Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere “Ọrụ A Ga-arụ Ruo Ogologo Ndụ Nile”?

Gịnị Mere “Ọrụ A Ga-arụ Ruo Ogologo Ndụ Nile”?

 Gịnị Mere “Ọrụ A Ga-arụ Ruo Ogologo Ndụ Nile”?

GRAHAM * rụrụ ọrụ afọ 37 n’otu nnukwu ụlọ ọrụ dị n’Australia. Ná ngwụsị nke afọ ndị 50 ya, na mberede e mere ka ọ mara na n’ime izu ole na ole ọrụ ya agaghịkwa adị mkpa. Anyị pụrụ ịghọta nchekasị o nwere, nke na-egosipụta ihe ijuanya na oké nchegbu o nwere maka ọdịmma ya n’ọdịnihu. ‘Gịnị mere “ọrụ m ga-arụ ruo ogologo ndụ m nile,” bụ́ nke m chere na o nweghị ihe ga-eme ya ruo mgbe m ga-eru afọ ezumike nká?’ Graham nọ ná mgbagwoju anya.

N’ezie, ịchụ mmadụ n’ọrụ adịghị ụkọ, ọ bụghịkwa ihe ọhụrụ. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ ndị a na-achụ n’ọrụ n’ụwa nile bụ ihe ọhụrụ nye ndị a na-ewe n’ọrụ n’oge a. Obi abụọ adịghị ya na e nwere ọtụtụ ihe mere e ji achụ mmadụ n’ọrụ, ma otu nke bụ́ isi yiri ka ọ bụ ihe a na-akpọ mgbubilata. Gịnị bụ mgbubilata, gịnịkwa kpatara ya?

Ebe Ọrụ Na-agbanwe Agbanwe

Ọnọdụ akụ̀ na ụba e nwere taa na-aghọwanye nke zuru ụwa ọnụ. A bịara ghọta nke a karịsịa na United States ná ngwụsị afọ ndị 1970 mgbe ụlọ ọrụ dị iche iche chọpụtara na ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba nke ndị mmadụ na-azụ ụgbọala, ngwá electronic, na ihe ndị ọzọ a na-emepụta n’ofesi.

Ná mgbalị ha na-eme iji dị ka ndị ọzọ nakwa iji wetulata ego mmepụta ihe na-ewe, ụlọ ọrụ ndị dị n’America malitere igbubilata ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ha ma na-eme ka ụzọ ndị ha si emepụta ihe na ihe ha ji emepụta ihe ka mma. Usoro e ji mee ka ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ha dị ala ghọrọ nke a maara dị ka mgbubilata. A kọwawo usoro ahụ dị ka “ime ka ọnụ ọgụgụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ dị ala, ọ na-abụkarị site n’ịchụ ndị ọrụ, ime ihe ga-akpali mmadụ ịla ezumike nká tupu oge eruo, ịtụga ndị ọrụ ebe ọzọ, na ihe ndị ọzọ ga-emerịrị ka mmadụ kwụsị ọrụ.”

Ruo afọ ụfọdụ, ọ bụ ndị na-arụ ọrụ e ji ọkpụkpụ aka arụ ka mgbubilata kasị na-emetụta. Ma ná ngwusị afọ ndị 1980 na ná mmalite afọ ndị 1990, nke a malitere ịgụnye ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-arụ ọrụ ọfịs, karịsịa ndị ọrụ nọ n’ọkwá dị n’etiti. N’oge na-adịghị anya, ihe ndị a na-emenụ metụtara mba nile mepere emepe. Ka nsogbu ego gara n’ihu, gọọmenti dị iche iche na ndị ọzọ na-ewe mmadụ n’ọrụ chọrọ ụzọ isi belata ihe ha na-emefu site n’imekwu mgbubilata.

Nye ọtụtụ ndị ọrụ, a dịghịkwa eji ọrụ n’aka. Otu onyeisi òtù ndị ọrụ na-ekwu, sị: “Ndị ji obi ha nile rụọ ọrụ ruo afọ 10, 15, 20 ahụwo ka e mebiri nkwekọrịta zuru ezu ha nwere, ha abụrụwokwa ndị a chụrụ n’ọrụ.” N’akwụkwọ ya bụ́ Healing the Downsized Organization, Delorese Ambrose na-akọwa na e chepụtara okwu bụ́ “onye nkwado òtù” na 1956 iji kọwaa ọnọdụ onye e were n’ọrụ. Ọ kọkwara, sị: “Ma ọ̀ rụrụ ọrụ dị ka onye ọrụ ọkwá ya dị ala ma ọ bụ dị ka manịja, o nyefere ọdịmma ọnọdụ akụ̀ na ụba ya, mmekọrịta ya na ndị mmadụ, na iguzosi ike n’ihe ya n’aka òtù ya iji nweta nchebe—ọrụ ọ ga-arụ ruo ogologo ndụ ya nile. N’ụzọ doro anya, e mebiwo nkwekọrịta a n’ụlọ ọrụ nke oge a.”

