihe ndị a na-esi emetụta ahụ ike ya. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị na-enye ọgwụgwọ ọzọ na-enyocha onye ahụ n’ozuzu ya kama inyocha nanị akụkụ ahụ nwere nsogbu ma ọ bụ ọrịa ahụ.

Ihe mere ụdị ọgwụgwọ ọzọ ji adọrọ nnọọ mmasị n’ezie bụ n’ihi echiche e nwere na ojiji a na-eji ihe ndị si n’okike eme ihe na ya na ụzọ a na-esi eji ya agwọ ọrịa na-adị nro karị, ọ dịghikwa adịru ize ndụ ka ọgwụgwọ Bekee. Ya mere, n’ihi mmasị ka ukwuu e nwere n’ịchọta ọgwụgwọ ndị na-adịghị ize ndụ, ndị dịkwa irè, a ga-atụle ihe atụ ole na ole nke usoro ọgwụgwọ ọzọ n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee Teta! (Bekee), nke June 22, 1988, peeji nke 25-26.