Mgbubilata emewo ka ọtụtụ nde ndị ọrụ  n’ụwa nile ghọọ ndị na-enwekwaghị ọrụ, ọ dịghịkwa ụdị ndị e were n’ọrụ ọ na-adịghị emetụta. Na nanị United States, ọnụ ọgụgụ ndị e were n’ọrụ o metụtara adịwo ukwuu, na-eme ka ọtụtụ nde rụworo ọrụ ruo ogologo oge ghakwara inwe ọrụ. E nwewokwa mgbubilata yiri nke ahụ n’ọtụtụ mba ndị ọzọ. Ma nanị ọnụ ọgụgụ nkịtị ndị a adịghị egosi nhụsianya ha na-akpata.

Mmetụta Ọjọọ Ha Na-enwe

Graham, bụ́ onye a kpọrọ aha ná mmalite nke isiokwu a, kwuru, sị: “O nwere nnọọ ka ọ na-esi emetụta gị n’ụbụrụ.” O ji ọchụchụ a chụrụ ya tụnyere “ọrịa ma ọ bụ mmerụ ahụ.”

Mgbe a na-enyeghị ndị mmadụ ụgwọ ọrụ n’ihi iguzosi ike n’ihe ha, ọ na-adị ha ka e mere ha ihe ọjọọ n’ihi na e jighị àjà ndị ha chụụrụ ụlọ ọrụ ha kpọrọ ihe. Ntụkwasị obi adịghịzi, karịsịa mgbe ọtụtụ ndị isi ụlọ ọrụ nwetara nnukwu ụgwọ ọrụ maka ime mgbubilata n’ụlọ ọrụ ha. Ọzọkwa, onye ahụ na-enwekwaghị ọrụ ịkwụsị na mberede inweta ego ndị ọ na-enwetabu mgbe nile na-eme ka ọ gharazie inwe ike ịkwụ ụgwọ ụlọ, ịkwụ ụgwọ ndị ọzọ, ilekọta ahụ ike nke ndị ezinụlọ ya, na ịkwụ ụgwọ ụlọ akwụkwọ, tinyere ịnọgide na-ebi ụdị ndụ mawooro ya ahụ, inwe ntụrụndụ na ịhụ maka ihe ndị o nwere. Nke a na-akpata obi nkoropụ na inwe echiche nke ịbụ onye na-abaghị uru.

Ebe ọ bụ na ọrụ kwụsiri ike ma dị mma na-atụnye ụtụ dị ukwuu n’uru mmadụ chere na ya bara, cheedị echiche ụdị ajọ mmetụta enweghị ọrụ na-enwe n’ahụ ndị nwere nkwarụ, ndị na-enweghị nkà, ma ọ bụ ndị kataworo ahụ. Otu nnyocha e mere n’Australia kpughere na ndị nọ n’agbata afọ 45 na 59 na-abụkarị ndị a na-achọ ịchụ n’ọrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ndị nọ n’agbata afọ ndụ a ka ọ na-esikarịrị ike ịnabata mgbanwe ahụ.

È nwere ihe ndị ọzọ a pụrụ ime? N’ezie ọrụ nwa oge ma ọ bụ ọrụ a na-akwụ ụgwọ dị ala na ya ka enweghị ọrụ mma. Otú ọ dị, nke a pụrụ ịkpata ọnọdụ ibi ndụ dị ala. A chọpụtawokwa na ọ bụ nanị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị a chụrụ n’ọrụ na-emesi nweta ọrụ a na-akwụ ha ego ruru ego ole a na-akwụ ha n’ọrụ ha rụburu. Nke a na-eme ka ndụ ezinụlọ nwekwuo nrụgide.

Ọbụna ọrụ a na-arụ ugbu a nwere ike ọ gaghị eweta obi iru ala. Nke a bụ n’ihi na atụmanya nke enwekwaghị ọrụ n’ọdịnihu nwere mmetụta dị njọ ma na-emebi ihe. Akwụkwọ bụ́ Parting Company na-ekwu, sị: “Mmadụ ịtụ anya na ya agakwaghị enwe ọrụ yiri mmadụ ịhọrọ ụzọ kasị mma gwongworo ga-esi kụtuo ya. Ọ na-esiri gị ike inwe ọbụna echiche kasị zie ezie, n’ihi na ị gaghịdị ahụ gwongworo ahụ—ma ọ bụ nchụpụ mberede ahụ—tupu o bibie gị.”

Olee otú enweghị ọrụ si emetụta ndị ntorobịa? Mgbe otu ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ na sayensị mesịrị otu nnyocha, a chọpụtara nke a: “Otu n’ime ihe ndị bụ́ isi a na-ahụ anya ndị na-egosi na mmadụ etoruwo ogo mmadụ bụ inweta ọrụ oge nile, bụ́ nke na-egosi mmalite ndụ onye toworo eto ‘n’ezie,’ n’ime ụwa nke ndị toworo eto nakwa dị ka ụkpụrụ ndị toworo eto si dị, bụ́ nke ya na mmadụ ijide ego nke ya na-agakọ.” Ya mere ọ bụrụ na a na-eche na inwe ọrụ na-egosi mmalite nke ndụ onye toworo eto n’ezie, enweghị ọrụ pụrụ ịdị na-akpa ndị ntorobịa aka ọjọọ.

Ịnagide Enweghị Ọrụ

E kwuwo na enweghị ọrụ yiri ịga ije n’ebe e liri ogbunigwe. Akwụkwọ bụ́ Parting Company na-ekwu na mmetụta uche ndị a na-enwekarị bụ iwe, ihere, ụjọ, enweghị obi ụtọ, na imewere onwe onye ebere.  Ịnagide ihe ndị a siri ike. Onye dere akwụkwọ ahụ kwuru, sị: “E kenyewo gị ọrụ siri ike—ikpebi ọdịnihu gị. I kwughị ka e kenye gị ọrụ a, ọ pụkwara ịbụ na ị maghị otú ị ga-esi malite ya, na mberede kwa ị pụrụ ịhụ nnọọ na i nweghị enyemaka.” Ịkọwara ezinụlọ ha ọchụchụ a chụrụ ha n’ọrụ na mberede bụ otu n’ime nsogbu kasị sie ike na-eche ndị a chụrụ n’ọrụ ihu.

Otú ọ dị, e nwere ụzọ ụfọdụ dị irè e si anagide mmetụta nke mgbubilata na-eweta. Nzoụkwụ mbụ bụ igbubilata ụzọ i si ebi ndụ ozugbo site n’ime atụmatụ nakwa ibi ndụ n’ụzọ dị mfe karịa ihe mawooro gị ahụ n’oge gara aga.

Ihe ndị na-esonụ bụ ụfọdụ aro pụrụ inyere gị aka ime ihe banyere ọnọdụ ahụ, ọ bụrụgodị na ha agwọtaghị ya kpam kpam. Nke mbụ, mara na ịkwụsị mmadụ ọrụ na mberede bụ ihe na-eme eme n’oge ndị a. N’ihi ya, n’agbanyeghị afọ ndụ gị na ahụmahụ i nwere, hazie ụzọ i si ebi ndụ tupu oge eruo maka a dịghị ama ama.

Nke abụọ, lezie anya ka ị ghara iji ụgwọ hiri nne n’ihi ihe ndị na-adịghị oké mkpa maka ihe oriri na ihe mgbokwasị. Na-ebi ndụ dị ka ihe ị na-akpata hà, echekwala na ị pụrụ iji ego ị na-atụ anya inweta site ná mbuli n’ọkwá ma ọ bụ ná mbuli ụgwọ ọnwa kwụọ ụgwọ ndị i ji. Ọnọdụ akụ̀ na ụba nke oge a na-egosi na e nwere ike ya abụrụ na ọdịnihu ga-adịte aka a ga-adabere na ya adịghị.

Nke atọ, chọta ụzọ ndị ị ga-esi mee ka ndụ gị dị mfe karị, belatakwa ihe ndị i ji ego eme ugbu a. Nke a na-agụnye ịkwụsị iji ụgwọ ndị na-adịghị oké mkpa ma jiri ezi uche na-ebi ndụ dị mfe ma dị mma.

Nke anọ, tụleghachi ihe mgbaru ọsọ ndị i nwere ná ndụ, ndị nke ime mmụọ na ndị nke anụ ahụ, megharịakwa ha. Mgbe ahụ ị pụrụ iji mkpebi nile i mere tụlee ihe mgbaru ọsọ ndị i nwere ma chọpụta mmetụta ọ ga-enwe.

N’ikpeazụ, ka ụzọ ndụ nke ndị ọzọ bi n’ógbè gị bụ́ ndị na-emefu ego aghara aghara ghara ịgụ gị agụụ, ma ọ bụghị ya ị ga-amalite ịchọ ka i nwee ihe ha nwere, e wee rabanye gị n’ụzọ ndụ ha.

Ihe ndị a bụ aro ole na ole pụrụ inyere gị na ezinụlọ gị aka izere ọnyà nke ichekwube akụ̀ na ụba a na-ejighị n’aka n’ime ụwa nke a na-ejighị n’aka ma ọlị ma zere ọtụtụ n’ime nchegbu ndị ụzọ ndụ nke oge a na-eme ka e nwee.

E hotara na onye na-arụbu ọrụ n’ụlọ akụ̀ bụ́ Felix Rohatyn kwuru, sị: “O nwere ihe dị oké njọ n’ụwa anyị mgbe enweghị ọrụ nke otu onye na-eme ka onye ọzọ nwee akụ̀ na ụba.” Usoro ihe a dị oké njọ nke na, n’oge na-adịghị anya, a ga-eji otu ụwa dochie anya ya, bụ́ ebe okwu ahụ bụ́ “ọrụ a ga-arụ ruo ogologo ndụ nile” ga-enwe ihe ọ pụtara karịa ihe anyị pụrụ iche n’echiche ugbu a.—Aịsaịa 65:17-24; 2 Pita 3:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanwewo aha ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]

‘O nwere ihe dị oké njọ mgbe enweghị ọrụ nke otu onye na-eme ka onye ọzọ nwee akụ̀ na ụba’

[Foto dị na peeji nke 17]

Chọọ ụzọ ndị ị ga-esi mee ka ndụ gị dị mfe